Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ijikọta Aka Na-ewu Ihe Owuwu Iji Wetara Chineke Otuto

Ijikọta Aka Na-ewu Ihe Owuwu Iji Wetara Chineke Otuto

Ijikọta Aka Na-ewu Ihe Owuwu Iji Wetara Chineke Otuto

NDỊ bi n’otu n’ime agwaetiti ndị dị na Solomon Islands nọ na-ekiri ka Ndịàmà Jehova na-ewu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ ihe omume ndị e ji atụrụ chọọchị anyị ego. A na-agwa ndị chọọchị anyị ka ha na-atụ ego ma anyị aka-enwetabeghị ego ga-ezu iji wuo chọọchị ọhụrụ. Olee otú unu bụ́ Ndịàmà Jehova si enweta ego unu?” Onyeàmà ọ gwara ihe a zara ya, sị: “Anyị na-efe Jehova dị ka otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụ ọgbakọ anyị na ụmụnna anyị nọ gburugburu ụwa nyere onyinye anyị ji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ a. Jehova akụzierela anyị ka anyị na-emekọ ihe nile ọnụ.”

Ịdị n’otu Ndịàmà Jehova na-apụta ìhè n’ihe nile ha na-eme, gụnyere ọtụtụ puku Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na-ewu. Otú a ha si dịrị n’otu n’iwu ihe owuwu ndị a abụghị ihe ọhụrụ. Ndị Chineke anọwo na-adị n’otu kemgbe ọtụtụ puku afọ. N’ụzọ dị aṅaa?

Iwu Ụlọikwuu ahụ na Ụlọ Nsọ Ahụ

Jehova bu ụmụ Izrel n’obi mgbe ọ gwara Mozis ihe karịrị puku afọ atọ na narị ise gara aga, sị: ‘Ha ga-emekwara m ebe nsọ.’ (Ọpụpụ 25:8) Mgbe Jehova na-agwa ha banyere otú ha ga-esi wuo ebe nsọ ahụ, o nyekwuru ntụziaka, sị: “Dị ka ihe nile Mụ onwe m na-eme ka ị hụ, bụ́ ihe atụ nke ebe obibi m, na ihe atụ nke ihe ya nile, ọbụna otú a ka unu ga-eme ya.” (Ọpụpụ 25:9) Jehova tụziri ụkpụrụ doro anya banyere otú a ga-esi wuo ebe nsọ ahụ, na otú a ga-esi chọọ ya mma nakwa ngwongwo ndị a ga-etinyeju na ya. (Ọpụpụ 25:10-27:19) “Ebe obibi,” ma ọ bụ ụlọikwuu a, ga-abụ ebe ndị Izrel nile ga-anọ na-efe Jehova ofufe.

Anyị amaghị mmadụ ole so wuo ihe owuwu ahụ, ma a kpọrọ Izrel nile oku ka ha nye onyinye maka ya. Mozis gwara ha, sị: “Sinụ n’obi unu wetara Jehova àjà mbuli: onye ọ bụla nke obi ya nwere afọ ofufo, ya weta ya, bụ́ àjà mbuli nke Jehova.” (Ọpụpụ 35:4-9) Gịnị ka ụmụ Izrel mere? Ọpụpụ 36:3 kwuru, sị: “Ha wee si n’ihu Mozis were ihe àjà mbuli ahụ nile nke ụmụ Izrel wetara iji jee ozi nke ofufe nke ebe nsọ ahụ, ime ya. Ma ndị Izrel ahụ nọ n’iwetara ya onyinye afọ ofufo kwa ụtụtụ.”

N’oge na-adịghị anya, ebe nile jupụtara n’ihe ndị ha nyere n’onyinye, ha nọgidekwara na-eweta ihe ndị ọzọ. Ndị na-ewu ihe owuwu ahụ mesịrị gwa Mozis, sị: “Ndị Izrel na-eweta ọtụtụ ihe karịa nke ga-ezuru ofufe nke dịrị ozi ahụ nke Jehova nyere iwu ka e jee ya.” Mozis gwaziri ụmụ Izrel, sị: “Nwoke ma ọ bụ nwanyị, ka ha ghara ije ozi ọzọ banyere àjà mbuli nke ebe nsọ ahụ.” Gịnị ka nke a rụpụtara? “Ihe ije ozi ahụ wee zuoro ha iji jee ozi nile, ime ya, ihe wee fọdụ.”—Ọpụpụ 36:4-7.

