Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Christophe Plantin Otu n’Ime Ndị Malitere Obibi Bible

Christophe Plantin Otu n’Ime Ndị Malitere Obibi Bible

Christophe Plantin Otu n’Ime Ndị Malitere Obibi Bible

A MA Johannes Gutenberg (ihe dị ka afọ 1397-1468) ama maka ibipụta Bible mbụ nke e ji mkpụrụ akwụkwọ a na-edogharị edogharị bie. Ma ọ bụ nanị mmadụ ole na ole maara Christophe Plantin. O so ná ndị malitere ibi akwụkwọ ma rụọ ọrụ dị mkpa n’ime ka ndị bi gburugburu ụwa nwee ike inweta akwụkwọ na Bible n’afọ ndị 1500.

A mụrụ Christophe Plantin n’ihe dị ka afọ 1520 n’obodo Saint-Avertin, France. Ebe Plantin chọrọ ịnọ ebe ndị mmadụ nweere onwe ha ikpe okpukpe masịrị ha na ebe ọ ga-enweta ego karịa na France rụọ ọrụ ya, ọ kwagara obodo Antwerp nke dị n’Ógbè Ndị Dị n’Ebe Dị Ala mgbe ọ fọrọ obere ka ọ gbaa iri afọ atọ. *

Plantin malitere ọrụ ya dị ka onye na-adụkọta akwụkwọ na onye na-achọ ihe ndị e ji akpụkpọ anụ mee mma. Ndị ọgaranya na-achọsi ihe ndị e ji akpụkpọ anụ mee bụ́ ndị ọ na-achọ mma dị egwu ike. Ma, otu ihe mere n’afọ 1555 mere ka Plantin gbanwee ọrụ ya. Mgbe ọ na-aga ibuga ihe e ji etinye ihe nke e ji akpụkpọ anụ mee bụ́ nke onye ọchịchị Ógbè Ndị Dị n’Ebe Dị Ala, bụ́ Eze Philip nke Abụọ nke Spen, kwuru ka a rụọrọ ya, a wakporo Plantin n’otu okporo ámá dị n’Antwerp. Ndị ikom mmanya na-egbu mara ya mma n’ubu. Ọ bụ ezie na mma ahụ a mara Plantin lara, o nwekwaghị ike ịrụ ọrụ ike, n’ihi ya kwa, ọ ghaghị ịkwụsị ọrụ ya. Plantin malitere ọrụ ibi akwụkwọ site n’enyemaka ego o nwetara n’aka Hendrik Niclaes, bụ́ onye ndú nke otu òtù ndị Anabaptist.

“Ọrụ na Ntachi Obi”

Plantin kpọrọ ụlọ obibi akwụkwọ ya De Gulden Passer (Compass Ọlaedo). Ihe e ji mara ụlọ ọrụ ya bụ compass ọlaedo abụọ e ji ese ihe bụ́ ndị e dekwasịrị “Labore et Constantia,” nke pụtara “Ọrụ na Ntachi Obi.” Ihe ahụ e ji mara ụlọ ọrụ ya kwesịịrị nnọọ nwoke a na-agba mbọ.

Ebe Plantin dịrị ndụ n’oge e nwere oké ọgba aghara n’ihe metụtara ọchịchị na okpukpe na Europe, ọ gbalịrị izere nsogbu. Ọrụ obibi akwụkwọ dị ya mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Maurits Sabbe kwuru na ọ bụ ezie na o kwenyeere Mgbanwe Ndị Protestant, ọ “kwụnyeereghị otu okpukpe.” N’ihi nke a, e boro Plantin ebubo na ọ na-ebi akwụkwọ na-emegide okpukpe Katọlik. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1562, a manyere ya ịgbaga Paris ma nọọ ebe ahụ ruo ihe karịrị otu afọ.

Mgbe Plantin lọghachiri Antwerp n’afọ 1563, ya na ndị ọchụ nta ego bara ọgaranya, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị a maara na-ekwenyere okpukpe Calvin, gbakọrọ aka n’achụmnta ego. N’afọ ise ya na ha gbakọrọ aka chụọ nta ego, Plantin biri narị akwụkwọ abụọ na iri isii dị iche iche. Ha gụnyere Bible Hibru, Grik, na nke Latin, nakwa Bible Dutch Ndị Katọlik nke Obodo Louvain, bụ́ nke nwere àgwà ndị mara mma.

