Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Gọziri Nnọọ Ọchịchọ m Ịbụ Onye Ozi Ala Ọzọ

Jehova Gọziri Nnọọ Ọchịchọ m Ịbụ Onye Ozi Ala Ọzọ

Akụkọ Ndụ

Jehova Gọziri Nnọọ Ọchịchọ m Ịbụ Onye Ozi Ala Ọzọ

Dị ka Sheila Winfield da conceição si kọọ

Ọ dị mgbe otu onye ozi ala ọzọ si Africa bịa ileta anyị gwara anyị na onye ọ bụla ya zutere n’ozi ya na-akpọbata ya ma ṅaa nnọọ ntị n’ozi ọma nke Alaeze Chineke. Agwara m ya na m nwere nnọọ mmasị ije ozi n’ụdị ókèala ahụ. Mkparịta ụka ahụ anyị na onye ozi ala ọzọ ahụ nwere n’oge ahụ m dị afọ iri na atọ mere ka m nwee ọchịchọ nke ịbụ onye ozi ala ọzọ.

OTÚ ọ dị, ọ dịwo anya ezinụlọ anyị malitere ịmụ ihe banyere Jehova. N’otu ụtụtụ nke afọ 1939, ụmụ okorobịa abụọ jiri ejiji dị mma kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ụlọ anyị dị na Hemel Hempstead, ma a gafetụ Greater London, England. Ha bụ Ndịàmà Jehova. Adị m nanị otu afọ mgbe ahụ, n’ihi ya apụghị m icheta ihe ndị mere mgbe ahụ ha bịara. Iji mee ka ha lawa, mama m gwara ha na papa m nwere ike inwe mmasị ma ọ ga-alọta ebe elekere anya itoolu nke abalị. Ọ tụrụ ya nnọọ n’anya mgbe ụmụ okorobịa ahụ lọghachiri n’abalị ahụ. Mgbe papa m bụ́ Henry Winfield chọpụtara na ụmụ okorobịa ahụ adịghị akwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ịhụ mba n’anya, ọ kpọbatara ha ma kwere ka ha mụwara ya Bible. O nwere ọganihu ngwa ngwa ma mee baptizim. Mama m bụ́ Kathleen malitekwara ịmụ Bible ka afọ ụfọdụ gasịrị. E mere ya baptizim na 1946.

Amalitere m ikerechi òkè anya n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke na 1948. Echere m na elekere aka ga-adị m mkpa ka m ghara ịgụfe awa ole m ji gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị akpazie àgwà, a na-enyekarị anyị peni isii na Saturday ọ bụla dị ka ego mmachi akpa. Echekwara m peni isii ahụ a na-enye m ruo ihe fọrọ nke nta ka o ruo afọ abụọ iji zụrụ elekere aka kasị dị ọnụ ala n’oge ahụ. Otú ọ dị, nwanne m nwoke nke kasị obere, bụ́ Ray, na-agwakarị papa m ka o nye ya peni atọ ụzọ abụọ kama inye ya peni isii nọkọtara ọnụ. Otu ụbọchị, papa m were iwe mgbe Ray siri ọnwụ na ọ ga-enyerịrị ya peni atọ ụzọ abụọ. Ray malitere ibe ákwá ma kwuo na ya chọrọ peni atọ ụzọ abụọ n’ihi ihe nanị ya na Jehova kpara. Ray kwuziri, sị: “Aga m etinye peni atọ n’igbe onyinye, ma peni atọ nke ọzọ ga-abụ nke m.” Anya mmiri ọṅụ gbara mama m, ngwa ngwa, papa m nyeweziri ya peni atọ ụzọ abụọ, nke a mekwara ka m mata na ọ dị mkpa iji ego na-akwado ọrụ Alaeze ahụ.

