Ịchọ Ụzọ n’Oké Osimiri
Ịchọ Ụzọ n’Oké Osimiri
IHE mejupụtara Marshall Islands bụ otu puku na narị agwaetiti abụọ ndị buru ibu na ndị dị obere. Ọtụtụ n’ime ha ji nanị mita ole na ole dị elu karị elu oké osimiri. A dịghị ahụ agwaetiti ndị a ma a gbatụ obere n’oké osimiri. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na Marshall Islands n’oge ochie na-ejili ụgbọ epeepe ha esi n’otu obere agwaetiti aga ná nke ọzọ, na-agbalị ịchọta ebe ha na-aga n’Oké Osimiri Pacific nke dị ihe dị ka narị puku kilomita isii na iri ise n’ogologo na n’obosara. Olee otú ha si eme nke a? Ihe na-eduzi ha bụ “map” ndị dị mfe nghọta ma dị ịrịba ama a kpọrọ chaatị osisi.
Site n’ahụmahụ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na Marshall Islands nweworo, ha na-eji ebili mmiri ụfọdụ amata mgbe ha rutewere ebe e nwere agwaetiti ma ha nọrọ ihe dị ka iri kilomita atọ site n’ebe agwaetiti ahụ dị. E nwere ọtụtụ ụdị ebili mmiri ha ga-amụ banyere ya, ma chaatị osisi ahụ nyeere ha aka ịdị na-echeta ha. Olee otú chaatị osisi ahụ dị? Dị ka ị pụrụ ịhụ n’ihe osise dị n’ebe a, a na-akpakọta mkpọrọgwụ osisi screw pine ma ọ bụ azịza akị Bekee n’ụzọ ga-eme ka ha yie ụdị ebili mmiri dịgasị iche iche. A na-ekenyeju mkpokoro eju mmiri na chaatị osisi ahụ iji gosi ebe agwaetiti ndị ahụ dịgasị.
Ruo ọtụtụ afọ, ọtụtụ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri amaghị ka e si eji chaatị osisi ahụ akwọ ụgbọ mmiri, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ka a kụziiri ya. Olee otú onye na-amụ ka e si akwọ ụgbọ mmiri ga-esi mụta otú e si eji chaatị osisi ahụ akwọ ụgbọ? Ọ bụ nanị site n’ịnata ọzụzụ na ịnọgide na-etinye ihe ndị ahụ a kụziiri ya n’ọrụ. Onye bụ́ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mmiri na-akụziri onye ahụ na-amụ amụ mgbe nanị ha abụọ nọ, ikekwe na-akpọrọ ya mgbe ọ na-aga agwaetiti ndị dị ha nso. Ka onye ahụ na-amụ ka e si akwọ ụgbọ mmiri na-amata ụdị ebili mmiri dịgasị iche iche, ọ na-enwekwu obi ike iji chaatị osisi ya eme ihe. Ka oge na-aga, ọ pụrụ ịkwọ ụgbọ mmiri n’onwe ya.
N’ụzọ yiri nke ahụ, Okwu Chineke bụ́ Bible pụrụ ịghọ ihe na-eduzi anyị ná ndụ. Ná mmalite, mmadụ nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe ndị bụ́ isi dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ma obi na-esi anyị ike n’ihe Bible na-ekwu mgbe anyị nọgidere na-amụ ya ma na-etinye ụkpụrụ ndị dị na ya n’ọrụ. A gwara onye ndú ụmụ Izrel, bụ́ Jọshụa, ka ọ nọgide na-agụ Okwu Chineke ka o wee nwee ike ‘ilezi anya ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya.’ Chineke gwara Jọshụa, sị: “Mgbe ahụ, ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche.” (Joshua 1:8) N’ezie, Bible pụrụ izi anyị ụzọ ka mma isi bie ndụ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
© Greg Vaughn