Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahụ́ Ndị Juu Na-asa Iji Mezuo Iwu Okpukpe Ha Ọ̀ Bụ Ebe E Si Nweta Baptizim?

Ahụ́ Ndị Juu Na-asa Iji Mezuo Iwu Okpukpe Ha Ọ̀ Bụ Ebe E Si Nweta Baptizim?

Ahụ́ Ndị Juu Na-asa Iji Mezuo Iwu Okpukpe Ha Ọ̀ Bụ Ebe E Si Nweta Baptizim?

JỌN ONYE NA-EME BAPTIZIM kwusara “baptizim dị ka ihe ngosipụta nke nchegharị.” Jizọs nyekwara ndị na-eso ụzọ ya iwu ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya ma na-eme ha baptizim.—Mak 1:4; Matiu 28:19.

Bible gosiri na baptizim Ndị Kraịst na-eme na-achọ ka e mikpuo mmadụ na mmiri kpamkpam. Akwụkwọ bụ́ Jesus and His World kwuru, sị: “A na-eme ihe dị otú ahụ n’ọtụtụ okpukpe, ma n’oge ochie ma n’oge a, n’akụkụ nile nke ụwa.” Akwụkwọ ahụ kwuru hoo haa na “baptizim Ndị Kraịst na-eme sitere . . . n’okpukpe ndị Juu.” Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?

Ebe Ndị Juu Na-asa Ahụ́ Iji Mezuo Iwu Okpukpe

Ndị ọkà mmụta ihe ochie bụ́ ndị na-egwu ala n’ebe dịdebere Ugwu Ụlọ Nsọ Jeruselem achọpụtala ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100 ebe a na-asa ahụ́ iji mezuo iwu okpukpe, ma ndị a rụrụ na narị afọ mbụ T.O.A. ma ndị a rụrụ na narị afọ mbụ O.A. Otu ihe e dere n’ụlọ nzukọ ndị Juu nke a rụrụ na narị afọ nke abụọ ma ọ bụ na narị afọ nke atọ O.A. kwuru na ndị a rụụrụ ebe ịsa ahụ́ ndị ahụ bụ “ndị ọbịa ọ dị mkpa.” A chọtala ọtụtụ ebe ịsa ahụ́ ndị ọzọ n’otu akụkụ Jeruselem ebe ezinụlọ ndị oké ozu na nke ndị nchụàjà biiri; ọ fọrọ nke nta ka ụlọ nke ọ bụla dị ebe ahụ nwee ebe ịsa ahụ́ nke ya bụ́ nke e ji emezu iwu okpukpe.

Ebe ịsa ahụ́ ndị ahụ nwere akụkụ anọ. A wapụtara ụfọdụ na nkume ma gwuo ndị ọzọ n’ala, dookwa ha brik ma ọ bụ okwute n’akụkụ. E tere ime ha ete ka ha ghara ihi mmiri. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-afọ nke nta ka ha ruo mita abụọ na mbara ma jiri obere ihe gafee mita abụọ na ọkara n’ogologo. A na-egwu ọwara mmiri ndị mmiri zoro ezo na-esi na ha asọba n’ebe ịsa ahụ́ ndị ahụ. Mmiri ya na-ejikarị obere ihe akarị otu mita n’omimi ma ọ bụ karịa otú ahụ ka o nwee ike irikpu isi mmadụ ma onye ahụ tukwuru etukwuru. Mgbe ụfọdụ, obere mgbidi na-eke steepụ e si abanye n’ebe ịsa ahụ́ ahụ abụọ. A na-eche na a na-esi n’otu akụkụ nke steepụ ahụ abanye n’ebe ahụ a na-asa ahụ́ iji mee ka a dị ọcha mgbe onye ahụ na-adịbeghị ọcha, onye ahụ sachaa ahụ́, ya esikwa n’akụkụ nke ọzọ pụọ iji zere imerụ onwe ya mgbe ọ dịchara ọcha.

Ndị Juu na-anọ ebe ndị ahụ asa ahụ́ iji mezuo iwu okpukpe ha maka ịdị ọcha. Gịnị ka nke a gụnyere?

Iwu ahụ na Omenala nke Ịsa Ahụ́

Iwu Mozis mesiri ike mkpa ọ dị ndị Chineke ịdị ọcha ma n’ofufe ha na-efe Chineke ma n’anụ ahụ́ ha. E nwere ihe dị iche iche na-eme ka ndị Izrel ghara ịdị ọcha bụ́ ndị ga-eme ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha site n’ịsa ahụ́ na uwe ha.—Levitikọs 11:28; 14:1-9; 15:1-31; Deuterọnọmi 23:10, 11.

Jehova Chineke dị ọcha ma dị nsọ n’ụzọ zuru ezu. N’ihi ya, a gwara ndị nchụàjà na ndị Livaị na ha aghaghị ịkwọ aka ma saa ụkwụ ha tupu ha abịa nso n’ebe ịchụàjà, ma ọ́ bụghị ya, ha anwụọ.—Ọpụpụ 30:17-21.