N’oge a, papa m mere ndokwa ịga jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Na 1949, o rere ugbo ya na olulu o ji ere ájá na ajịrịja okwute ma malite ịsụ ụzọ, na-eje ozi dị ka onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. E mere m baptizim na September 24, 1950, iji gosi na mụ ararawo onwe m nye Jehova. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, ana m ewere ọrụ ọsụ ụzọ oge ezumike (bụ́ nke a na-akpọzi ọsụ ụzọ inyeaka) ma anyị mechie akwụkwọ, na-etinye otu narị awa n’ọnwa n’ozi ubi. Ma nke ahụ ka bụ nanị mmalite. N’oge na-adịghị anya, abịara m nwee ọchịchọ siri nnọọ ike imekwu ihe iji mee ka ofufe dị ọcha nọgide na-aga n’ihu.

Ọchịchọ M Ịbụ Onye Ozi Ala Ọzọ

Na 1951, e zigara papa m na Bideford bụ́ nke dị na North Devon. Dị ka m buru ụzọ kwuo, onye ozi ala ọzọ ahụ na-eje ozi n’Africa bịara leta ọgbakọ anyị obere oge ka anyị rutesịrị ebe ahụ. Ka o letasịrị anyị, obi m nile bịaziri dịrị n’ịga ozi ala ọzọ. Ndị nkụzi nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị maara banyere ihe mgbaru ọsọ a m setịpụrụ, ha mekwara ihe nile ha nwere ike ime iji kụda m mmụọ, na-eche na m kwesịrị ịga rụwa ọrụ ego. Otú ọ dị, mgbe m gara n’ebe ndị nkụzi na-anọ n’ụbọchị ikpeazụ m n’ụlọ akwụkwọ ịga kelee ha ma sị ha nọrọ nke ọma, otu n’ime ha jara m mma ma kwuo, sị: “N’ezie, ọ bụ nanị gị bụ nwa akwụkwọ nwere ihe mgbaru ọsọ ná ndụ. Anyị nwere olileanya na ị ga-eru ihe mgbaru ọsọ gị.”

N’egbughị oge, enwetara m ọrụ m na-agaghị adị na-arụ mgbe nile, aghọkwara m onye ọsụ ụzọ oge nile na December 1, 1955. Mama m na ụmụnne m ndị nwoke mesịkwara ghọọ ndị ọsụ ụzọ. Ya mere, mmadụ nile nọ n’ezinụlọ anyị jere ozi oge nile ruo ọtụtụ afọ.

Ịga Ireland

Otu afọ ka m ghọsịrị onye ozi oge nile, anatara m akwụkwọ ịga jee ozi na Ireland. Nke a ga-eme ka m ruo ihe mgbaru ọsọ m nke bụ́ ịghọ onye ozi ala ọzọ. Na February 1957, mụ na ndị ọsụ ụzọ abụọ ọzọ na-eto eto aha ha bụ́ June Napier na Beryl Barker, rutere Cork, bụ́ nke dị n’ebe ndịda Ireland.

Ije ozi na Ireland adịghị nnọọ mfe. Ndị Chọọchị Roman Katọlik megidere anyị n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Anyị mụtara ibu ụzọ chọta ụzọ anyị ga-esi gbapụ ma e nwee ka egwu si dagharịa mgbe ọ bụla anyị gara n’ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ ma ọ bụ ebe a rụsasịrị ụlọ. Anyị na-ezokarị ịnyịnya ígwè anyị n’ebe dị nnọọ anya, ma mmadụ na-ahụkarị ebe anyị dọbara ha ma gbawa taya anyị ma ọ bụ kwụpụ valvụ ha.

