Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Eklisiastis

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Eklisiastis

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Eklisiastis

NNA OCHIE bụ́ Job kwuru, sị: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) Ọ dị nnọọ oké mkpa ka anyị ghara iji ndụ anyị nke na-adịghị ogologo chụsoo ihe ndị na-abaghị uru. Olee ụdị ihe anyị kwesịrị iji oge, ume na ihe ndị anyị nwere na-achụso? Olee ndị nke anyị ga-ezere? Okwu amamihe ndị dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Eklisiastis na-enye ezigbo nduzi na nke a. Ozi dị na ya “nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi” ma nwee ike inyere anyị aka ibi ezigbo ndụ.—Ndị Hibru 4:12.

Akwụkwọ Eklisiastis, bụ́ nke Eze Solomọn nke Izrel oge ochie a maara nke ọma n’ihi amamihe ya dere, nwere ndụmọdụ gbara ọkpụrụkpụ banyere ihe ndị bara uru na ihe ndị na-abaghị uru ná ndụ. Ebe ọ bụ na Solomọn kpọtụrụ ụfọdụ ihe ndị o wuru aha, ọ ga-abụ na o dere Eklisiastis mgbe o wuchara ihe ndị ahụ nakwa tupu ya adapụ n’ezi ofufe. (Nehemaịa 13:26) Nke ahụ na-egosi na e dere ya tupu afọ 1000 T.O.A., ná ngwụsị ọchịchị Solomọn nke were afọ iri anọ.

OLEE IHE NA-ABỤGHỊ IHE EFU?

(Eklisiastis 1:16:12)

Onye mkpọkọta ahụ kwuru, sị: “Ihe nile bụ ihe efu.” Ọ jụkwara, sị: “Olee ihe fọdụrụ mmadụ n’ime ndọgbu ya nile nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’okpuru anyanwụ?” (Eklisiastis 1:2, 3) Okwu ndị bụ́ “ihe efu” na “n’okpuru anyanwụ” pụtara ọtụtụ ugboro n’Eklisiastis. Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ihe efu” pụtara “iku ume” ma ọ bụ “alụlụ,” ọ na-ezokwa aka n’ihe na-enweghị isi, ihe na-adị nwa oge, ma ọ bụ ihe na-enweghị abamuru na-adịte aka. Okwu ahụ bụ́ “n’okpuru anyanwụ” pụtara “n’elu ala a” ma ọ bụ “n’ụwa a.” N’ihi ya, ihe nile—ya bụ, ihe nile ụmụ mmadụ na-eme bụ́ ndị na-ekwekọghị n’uche Chineke—bụ ihe efu.

Solomọn kwuru, sị: ‘Debe ụkwụ gị mgbe ị na-ejeru ụlọ Chineke n’ihi na ọ dị mma ịbịaru nso ịnụ anụ.’ (Eklisiastis 5:1) Ife ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova ofufe abụghị ihe efu. N’ezie, ilebara mmekọrịta anyị na ya anya bụ isi ihe na-eme ka anyị bie ezigbo ndụ.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:4-10—N’echiche dị aṅaa ka otú ihe ndị e kere eke, dị ka otú anyanwụ si awa ma na-ada, otú ifufe si na-efe, na otú mmiri si erugharị si bụrụ ‘ịdọgbu onwe ha n’ọrụ’? Onye mkpọkọta ahụ kwuru okwu banyere nanị atọ n’ime ihe ndị bụ́ isi na-eme ka ịdị ndụ n’ụwa a kwe omume—anyanwụ, usoro ifufe si efe, nakwa nrugharị nke mmiri. N’ikwu nke bụ́ eziokwu, ihe ndị e kere eke na-erugharị erugharị dị ọtụtụ, ọ naghịkwa adị mfe ịghọtacha ha. Mmadụ nwere ike iji ndụ ya nile mụọ banyere ha ma ọ gaghị aghọtacha ha nile. Nke ahụ pụrụ n’ezie ịbụ ‘mmadụ ịdọgbu onwe ya n’ọrụ.’ Ọ ga-abụkwa ihe na-akụda mmụọ mmadụ iji ndụ a dị mkpụmkpụ anyị na-adị taa atụnyere nrugharị na-enweghị ọgwụgwụ nke ihe ndị e kere eke na-erugharị. Ọbụna mgbalị ndị a na-eme iji chọpụta ihe ndị ọhụrụ bụ mmadụ ịdọgbu onwe ya n’ọrụ. Ọ bụrụgodị na a chọpụta ihe ndị ọhụrụ, ha na-adabere n’ụkpụrụ ndị e nwetara site n’ihe ndị ezi Chineke ahụ kere, e jikwala ha na-eme ihe kemgbe ụwa.

