Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ànyị Nwere Nnọọ Ike Ịmata Chineke?

Ànyị Nwere Nnọọ Ike Ịmata Chineke?

Ànyị Nwere Nnọọ Ike Ịmata Chineke?

“Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere . . . nanị ezi Chineke ahụ.”—Jọn 17:3.

PỌL ONYEOZI tiri mkpu, sị: “Lee ịdị omimi nke akụ̀ na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke!” O kwukwara, sị: “Lee otú ikpe ya si bụrụ ndị a na-apụghị inyochapụta enyochapụta na otú ụzọ ya si bụrụ ndị a na-apụghị ịchọpụta achọpụta!” (Ndị Rom 11:33) Okwu ndị a ò kwesịrị ime ka anyị kwubie na ụmụ mmadụ agaghị achọtali amamihe na ihe ọmụma Chineke, n’ihi ya, na ha agaghị amatali Chineke na nzube ya?

Ọtụtụ ndị okpukpe kweere na a gaghị amatali Chineke amata. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion kwuru banyere echiche dị otú ahụ, sị: “Ọ dịghị onye nwere ike ịmata Chineke. . . . A gaghị enyeli Chineke aha ma ọ bụ kọwaa ya akọwaa. Aha ọ bụla ma ọ bụ nkọwa ọ bụla mmadụ nyere Chineke agaghị ezu ezu, Chineke ga-akarịkwa . . . ya. . . . Ọ bụghị onye a ga-amata amata, n’ihi na ọ karịrị ihe nile a na-amata amata.” *

Magazin bụ́ Newsweek kwuru na ọtụtụ ndị bi ná mba ndị na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe nwere “ihe e nwere ike ịkpọ echiche ọhụrụ,” nke bụ́ na “e nwere nanị otu eziokwu, eziokwu a bụkwanụ na ọ dịghị eziokwu dịnụ.”

N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị enwetabeghị azịza nye ajụjụ ndị ha na-ajụ banyere ihe bụ́ nzube nke ndụ. Ha na-ahụ nsogbu ndị na-agbawa obi bụ́ ịda ogbenye, ọrịa, na ime ihe ike. Ndụ a na-ejighị n’aka a na-ebi n’ụwa pụrụ ịdị na-ewute ha nke ukwuu. Ọ pụrụ ịdị na-agụsi ha agụụ ike inweta azịza nke ajụjụ ndị ahụ, ma mgbe ha na-apụghị inweta ha, ha nwere ike ikwubi na ajụjụ ndị ahụ enweghị azịza. N’ihi nke a, ọtụtụ n’ime ndị dị otú ahụ akwụsịla ịga chọọchị ma na-efezi Chineke otú ha chere dị mma—ma ọ bụrụ na ha ka kweere n’ezie na Chineke dị adị.

Ihe Bible Na-ekwu

Ndị ji Bible kpọrọ ihe ma kwere n’obi ha na Jizọs Kraịst bụ Ọnụ Na-ekwuru Chineke kwesịrị ịchọ ịmata ihe Bible na-ekwu banyere okwu a. Ikekwe i chetara na Jizọs nwere mgbe o kwuru banyere okporo ụzọ abụọ, “okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi [bụ́ nke] sara mbara ma dị obosara” na “ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ [bụ́ nke] dị . . . mkpagide.” Ọ kọwara otú a ga-esi amata ndị na-aga n’okporo ụzọ nke ọ bụla, na-asị: “Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha.” Olee ụdị mkpụrụ ọ bụ? Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ site n’ihe ndị ha na-eme, ọ bụghị site n’ihe ndị ha na-ekwu, ọ sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze nke eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba.” O bighị n’anyị ikwu na anyị kweere na Chineke. Anyị aghaghị ime uche Chineke. N’ezie, anyị aghaghị ibu ụzọ mata nke ọma ihe uche Chineke bụ.—Matiu 7:13-23.

Jizọs mere ka o doo anya na ụmụ mmadụ ga-enwetali ihe ọmụma banyere Chineke. Ọ sịrị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) O doro anya na anyị nwere ike inweta amamihe na ihe ọmụma Chineke na-ekpughe—ma ọ ga-abụ nanị ma anyị tinye mgbalị siri ike inweta ha. Otú ọ dị, onyinye Chineke ga-enye ndị mere mgbalị dị otú ahụ bụ ndụ ebighị ebi, n’ihi ya, mgbalị a bụ nnọọ ihe bara uru.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Okpukpe Hindu, Tao, na nke Buddha bụ́ ndị e nwere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nwere nkwenkwe ndị yiri nke a.

[Foto dị na peeji nke 4]

Jizọs kwuru na okporo ụzọ ahụ nke dị mkpagide na-eduba ná ndụ