N’ihi otú ndị Izrel si jiri obi ha nile nye onyinye, e jiri otu afọ wuzuo ụlọikwuu ahụ. (Ọpụpụ 19:1; 40:1, 2) Site n’ịkwado ezi ofufe, ndị Chineke kwanyeere Jehova ùgwù. (Ilu 3:9) Ha ka ga-ewu ihe owuwu ka nke ahụ ibu ka oge na-aga. Mgbe oge ime nke ahụ ruru, mmadụ nile chọrọ inye aka pụrụ ime otú ahụ, ma hà nwere nkà ma ọ bụ na ha enweghị.

Mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ ise gasịrị ka ha wusịrị ụlọikwuu ahụ, ndị Izrel malitere iwu ụlọ nsọ na Jeruselem. (1 Ndị Eze 6:1) Nke a ga-abụ ụlọ buru ibu nke a na-agaghị adị na-ebugharị ebugharị, bụ́ nke a ga-eji nkume na osisi wuo. (1 Ndị Eze 5:17, 18) Jehova sitere n’ikike “Mmụọ Nsọ” gosi Devid otú a ga-esi wuo ụlọ nsọ ahụ. (1 Ihe E Mere 28:11-19) Ma, ọ họọrọ nwa Devid bụ́ Solomọn dị ka onye ga-eduzi ihe owuwu ahụ. (1 Ihe E Mere 22:6-10) Devid ji obi ya nile kwado ihe owuwu ahụ. Ọ chịkọtara nkume, ogidi, na ihe ndị ọzọ e ji ewu ụlọ, o nyekwara ọlaọcha na ọlaedo buru ibu site n’akụ̀ ya. Ọ gbakwara ndị Izrel ibe ya ume ka ha jiri obi ha nye onyinye site n’ịgwa ha, sị: “Ònye kwa na-ewere afọ ofufo nye onwe ya imejuru Jehova aka ya taa?” Gịnị ka ha mere?—1 Ihe E Mere 29:1-5.

Ka ọ na-erule mgbe Solomọn ga-amalite iwu ụlọ nsọ ahụ, a chịkọtalarị ọtụtụ puku tọn ọlaọcha na ọlaedo. E nwekwara ọtụtụ ọla kọpa na ígwè a na-apụghị ịgụta ọnụ. (1 Ihe E Mere 22:14-16) Site n’enyemaka Jehova nakwa n’ihi otú Izrel nile si kwado ihe owuwu ahụ, e jiri nanị afọ asaa na ọkara wuchaa ya.—1 Ndị Eze 6:1, 37, 38.

“Ụlọ Chineke”

A kpọrọ ma ụlọikwuu ahụ ma ụlọ nsọ ahụ “ụlọ Chineke.” (Ndị Ikpe 18:31; 2 Ihe E Mere 24:7) Ọ dịtụbeghị mgbe ụlọ dị Jehova mkpa. (Aịsaịa 66:1) O mere ka e wuo ihe owuwu ndị a n’ihi ụmụ mmadụ. N’ezie, mgbe a na-arara ụlọ nsọ ahụ nye Jehova, Solomọn jụrụ, sị: “Ma ọ̀ bụ n’ezie na Chineke ga-ebi n’elu ụwa? Lee, eluigwe na eluigwe nke eluigwe agaghị anagide Gị; ụlọ a nke m wuworo, ọ̀ ga-esikwa aṅaa ruo ịnagide Gị?”—1 Ndị Eze 8:27.

Jehova sitere n’ọnụ Aịzaịa onye amụma kwuo, sị: “A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere dịịrị ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 56:7) Ma àjà ndị a na-achụ n’ụlọ nsọ ahụ ma ekpere ndị a na-ekpe na ya, tinyekwara ememe ndị a na-eme na ya, mere ka ndị na-atụ egwu Chineke—ma ndị Juu ma ndị na-abụghị ndị Juu—na-abịaru ezi Chineke ahụ nso. Ha ghọrọ ndị enyi Jehova, o chebekwara ha, n’ihi na ha na-efe ya ofufe n’ụlọ ya. Ekpere Solomọn kpere mgbe a na-arara ụlọ nsọ ahụ nye mere ka eziokwu a pụta ìhè. Ị pụrụ ịgụ ekpere a na-emetụ n’ahụ́ o kpegaara Chineke ná 1 Ndị Eze 8:22-53 na 2 Ihe E Mere 6:12-42.

Ụlọ ahụ a rụụrụ ezi Chineke ahụ n’oge ochie apụwo n’anya eri ogologo oge gara aga, ma Okwu Chineke kpọtụrụ uche mgbe ndị nke mba nile ga-agbakọta ife Jehova ofufe n’ụlọ nsọ ime mmụọ nke ka nnọọ nke ochie ahụ ukwuu. (Aịsaịa 2:2) Otu àjà zuru okè Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya chụrụ, bụ́ nke àjà ụmụ anụmanụ a na-achụ n’ụlọ nsọ sere onyinyo ya, megheere anyị ụzọ ịbịakwute Jehova. (Jọn 14:6; Ndị Hibru 7:27; 9:12) Ndịàmà Jehova na-efe Chineke ugbu a n’ụzọ karịrị nnọọ otú ụmụ Izrel si fee ya, ha na-enyekwara ọtụtụ ndị ọzọ aka ime otu ihe ahụ.