2:1, 2—Gịnị mere e ji kwuo na ọchị bụ ‘ịwị ara’? Ọchị pụrụ ime ka anyị chefutụ nsogbu anyị, oriri na nkwari pụkwara ime ka anyị lee nsogbu anyị anya dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ. Otú ọ dị, ọchị adịghị ewepụ nsogbu anyị. N’ihi ya, e kwuru na mmadụ ịchọ inweta obi ụtọ site n’ọchị bụ ‘ịwị ara.’

3:11—Gịnị ka Chineke “meworo ka ọ maa mma na mgbe ya”? Ụfọdụ ihe ndị Jehova Chineke mere ka ha “maa mma,” ma ọ bụ kwesị ekwesị n’oge ha bụ ike Adam na Iv, ọgbụgba ndụ o ji eke na egwurugwu gbaa, ọgbụgba ndụ ya na Ebreham, ọgbụgba ndụ ya na Devid, ọbịbịa Mezaịa ahụ, na ichi Jizọs Kraịst eze dị ka Eze nke Alaeze Chineke. Otú ọ dị, e nwekwara ihe ọzọ Jehova ga-eme ka ọ “maa mma” n’ọdịnihu dị nso. Obi pụrụ isi anyị ike na ụwa ọhụrụ ahụ ga-abịa n’oge ya.—2 Pita 3:13.

3:15b—Olee otú ‘ezi Chineke ahụ si na-achọ ihe a chụpụrụ achụpụ’? ‘Ihe a chụpụrụ achụpụ’ pụrụ izo aka n’ihe Chineke zubere ime. N’agbanyeghị na otú e si nọgide na-enwe oge ọmụmụ na oge ọnwụ, na oge agha na oge udo, pụrụ ịgwụ mmadụ ike ma mee ka o chee na ihe ndị a agaghị akwụsị akwụsị, ezi Chineke ahụ pụrụ ịchụso ihe ọ bụla Ọ chọrọ ma mezuo ha. (Eklisiastis 3:1-10, 15a) ‘Ihe a chụpụrụ achụpụ’ pụkwara izo aka ná ndị ezi omume, bụ́ ndị ndị ajọ omume na-achụpụ. Nke a pụtara na Jehova na-anọgide na-achọ ndị ezi omume iji nwee ike “igosi Onwe ya onye dị ike” inyere ha aka.—2 Ihe E Mere 16:9.

5:9—Olee otú ‘njubiga ókè nke ala si dịrị ọha mmadụ’? Ihe nile dị ndụ n’ụwa dabeere ná “njubiga ókè nke ala” iji dị ndụ—ya bụ, ha dabere n’ihe ala na-emepụta. Nke a gụnyekwara onye eze. Iji weta ihe ubi ya, ndị ohu ya na-arụsi ọrụ ike aghaghị ijere ya ozi site n’ịkọrọ ya ubi ya.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

1:15. Ọ baghị uru iji oge na ume anyị na-agbalị ịkwụsị mmegbu na ikpe na-ezighị ezi anyị na-ahụ taa. Ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-akwụsị ajọ omume nile.—Daniel 2:44.

2:4-11. Ihe ndị dị ka iwu ụlọ, ịkụ na ilekọta ogige, na egwú, tinyere ịba ọgaranya bụ “ịchọ ijide ifufe” n’ihi na ihe ndị a adịghị eme ka mmadụ nwee afọ ojuju, ha adịghịkwa eweta obi ụtọ na-adịgide adịgide.

2:12-16. Amamihe bara uru karịa nzuzu n’ihi na ọ pụrụ inyere mmadụ aka idozi nsogbu ụfọdụ. Otú ọ dị, amamihe mmadụ abaghị uru ọ bụla ma onye ahụ nwụọ. Ọ bụrụgodị na a ma mmadụ ama n’ihi amamihe ya, a ga-echefu onye ahụ n’oge na-adịghị anya ma onye ahụ nwụọ.

