Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ele Ihe Ndị Dị Nsọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha?

Ị̀ Na-ele Ihe Ndị Dị Nsọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha?

Ị̀ Na-ele Ihe Ndị Dị Nsọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha?

“Jiri nlezianya na-eche nche . . . ka e wee ghara inwe onye ọ bụla na-akwa iko ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ejighị ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe.”—NDỊ HIBRU 12:15, 16.

1. Àgwà dị aṅaa nke ndị mmadụ nwere taa ka ndị ohu Jehova na-enweghị?

ỤWA n’ozuzu ya ejichazighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ọkà mmụta n’ihe banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya, bụ́ onye France aha ya bụ Edgar Morin kwuru, sị: “Adịghịzi eji ebe nile e si enweta ntụziaka n’ihe banyere omume—dị ka n’aka Chineke, n’ihe ndị e kere eke, n’aka ndị agadi nọ n’ụlọ, n’akụkọ ihe mere eme, nakwa n’ọgụgụ isi—akpọrọ ihe taa. . . . Ndị mmadụ na-ejizi aka ha ahọrọ ụkpụrụ ndị masịrị ha.” Nke a bụ ihe e ji amata ndị nwere “mmụọ nke ụwa,” ma ọ bụ “mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.” (1 Ndị Kọrịnt 2:12; Ndị Efesọs 2:2) Ndị raara onwe ha nye Jehova ma jiri obi ha na-erubere ya isi enweghị mmụọ enweghị nsọpụrụ dị otú ahụ. (Ndị Rom 12:1, 2) Kama nke ahụ, ndị ohu Chineke ghọtara otú e si ele ịdị nsọ anya ma a bịa n’ihe banyere ofufe ha na-efe Jehova. Olee ihe ndị anyị kwesịrị iwere dị ka ihe ndị dị nsọ ná ndụ anyị? A ga-atụle ihe ise ndị dị nsọ n’anya ndị ohu Chineke nile n’isiokwu a. N’isiokwu na-esonụ, a ga-atụle otú nzukọ Ndị Kraịst si bụrụ ihe dị nsọ. Ma gịnị n’ezie ka okwu ahụ bụ́ “nsọ” pụtara?

2, 3. (a) Olee otú Akwụkwọ Nsọ si mee ka ọ pụta ìhè na Jehova dị nsọ? (b) Olee otú anyị si ewere aha Jehova dị ka ihe dị nsọ?

2 N’asụsụ Hibru e ji dee Bible, okwu ahụ bụ́ “nsọ” na-ezo aka n’ihe e dopụrụ iche. A bịa n’ihe metụtara ofufe, e ji “nsọ” eme ihe maka ihe e si n’ihe ndị ọzọ wepụta iche. Jehova dị nsọ n’ụzọ na-enweghị atụ. A kpọrọ ya “Onye Kasị Nsọ.” (Ilu 9:10; 30:3, NW) N’Izrel oge ochie, onye nchụàjà nwere otu ihe e ji ọlaedo mee nke e dere okwu bụ́ “IHE NSỌ NKE JEHOVA NWERE” nke dị n’ákwà ọ na-eke n’isi. (Ọpụpụ 28:36, 37) E kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na ndị cherub na ndị seraf nọ gburugburu ocheeze Jehova na-akpọsa, sị: “Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke ụsụụ nile nke ndị agha dị.” (Aịsaịa 6:2, 3; Mkpughe 4:6-8) Ikwughachi okwu ahụ bụ́ nsọ ugboro ugboro na-emesi ya ike na Jehova kasị dịrị nsọ ma dịrị ọcha. N’eziokwu, ịdị nsọ nile sitere n’ebe Ọ nọ.

