Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọta Akụ̀ Ihe Atụ na Guinea

Ịchọta Akụ̀ Ihe Atụ na Guinea

Ịchọta Akụ̀ Ihe Atụ na Guinea

RUO ọtụtụ narị afọ, ndị na-egwu akụ̀ ndị dị n’ala tinyere ndụ na ahụ́ ike ha n’ihe ize ndụ ka ha na-achọ ụdị akụ̀ dị iche iche. Ndị na-anaghị atụ ụjọ n’ime ha bụ́ ndị ruru Guinea, bụ́ mba dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, achọtawo ụdị akụ̀ dị iche iche—nke nkịtị na nke ihe atụ. Ala ha, nke daịamọnd, ọlaedo, ihe e ji emepụta ígwè, na ihe e ji emepụta alụminiọn jupụtara na ya, nwekwara ihe karịrị nde ndị Guinea itoolu bi na ya.

Ọ bụ ezie na okpukpe Krisendọm ebukarịghị ibu n’obodo ahụ, ndị obodo ahụ ji ofufe kpọrọ ihe, ọtụtụ n’ime ha jikwa akụ̀ ihe atụ kpọrọ ihe. Gịnị kpọmkwem ka akụ̀ ndị a bụ? Ha bụ ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị a kpọrọ “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” na Hagaị 2:7.

Akụ̀ Ihe Atụ

Igwumi ala iji chọta akụ̀ zoro ezo chọrọ nnọọ mgbalị. N’otu aka ahụ, n’ozi Ndị Kraịst, ọ dị mkpa ime mgbalị dị ukwuu iji chọta akụ̀ ihe atụ. A malitere ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’ime ime obodo Guinea obere oge ka afọ 1950 gasịrị, ma o ruteghị n’isi obodo ya bụ́ Conakry ruo obere oge ka afọ 1960 gasịrị. E nwere ugbu a ihe dị ka narị mmadụ itoolu bụ́ Ndịàmà Jehova n’ọgbakọ na ìgwè ọmụmụ ihe 21 dị n’akụkụ nile nke mba ahụ.

Ndị ozi ala ọzọ bịara n’afọ 1987 ma soro nanị otu ọgbakọ e nwere na Conakry jee ozi. Ugbu a e nwere ihe karịrị ndị ozi ala ọzọ 20 n’isi obodo ahụ na n’ime ime obodo ya. Ha na-eji ịnụ ọkụ n’obi ewusi ọgbakọ ndị dị ebe ahụ ike ma na-eso ụmụnna ndị obodo ahụ eje ozi ọma.

Otu onye bi na Conakry aha ya bụ Luc enwetawo ọṅụ n’ihi Bible ọ na-amụrụ otu nwa okorobịa bụ́ dọkịta nke aha ya bụ Albert. Albert achọwo eziokwu na chọọchị dị iche iche, o fekwara ndị mmụọ ọjọọ. O nwere otu ọla aka ọ na-agbabu, bụ́ nke otu dibịa nyere ya ma kwe ya nkwa na ọla aka ahụ ga-eme ka ihe ọma na-abịara ya. Mgbe Albert na-achọtaghị ezi okpukpe ọ na-achọ, ọ tụfuru ọla aka ya ma kpee ekpere, sị: “Chineke, ọ bụrụ na ị dị adị, mee ka o kwe m omume ịmata na ife gị. Ma ọ́ bụghị ya, m ga-ebiwe ndụ m otú o si masị m.” Ka obere oge gasịrị, Albert gara n’ụlọ nwanne ya nwanyị ileta ya ma nụpere ka otu Onyeàmà Jehova na-amụrụ nwa nwanne ya nwanyị Bible. N’oge na-adịghị anya, e mere ndokwa ka Luc mụwara ya Bible.

Kwa izu, Luc na-eji obi ụtọ eji ụkwụ aga ihe karịrị kilomita ise iji duzie ọmụmụ ihe ahụ. N’agbanyeghị na Luc agụghị oké akwụkwọ, Albert, bụ́ onye gara mahadum, nwere nnọọ mmasị n’okwukwe siri ike Luc nwere n’Akwụkwọ Nsọ na otú o si akọwa ihe. Albert nwere nọọ obi ụtọ ịmata na ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata esighị Chineke n’aka, kama na Jehova zubere iwepụ ahụhụ nile ma mee ka ụwa a ghọọ paradaịs. (Abụ Ọma 37:9-11) Eziokwu Bible na àgwà ọma ọ hụrụ n’ebe ndị nọ n’ọgbakọ nọ metụrụ Albert n’obi.

