Olee Otú Anyị Ga-esi Nweta Ihe Ọmụma Chineke?
Olee Otú Anyị Ga-esi Nweta Ihe Ọmụma Chineke?
Ụfọdụ nwere ike ịdị na-enwe obi abụọ ma Chineke ò nwere mmasị n’ezie ikpughere ụmụ mmadụ onwe ya. Ọ bụrụ na o nwere mmasị ime otú ahụ, olee otú o si eme ya?
ONYE Protestant Na-eme Mgbanwe nke dịrị ndụ na narị afọ nke 16 nke aha ya bụ John Calvin kwubiri n’ụzọ ziri ezi na ụmụ mmadụ apụghị ịmata Chineke n’onwe ha karịa otú Chineke si kpugheere ụmụ mmadụ onwe ya. Otú ọ dị, ụfọdụ nwere ike ịdị na-eche ma Chineke ò nwere mmasị n’ezie n’ikpughere ụmụ mmadụ onwe ya. Ya bụrụkwa na o nwere mmasị ime otú ahụ, olee otú o si eme ya?
Jehova, bụ́ ‘Onye Okike,’ nwere ihe o bu n’uche eme ihe nile ọ na-eme. Dịkwa ka “Chineke Nke pụrụ ime ihe nile,” o nwere ike zuru ezu iji mezuo nzube ya. (Eklisiastis 12:1; Ọpụpụ 6:3) Anyị pụrụ inwe obi ike na ọ dị nnọọ njikere ikpughere ụmụ mmadụ nzube ya, n’ihi na onye amụma ya bụ́ Emọs sitere n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.” Otú ọ dị, rịba ama na e kwuru na ọ bụ nanị ndị ohu Chineke, bụ́ ndị ji obi ha nile hụ ya n’anya, ka ọ na-ekpughere nzube ya. Ọ̀ bụ na nke ahụ ekwesịghị ekwesị? Ònye ka ị na-akọrọ ihe nzuzo gị? Ọ̀ bụ onye ọ bụla ị hụrụ, ka ọ̀ bụ ndị gị na ha dị nnọọ ná mma?—Emọs 3:7; Aịsaịa 40:13, 25, 26.
Amamihe na ihe ọmụma Chineke na-eme ka ndị dị umeala n’obi na-atụ egwu ya, o kwesịkwara ịdị otú ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ịtụ Chineke egwu abụghị nanị ihe a chọrọ ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta amamihe na ihe ọmụma Ya. Bible kwusiri ike na ọ dị anyị mkpa inwe obi dị umeala ka anyị wee mata uche Chineke. O kwuru, sị: ‘Zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ. Tọọrọ amamihe ntị gị n’ala. Wezụga obi gị inwe nghọta. Kpọkuo mmata, weliere nghọta olu gị. Chọọ ya dị ka ọlaọcha.’—Ilu 2:1-4.
Onye dị umeala n’obi nke na-eme ụdị mgbalị a ga-enwe nnọọ ike ịmata Chineke. Isiakwụkwọ Ilu ahụ dị n’elu kwukwara, sị: “Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.” Ee, ndị ji obi ha nile na-achọ eziokwu pụrụ ‘ịghọta ezi omume na ikpe, na izi ezi nile, ee, ezi ụzọ ọ bụla.’—Ilu 2:6-9.
Ọchịchọ Ụmụ Mmadụ Na-achọ Eziokwu
Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu, sị: “Ụmụ mmadụ na-achọkarị ịmata ihe bụ́ ezie na nke bụ́ adịgboroja, ihe siri ike na ihe na-esighị ike, eziokwu na aghụghọ, ihe dị ọcha na ihe ruru unyí, ihe doro anya na ihe dị mgbagwoju anya, nakwa ịmata otú ihe dịruru ná mma na otú ọ dịruru ná njọ.” Iji mezuo ọchịchọ a, ọ dịla anya ụmụ mmadụ chọwara eziokwu. Ruo ókè ha chọrọ ya n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye ọbụ abụ kpọrọ “Chineke nke eziokwu,” ruo ókè ahụ ka ha nweworo ọganihu n’ịchọta ya.—Abụ Ọma 31:5.
Aha ahụ bụ́ Jehova pụtara n’ụzọ nkịtị “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” (Jenesis 2:4) N’ihi ya, nanị ihe aha Chineke pụtara na-eme ka anyị mara na ọ bụ ya bụ Onye Okike ma na-agwa anyị banyere nzube ya. N’ezie, ịmara na iji aha ahụ bụ́ Jehova eme ihe bụ ihe e ji amata ezi okpukpe. Jizọs maara nnọọ na nke ahụ bụ eziokwu. Mgbe ọ na-ekwu banyere ndị na-eso ụzọ ya, ọ gwara Chineke n’ekpere, sị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya ị hụrụ m wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.”—Jọn 17:26.
Mgbe otu onye Hibru aha ya bụ Josef chọrọ ịkọwa nrọ, ọ dabeere ná mmekọrịta ya na Chineke ma jiri obi ike kwuo, sị: “Ọ́ bụghị Chineke nwe akụkọ isi nrọ nile?”—Jenesis 40:8; 41:15, 16.
Ka ọtụtụ narị afọ gasịrị, Eze Nebukadneza nke Babilọn rọrọ nrọ bụ́ nke ndị amamihe ya na-akọwalighị. Daniel onye amụma gwara eze ahụ, sị: “Chineke dị, Onye nọ n’eluigwe, Nke na-ekpughe ihe nzuzo nile, O mewokwa ka eze, bụ́ Nebukadneza, mara ihe aghaghị ịdị n’ikpeazụ ụbọchị ndị a.”—Daniel 2:28.