Ihe Ndị A Na-ewu Taa

Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa nile na-efe ezi Chineke ahụ. Ha mejupụtara “mba nwere ume,” bụ́ nke ọnụ ọgụgụ ya nọgidere na-amụba. (Aịsaịa 60:22) Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe bụ́ isi Ndịàmà Jehova na-anọ enwe nzukọ ha. * A na-eji ọtụtụ puku ụlọ ndị a eme ihe ugbu a, a ka chọkwuru ọtụtụ puku.

Ndịàmà Jehova ‘na-enye onwe ha n’afọ ofufo’ iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze. (Abụ Ọma 110:3) Otú ọ dị, Ndịàmà nọ n’otu ógbè nwere ike ha enwekarịghị nkà ndị a chọrọ iji wuo ụlọ, ma ọ bụkwanụ ya a bụrụ na ógbè ụfọdụ nwere ọtụtụ ndị na-anabata eziokwu ahụ ma ụkọ ego na-akpa ha aka ọjọọ. Na 1999, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova hiwere otu òtù na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze iji nyere ndị nwere nsogbu ndị dị otú a aka. Site ná ndokwa dị otú a, Ndịàmà nwere nkà iwu ihe owuwu na-aga ebe ndị dị anya iji zụọ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị n’otú e si ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị ahụ ha zụrụ na-ewerezi ọrụ iwu ihe ahụ gaa n’ihu n’ógbè ha. Olee ihe ndị ha rụpụtarala n’ihi mgbalị a pụrụ iche ha na-eme?

Ka ọ na-erule February 2006, Ndịàmà Jehova ewuola ihe karịrị narị puku Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ iri na atọ ná mba ndị na-enwechaghị ego. Ihe ndị na-esonụ bụ ihe ụfọdụ ndị na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ a eme ihe kwuru.

“Nkezi nke ndị na-abịa ọmụmụ ihe n’ọgbakọ anyị bụ otu narị mmadụ na iri isii. Ná nzukọ mbụ anyị nwere mgbe a rụchara Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, ndị bịara ya ruru narị mmadụ abụọ. Taa, ka ọnwa isii gasịrị, ha eruola narị mmadụ abụọ na iri atọ. O doro anya na Jehova na-agọzi owuwu nke ụlọ ndị a a na-achọghị oké mma bụ́ ndị bara ezigbo uru.”—Onye nlekọta sekit si Ecuador.

“Ruo ọtụtụ afọ, ndị mmadụ anọwo na-ajụ anyị, sị, ‘Ò nwedịkwara mgbe unu ga-enwe ụdị Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị anyị na-ahụ n’akwụkwọ unu?’ Ekele dịrị Jehova na anyị emechaala nwee ebe mara mma anyị na-anọ efe ya ofufe. Anyị na-enwebu nzukọ anyị n’ụlọ ahịa otu nwanna nwoke, nkezi ndị na-abịa ya bụ mmadụ iri atọ. Otu narị mmadụ na iri bịara nzukọ mbụ e nwere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ anyị.”—Otu ọgbakọ dị na Uganda.

“Ụmụnna nwanyị abụọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-akọ na ịga ozi ọma n’ógbè ha na-atọkwu ụtọ kemgbe e wuchara Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ndị mmadụ na-adịkwu njikere ige ntị ma anyị gaa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa ma ọ bụrụ na anyị ana-agba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi. Ụmụnna nwanyị abụọ a na-eduzi ọmụmụ Bible iri na asaa ugbu a, ọtụtụ n’ime ndị a ha na-amụrụ ihe na-abịa ọmụmụ ihe.”—Alaka ụlọ ọrụ dị na Solomon Islands.

“Otu pastọ bi nso n’ebe e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ kwuru na Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ahụ mere ka gburugburu ebe ahụ nile dị ùgwù, ndị bikwa gburugburu ebe ahụ ji Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ eme ọnụ. Ọtụtụ ndị na-agafe agafe na-ekwukwa otú ụlọ ahụ si maa mma. Nke a na-emeghere ụmụnna ọmarịcha ohere iji gbaa àmà. Ọtụtụ ndị na-achọ ịma banyere òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ. Nke a akpaliwokwa ọtụtụ ndị na-agabeghị ọmụmụ ihe ruo ọtụtụ afọ ịbịachiwezi ọmụmụ ihe anya.”—Alaka ụlọ ọrụ dị na Myanmar.

