Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù

Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù

Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù

GORDON, bụ́ onye ọ fọrọ nke nta ka o ruo afọ 60 ọ lụrụ nwanyị, kwuru, sị: “Ụbọchị agbamakwụkwọ m so n’ụbọchị ndị kasị dị m mkpa ma nye m obi ụtọ ná ndụ.” Gịnị na-eme ka ụbọchị agbamakwụkwọ ezi Ndị Kraịst dị ha nnọọ mkpa? Ọ bụ ụbọchị ha na-ekwe ndị ha hụrụ nnọọ n’anya—di ha ma ọ bụ nwunye ha na Jehova Chineke—nkwa dị nsọ. (Matiu 22:37; Ndị Efesọs 5:22-29) Ee, nwoke na nwanyị na-eme atụmatụ ịlụ di na nwunye chọrọ ka ụbọchị agbamakwụkwọ ha nye ha obi ụtọ, ma ha chọkwara ịsọpụrụ Onye mere ndokwa alụmdi na nwunye.—Jenesis 2:18-24; Matiu 19:5, 6.

Olee otú nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ ga-esi mee ka ihe omume a na-enye obi ụtọ dịkwuo ùgwù? Gịnị ka nwanyị a na-alụ ọhụrụ ga-eme iji sọpụrụ di ya na Jehova? Olee otú ndị ọzọ ga-abịanụ ga-esi mee ka ụbọchị agbamakwụkwọ wetakwuo ọṅụ? Ịtụle ụkpụrụ Bible ụfọdụ ga-enye aka zaa ajụjụ ndị ahụ, imekwa ihe kwekọrọ na ha ga-ebelata nsogbu ndị nwere ike imebi ihe omume a pụrụ iche.

Ònye Ga-ekpebi Ihe A Ga-eme?

N’ọtụtụ mba, iwu pụrụ inye onye ozi bụ́ Onyeàmà Jehova ikike ijikọta di na nwunye. Ọbụna n’ebe ọ na-aghaghị ịbụ onye ọrụ gọọmenti ga-ejikọta di na nwunye, di na nwunye ahụ ka pụrụ ịchọ ka e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ dabeere na Bible. Mgbe a na-ekwu okwu dị otú ahụ, a na-agwakarị nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ ka o chesie echiche ike banyere ọrụ Chineke nyere ya dị ka onyeisi ezinụlọ. (1 Ndị Kọrint 11:3) N’ihi ya, ọ bụ nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ ga-ekpebi ihe a ga-eme n’agbamakwụkwọ ahụ. Otú ọ dị, a na-amalitekarị n’oge eme ndokwa maka agbamakwụkwọ na oriri ọ bụla nwere ike isochi ya. N’ihi gịnị ka nke a nwere ike iji ghọọrọ nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ nsogbu?

Otu ihe kpatara ya bụ na ndị ikwu ya ma ọ bụ ndị nke nwanyị nwere ike ịchọ ịtụ ihe a ga-eme n’agbamakwụkwọ ahụ. Rodolfo, bụ́ onye duzirila ọtụtụ agbamakwụkwọ, kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ndị ikwu na-achọ ịtụwara nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ ụka ihe ọ ga-eme, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ bụ ha wetara ego e ji eme oriri agbamakwụkwọ ahụ. Ha nwere ike ikwu na a ga-emerịrị agbamakwụkwọ ahụ na oriri ya otú ha chọrọ. Nke a nwere ike ịnapụ nwoke ahụ ikike Akwụkwọ Nsọ nyere ya ikpebi ihe a ga-eme ná nnọkọ ahụ.”

Max, bụ́ onye duzirila agbamakwụkwọ ruo ihe karịrị afọ 35, kwuru, sị: “Ahụla m na ọ na-abụkarịzi nwanyị a na-alụ ọhụrụ na-ekpebi ihe a ga-eme n’agbamakwụkwọ na n’oriri ya, di ya anaghịzikwa enwecha ọnụ.” David, bụ́ onye duzikwarala ọtụtụ agbamakwụkwọ, kwuru, sị: “Ndị nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ na-abụkarị ndị na-enweghị ahụmahụ n’ime mkpebi, ọtụtụ mgbe kwa, a naghị ajụkarị ha echiche ha mgbe a na-eme ndokwa maka agbamakwụkwọ.” Olee otú nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ pụrụ isi rụọ ọrụ ya nke ọma?