N’otu oge, ka mụ na Beryl na-eleta ndị bi n’otu ebe a rụsasịrị ụlọ, ìgwè ụmụaka malitere ịkparị anyị na ịtụ anyị okwute. Ya mere, anyị banyere n’otu ụlọ ahịa dịdewere ụlọ mmadụ, bụ́ ebe a na-ere mmiri ara ehi. Ìgwè mmadụ iwe ji malitere ịgbakọ n’èzí. Ebe ọ bụ na Beryl na-enwe mmasị n’ịṅụ mmiri ara ehi, o jiri nnọọ nwayọọ ṅụọ iko abụọ ma ọ bụ atọ, na-atụ anya na ìgwè ahụ ga-apụ. Ma ha apụghị. Ya mere, otu ụkọchukwu ka bụ́ nwa okorobịa batara n’ụlọ ahịa ahụ. O chere na anyị bịara ime mkpagharị n’obodo ha ma gwa anyị na ya ga-enwe mmasị ịkpọgharị anyị. Otú ọ dị, o buru ụzọ kpọrọ anyị gaa n’ọnụ ụlọ ọzọ nke dị n’ụlọ ahụ, ka anyị nọdụkwara ala ma nọrọ jụụ, ọ kwanyeere otu agadi nwoke na-achọ ịnwụ anwụ ùgwù ikpeazụ site n’ikpere ya ekpere. Mgbe o mechara, anyị sozi ya pụọ. Ìgwè ahụ iwe ji pụwaziri mgbe ha hụrụ ka anyị na onye ụkọchukwu ahụ na-akparịta nkata.

Ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead

Na 1958, e mere ndokwa ime mgbakọ mba nile nke isiokwu ya bụ́ Ime Uche Chineke, na New York. Papa m na-aga, achọkwara m iso ya gaa, ma ejighị m ego. Ya mere, nne papa m nwụrụ na mberede ma hapụrụ m otu narị pound ($280, U.S.). Mgbakọ ahụ ga-ewe m iri pound itoolu na isii uje na ụla, n’ihi ya, agara m ozugbo kwụọ ụgwọ ụgbọ elu m ga-eji gaa.

Obere oge ka nke ahụ gasịrị, onye nnọchiteanya si n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Britain letara anyị ma gwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nile na-aga mgbakọ ahụ ka ha tinye akwụkwọ maka ọzụzụ a na-enye ndị ozi ala ọzọ na Watchtower Bible School of Gilead. Nke ahụ tụrụ m n’anya. O nyere onye ọ bụla fọm ka o dejupụta ma o nyeghị m. Akadị m obere ịga ụlọ akwụkwọ Gilead. Agwara m ya ka o nye m fọm, ma kọwaara ya na mụ ahapụla obodo m, nakwa na m na-eje ozi n’ala ọzọ. Mgbe ọ hụrụ na m kpebisiri ike ịga, o nyere m fọm. Ekpesiri m ekpere ike ka a kpọọ m. A zara ekpere m ngwa ngwa, a kpọrọ m ịga ụlọ akwụkwọ Gilead.

Enwere m nnọọ ọṅụ na e denyekọtara aha mụ na ndị ọsụ ụzọ iri asatọ na otu si mba iri na anọ na klas nke iri atọ na atọ nke Gilead. N’eziokwu, ọnwa ise ahụ anyị ji mụọ ihe gwụrụ ngwa ngwa. Ka ụlọ akwụkwọ ahụ na-abịa ná ngwụsị ya, Nwanna Nathan H. Knorr jiri awa anọ gwa anyị okwu na-akpali nnọọ akpali. Ọ gbara ndị pụrụ ịnọgide n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ume ka ha mee otú ahụ. (1 Ndị Kọrịnt 7:37, 38) Ma nye anyị bụ́ ndị chọrọ ịlụ n’ọdịnihu, ọ tụụrụ anyị aro ka anyị depụtasịa ihe ndị anyị ga-eji mata onye ga-abụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye. Ọ bụrụzie na o nwee onye na-achọ ịlụ anyị, ihe ndị ahụ anyị depụtara pụrụ inyere anyị aka ịtụle ma onye ahụ ò ruru ihe ndị ahụ anyị chọrọ.

Ihe ndị m depụtara m ga-achọ n’aka onye ga-achọ ịlụ m gụnyere ihe ndị na-esonụ. Ọ ga-abụ onye ozi ala ọzọ ibe m ma hụ Jehova n’anya, ọ ga-amara eziokwu Bible karịa m, ọ ga-adị njikere ịhapụ ịmụ ụmụ ruo mgbe Amagedọn gasịrị ka anyị wee nwee ike ịnọgide n’ozi oge nile, asụsụ Bekee ga na-aga ya were were n’ọnụ, onye ahụ ga-atọkwa m. Ihe ndị a m depụtasịrị nyeere mụ bụ́ onye dị iri afọ abụọ a na-aga iziga n’ala dị anya aka nke ukwuu.