“Otu nwanna nwanyị gwara otu nwoke nwere mmasị ka ọ gaa ebe a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ógbè ya. Nwoke ahụ mesịrị kwuo, sị: ‘Echere m na ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ agaghị ekwe ka m bata. Ọ tụrụ m n’anya na Ndịàmà ahụ ji obiọma nabata m. Ma ndị nwoke ma ndị nwanyị nọ na-arụsi ọrụ ike, ọ dịghịkwa onye dị umengwụ. Ha na-emekọ ihe ọnụ ma nwee obi ụtọ.’ Nwoke ahụ kwere ka a mụwara ya Bible, ọ malitekwara ịga ọmụmụ ihe. O mesịrị kwuo, sị: ‘Otú m si eche echiche agbanweela. Agaghị m ahapụ Chineke ugbu a m chọtara ya.’”—Alaka ụlọ ọrụ dị na Colombia.

A Chọrọ Nkwado Anyị

Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ akụkụ dị mkpa nke ozi dị nsọ anyị na-ejere Jehova. A na-aja Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa nile mma n’ihi otú ha si na-akwado ọrụ a—ma n’ego ma n’ụzọ ndị ọzọ. Anyị kwesịrị icheta na akụkụ ndị ọzọ nke ozi a dị nsọ dịkwa mkpa. Ọdachi ndị na-emere onwe ha na-akpa ụmụnna anyị aka ọjọọ site n’oge ruo n’oge, enyemaka anyị na-adịkwa ha mkpa. Ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible na-arụ ọrụ gbara ọkpụrụkpụ n’ịkwado ozi ahụ dị nsọ. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ahụwo ike dị egwu magazin ma ọ bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible e nyere ndị obi ha ziri ezi na-akpa n’ahụ́ ha. Tụkwasịkwa na nke ahụ, ọ dịkwa mkpa ịkwado ndị ozi ala ọzọ na ndị ozi oge nile pụrụ iche. Ndị Kraịst dị otú a nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà na-arụ ọrụ gbara ọkpụrụkpụ n’ịgbasa ọrụ nkwusa ahụ n’oge ikpeazụ a.

Ndị nyere aka n’iwu ụlọ nsọ ahụ ṅụrịrị ọṅụ dị ukwuu. (1 Ihe E Mere 29:9) Taa, ịkwado ezi ofufe site n’inye onyinye na-ewetakwara anyị obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Anyị na-enweta obi ụtọ dị otú ahụ mgbe anyị na-enye onyinye maka Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ji eme ihe nakwa maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, si otú a na-akwado ihe owuwu ndị ọzọ metụtara nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ. Ndịàmà Jehova na-efekọ ezi ofufe ọnụ ma dịrị n’otu n’ụzọ magburu onwe ya. Ka anyị nile nweta obi ụtọ nke na-abịa site n’ịkwado ofufe ahụ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ebe e si nweta aha ahụ bụ́ “Ụlọ Nzukọ Alaeze,” lee Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 319, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20, 21]

ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ NA-AHỌRỌ ISI NA-ENYE IHE

ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ na-amawapụta ego iche bụ́ nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ e dere “Contributions for the Worldwide Work—Matthew 24:14” (“Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ—Matiu 24:14”).

Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-eziga ego ndị a n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba ha. A pụkwara iziga ego dị ka onyinye afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba unu. A ga-ede “Watch Tower” n’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla a na-ezigara ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. A pụkwara inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọta ihe ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

Tinyere inye onyinye, e nwere ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi nye ihe ndị ga-aba uru n’ozi Alaeze ahụ a na-eje n’ụwa nile. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: Mmadụ pụrụ ime ndokwa ka e nye Watch Tower ego o debere n’ụlọ akụ̀, ego ọ gbazinyere ụlọ akụ̀, ma ọ bụ ego ezumike nká ya mgbe ọ nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ya na-agbaso.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere dị ka onyinye, ọ bụrụkwanụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, ọ pụkwara inye ya dị ka onyinye ma ka biri na ya n’oge nile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-edenyere ya ala na ụlọ ọ bụla.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: A pụrụ idenyere Watch Tower ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Watch Tower aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye ya.

Iji matakwuo banyere ụzọ ndị a e si enye onyinye, ị pụrụ ịkpọtụrụ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova na Nigeria, n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ na telefon, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba unu.

Jehovah’s Witnesses

P.M.B. 1090,

Benin City 300001,

Edo State, Nigeria.

Telefon: (052) 202020

[Foto dị na peeji nke 18]

Mgbalị anyị gbakọrọ aka na-eme na-eme ka o kwe omume iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị mara mma n’ụwa nile

[Foto dị na peeji nke 18]

Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ e wuru na Ghana