Nkwurịta Okwu Na-eme Ka E Nwekwuo Ọṅụ

Ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ nwee ike ịrụ ọrụ ya nke ọma n’ịkwadebe agbamakwụkwọ ya, ọ ghaghị iso ndị ọzọ kwurịta nnọọ okwu. Bible kwuru hoo haa, sị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.” (Ilu 15:22) Otú ọ dị, a pụrụ izere ọtụtụ ihe ndị na-akpata obi nkoropụ ma ọ bụrụ na nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ eburu ụzọ soro nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ, ndị ezinụlọ ha, na ndị ọzọ pụrụ inye ya ezigbo ndụmọdụ dabeere na Bible, kwurịta okwu.

N’ezie, ọ dị nwoke na nwanyị kwere onwe ha nkwa ọlụlụ mkpa iburu ụzọ kwurịta atụmatụ ha na ihe ndị ha nwere ike ime. N’ihi gịnị? Dị ka ihe atụ, gee ntị n’ụfọdụ ihe Ivan na nwunye ya bụ́ Delwyn kwuru, bụ́ ndị lụrụla di na nwunye ọtụtụ afọ ma na-enwe obi ụtọ na ya, bụ́kwa ndị a na-azụliteghị n’otu ebe. Ivan chetara otú ha si mee ndokwa agbamakwụkwọ ha ma kwuo, sị: “Amara m kpọmkwem ihe m chọrọ n’agbamakwụkwọ m, nke gụnyere mụ na ndị enyi m nile bịaranụ inwe oriri, anyị ịwa keeki, nakwa nwunye m iyi uwe agbamakwụkwọ ọcha. Ma Delwyn chọkwaranụ ka anyị mee obere agbamakwụkwọ, n’awaghị keeki. Ọ nọdị na-eche ma ọ̀ ga-eyi ihe ọzọ n’abụghị uwe agbamakwụkwọ.”

Olee otú di na nwunye a si mee ka echiche dị iche iche ha nwere kwekọọ? Ọ bụ site n’iji obiọma gwa ibe ha ihe ha na-eche. (Ilu 12:18) Ivan kwukwara, sị: “Anyị mụrụ isiokwu ndị dabeere na Bible kwuru banyere agbamakwụkwọ, dị ka ndị dị n’Ụlọ Nche nke October 15, 1984. * Ụlọ Nche a nyeere anyị aka ile ihe omume a anya otú Chineke si ele ya. Ebe ọ bụ na a zụliteghị anyị n’otu ebe, onye nke ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịgbanwe ihe ụfọdụ ọ chọburu.”

Aret na Penny mere ihe yiri nke ahụ. Aret kwuru banyere ụbọchị agbamakwụkwọ ha, sị: “Mụ na Penny kwurịtara ihe dị iche iche anyị chọrọ maka agbamakwụkwọ anyị, anyị kwekọrịtakwara. Anyị kpere ekpere ka Jehova gọzie ụbọchị ahụ. Agakwukwaara m ndị mụrụ anyị na ụfọdụ ndị di na nwunye ọzọ tozuru okè nọ n’ọgbakọ anyị ka ha nye m ndụmọdụ. Aro ndị ha tụụrụ m nyeere m aka nke ukwuu. Agbamakwụkwọ anyị mesịkwara gaa nnọọ nke ọma.”

Ime Ka Uwe na Ejiji Unu Dị Ùgwù

O doro anya na ma nwanyị a na-alụ ọhụrụ ma nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ ga-achọ iyi uwe dị mma n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha. (Abụ Ọma 45:8-15) Ha pụrụ itinye oge, mgbalị, na ego iji zụta uwe kwesịrị ekwesị. Olee ụkpụrụ Bible ndị nwere ike inyere ha aka ịhọrọ uwe ndị dị ùgwù ma maa mma?