Otú ọ dị, dị nnọọ ka ọkpụ ụzụ nwere nkà na-aghaghị iji nlezianya kpụchaa daịamọnd ka o wee na-egbuke egbuke, ọ dị Albert mkpa iwepụ omume ụwa ndị o nwere iji mee ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke. Ọ kwụsịrị ịga na nke ndị dibịa afa, kwụsị ịṅụbiga mmanya ókè, kwụsịkwa ịgba chaa chaa. Ịkwụsị ise siga siiri nnọọ Albert ike karị. Mgbe o mesịrị kpesie ekpere ike ka Jehova nyere ya aka, ọ kwụsịrị ya. Ka ọnwa isii gasịrị, o debara alụmdi na nwunye ya n’akwụkwọ dị ka iwu chọrọ. Nwunye ya malitere ịmụ Bible. Ugbu a, ha abụọ bụcha ndị ohu Jehova e mere baptizim.

Martin bụ daịamọnd ihe atụ ọzọ. Ọ malitere ịmụ Bible n’obodo Guéckédou mgbe ọ dị afọ 15. Ndị mụrụ ya bụ́ ndị na-ekpe Katọlik kpagburu ya n’ihi na ọ na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ha dọkasịrị akwụkwọ ndị Martin na-eji amụ Bible, tie ya ihe, ma chụpụ ya n’ụlọ. Dị nnọọ ka oké okpomọkụ na-eme ka kabọn ghọọ daịamọnd, otú ahụ ka mmegide si mee ka ịhụnanya Martin nwere maka eziokwu Bible sie ike. Ka oge na-aga, ndị mụrụ ya kwụsịrị imegide ya, ya alọghachikwa n’ụlọ. Gịnị mere obi ndị mụrụ ya ji gbanwee? Ha hụrụ nnukwu ọdịiche dị n’àgwà Martin na nke ụmụnne ya ndị ọ tọrọ, bụ́ ndị maliterela inupụ isi ma na-akwa iko. Nna Martin malitere nabatawa Ndịàmà Jehova n’ụlọ ya n’ihi na o doola ya anya na okpukpe ọhụrụ nwa ya na-ekpe abaarala nwa ya uru. Nne Martin ekeleela ụmụnna ọtụtụ mgbe n’ihi ihe nile ha mere iji nyere nwa ya nwoke aka. E mere Martin baptizim mgbe ọ dị afọ 18, ya emesịakwa gaa Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, ugbu a kwanụ, ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Akụ̀ Ihe Atụ Ndị Si Mba Ọzọ

Ọ bụ ezie na Guinea na-ebuga ọtụtụ akụ̀ ya ndị sitere n’ala ná mba ọzọ, ụfọdụ akụ̀ ihe atụ e nwere n’ebe ahụ si mba ọzọ. Ọtụtụ ndị esila ná mba ndị ọzọ dị n’Africa kwabata, ọ na-abụkarịkwa iji nweta ego. Ụfọdụ abịawo ebe a iji gbanahụ agha ọjọọ a lụrụla ná mba ha ruo ogologo oge.

Ernestine si Cameroon bịa Guinea afọ 12 gara aga. Ndịàmà Jehova mụụrụ ya ihe, ya agaakwa ọmụmụ ihe ha ruo ọtụtụ afọ, ma e meghị ya baptizim. N’afọ 2003, anya mmiri rujuru ya anya ka ọ nọ na-ekiri ka a na-eme ndị mmadụ baptizim n’otu mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova. Oké obi amamikpe mere ka o kpegara Jehova ekpere, sị: “Adị m afọ 51 ugbu a, ọ dịbeghịkwa ezi ihe m meere gị. Achọrọ m ife gị.” Mgbe nke ahụ gasịrị, Ernestine mere ihe kwekọrọ n’ekpere ahụ o ji obi umeala kpee. Ọ kọwaara nwoke ya na ya bi na nanị ihe ga-eme ka ha nọgide na-ebi bụ ma hà lụrụ n’ụzọ iwu kwadoro. Nwoke ahụ kwetara, anya mmiri ọṅụ gbakwara Ernestine ka e mesịrị mgbe a na-eme ya baptizim na November 2004.