3 Aha Jehova dị nsọ. Ọbụ abụ ahụ kwuru n’oké olu, sị: “Ka ha kelee aha Gị nke dị ukwuu, nke a na-atụkwa egwu ya: Onye nsọ ka Ọ bụ.” (Abụ Ọma 99:3) Jizọs kụziiri anyị ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Nne Jizọs n’ụwa, bụ́ Meri, kwuru, sị: “Mkpụrụ obi m na-eto Jehova, n’ihi na Onye ahụ nke dị ike emeworo m oké ihe dị iche iche, aha ya dịkwa nsọ.” (Luk 1:46, 49) Dị ka ndị ohu Jehova, anyị na-ewere aha ya dị ka ihe dị nsọ ma na-ezere ime ihe ọ bụla pụrụ iwetara aha ahụ dị nsọ nkọcha. Tụkwasị na nke ahụ, anyị na-ele ihe ndị dị nsọ anya dị ka Jehova si ele ha, ya bụ, anyị na-ele ha anya dị ka ihe ndị dị nsọ, dịkwa nnọọ ka o si ewere ha dị ka ihe ndị dị nsọ.—Emọs 5:14, 15.

Ihe Mere Anyị Ji Akwanyere Jizọs Ùgwù n’Ụzọ Miri Emi

4. N’ihi gịnị ka Bible ji kọwaa Jizọs dị ka “Onye Nsọ”?

4 Dị ka “ọkpara a mụrụ nanị ya” nke Chineke dị nsọ, bụ́ Jehova, Jizọs dị nsọ mgbe e kere ya. (Jọn 1:14; Ndị Kọlọsi 1:15; Ndị Hibru 1:1-3) N’ihi ya, a kpọrọ ya “Onye Nsọ nke Chineke.” (Jọn 6:69) Ọ nọgidere na-adị nsọ mgbe e si n’eluigwe bufete ndụ ya n’ụwa, n’ihi na ọ bụ site n’ike mmụọ nsọ ka Meri mụrụ Jizọs. Otu mmụọ ozi gwara Meri, sị: “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị . . . a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.” (Luk 1:35) Mgbe Ndị Kraịst nọ na Jeruselem na-ekpeku Jehova ekpere, ha kpọrọ Ọkpara Chineke “ohu gị dị nsọ bụ́ Jizọs” ugboro abụọ.—Ọrụ 4:27, 30.

5. Ọrụ dị aṅaa dị nsọ ka Jizọs bịara rụọ n’ụwa, gịnịkwa mere ọbara ya ji dịrị oké ọnụ ahịa?

5 Jizọs nwere ọrụ dị nsọ ịrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Mgbe e mere Jizọs baptizim n’afọ 29 O.A., e tere ya mmanụ dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà nke nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. (Luk 3:21, 22; Ndị Hibru 7:26; 8:1, 2) E wezụga nke ahụ, ọ nwụrụ iji jiri ndụ ya chụọ àjà. Ọbara ya a wụsịrị bụ ihe mgbapụta nke a ga-eji zọpụta ụmụ mmadụ na-eme mmehie. (Matiu 20:28; Ndị Hibru 9:14) N’ihi nke a, anyị na-ewere ọbara Jizọs dị ka ihe dị nsọ, “ihe dị oké ọnụ ahịa.”—1 Pita 1:19.

6. Olee otú anyị kwesịrị isi were Kraịst Jizọs, oleekwa ihe anyị ji kwesị iwere ya otú ahụ?

6 Iji gosi na anyị ga-akwanyere Eze anyị na Nnukwu Onye Nchụàjà anyị, bụ́ Kraịst Jizọs, ùgwù n’ụzọ miri emi, Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke buliri [Ọkpara ya] gaa n’ọkwá ka elu ma jiri obiọma nye ya aha nke dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ, ka ikpere ọ bụla wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’elu ụwa ma nke ndị nọ n’okpuru ala, ire ọ bụla ekwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.” (Ndị Filipaị 2:9-11) Anyị na-egosi na anyị na-ele ihe ndị dị nsọ anya dị ka Jehova si ele ha anya site n’iji ọṅụ na-edo onwe anyị n’okpuru Onye Ndú anyị na Eze anyị na-achị achị, bụ́ Kraịst Jizọs, onye bụ́ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst.—Matiu 23:10; Ndị Kọlọsi 1:18.