Ka anyị tụlee ihe nwanyị a na-alụ ọhụrụ ga-eyi n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ ezie na ndị dị iche iche na obodo dị iche iche nwere ụdị ejiji na-amasị ha, ndụmọdụ Bible na-abara ndị bi n’ebe nile uru. A chọrọ ka ụmụ nwanyị “jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.” Nke ahụ metụtara ụmụ nwanyị bụ́ Ndị Kraịst mgbe nile, ọ gụnyekwara nnọọ ụbọchị agbamakwụkwọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na agbamakwụkwọ nke na-eweta ọṅụ achọghị “ejiji dị nnọọ oké ọnụ.” (1 Timoti 2:9; 1 Pita 3:3, 4) Lee nnọọ obi ụtọ a ga-enwe mgbe a gbasoro ndụmọdụ a!

David, bụ́ onye e kwurula banyere ya na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị di na nwunye na-agbalịsi ike ịgbaso ụkpụrụ Bible, e kwesịkwara ịja ha mma. Ma, e nweela mgbe ụfọdụ uwe ụmụ nwanyị a na-alụ ọhụrụ na ndị na-enyere ha aka na-adịghị mma, ma ọ́ bụghị na ọ gbadaghị agbada, ya abụrụ na ọ na-ahụ ụzọ.” Otu okenye tozuru okè n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-abụ mgbe ya na ndị ahụ na-achọ ịlụ di na nwunye na-ekwurịta okwu tupu agbamakwụkwọ ha, ya enyere ha aka ile ihe anya otú Chineke si ele ya. Olee otú o si eme nke a? Ọ bụ site n’ịjụ ha ma uwe ha chọrọ iyi ọ̀ ga-adị mma iyi aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Nke bụ́ eziokwu bụ na uwe mmadụ ga-eyi nwere ike dịrị iche n’uwe ọ na-eyikarị aga ọmụmụ ihe, uwe mmadụ yi n’agbamakwụkwọ ya nwekwara ike kwekọọ n’omenala obodo, ma ihe e weere dị ka ejiji dị mma kwesịrị ikwekọ n’ụkpụrụ Ndị Kraịst a na-akwanyere ùgwù. Ọ bụrụgodị na ụfọdụ ndị ụwa elee ụkpụrụ omume ọma nke Bible anya dị ka ihe na-adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́, ezi Ndị Kraịst na-adị njikere ịjụ mgbalị ụwa na-eme ịgbanwe ha otú o si chọọ.—Ndị Rom 12:2; 1 Pita 4:4.

Penny kwuru, sị: “Kama iwere uwe ma ọ bụ oriri dị ka ihe kasị mkpa, mụ na Aret lekwasịrị anya n’okwu agbamakwụkwọ ahụ nke dabeere na Bible. Ọ bụ ya bụ ihe kasị mkpa a ga-eme n’ụbọchị ahụ. Ihe na-akasị eme m obi ụtọ ma m cheta ya abụghị uwe m yiri ma ọ bụ ihe m riri, kama nke ahụ, ọ bụ onye mụ na ya nọrọ n’ụbọchị ahụ na obi ụtọ m nwere na m lụrụ nwoke m hụrụ n’anya.” Di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iburu okwu dị otú ahụ n’uche mgbe ha na-eme atụmatụ maka agbamakwụkwọ ha.

Ụlọ Nzukọ Alaeze Bụ Ebe Dị Ùgwù

Ọtụtụ Ndị Kraịst na-achọ ịlụ di na nwunye na-enwe mmasị ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze agba akwụkwọ ma ọ bụrụ na ha nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi gịnị ka ha ji ahọrọ ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ya? Otu di na nwunye kọwara ihe mere ha ji họrọ ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, sị: “Anyị ghọtara na alụmdi na nwunye bụ ndokwa dị nsọ Jehova mere. Ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ebe anyị na-anọ efe ofufe, lụọ mere ka anyị mata malite n’ụbọchị mbụ ahụ anyị lụrụ na ọ dị mkpa ka Jehova nọrọ n’alụmdi na nwunye anyị. Uru ọzọ ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ya kama ịnọ n’ebe ọzọ bara bụ na o gosiri ndị ikwu anyị na-abụghị ndị kwere ekwe bịaranụ otú ofufe Jehova dịruru anyị ná mkpa.”