Kemgbe mmalite afọ ndị 1990, ọtụtụ puku mmadụ esila Liberia na Sierra Leone gbata ọsọ ndụ na Guinea, nke a gụnyekwara ọtụtụ narị ndị ohu Jehova. Obere oge ka ụmụnna rutesịrị n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, ha na-eme ndokwa maka ọmụmụ ihe, meekwa ndokwa maka ọrụ nkwusa ma rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụfọdụ ndị anọrọla n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ ghọọ ndị ohu Jehova. Isaac bụ otu onye n’ime ha. Mgbe e mesịrị Isaac baptizim, a kpọrọ ya ka ọ lọghachi n’ọrụ ọ na-arụbu n’otu ụlọ ọrụ ndị Liberia. Kama ịlaghachị, ọ họọrọ ịnọgide n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị na Lainé bụ́ ebe ọ nọ na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile. Ọ kọwara, sị: “Ọ bụkwaghị m chọwa ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ mụ agaa nara ikike n’aka onyeisi. Enweere m onwe m ife Jehova.” Na December 2003, e mere mgbakọ distrikti n’ogige a dịpụrụ adịpụ maka otu narị Ndịàmà na iri ise bụ́ ndị ha na ndị gbara ọsọ ndụ dị puku iri atọ bi. Ọ bụ ihe obi ụtọ na narị mmadụ ise na iri itoolu na otu bịara mgbakọ ahụ, gụnyere ndị ogbi itoolu e ji asụsụ ndị ogbi kọwaara ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ. E mere mmadụ 12 baptizim. Ụmụnna ahụ nwere nnọọ obi ụtọ ná mgbalị e mere iji kwadebere ha oriri ime mmụọ ahụ.

“Ihe A Na-achọsi Ike” Emee Mgbanwe Ndị Dị Mkpa

Ọ dịghị ihe ndị na-achọ daịamọnd na-ekwe ka o gbochie ha ịchọta ya. Otú ọ dị, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ mgbalị ndị ọhụrụ na-eme iji nagide ihe isi ike ka ha wee nwee ike ijere Jehova ozi. Tụlee ihe mere Zainab.

Mgbe Zainab dị afọ 13, a manyere ya ịgba ohu. E si n’obodo ya nke dị ná mba ọzọ dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa kpọga ya Guinea. Mgbe ọ dị afọ 20, ọ nụrụ ozi Bible. Ọ dị njikere ime ihe ndị ọ na-amụta.

O siiri Zainab ike ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ma ọmụmụ ihe anyị na-amasị ya nke ukwuu, o kpebisikwara ike ịghara ikwe ka ha kwaa ya. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ na-ezo akwụkwọ ya n’èzí ka o wee nwee ike iwere ha mgbe ọ na-aga ọmụmụ ihe. Ndị ọ na-agbara ohu tirụsịrị ya ahụ́ ugboro ugboro n’ihi ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst.

Ihe mesịrị gbanwee, Zainab enwerekwa onwe ya. Ọ malitere ozugbo ahụ gawa ọmụmụ ihe nile a na-enwe, bụ́ nke nyeere ya aka ime ka mmekọrịta ya na Jehova sie ike ngwa ngwa. Ọ jụrụ ịnara ọrụ a na-akwụ ego buru ibu na ya, bụ́ nke gaara eme ka ọ na-agha ọmụmụ ihe bụ́ ebe ọ na anata ọzụzụ dị ka Onye Kraịst. O debanyere aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ghọọ onye nkwusa Alaeze a na-emebeghị baptizim ma mesịa gosipụta nrara ọ raara onwe ya nye Jehova site na baptizim ime mmiri. Ozugbo nke ahụ gasịrị, ọ rụrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ka ọnwa isii gasịrị, o tinyere akwụkwọ ije ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile.

Mgbe otu onye nwere mmasị gasịrị ọmụmụ ihe ugboro ole na ole, o kwuru, sị: “M nọrọ ebe a, ọ naghị adị m ka m̀ bụ ogbenye.” Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị nwere mmasị nanị n’akụ̀ nkịtị ndị dị n’ala Guinea, ndị hụrụ Jehova n’anya ji ịnụ ọkụ n’obi na-achọ akụ̀ ihe atụ ndị dị na ya. Ee, taa “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” na-abata n’ofufe Jehova nke dị ọcha!

[Igbe dị na peeji nke 8]

GUINEA - 2005

Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke Ndịàmà: 883

Ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible: 1,710

Ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs: 3,255

[Map ndị dị na peeji 8]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

GUINEA

Conakry

SIERRA LEONE

LIBERIA

[Foto dị na peeji nke 9]

Albert na Luc

[Foto dị na peeji nke 9]

Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Conakry

[Foto dị na peeji nke 10]

Ernestine

[Foto dị na peeji nke 10]

Martin

[Foto dị na peeji nke 10]

Zainab

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

USAID