Ndị ọkà mmụta kweere na ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., okpukpe ndị Juu emeela ka ọ bụrụ iwu na ndị Livaị na-abụghị ndị nchụàjà ga na-erubekwara iwu ahụ isi. Ma ndị Essene ma ndị Farisii na-asa ahụ́ mgbe mgbe iji mezuo iwu okpukpe. Mgbe otu akwụkwọ na-ekwu banyere oge Jizọs, o kwuru, sị: “Ọ bụ iwu na onye Juu ga-asa ahụ́ iji mezuo iwu okpukpe tupu ya ana-arịgo n’Ugwu Ụlọ Nsọ, tupu ya achụọ àjà, tupu ya ana-erite uru n’àjà onye nchụàjà chụụrụ ya na n’oge ndị ọzọ yiri nke ahụ.” Ihe odide Talmud kwuru na a chọrọ ka ndị na-asa ahụ́ mikpuo onwe ha kpamkpam n’ime mmiri.

Jizọs katọrọ ndị Farisii n’ihi ịnọgide na-amanye ndị mmadụ ịsa ahụ́ iji mezuo iwu okpukpe. O doro anya na ha na-eme “baptizim dị iche iche,” gụnyere ime “iko na arịa ndị e ji agbapụta ihe na arịa ọla kọpa baptizim.” Jizọs kwuru na ndị Farisii na-emebi iwu Chineke n’ihi omenala ha. (Ndị Hibru 9:10; Mak 7:1-9; Levitikọs 11:32, 33; Luk 11:38-42) Ọ dịghị iwu dị n’Iwu Mozis kwuru ka mmadụ mikpuo onwe ya n’ime mmiri kpamkpam.

Baptizim Ndị Kraịst na-eme ò sitere n’ahụ́ ndị Juu na-asa iji mezuo iwu okpukpe ha? Mbanụ!

Ịsa Ahụ́ Iji Mezuo Iwu Okpukpe na Baptizim Ndị Kraịst

Ndị Juu na-asa ahụ́ iji mezuo iwu okpukpe ha. Otú ọ dị, Baptizim Jọn mere abụghị ụdị ịsa ahụ́ ndị Juu na-asa iji mezuo iwu okpukpe ha. Na a bịara mara Jọn dị ka Onye Na-eme Baptizim gosiri na otú o si mikpuo ndị mmadụ na mmiri dị iche n’ihe ndị Juu na-eme. Ndị ndú okpukpe ndị Juu zigadịrị ndị ozi ka ha jee jụọ Jọn, sị: ‘Gịnị mere i ji eme baptizim?’—Jọn 1:25.

Ịsa ahụ́ Iwu Mozis chọrọ pụtara na onye Juu ga-asa ahụ́ mgbe ọ bụla ọ ghọrọ onye na-adịghị ọcha. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị baptizim ahụ Jọn mere na nke Ndị Kraịst mesịrị mewe. Baptizim Jọn mere gosiri nchegharị na ọjụjụ mmadụ jụrụ omume ọjọọ ndị ọ na-emebu. Baptizim Ndị Kraịst bụ ihe atụ nke na-egosi na mmadụ ararala onwe ya nye Chineke. Onye Kraịst ahụ na-eme ya nanị otu ugboro, ọ bụghị ugboro ugboro.

Ahụ́ ahụ a na-asa n’ụlọ ndị nchụàjà ndị Juu nakwa n’ebe ịsa ahụ́ ọhaneze ndị dịdebere Ugwu Ụlọ Nsọ ahụ iji mezuo iwu okpukpe bụ nanị obere ihe ka o ji yie baptizim Ndị Kraịst. Ihe baptizim Ndị Kraịst na-eme pụtara dị iche kpamkpam n’ihe ahụ́ ndị Juu na-asa iji mezuo iwu okpukpe, pụtara. Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ The Anchor Bible Dictionary kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na Jọn [Onye Na-eme Baptizim] agbasoghị ụdị baptizim ọ bụla a na-eme n’oge ya,” ya bụ, ụdị baptizim ọ bụla okpukpe ndị Juu na-eme. A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere baptizim ọgbakọ Ndị Kraịst na-eme.

Baptizim Ndị Kraịst na-eme bụ “arịrịọ a na-arịọ Chineke maka ezi akọ na uche.” (1 Pita 3:21) Ọ na-egosi na mmadụ ararawo onwe ya kpamkpam nye Jehova ife Ya dị ka onye na-eso ụzọ nke Ọkpara Ya. Mmikpu a na-emikpu mmadụ na mmiri kpamkpam bụ ihe atụ kwesịrị ekwesị nke nraranye dị otú ahụ. Mmikpu e mikpuru onye ahụ na mmiri na-egosi na ọ nwụọla n’omume ọjọọ ndị ọ na-emebu. Mwepụta e wepụtara ya na mmiri na-egosi na onye ahụ adịla ndụ ime uche Chineke.

Jehova Chineke na-enye ndị si otú ahụ raara onwe ha nye ya, e meekwa ha baptizim, ezi akọnuche. N’ihi ya, Pita onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ nwere ike ịgwa ndị kwere ekwe ibe ya, sị: “[Baptizim] na-azọpụtakwa unu ugbu a.” Nke ahụ bụ ihe ụdị ịsa ahụ́ ọ bụla ndị Juu na-asa iji mezuo iwu okpukpe na-enweghị ike ime.