Ịga Brazil

Anyị gụsịrị akwụkwọ na Sunday, August 2, 1959, a gwakwara anyị ebe ndị anyị ga-eje ozi. E kenyere mụ na Vehanouch Yazedjian, Sarah Greco, Ray na Inger Hatfield, Sonia Springate, na Doreen Hines ịga Brazil. Anyị nwere nnọọ obi ụtọ. Echere m banyere oké ọhịa, agwọ, osisi rọba, na ndị India. Otú ọ dị, ihe m tụrụ anya na m ga-ahụ mgbe m rutere abụghịzi ihe m hụrụ. Kama ịhụ oké ọhịa mmiri Amazon, ihe m hụrụ bụ Rio de Janeiro, bụ́ obodo anwụ na-achasi ike na ya na nke mepere emepe, ọ bụkwa ya bụ isi obodo Brazil n’oge ahụ.

Ihe ịma aka anyị nwetara ozugbo anyị rutere bụ ịmụ asụsụ Portuguese. N’ọnwa mbụ anyị nọrọ n’ebe ahụ, anyị jiri awa iri na otu kwa ụbọchị mụọ asụsụ ahụ. Ka anyị kwusasịrị ozi ọma na Rio ma bitụ obere n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ, e zigara m n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Piracicaba, na steeti São Paulo, e mesịkwara ziga m na nke dị na Porto Alegre, nke dị na steeti Rio Grande do Sul.

Ná mmalite afọ 1963, anatara m akwụkwọ ịga rụọ ọrụ ná Ngalaba Nsụgharị n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. Onye na-elekọta ngalaba ahụ bụ Floriano Ignez da Conceição, bụ́ onye kụziiri anyị Portuguese mgbe anyị bịara ọhụrụ n’obodo ahụ. Ọ natara eziokwu ahụ na 1944, bụ́ mgbe e nwere nanị narị Ndịàmà atọ na Brazil, ọ gakwara klas nke iri abụọ na abụọ nke Gilead. Ka ọnwa ole na ole gasịrị, Nwanna Conceição gwara m otu ụbọchị ka m cheretụ ma mgbịrịgba e ji akwụsị ọrụ ụtụtụ kụọ, na o nwere ihe ya chọrọ ịgwa m. Obi erughị m ala ná mbụ. M nọ na-eche ma ò nwere ihe ọjọọ m mere? Mgbe mgbịrịgba ahụ e ji eri nri ehihie mechara kụọ, ajụrụ m ya ihe ọ chọrọ ịgwa m. Ọ zaghachiri site n’ịjụ m ma m̀ ga-alụ ya. Nke a riri m ọnụ. Agwara m ya ka o nyetụ m oge ka m gaa chebara ya echiche, ma jiri ọsọ gaa iri nri ehihie.

Floriano abụghị nwanna nwoke mbụ gosirila ụdị mmasị a n’ebe m nọ. Otú ọ dị, ruokwa mgbe ahụ, ọ dịbeghị onye nke ruru ihe ndị m chọrọ iji mata onye ga-abụ ezigbo di m. Ekwetara m na ihe ndị ahụ m depụtara nyeere m aka ịghara ime mkpebi na-ezighị ezi. Ma nke ugbu a dị iche. Floriano ruru ihe nile m chọrọ! Ya mere, anyị lụrụ na May 15, 1965.

Iche Nsogbu Ahụ́ Ike Ihu

Mụ na di m bụ́ Floriano enwewo ahụmahụ ndị na-enye obi ụtọ n’alụmdi na nwunye anyị n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị anyị nwetaworo. Otu n’ime ihe ịma aka ndị a bụ ọrịa di m, bụ́ nke malitere obere oge tupu anyị alụọ. Tupu mgbe ahụ, akpa ume ya nke aka nri kwụsịrị ịrụ ọrụ, nke ahụ kpatakwaara ya ọtụtụ ihe isi ike. N’ihi ya, anyị hapụrụ Betel ịga jee ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Teresópolis, bụ́ nke dị n’ebe ugwu steeti Rio de Janeiro. Anyị tụrụ anya na ọnọdụ ihu igwe e nwere ebe ahụ ga-enyere ya aka ịgbake.