7. Olee otú anyị si egosi na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru Kraịst?

7 Ido onwe anyị n’okpuru Kraịst gụnyekwara ịkwanyere ndị ikom o ji na-eduzi ọrụ a ọ na-elekọta ugbu a ùgwù n’ụzọ kwesịrị ekwesị. E kwesịrị ile ọrụ ndị e tere mmanụ so n’Òtù Na-achị Isi nakwa nke ndị nlekọta ha họpụtara n’alaka dị iche iche, na distrikti dị iche iche, na sekit dị iche iche, nakwa n’ọgbakọ dị iche iche anya dị ka ọrụ dị nsọ. Ya mere, anyị kwesịrị ịkwanyere ndokwa a e mere ùgwù n’ụzọ miri emi ma na-edo nnọọ onwe anyị n’okpuru.—Ndị Hibru 13:7, 17.

Ndị Dị Nsọ

8, 9. (a) N’echiche dị aṅaa ka ndị Izrel bụ ndị dị nsọ? (b) Olee otú Jehova si mesie okwu banyere ịdị nsọ ike nye ụmụ Izrel?

8 Jehova na Izrel gbara ndụ. Ọgbụgba ndụ ahụ mere ka mba ọhụrụ ahụ pụọ iche. E doro ha nsọ, dookwa ha iche. Jehova gwara ha n’onwe ya, sị: “Unu ga-abụkwara m ndị nsọ: n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m, bụ́ Jehova, dị, akpawokwa m ókè n’etiti unu na ndị nile ọzọ, ka unu wee bụrụ nke m.”—Levitikọs 19:2; 20:26.

9 Mgbe Jehova guzobere mba Izrel ọhụrụ, o mere ka okwu banyere ịdị nsọ doo ha anya. A gwadịrị ha ka ha ghara imetụ ugwu ahụ a nọ na ya nye Iwu Iri ahụ aka ma ọ bụghị ya, ha ga-anwụ. N’oge ahụ, e lere Ugwu Saịnaị anya dị ka ebe dị nsọ. (Ọpụpụ 19:12, 23) E kwesịkwara ile òtù ndị nchụàjà, ụlọikwuu ahụ, na ihe ndị e ji chọọ ya mma anya dị ka ihe dị nsọ. (Ọpụpụ 30:26-30) Olee otú Ndị Kraịst si ele ihe ndị dị nsọ anya?

10, 11. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọgbakọ Ndị Kraịst nke ndị e tere mmanụ mejupụtara dị nsọ, oleekwa mmetụta nke a na-enwe n’ahụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ?

10 Ọgbakọ Ndị Kraịst nke ndị e tere mmanụ mejupụtara dị nsọ n’anya Jehova. (1 Ndị Kọrịnt 1:2) N’ezie, e ji ìgwè Ndị Kraịst e tere mmanụ dum nọ n’ụwa n’oge ọ bụla tụnyere ụlọ nsọ, ọ bụ ezie na ọ bụghị ha mejupụtara nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. Jehova bi n’ụlọ nsọ ahụ site ná mmụọ nsọ ya. Pọl onyeozi dere, sị: “N’iso [Kraịst Jizọs] dị n’otu, ihe owuwu ahụ dum, n’ịbụ nke e jikọrọ ọnụ n’otu, na-eto eto ịghọrọ Jehova ụlọ nsọ. N’iso ya dị n’otu, a na-ewulikọkwa unu elu ịghọ ebe Chineke ga-ebi na mmụọ.”—Ndị Efesọs 2:21, 22; 1 Pita 2:5, 9.

