“N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Nọrọ n’Ebe A?”
“N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Nọrọ n’Ebe A?”
ONYE nwetara ihe nrite Nobel na onye lanahụrụ Oké Mgbukpọ ndị Nazi bụ́ Elie Wiesel nwere mgbe ọ kpọrọ ya “ajụjụ kasị mkpa mmadụ ga-ajụ.” Olee ajụjụ ọ bụ? Ajụjụ ahụ bụ, “N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a?”
Ọ̀ dịtụla mgbe ị jụrụ ajụjụ ahụ? Ọtụtụ ajụọla ya, ma ha enwetabeghị azịza ya. Mgbe onye Britain na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Arnold Toynbee nwara ịkọwa nzube nke ndụ, o dere, sị: “Ihe mgbaru ọsọ nke mmadụ bụ nnọọ ito Chineke na inweta obi ụtọ n’aka Ya ruo mgbe ebighị ebi.”
Ọ na-akpali mmasị ịhụ na ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, nwoke ọzọ, bụ́ onye a maara dị ka onye nwere amamihe n’ịchọpụta ihe banyere ndụ adịla mbụ nye azịza bụ́ isi nke ajụjụ ahụ. Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.
Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs Kraịst, kwadoro ụkpụrụ a bụ́ isi. Mgbe Jizọs nọ n’elu ala, o mere ihe nile o nwere ike ime iji too Nna ya nke eluigwe. Jizọs nwetara obi ụtọ ná ndụ site n’ife Onye kere ya. O mere ka o nwee afọ ojuju, bụ́ nke mere ka o kwuo, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m.”—Jọn 4:34.
Ya bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a? Dị ka Jizọs, Solomọn, na ọtụtụ ndị ohu Chineke ndị ọzọ, anyị pụrụ ịmata nnọọ nzube nke ndụ ma nweta obi ụtọ na-adịgide adịgide site n’ime uche Chineke. Ị̀ ga-achọ ịmatakwu otú ị ga-esi fee Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu”? (Jọn 4:24) Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịza ajụjụ ahụ bụ́, “N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a?”