Tụkwasị na nke ahụ, na December 1965, anatara m ozi na ọrịa cancer jisiri mama m ike. Anyị na-ederịta akwụkwọ ozi mgbe ọ bụla, ma ahụbeghị m ya anya kemgbe afọ asaa. Ya mere, ọ kwụụrụ anyị ụgwọ ụgbọ ịbịa hụ ya anya n’England. A wara mama m ahụ́ iji wepụ cancer ahụ, ma dọkịta ahụ wara ya ahụ́ ewepụlighị ya. Ọ bụ ezie na ọ nọ n’ute ọrịa, nke a emeghị ka ọchịchọ ya ikwusa ozi ọma jụọ oyi. O nwere ígwè typewriter n’ime ụlọ ebe ọ na-anọ ehi ụra ka o nwee ike ịdị na-akpọ ihe ndị ọ chọrọ ka e deere ya n’akwụkwọ ozi. Ọ na-agbakwara ndị na-abịa ileta ya àmà n’ụzọ dị nkenke. Ọ nwụrụ na November 27, 1966. N’ọnwa ahụ ọ nwụrụ, o nyere awa iri dị ka akụkọ ozi ubi ya. Papa m nọgidere n’ọrụ ọsụ ụzọ ruokwa mgbe ọ nwụrụ na 1979.

Mụ na di m laghachiri Brazil mgbe mama m nwụsịrị, bụ́ ebe anyị nọworo na-eje ozi kemgbe ahụ na steeti Rio de Janeiro. E buru ụzọ ziga anyị ịga rụọ ọrụ sekit n’isi obodo ahụ, ma ọṅụ anyị nwere adịteghị aka, n’ihi na di m maliteghachiri ịrịa ọrịa. Nke a mere ka anyị lọghachi Teresópolis dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Ndị dọkịta mesịrị wepụ akpa ume akụkụ aka ekpe di m na 1974, ka ọrịa a nọ na-agwọ ya gbugidere ya mgbu ruo ọtụtụ afọ. N’oge ahụ, di m apụghịzi ije ozi dị ka onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, ma o nwere ike iduzi ọmụmụ Bible n’oge ndị mmadụ ji abịa eleta ndị ọrịa n’ụlọ ọgwụ—otu n’ime ọmụmụ Bible ndị ahụ bụ nke ọ na-eji Bekee eduziri otu onye America lara ezumike nká nke aha ya bụ Bob. Bob nabatara eziokwu ahụ, e mesịkwara mee ya baptizim. Di m jiri nwayọọ nwayọọ gbakee, ọ nọwokwa na-eje ozi kemgbe ahụ dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile.

Jehova Agọziwo Ozi M

Kemgbe ọtụtụ afọ, anọgidewo m na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, Jehova agọziwokwa ozi m. Na Teresópolis, enwere m ihe ùgwù magburu onwe ya nke inyere ihe karịrị iri mmadụ isii aka ịrara ndụ ha nye Jehova. Otu onye n’ime ndị a bụ otu nwanyị aha ya bụ Jupira, bụ́ onye m kụziiri otú e si agụ ihe. Ka oge na-aga, amụụrụ m ụmụ ya asatọ ndị toro eto ihe. N’ihi ya, Jupira na ihe karịrị iri mmadụ abụọ n’ime ndị ezinụlọ ya ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi taa. Otu onye n’ime ha bụ okenye, atọ bụ ndị ohu na-eje ozi, abụọ bụkwa ndị ọsụ ụzọ.