11 Pọl degakwaara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ ọzọ, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na unu bụ ụlọ nsọ Chineke, nakwa na mmụọ Chineke bi n’ime unu? . . . Ụlọ nsọ Chineke dị nsọ, bụ́ ụlọ nsọ nke unu bụ.” (1 Ndị Kọrịnt 3:16, 17) Site ná mmụọ nsọ ya, Jehova ‘bi’ n’etiti ndị e tere mmanụ ma ‘na-ejegharịkwa n’etiti ha.’ (2 Ndị Kọrịnt 6:16) Ọ nọgidere na-eduzi “ohu” ya kwesịrị ntụkwasị obi. (Matiu 24:45-47) “Atụrụ ọzọ” ahụ ji ihe ùgwù ha nke isonyere òtù “ụlọ nsọ” ahụ kpọrọ ihe.—Jọn 10:16; Matiu 25:37-40.

Ihe Ndị Dị Nsọ ná Ndụ Ndị Kraịst

12. Olee ihe ndị dị nsọ ná ndụ anyị, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

12 Ọ bụghị ihe ijuanya na e lere ihe nile metụtara ndụ ndị e tere mmanụ so n’ọgbakọ Ndị Kraịst na ndị enyi ha anya dị ka ihe dị nsọ. Mmekọrịta anyị na Jehova bụ ihe dị nsọ. (1 Ihe E Mere 28:9; Abụ Ọma 36:7) Ọ dị nnọọ oké ọnụ ahịa nye anyị nke na anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla tisaa anyị na Chineke anyị, bụ́ Jehova. (2 Ihe E Mere 15:2; Jems 4:7, 8) Ekpere na-arụ ọrụ dị mkpa n’ime ka mmekọrịta anyị na Jehova na-echikwu anya. Ekpere dị nsọ n’anya Daniel onye amụma nke na ọ nọgidere na-ekpegara Jehova ekpere dị ka ọ na-eme, ọbụna mgbe ọ dịrị ize ndụ ime otú ahụ. (Daniel 6:7-11) E ji “ekpere ndị nsọ” ma ọ bụ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, tụnyere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke e ji eme ihe n’ofufe a na-efe n’ụlọ nsọ ahụ. (Mkpughe 5:8; 8:3, 4; Levitikọs 16:12, 13) Iji ekpere tụnyere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ gosiri nnọọ na ekpere bụ ihe dị nsọ. N’ezie, ọ dịghị ihe ùgwù ọ bụla karịrị iso Eze eluigwe na ala na-ekwurịta okwu. Ka a sịkwa ihe mere anyị ji ewere ekpere dị ka ihe dị nsọ ná ndụ anyị!

13. Olee ikike nke dị nsọ, oleekwa otú anyị kwesịrị isi kwere ka ọ na-arụ ọrụ ná ndụ anyị?

13 E nwere ikike na-akpa ike n’ahụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha bụ́ nke ha na-ewere nnọọ dị ka ihe dị nsọ—mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ bụ ike Jehova nọ n’ọrụ, ebe ọ bụkwa na mmụọ a na-arụ ọrụ mgbe nile n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke dị nsọ, a kpọrọ ya aha kwesịrị ekwesị nke bụ́ “mmụọ nsọ” ma ọ bụ “mmụọ nke dị nsọ.” (Jọn 14:26; Ndị Rom 1:4) Jehova na-esite ná mmụọ nsọ ya enye ndị ohu ya ike iji kwusaa ozi ọma ahụ. (Ọrụ 1:8; 4:31) Jehova na-ewerekwa mmụọ nsọ enye “ndị na-erubere ya isi dị ka onye na-achị achị” nakwa ndị ‘nọgidere na-eje ije site na mmụọ nsọ,’ ọ bụghị ndị na-ebi ndụ dị ka ọchịchọ anụ ahụ́ si dị. (Ọrụ 5:32; Ndị Galeshia 5:16, 25; Ndị Rom 8:5-8) Ikike a dị ike na-enyere Ndị Kraịst aka ịmịpụta “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”—àgwà ndị mara mma na ‘àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke.’ (Ndị Galeshia 5:22, 23; 2 Pita 3:11) Ọ bụrụ na mmụọ nsọ dị nsọ n’anya anyị, anyị ga-ezere ime ihe ọ bụla nke pụrụ iwute mmụọ ahụ, ma ọ bụ ihe ọ bụla ga-egbochi ya ịrụ ọrụ ná ndụ anyị.—Ndị Efesọs 4:30.