2:24; 3:12, 13, 22. Mmadụ iri uru sitere n’ihe ọ rụpụtara abụghị ihe ọjọọ.

2:26. Ọ bụ ‘onye nke dị mma n’ihu Jehova’ ka a na-enye amamihe sitere n’aka Chineke bụ́ nke na-eweta ọṅụ. Ọ gaghị ekwe omume mmadụ inweta amamihe a ma ọ bụrụ na ya na Chineke adịghị ná mma.

3:16, 17. Ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya mmadụ iche na a ga-ekpe ikpe ziri ezi n’ihe nile. Kama ịdị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị na-eme n’ụwa taa, anyị kwesịrị ichere ka Jehova dozie nsogbu ndị dị n’ụwa n’oge ya.

4:4. Iji nkà arụsi ọrụ ike na-eweta afọ ojuju. Otú ọ dị, mmadụ ịrụsi ọrụ ike nanị iji rụkarịa ndị ọzọ na-eme ka e nwee mmụọ ịsọ mpi bụ́ nke pụrụ ịkpalite obi ilu na ekworo. Anyị kwesịrị ibu ezi ihe n’obi na-arụsi ọrụ ike n’ozi Ndị Kraịst anyị.

4:7-12. Mmekọrịta nke anyị na mmadụ ibe anyị dị mkpa karịa ihe onwunwe, anyị ekwesịghịkwa ileghara nke a anya ka anyị na-achụso ihe onwunwe.

4:13. Ọ bụghị mgbe nile ka ịnọ n’ọkwà dị elu na afọ ndụ mmadụ na-eme ka a na-akwanyere mmadụ ùgwù. Ndị nwere ihe ùgwù ije ozi dị iche iche kwesịrị iji amamihe na-eme ihe.

4:15, 16. “Nwata, bụ́ nke abụọ”—onye na-anọchite anya eze—pụrụ inweta nkwado nke ‘ndị nile ọ nọ n’ihu ha,’ ma “ndị ga-adị n’ọdịnihu agaghị aṅụrị n’ime ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ adịghị anọgide bụrụ onye a ma ama.

5:2. Anyị kwesịrị iche echiche tupu anyị ekpee ekpere, o kwesịkwara ịdị ùgwù ma bụrụ nke a na-ejighị ọtụtụ okwu kpee.

5:3-7. Ọ bụrụ na mmadụ ana-eche banyere ihe onwunwe mgbe nile, ọ pụrụ ime ka ọ mụrụ anya na-arọ nrọ banyere ihe ndị ahụ. Ọ pụkwara ichu onye ahụ ụra n’abalị ma mee ka ọ na-arọgharị nrọ n’abalị kama ihi ụra nke ọma. Ikwu ọtụtụ okwu pụrụ ime ka ndị ọzọ lee mmadụ anya dị ka onye nzuzu, ọ pụkwara ime ka o kwe Chineke nkwa n’ebughị ụzọ chebara ya echiche. ‘Ịtụ egwu ezi Chineke’ ahụ pụrụ ime ka anyị ghara ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị a a kpọtụrụ aha.

6:1-9. Olee uru akụ̀, nsọpụrụ, ndụ ogologo na ọbụna ezinụlọ buru ibu na-aba ma ọ bụrụ na ọnọdụ anyị adịghị ekwe ka ha wetara anyị obi ụtọ? “Ọ dị mma bụ ihe ọhụhụ nke anya abụọ,” ma ọ bụ, ime ihe banyere ọnọdụ anyị nọ na ya, karịa “njegharị nke mkpụrụ obi,” ya bụ, ịdọga imeju ọchịchọ ndị na-agaghị ekwe mmeju. N’ihi ya, ụzọ kasị mma isi bie ndụ bụ inwe afọ ojuju ‘n’ihe oriri na ihe mgbokwasị,’ ma n’otu oge ahụ na-ekere òkè n’ihe ntụrụndụ ndị na-ewuli elu, na-agbalịsikwa ike ịhụ na anyị na Jehova nọgidere na-adị ná mma.—1 Timoti 6:8.