Amụtala m ịdị na-ele onye ọ bụla m zutere anya dị ka onye nwere ike ịnabata eziokwu ahụ. Otu oge ka m nọ na-amụrụ otu nwanyị aha ya bụ Alzemira Bible, di ya bụ́ Antônio yiri m egwu na ya ga-akpọpụtara m agadaga nkịta abụọ ma ọ bụrụ na m esighị n’ụlọ ha pụọ ozugbo. Mgbe nke ahụ gasịrị, anaghị m eleta Alzemira otú m sibu eme ruo ihe dị ka afọ asaa bụ́ mgbe Antônio jisiri ike kwe ka m malitekwa ịmụrụ nwunye ya Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, o nyere m iwu ka m ghara ịgwa yanwa bụ́ Antônio ihe ọ bụla banyere Bible. Otú ọ dị, otu ụbọchị mmiri nọ na-ezo, akpọrọ m Antônio ka o sonyere anyị n’ọmụmụ ihe ahụ. Abịaziri m chọpụta na nsogbu ya bụ na ọ gaghị akwụkwọ. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, di m na ụmụnna ndị ọzọ mụwaziiri ya ihe ma na-akụziri ya otú e si agụ ihe. Taa, e meela ma Alzemira ma Antônio baptizim. Antônio na-enye nnọọ aka n’ọgbakọ, na-eso ọtụtụ ndị na-eto eto aga ozi.

Nke a bụ nanị ole na ole n’ime ahụmahụ ndị anyị nwetara n’ihe karịrị iri afọ abụọ anyị jere ozi na Teresópolis. Ná mmalite afọ 1988, e kenyere anyị ebe ọhụrụ anyị ga-eje ozi—obodo Niterói, bụ́ ebe anyị jere ozi ruo afọ ise ọzọ tupu anyị agaa Santo Aleixo. Anyị mesịziri soro Ọgbakọ Japuíba nke dị n’etiti obodo Rio de Janeiro jee ozi, anyị nwekwara ihe ùgwù nke ihiwe Ọgbakọ Ribeira.

Ndụ Dị Mfe Ma Na-akwụghachi Ụgwọ

Kemgbe ọtụtụ afọ, mụ na di m enwewo ihe ùgwù inyere ihe karịrị narị mmadụ atọ aka ịrara ndụ ha nye Jehova. Ụfọdụ n’ime ha na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ, ụfọdụ bụkwa ndị ọsụ ụzọ, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi. Obi dị m nnọọ ụtọ na Chineke esitewo ná mmụọ nsọ ya jiri anyị nyere ọtụtụ mmadụ aka.—Mak 10:29, 30.

N’ezie, di m na ọrịa ndị siri nnọọ ike ka na-alụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka na-eguzosi ike n’ihe, na-enwe ọṅụ, ma na-enwe obi ike n’ebe Jehova nọ. Ọ na-ekwukarị, sị: “Obi ụtọ adịghị abịa taa site n’ibi ndụ na-enweghị nsogbu. Ọ na-abịa site n’aka Jehova na-enyere anyị imeri nsogbu ndị anyị na-enwe.”—Abụ Ọma 34:19.

N’afọ 2003, a chọpụtara na cancer nọ n’anya aka ekpe m. E wepụrụ anya m ma tinyere m nke aka mere, bụ́ nke m ga na-ehicha ọtụtụ ugboro n’ụbọchị. N’agbanyeghị nke a, Jehova enyewo m ume ịnọgide na-ejere ya ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Ebiri m ndụ dị mfe ma a bịa n’ihe banyere ihe onwunwe. Ma, Jehova agọziwo ozi m, ma mee m ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ. Okwu ahụ nwanna nwanyị ahụ bụ́ onye ozi ala ọzọ kwuru banyere ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ n’Africa abụwo nnọọ ụzọ kwesịrị ekwesị isi kọwaa ozi anyị na Brazil. N’eziokwu, Jehova agọziwo nnọọ ọchịchọ m ịbụ onye ozi ala ọzọ.

[Foto dị na peeji nke 9]

Mụ na ndị ezinụlọ m na 1953

[Foto dị na peeji nke 9]

Mgbe m na-agba àmà na Ireland na 1957

[Foto dị na peeji nke 10]

Mụ na ndị ozi ala ọzọ ibe m na 1959 na Brazil. Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Mụ, Inger Hatfield, Doreen Hines, na Sonia Springate

[Foto dị na peeji nke 10]

Mụ na di m