Ntụziaka “Ndị Ọkachamara” Na-abụ Ọ̀ Bịara Taa Laa Echi
Ntụziaka “Ndị Ọkachamara” Na-abụ Ọ̀ Bịara Taa Laa Echi
TAA, ọ bụrụ na ị chọọ n’Intanet, ị ga-ahụ ihe karịrị nde ntụziaka iri abụọ na isii banyere otú e si azụ ụmụ. I jiri nanị otu minit chọọ ịgụ nke ọ bụla n’ime ntụziaka ndị a, nwa gị ga-etolite lụọ di ma ọ bụ nwunye tupu gị enweedị ike ịgụcha ha.
Tupu e nwee Intanet na ndị ọkachamara n’ihe banyere ụmụaka, ebee ka ndị nne na nna na-aga enweta ntụziaka? N’ozuzu, ha na-agakwuru ndị ikwu ha. Ndị nne, ndị nna na ndị ikwu nne na ndị ikwu nna dị njikere inye ntụziaka, inye aka n’ụzọ ego, na ilekọta nwatakịrị ma ndị mụrụ ya pụọ. Ma n’ọtụtụ ala, nkwaga ndị mmadụ na-akwaga n’obodo ukwu emewo ka ihe ndị a kụọ afọ n’ala. Taa, ọ bụ nanị ndị nne na nna na-azụkarị ụmụ ha.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a bụ otu n’ime ihe ndị mere ụlọ ọrụ ndị na-enye ntụziaka banyere otú e si elekọta ụmụaka n’oge a ji mụbaa. Ihe ọzọ mere o ji dị otú ahụ bụ echiche ndị mmadụ nwere nke bụ́ na ndị ọkà mmụta sayensị pụrụ inye ntụziaka ndị bụ́ ịgba banyere otú e si azụ ụmụaka. Ka ọ na-eru ná ngwụsị afọ ndị 1800, onye ọ bụla nọ n’America kweere na nkà mmụta sayensị pụrụ inye aka n’akụkụ nile nke ndụ mmadụ, tinyekwara n’ihe banyere ịzụ ụmụ. Ya mere, mgbe Òtù Ndị Nne America kpesaara ọhaneze na 1899 na “ndị nne na nna adịghị arụ ọrụ ha nke ọma,” ọtụtụ ndị ‘ọkachamara n’ịzụ ụmụ’ gbatara ozugbo. Ha kwere nkwa inyere ndị nne na ndị nna ọ na-esiri ike ịzụ ụmụ ha aka.
Ịchọ Ntụziaka n’Akwụkwọ
Ma gịnị ka ndị ọkachamara a rụzurula? Ndị nne na nna nke oge a, hà ka ndị nke oge mbụ nwee obi iru ala, karakwa ha mara ka e si azụ ụmụ? Otu njụta echiche e mere na Britain n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ọ dịghị otú ahụ. O gosiri na ihe dị ka ndị nne na nna iri atọ na ise n’ime otu narị bụ́ ndị nwere ụmụaka, ka na-achọ nduzi bụ́ ịgba ha pụrụ ịtụkwasị obi. Ndị ọzọ chere na nanị ihe ha nwere ike ime bụ ime ihe akọnuche ha gwara ha.
N’akwụkwọ ya nke na-akọ banyere otú e si azụ ụmụ, Ann Hulbert tụlere ihe ndị ọkachamara dere banyere otú e kwesịrị isi na-azụ ụmụaka. Hulbert, bụ́ onye mụrụ ụmụ abụọ, mere ka ọ pụta ìhè na ọ bụ nanị ole na ole n’ime ntụziaka ndị ọkachamara na-enye dabeere nnọọ n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara bụ́ ndị e weere na ha bụ eziokwu. N’ezie, o yiri ka ha na-adaberekarị n’ahụmahụ onwe ha na-enye ntụziaka kama ịdabere n’ihe ndị mere eme. Dị ka ihe ndị merela eme gosiri, o yiri ka ihe ka ọtụtụ ná ntụziaka ndị ha dere n’akwụkwọ adịghịzi irè, ha na-emegiderịta onwe ha, ụfọdụ n’ime ha enweghịkwa isi.
Ya mere, olee ọnọdụ ndị nne na nna nọ na ya taa? N’eziokwu, ọtụtụ ntụziaka na echiche nke ndị ọzọ na-enye ha emeela ka ọtụtụ n’ime ha nọrọ ná mgbagwoju anya. Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nne na nna nile na-eche na ha amaghị otú ha ga-esi zụọ ụmụ ha. Gburugburu ụwa, ndị nne na nna ka na-erite uru site n’otu ebe e siworo na-enweta nduzi kemgbe gboo, bụ́ nke nọgideworo na-enye ntụziaka bụ́ ịgba, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.