Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchọ Ụmụ Mmadụ Na-achọ Ndụ Ebighị Ebi

Ọchịchọ Ụmụ Mmadụ Na-achọ Ndụ Ebighị Ebi

Ọchịchọ Ụmụ Mmadụ Na-achọ Ndụ Ebighị Ebi

Ọ DỊWO anya ọ nọworo na-agụ ụmụ mmadụ agụụ ịdị ndụ ebighị ebi. Ma nke ahụ enwebeghị isi—ọ dịbeghị onye nwere ike ịkwụsị ọnwụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịchabeghị anya, nnyocha ndị a na-eme n’ihe banyere ọgwụ na ahụ́ ike emeela ka ndị mmadụ nweghachi olileanya na ọ ka ga-ekwe omume ịgbatị ndụ mmadụ. Ka anyị tụlee nnyocha dị iche iche ndị ọkà mmụta sayensị nọworo na-eme iji mee ka nke a kwe omume.

Ndị na-amụ ihe banyere ihe ndị dị ndụ na-enyocha otu mmiri ọgwụ ahụ́ mmadụ na-emepụta bụ́ nke a na-akpọ telomerase iji nwee ike ịmụba ugboro ole mkpụrụ ndụ ga na-emepụtaghachi onwe ha. Ndị sayensị maara na mkpụrụ ndụ ndị merela ochie na ndị nke ike gwụrụla na-anwụ, ndị ọhụrụ anọchie ha. N’ezie, ọ na-afọ nke nta ka akụkụ ahụ́ nile nke mmadụ nwoghaa onwe ha ọtụtụ ugboro n’oge nile mmadụ dị ndụ. Ndị ahụ na-eme nnyocha na-eche na ọ bụrụ na a mụbaa ugboro ole mkpụrụ ndụ na-emepụtaghachi onwe ha, “ahụ́ mmadụ pụrụ ịdị na-enwogha onwe ya ruo ogologo oge—ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.”

E nwere ihe ọzọ ndị sayensị na-amụ banyere ya. Nke ahụ bụ otú ha ga-esi jiri mkpụrụ ndụ ha wepụtara n’imeju, akụrụ, ma ọ bụ n’obi mmadụ nke mebiri emebi mepụta imeju, akụrụ ma ọ bụ obi ọhụrụ. Nke ọhụrụ ahụ ha mepụtara ga-adị nnọọ ka nke ahụ mebiri emebi, ha ga-etinyere onye ahụ nke ọhụrụ ahụ ma ha wepụ nke ahụ mebiri emebi.

Ndị ọkà mmụta na-amụ otú a pụrụ isi mepụta ụmụ ihe ndị pere nnọọ mpe a ga-eji nanị onyokomita na-ahụ, na-atụ anya na oge ga-eru mgbe a ga-emepụta robot ndị ha ka mkpụrụ ndụ, bụ́ ndị ndị dọkịta ga na-agbanye n’ọbara ka ha gaa chọta mkpụrụ ndụ ndị bu ọrịa cancer na nje ndị na-akpata ọrịa ma gbuo ha. Ụfọdụ ndị kweere na ọ bụrụ na e mepụta nke a ma jikọta ya na usoro iji mkpụrụ ndụ e ketara eketa agwọ ọrịa, na ọ ga-eme ka ahụ́ mmadụ dịgide ndụ.

E nwere ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-akwado ka a na-adọwa ozu na friza iji chekwaa ha ruo mgbe ndị dọkịta ga-achọpụta ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa dịgasị iche iche, ọgwụ ndị a ga-eme ka ndị mmadụ ghara ịdị na-aka nká, mee ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ ma nweghachi ahụ́ ike ha. Otu akwụkwọ kwuru na nke a na ịgbasi ozu bụ́ nke ndị Ijipt oge ochie na-eme bụ nwanne.

Otú a ụmụ mmadụ si na-eme ike ha nile iji chọta ihe ga-eme ka mmadụ ghara ịnwụ anwụ gosiri otú o si siere ha ike ịnabata echiche ahụ bụ́ na mmadụ na-anwụ anwụ. Ọ̀ ga-ekwe ụmụ mmadụ omume ịdị ndụ ebighị ebi? Gịnị ka Bible nwere ikwu n’okwu a? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị ahụ.