NDỤMỌDỤ E NYERE NDỊ MAARA IHE

(Eklisiastis 7:112:8)

Olee otú anyị pụrụ isi chekwaa ezigbo aha anyị? Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị ọchịchị bụ́ mmadụ na ikpe na-ezighị ezi a na-ekpe anya? Ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, olee otú anyị kwesịrị isi jiri ndụ anyị na-eme ihe taa? Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi jiri amamihe na-eji oge na ume ha eme ihe? E dekọrọ ndụmọdụ onye mkpọkọta ahụ nyere banyere ajụjụ ndị a nakwa ihe ndị ọzọ n’isi nke 7 ruo n’isi nke 12 nke akwụkwọ Eklisiastis.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

7:19—Olee otú amamihe si dị ike karịa “mmadụ iri na-achị achị”? Ọ bụrụ na e jiri nọmba ahụ bụ́ iri mee ihe n’ụzọ ihe atụ n’ime Bible, ọ na-anọchi anya ihe zuru ezu. Solomọn na-ekwu na uru amamihe bara n’ichebe onye nwere ya karịrị ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke ndị dike na-eche obodo nche.

10:2—Gịnị ka obi mmadụ ịdị “n’aka nri ya” ma ọ bụ “n’aka ekpe ya” pụtara? Ebe ọ bụ na aka nri na-apụtakarị inweta ihu ọma, ikwu na obi mmadụ dị n’aka nri ya pụtara na obi ya na-akpali ya ime ihe ọma. Otú ọ dị, ọ bụrụ na obi mmadụ na-akpali ya ime ihe ọjọọ, a na-asị na obi ya dị n’aka ekpe ya.

10:15—Olee otú ‘ndọgbu nke ndị nzuzu na-adọgbu onwe ha n’ọrụ si agwụ onye ọ bụla n’ime ha ike’? Ọ bụrụ na mmadụ adịghị echezi echiche echezi, ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ adịghị arụpụta ezigbo ihe. Ọ nakwaghị enweta afọ ojuju site n’ihe ndị ọ na-arụpụta. Nanị ihe ndọgbu dị otú ahụ ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ na-arụpụta bụ ike ọgwụgwụ.

11:7, 8—Gịnị ka okwu a pụtara: “Ìhè dị ụtọ, ọ dịkwara anya abụọ mma ịhụ anyanwụ”? Ìhè na anyanwụ na-eme ka ndụ dị ụtọ obibi. Solomọn na-ekwu ebe a na ndụ na-atọ ụtọ nakwa na anyị kwesịrị ‘ịṅụrị ọṅụ’ tupu ụbọchị nile nke ọchịchịrị, ma ọ bụ, oge nká, ewekọrọ ume anyị.

11:10—Gịnị mere “okorobịa na mgbe dimkpa” ji bụrụ ihe efu? Ihe ndị a bụ ihe efu ma ọ bụrụ na e jighị ha mee ihe n’ụzọ ziri ezi, n’ihi na dị ka alụlụ, ume okorobịa na-apụ n’anya ngwa ngwa.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

7:6. Mmadụ ịchị ọchị mgbe ọ na-ekwesịghị na-ewe iwe ma bụrụ ihe nzuzu, dị nnọọ ka ogwu nọ n’ọkụ na-agba kịtịkịtị n’okpuru ite e sinyere n’ọkụ. Anyị kwesịrị izere ịchị ụdị ọchị ahụ.

7:21, 22. Anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị banyere ihe ndị ọzọ na-ekwu.

8:2, 3; 10:4. Ọ bụrụ na onye na-elekọta ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ onye were anyị n’ọrụ akatọọ ọrụ anyị ma ọ bụ gbazie anyị, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịghara ikwu okwu n’iwe. Nke ahụ ga-aka mma karịa ‘isi n’ihu ya pụọ ọsọ ọsọ,’ ya bụ, iji ọkụ ọkụ gbaa arụkwaghị m.

8:8; 9:5-10, 12. Ọnwụ pụrụ igbu anyị n’oge a na-atụghị anya ya dị ka azụ ụgbụ jidere ma ọ bụ nnụnụ ọnyà mara. Ọzọkwa, ọ dịghị onye pụrụ ime ka mmadụ ghara ikubi ume ma ọnwụ bịa, ọ dịghịkwa onye pụrụ ịgbanahụ agha ọnwụ na-ebuso ụmụ mmadụ. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịla oge anyị n’iyi. Jehova chọrọ ka anyị jiri ndụ kpọrọ ihe nakwa ka anyị kporie ndụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Iji mee nke a, anyị kwesịrị ibute ozi Jehova ụzọ ná ndụ anyị.