14. Ihe ùgwù dị aṅaa ka ndị e tere mmanụ na-ewere dị ka ihe dị nsọ, oleekwa otú atụrụ ọzọ ahụ si soro ha nwee ihe ùgwù a?

14 Ihe ùgwù anyị nwere nke ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha Chineke ahụ dị nsọ, bụ́ Jehova, nakwa nke ịbụ Ndịàmà ya, bụ ihe ọzọ anyị na-ewere dị ka ihe dị nsọ. (Aịsaịa 43:10-12, 15) Jehova emewo ka Ndị Kraịst e tere mmanụ ruo eruo “ịbụ ndị ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” (2 Ndị Kọrịnt 3:5, 6) N’ihi nke a, e nyere ha ọrụ ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” na ‘ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ a, ọtụtụ ndị yikwara atụrụ na-aṅa ntị n’ozi ọma ha, na-ekwu n’ụzọ ihe atụ, sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Ndị a yiri atụrụ ji ọṅụ na-ejere ‘ndị ozi e tere mmanụ nke Chineke anyị’ ozi n’ụzọ ime mmụọ dị ka “ndị ọrụ ubi” na “ndị ọrụ ubi vaịn.” Atụrụ ọzọ ahụ si otú a na-enyere ndị e tere mmanụ aka n’ụzọ dị ukwuu n’ijezu ozi ha n’ụwa nile.—Aịsaịa 61:5, 6.

15. Ọrụ dị aṅaa ka Pọl onyeozi lere anya dị ka ihe dị nsọ, oleekwa ihe mere anyị ji ele ọrụ anyị anya n’otu ụzọ ahụ?

15 Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi lere ozi ọ na-ekwusara ọha anya dị ka ihe dị nsọ. O kwuru na ya bụ “onye ozi Kraịst Jizọs nke na-ejere ọha mmadụ bụ́ ndị mba ọzọ ozi, na-arụ ọrụ dị nsọ nke ozi ọma banyere Chineke.” (Ndị Rom 15:16) Mgbe Pọl na-edegara Ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ, o lere ozi ya anya dị ka “akụ̀.” (2 Ndị Kọrịnt 4:1, 7) Site n’ozi anyị na-ekwusara ọha mmadụ, anyị na-eme ka a mara “okwu dị nsọ nke Chineke.” (1 Pita 4:11) N’ihi ya, ma ànyị so ná ndị e tere mmanụ ma ànyị so n’atụrụ ọzọ ahụ, anyị na-ele ikere òkè n’ọrụ ịgba àmà anya dị ka ihe ùgwù dị nsọ.

“Na-eme Ka Ịdị Nsọ Zuo Okè n’Egwu Chineke”

16. Gịnị ga-enyere anyị aka izere ịghọ ndị “na-ejighị ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe”?

16 Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị ka ha ghara ịbụ ndị “na-ejighị ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe.” Kama ime otú ahụ, ọ dụrụ ha ọdụ ka ha ‘na-achụso ịdị nsọ,’ “jiri nlezianya na-eche nche . . . ka mgbọrọgwụ ọ bụla nsí dị na ya ghara ipulite wee kpata nsogbu, ka o wee gharakwa ime ka ọtụtụ ndị rụọ arụ.” (Ndị Hibru 12:14-16) Okwu ahụ bụ́ “mgbọrọgwụ ọ bụla nsí dị na ya” na-ezo aka ná mmadụ ole na ole nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-akatọ otú e si eme ihe n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ịjụ ile alụmdi na nwunye anya dị ka ihe dị nsọ dị ka Jehova si ele ya ma ọ bụkwanụ ghara ile ihe Jehova lere anya dị ka omume rụrụ arụ anya dị ka omume rụrụ arụ. (1 Ndị Tesalonaịka 4:3-7; Ndị Hibru 13:4) Ma ọ̀ bụkwanụ ha pụrụ ịdị na-akọsa echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ihe ndị bụ́ “okwu nzuzu bụ́ ndị na-emerụ ihe dị nsọ,” nke si n’aka ndị ‘wezụgaworo onwe ha n’eziokwu ahụ.’—2 Timoti 2:16-18.

17. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị e tere mmanụ nọgide na-etinye mgbalị iji na-ele ihe ndị dị nsọ anya dị ka Jehova si ele ha?

17 Pọl degaara ụmụnna ya e tere mmanụ akwụkwọ, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ, na-eme ka ịdị nsọ zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Okwu a gosiri na Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ “ndị nketa nke ọkpụkpọ eluigwe ahụ,” aghaghị ịnọgide na-etinye mgbalị iji gosipụta na ha na-ele ihe ndị dị nsọ anya dị ka Jehova si ele ha n’ihe nile ha na-eme ná ndụ. (Ndị Hibru 3:1) N’ụzọ yiri nke ahụ, Pita onyeozi nyere ụmụnna ya e tere mmanụ ndụmọdụ, sị: “Dị ka ụmụ na-erube isi, kwụsịnụ ịbụ ndị e mere ka ha kwekọọ n’ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga n’amaghị ihe unu, kama, n’ụzọ kwekọrọ n’Onye Nsọ ahụ nke kpọrọ unu, ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’omume nile unu.”—1 Pita 1:14, 15.

18, 19. (a) Olee otú ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ si egosi na ha na-ele ihe ndị dị nsọ anya dị ka Jehova si ele ha? (b) Olee akụkụ ọzọ dị nsọ nke ndụ anyị dị ka Ndị Kraịst bụ́ nke anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Gịnị banyere ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ bụ́ ndị ga-alanarị “oké mkpagbu ahụ”? Ha aghaghịkwa igosi na ha na-ele ihe ndị dị nsọ anya dị ka Jehova si ele ha. N’akwụkwọ Mkpughe, e kwuru na ha na-ejere Jehova “ozi dị nsọ” n’akụkụ ụlọ nsọ ime mmụọ ya nke dị n’elu ala. Ha nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst, ‘na-asa uwe mwụda ha ma mee ka ha na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ’ n’ụzọ ihe atụ. (Mkpughe 7:9, 14, 15) Nke a mere ka ha na Jehova dịrị ná mma ma mee ka ha nwee ibu ọrụ nke ‘ịsachapụ onwe ha mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ, na-eme ka ịdị nsọ zuo okè n’egwu Chineke.’

19 Otu ihe dị oké mkpa ná ndụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha bụ ịgachi nzukọ anya iji fee Jehova ofufe na iji mụọ Okwu ya. Jehova na-ele nzukọ ndị anyị na-ezukọta ọnụ anya dị ka ihe dị nsọ. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú anyị pụrụ isi na-ele ihe ndị dị nsọ anya dị ka Jehova si ele ha nakwa ihe mere anyị ji kwesị ime otú ahụ ma a bịa n’akụkụ a dị oké mkpa nke bụ́ ịga nzukọ.

Ntụleghachi

• Olee echiche ụwa nwere banyere ihe ndị dị nsọ bụ́ nke ndị ohu Jehova na-enweghị?

• N’ihi gịnị ka o ji bụrụ n’aka Jehova ka ihe nile dị nsọ sitere?

• Olee otú anyị si egosi na anyị na-akwanyere ịdị nsọ nke Kraịst ùgwù?

• Olee ihe ndị anyị kwesịrị ile anya dị ka ihe ndị dị nsọ ná ndụ anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

N’Izrel oge ochie, e lere òtù ndị nchụàjà, ụlọikwuu ahụ, na ihe ndị e ji chọọ ya mma, anya dị ka ihe ndị dị nsọ

[Foto dị na peeji nke 24]

Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa mejupụtara ụlọ nsọ ime mmụọ

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ekpere na ozi anyị na-ekwusara ọha mmadụ bụcha ihe ùgwù ndị dị nsọ