Ọ bụrụ na ndị okenye ọgbakọ na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ekwere ka di na nwunye chọrọ ịgba akwụkwọ nọrọ na ya gbaa akwụkwọ, di na nwunye ahụ kwesịrị ịgwa ha tupu oge eruo otú ha na-eme atụmatụ isi kwadebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Otu ụzọ nwanyị a na-alụ ọhụrụ na nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ pụrụ isi kwanyere nnọọ ndị a kpọrọ ịbịa agbamakwụkwọ ha ùgwù bụ ikpebisi ike ịbịa kpọmkwem n’oge ahụ ha kwuru a ga-eji malite agbamakwụkwọ ha. Ha kwesịkwara nnọọ ijide n’aka na e mere ihe nile n’ụzọ dị ùgwù. * (1 Ndị Kọrint 14:40) Nke ahụ ga-eme ka ha zere ngosipụta gabigara ókè nke ihe onwunwe bụ́ nke a na-ahụ n’ọtụtụ agbamakwụkwọ ndị ụwa.—1 Jọn 2:15, 16.

Ndị bịara agbamakwụkwọ ahụ pụkwara igosi na ha na-ele alụmdi na nwunye anya otú Jehova si ele ya. Dị ka ihe atụ, ha agaghị atụ anya ka agbamakwụkwọ ha kụpụ agbamakwụkwọ Ndị Kraịst ndị ọzọ, ka à ga-asị na a na-ama aka onye agbamakwụkwọ nke ya ga-aka efu ego. Ndị Kraịst tozuru okè ghọtakwara na ịbịa gere okwu agbamakwụkwọ ahụ dabeere na Bible a ga-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị mkpa ma baa uru karịa oriri agbamakwụkwọ ma ọ bụ ememe ọ bụla ọzọ pụrụ isochi ya. Ọ bụrụ na ọ bụ nanị otu n’ime ha ka Onye Kraịst ga-agali n’ihi oge ma ọ bụ ọnọdụ ya, ọ ka nnọọ mma ka ọ gaa nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Otu okenye nke aha ya bụ William kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị a kpọrọ maka agbamakwụkwọ ahụ akpachara anya ghara ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma mesịa bịa n’ebe a ga-anọ mee oriri agbamakwụkwọ ahụ, nke a na-egosi na ha aghọtaghị na ihe omume ahụ dị nsọ. Ya bụrụgodị na a kpọghị anyị maka oriri agbamakwụkwọ ahụ, anyị nwere ike igosi na anyị kwadoro di na nwunye ahụ ma gbaara nnọọ ndị ikwu na-ekweghị ekwe bịara agbamakwụkwọ ahụ àmà site n’ịbịa gere okwu ahụ a ga-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.”

Ọṅụ nke Na-anaghị Akwụsị n’Ụbọchị Agbamakwụkwọ

Ụwa na-ejizi agbamakwụkwọ akpa ego. Otu akụkọ e nwetara na nso nso a kwuru na agbamakwụkwọ dị otú o kwesịrị na United States “na-efu $22,000, ma ọ bụ ọkara nke ego otu ezinụlọ na-akpata n’America [n’otu afọ].” N’ihi ịgbaso mkpọsa a na-eme n’usoro mgbasa ozi, ọtụtụ ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha na-eji otu ụbọchị ahụ abanye n’oké ụgwọ ga-ewe ha ọtụtụ afọ ịkwụ. Nke ahụ ọ̀ bụ ụzọ amamihe dị na ya mmadụ isi malite alụmdi na nwunye ya? Ndị na-amaghị ụkpụrụ Bible ma ọ bụ ndị na-achọdịghị ịma nwere ike ịhọrọ imefu oké ego otú ahụ, ma ezi Ndị Kraịst adịtụghị otú ahụ!

