Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere New World Translation ji kwuo na Deuterọnọmi 31:2 na ‘a gakwaghị ekwe ka Mozis na-apụ apụ ma na-abata abata’ dị ka onye ndú ụmụ Izrel, ebe nsụgharị ndị ọzọ kwuru na ọ pụkwaghị ịpụ apụ ma ọ bụ ịbata abata n’ihu ụmụ Izrel?

Ọ bụ ezie na a pụrụ ịsụgharị okwu Hibru e ji mee ihe n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a ịbụ nke ọ bụla n’ime nsụgharị ndị a, otú e si jiri ya mee ihe ná nsụgharị Bible Bekee ụfọdụ nyere echiche na Mozis adịkwaghị ike ịrụ ọrụ ya dị ka onye ndú, mgbe o mere agadi. Dị ka ihe atụ, Bible Nsọ nke Union Version si otú a kwuo ihe ahụ Mozis kwuru: “Otu narị afọ na iri abụọ ka m gbara taa; apụghị m ịpụ apụ na ịbata abata ọzọ.” N’ụzọ yiri nke ahụ, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik kwuru, sị: “Adịghịkwa m ike ịbụ onyendu ụnụ.”

Otú ọ dị, Deuterọnọmi 34:7 gosiri na n’agbanyeghị na Mozis emeela agadi, ọ ka dị ike. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ kwuru, sị: “Mozis gbara otu narị afọ na iri abụọ mgbe ọ nwụrụ: anya ya adịghị ahụ inyoghi inyoghi, ume ya apụghị n’ahụ́ ya.” Ya mere, Mozis, ka dị ike idu mba Izrel, ma ọ bụghị uche Jehova ka ọ nọgide na-edu ha. Nke a pụtara ìhè n’ihe ọzọ Mozis kwuru. Ọ sịrị: “Jehova asịwokwa m, Ị gaghị agabiga Jọdan nke a.” O yiri ka Jehova nọ na-ekwughachi ihe ahụ o kpebiri ná mmiri Meriba.—Ọnụ Ọgụgụ 20:9-12.

Mozis biri ogologo ndụ dị ịrịba ama bụ́ nke a pụrụ ikewa ụzọ atọ. O biri afọ iri anọ n’Ijipt, bụ́ ebe a ‘kụziiri ya ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt, ya adịkwa ike n’okwu na n’omume.’ (Ọrụ 7:20-22) O bikwara afọ iri anọ ọzọ na Midian. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ nọrọ zụlite àgwà ndị kwekọrọ n’ihe Jehova chọrọ iji duo ndị ya. N’ikpeazụ, Mozis duru ụmụ Izrel ruo afọ iri anọ. Jehova kpebiziri na ọ bụ Jọshụa ga-eduru mba ahụ gafee Osimiri Jọdan ma banye n’Ala Nkwa ahụ, ọ bụghị Mozis.—Deuterọnọmi 31:3.

N’ihi ya, otú New World Translation si sụgharịa Deuterọnọmi 31:2, bụ nnọọ otú e kwesịrị isi sụgharịa ya. Ihe mere Mozis agaghị anọgide na-edu ụmụ Izrel abụghị n’ihi na ọ dịkwaghị ike, kama ọ bụ n’ihi na Jehova ekweghị ka ọ nọgide na-edu ha.