Ihe atụ Josef na Daniel na-egosi na ọ bụ nanị ndị na-ejere Jehova Chineke ozi na-enweta amamihe na ihe ọmụma Ya. N’eziokwu, anyị na Chineke ịdị ná mma nwere ike ịchọ anyị n’aka ịhapụ ịdị na-ele ihe anya otú anyị si ele ya na mbụ. Ndị Juu narị afọ mbụ bụ́ ndị ghọrọ Ndị Kraịst aghaghị nnọọ ime otú ahụ. Ebe ọ bụ na a zụlitere ha ịkwanyere iwu ndị Juu ùgwù na irubere ha isi, o were ha oge ịnabata Jizọs dị ka Mezaịa ahụ. Ọ bịara imezu Iwu Mozis, nke bụ́ “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 10:1; Matiu 5:17; Luk 24:44, 45) “Iwu nke Kraịst ahụ,” bụ́ nke ka Iwu Mozis elu, nọchiri ya.—Ndị Galeshia 6:2; Ndị Rom 13:10; Jems 2:8.
A mụrụ anyị nile n’ime ụwa e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. N’ihi mmehie anyị ketara n’aka di na nwunye mbụ ahụ, a mụrụ anyị dị ka ndị iro Chineke, anyị enweghịkwa ezi ihe ọmụma banyere nzube ya. Anyị ketakwara obi dị aghụghọ. (Jeremaịa 17:9; Ndị Efesọs 2:12; 4:18; Ndị Kọlọsi 1:21) Ka anyị na Chineke wee dị ná mma, anyị aghaghị ịmụta iche echiche otú Chineke si eche. Iche echiche otú ahụ adịtụghị mfe.
Ọ pụrụ isiri anyị ike ịhapụ ihe ndị a na-akụzi ma ọ bụ ihe ndị a na-eme n’okpukpe ụgha, karịsịa ma ọ bụrụ na a malitere mgbe anyị dị obere ziwe anyị ihe ndị ahụ. Ma, ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ịnọgide na-eme ihe na-adịghị mma? Mbanụ! Ọ ka nnọọ mma mmadụ ịgbanwe otú o si eche echiche ma nweta ngọzi Chineke.
Ịmata Ndị Chineke Si n’Aka Ha Enye Ntụziaka
Olee ebe anyị ga-achọta enyemaka iji ghọta Okwu nke eziokwu ahụ ma bie ndụ kwekọrọ Matiu 24:45-47; Ndị Kọlọsi 1:18) Ma, olee otú mmadụ pụrụ isi mata ndị Chineke si n’aka ha enye ntụziaka?
na ya? N’Izrel oge ochie, Chineke si n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi duo ndị ya. Onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ Kraịst, na-eduzikwa ndị ji obi ha nile na-achọ eziokwu ahụ taa. Ọ na-eme nke a site n’aka ụmụazụ ya ọ tụkwasịrị obi bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị o ji eduzi ma na-echebe ndị ji obi ha nile na-achọ eziokwu ahụ. (Ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst na-agbalịsi ike ịkpa àgwà ndị ahụ Jizọs kpara mgbe ọ bụ mmadụ. Mgbapụ iche ha n’ihi àgwà ndị dị otú ahụ na-ewetara Chineke nsọpụrụ ha na-akpa, na-eme ka ọ dị mfe ịmata ha n’ụwa a nke na-ajọwanye njọ. (Lee igbe dị na peeji nke 6.) À na-akpa àgwà ndị a na chọọchị ị na-aga ma ọ bụ na chọọchị ndị agbata obi gị na-aga? Ọ ga-abara gị uru iji Bible zaa ajụjụ a.
Ezi onye na-agụ akwụkwọ anyị, anyị na-agba gị ume ime otú ahụ site n’ịmụ Bible. N’afọ gara aga, e nwere ngụkọta nke ihe karịrị nde mmadụ isii nọ na narị ala abụọ na iri atọ na ise, bụ́ ndị nabatara ndokwa a nke iso Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Inweta amamihe na ihe ọmụma Chineke bụ ihe bara uru nke na-enye obi ụtọ nke mmadụ na-aghaghị ịnọgide na-eme. Gịnị ma ị malite ime mgbalị inweta amamihe na ihe ọmụma Chineke? Ọ bụ mgbalị ị na-agaghị akwara ụta. Ee, anyị nwere nnọọ ike ịmata Chineke!
[Igbe dị na peeji nke 6]
NDỊ NA-EME UCHE CHINEKE . . .
na-anọgide na-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.—Aịsaịa 2:4.
na-amị mkpụrụ dị mma site n’ime uche Chineke.—Matiu 7:13-23.
na-egosipụta ezi ịhụnanya n’etiti onwe ha. —Jọn 13:35; 1 Jọn 4:20.
na-ekwu otu ihe n’ebe nile. —Maịka 2:12.
adịghị eṅomi àgwà na omume ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa ha nọ n’ime ya.—Jọn 17:16.
na-agbara eziokwu ahụ àmà ma na-eme ndị na-eso ụzọ.—Matiu 24:14; 28:19, 20.
na-aga ọmụmụ ihe mgbe nile iji na-agba onwe ha ume.—Ndị Hibru 10:25.
na-eto Chineke dị ka nzukọ zuru ụwa ọnụ. —Mkpughe 7:9, 10.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Mmadụ pụrụ inweta ihe ọmụma Chineke n’onwe ya, a pụkwara ịkụziri ya ezinụlọ, nakwa ọgbakọ