Ọtụtụ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst enweela ike iji oge ha na ego ha eme ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nrara ha raara onwe ha nye Chineke site n’ịkpọ nanị mmadụ ole na ole na ịghara imefu ihe karịrị ihe ha nwere nakwa site n’ilekwasị anya n’okwu agbamakwụkwọ a ga-ekwu n’ụbọchị ahụ. (Matiu 6:33) Tụlee ihe atụ Lloyd na Alexandra, bụ́ ndị nọgidere n’ozi oge nile kemgbe afọ 17 ha gbasịrị akwụkwọ. Lloyd kwuru, sị: “Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ lere agbamakwụkwọ anyị anya dị ka ihe na-akpọtụghị akpọtụ, ma ọ masịrị nnọọ mụ na Alexandra. Anyị chere na ụbọchị agbamakwụkwọ anyị ekwesịghị ịbụ ụbọchị anyị ga na-echegbu onwe anyị maka nnukwu ego anyị ga-emefu na ya, kama nke ahụ, na o kwesịrị ịbụ ụbọchị anyị ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ihi ndokwa Jehova mere ime ka mmadụ abụọ nwee nnọọ obi ụtọ.”

Alexandra gbakwụnyere, sị: “Ana m asụ ụzọ mgbe anyị lụrụ, achọkwaghị m ka ihe ùgwù a funahụ m iji nwee agbamakwụkwọ kpọtụrụ akpọtụ. Ụbọchị agbamakwụkwọ anyị pụrụ nnọọ iche. Ma, ọ bụ nanị mmalite nke ndụ anyị dị ka di na nwunye. Anyị jiri ndụmọdụ ahụ e nyere bụ́ ka anyị ghara ilekwasị anya gabiga ókè n’ịlụ di na nwunye mee ihe, kama nke ahụ, anyị achọwo nduzi Jehova ná ndụ anyị dị ka ndị bụ́ di na nwunye. Nke a emewo nnọọ ka Jehova gọzie anyị.” *

Ee, ụbọchị agbamakwụkwọ gị bụ ụbọchị pụrụ iche. Ihe e mere n’ụbọchị ahụ nwere ike igosi otú alụmdi na nwunye gị ga-adị n’ọdịnihu. N’ihi ya, dabere n’ebe Jehova nọ maka nduzi. (Ilu 3:5, 6) Ka ihe kasị mkpa ị ga-eburu n’obi bụrụ ihe okwu agbamakwụkwọ ahụ dabeere na Bible a ga-ekwu n’ụbọchị ahụ pụtara. Na-akwadorịtanụ onwe unu n’ọrụ Chineke nyere unu. N’ụzọ dị otú ahụ, ị pụrụ ịtọ ntọala siri ike maka alụmdi na nwunye gị, sitekwa na Jehova ịgọzi gị, ị ga-enweta ọṅụ nke na-agaghị akwụsị n’ụbọchị agbamakwụkwọ gị.—Ilu 18:22.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 E bipụtakwuru ihe ọmụma ọzọ na Teta nke February 8, 2002, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 20 Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ na-achọ ịlụ di na nwunye chọrọ ka e see ha foto ma ọ bụ vidio n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha kwesịrị ibu ụzọ hụ na ọ dịghị ihe a ga-eme nke ga-eme ka agbamakwụkwọ ahụ gharakwa ịdị ùgwù.

^ par. 25 Lee peeji nke 26 nke akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ndị na-achọ ịlụ di na nwunye kwesịrị iji nkwanye ùgwù gwa ibe ha obi ha mgbe ha na-eme atụmatụ ịgba akwụkwọ

[Foto dị na peeji nke 31]

Ka ihe kasị mkpa ị ga-ebu n’obi bụrụ ihe okwu agbamakwụkwọ ahụ dabeere na Bible a ga-ekwu n’ụbọchị agbamakwụkwọ gị pụtara