8:16, 17. Anyị apụghị ịghọtacha ihe nile Chineke mere nakwa ihe nile o kwere ka ha bịakwasị ụmụ mmadụ ọ bụrụgodị na ịmụ banyere ha echuo anyị ụra. Ịnọgide na-eche nanị banyere ihe ọjọọ nile e merela n’ụwa ga-eme ka anyị ghara inwe obi ụtọ ná ndụ.

9:16-18. E kwesịrị ile amamihe anya dị ka ihe bara uru ọbụna mgbe ndị mmadụ n’ozuzu na-ejighị ya kpọrọ ihe. Ndị mmadụ na-enwe mmasị mgbe onye maara ihe ji nwayọọ na-ekwu okwu karịa mgbe onye nzuzu ji olu ike na-ekwu okwu.

10:1. Anyị aghaghị ịkpachara anya banyere ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eme. Ime omume nzuzu nanị otu ugboro, dị ka iwe iwe ọkụ, ịnụbiga mmanya ókè otu ugboro, ma ọ bụ ime omume rụrụ arụ otu ugboro ezuola imebi aha ọma nke onye a na-akwanyeburu ùgwù nwere.

10:5-11. A naghị ekwoso onye nọ n’ọkwà dị elu nke na-amaghị ọrụ ya ekworo. Ọ bụrụ na mmadụ amaghị ọrụ ya nke ọma ọ na-eweta ọdachi ọ bụrụgodị na ọ bụ obere ọrụ ka e nyere ya rụọ. Kama nke ahụ, ịzụlite ikike nke iji ‘amamihe na-eme ka ihe na-agazi agazi’ bara uru. Ọ dị oké mkpa ka anyị nwee nkà n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ.

11:1, 2. Anyị kwesịrị iji obi anyị na-enye ihe n’ụba. Nke ahụ na-akpalikwa ndị ọzọ inyekwa anyị ihe n’ụba.—Luk 6:38.

11:3-6. Na ndụ bụ ihe a na-ejighị n’aka ekwesịghị ime ka anyị ghara ịma nke anyị ga-eme eme ná ndụ.

11:9; 12:1-7. Ndị na-eto eto ga-aza Jehova ajụjụ. N’ihi ya, ha kwesịrị iji oge ha na ume ha jeere Chineke ozi tupu nká anapụ ha ume okoro na agbọghọ ha.

“OKWU NILE NKE NDỊ MAARA IHE” KWURU IJI DUZIE ANYỊ

(Eklisiastis 12:9-14)

Olee otú anyị kwesịrị isi ele “okwu nile na-atọ ụtọ” nke onye mkpọkọta ahụ gbalịrị ịchọta na ide anya? N’ụzọ dị iche ‘n’ọtụtụ akwụkwọ’ ndị e ji amamihe mmadụ dee, “okwu nile nke ndị maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi, ọzọ, dị ka ntú a kụmiri nke ọma ka okwu nke ndị nwe nzukọ dị, bụ́ okwu e nyere site n’aka otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Eklisiastis 12:10-12) Okwu amamihe nke “otu onye ọzụzụ atụrụ” ahụ, bụ́ Jehova, nyere na-eme ka ndụ anyị kakwuo mma.

Ịgbaso ndụmọdụ ndị amamihe dị na ha bụ́ ndị dị n’akwụkwọ Eklisiastis ga-enyere anyị nnọọ aka ibi ndụ nwere nzube na nke obi ụtọ. Tụkwasị na nke ahụ, e mesiri anyị obi ike, sị: “Ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma.” Ka anyị kpebisizie ike ‘ịtụ egwu Chineke na idebe ihe nile O nyere n’iwu.’—Eklisiastis 8:12; 12:13.

[Foto dị na peeji nke 15]

Otu n’ime ọrụ Chineke ndị makarịsịrị mma ga-apụta ìhè n’oge ya

[Foto dị na peeji nke 16]

Onyinye Chineke gụnyere nri, ihe ọṅụṅụ na ịnụ ụtọ ihe ọma ndị si n’ọrụ anyị na-arụsi ike pụta