“Akwụkwọ nke Mkpụrụ Akwụkwọ Ya Kasị Mma”

N’afọ 1567, mgbe ọtụtụ ndị bi n’Ógbè Ndị Dị n’Ebe Dị Ala na-emegidewanye ọchịchị ndị Spen, Eze Philip nke Abụọ nke Spen zigara Onye Ọchịchị Alba ịghọ gọvanọ nke ebe ahụ. Onye ọchịchị ahụ gbalịrị iji ikike zuru ezu eze ahụ nyere ya kwụsị mmegide ndị Protestant na-emegide ọchịchị Spen n’ebe ahụ. N’ihi ya, Plantin malitere nnukwu ọrụ o bu n’uche ga-eme ka a kwụsị nnọọ inyo ya enyo dị ka onye na-ebi akwụkwọ ndị na-emegide okpukpe Katọlik. Ọ chọsiri ike iji ihe ọmụma ndị ọhụrụ e nwere mgbe ahụ bipụta Bible n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya. Plantin nataliri Philip nke Abụọ ikike ibipụta Bible ọhụrụ a. Eze ahụ kwere ya nkwa ego iji nyere ya aka ma zigara ya otu onye a ma ama maara asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible nke ọma bụ́ Arias Montano ilekọta ọrụ ahụ.

Montano nwere nkà n’asụsụ, ọ rụkwara ọrụ ruo awa 11 kwa ụbọchị. Ndị Spen, Belgium, na France bụ́ ọkachamara n’asụsụ nyeere ya aka. Ha bu n’obi ibipụtaghachi Bible Complutensian Polyglot ahụ a ma ama. * Bible Polyglot ọhụrụ Plantin ahụ nwere Vulgate Latin, Septuagint Grik, na ihe odide Hibru mbụ ahụ e si na ya sụgharịa Bible, o nwekwara Targum Aramaic na Peshitta Syriac, nakwa nsụgharị ha na Latin.

A malitere ibi ya n’afọ 1568. E bichara nnukwu akwụkwọ ahụ n’afọ 1573. A ga-asị na e bichara akwụkwọ ahụ ngwa ngwa n’ihi ihe ọ na-ewe iji bie akwụkwọ n’oge ahụ. N’akwụkwọ ozi Montano degaara Eze Philip nke Abụọ, o dere, sị: “Ihe a na-arụ ebe a n’otu ọnwa karịrị ihe a na-arụ na Rom n’otu afọ.” Plantin biri Bible Polyglot ọhụrụ ahụ otu puku, narị abụọ na iri na atọ, nke ọ bụla n’ime ha nwekwara mpịakọta asatọ buchara ibu. E sere ebe ọdụm, oké ehi, anụ wolf, na nwa atụrụ na-erikọ nri n’udo n’ihu Bible ahụ, si otú ahụ na-egosi ihe e kwuru n’Aịsaịa 65:25. Ihe a na-ere nke a na-adụkọtabeghị ọnụ bụ guilder 70—nke bụ́ nnukwu ego, n’ihi na ọtụtụ ezinụlọ na-akpata ihe dị ka guilder 50 n’afọ mgbe ahụ. A bịara mara mpịakọta ya zuru ezu dị ka Polyglot Antwerp. A kpọkwara ya Biblia Regia (Bible Eze) n’ihi na ọ bụ Eze Philip nke Abụọ wetara ego e ji bie ya.

N’agbanyeghị na Popu Gregory nke Iri na Atọ kwadoro Bible ahụ, a katọrọ Arias Montano nkatọ dị egwu n’ihi Bible ahụ ọ sụgharịrị. Otu ihe kpatara ya bụ na Montano kweere na ihe odide Hibru mbụ ahụ e si na ya sụgharịa Bible ka Vulgate Latin mma. Onye bụ́ isi ná ndị na-emegide ya bụ León de Castro, onye Spen bụ́ ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye weere Bible Vulgate Latin dị ka o kwusịa o bie. De Castro boro Montano ebubo na o debanyere ozizi ndị na-emegide Atọ n’Ime Otu n’ime Bible ahụ ma si otú ahụ gwagbuo ya. Dị ka ihe atụ, de Castro kwuru kpọmkwem na nsụgharị Peshitta Syriac nke dị na Bible ahụ wepụrụ ihe odide ahụ na-ezighị ezi a gbakwụnyere na 1 Jọn 5:7, nke bụ́ “n’eluigwe, Nna ahụ, Okwu ahụ, na Mmụọ Nsọ ahụ: ha atọ bụkwa otu.” (King James Version) Otú ọ dị, Ndị Ikpe nke Ndị Jụrụ Okwukwe na Spen kwuru na ọ dịghị otú Montano si na-emegide okpukpe Katọlik. Ụfọdụ weere Bible Polyglot Antwerp ahụ dị ka “akwụkwọ nke mkpụrụ akwụkwọ ya kasị mma n’akwụkwọ nile otu onye na-ebi akwụkwọ biri na narị afọ nke 16.”

Ihe Ọ Rụzuru Na-adịgide Adịgide

Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ebi akwụkwọ n’oge ahụ nwere nanị otu ígwè obibi akwụkwọ ma ọ bụ abụọ. Otú ọ dị, mgbe ụlọ ọrụ Plantin kasị wuo ewuo, o yiri ka ò nwere ọ dịkarịa ala ígwè obibi akwụkwọ 22 na otu narị na iri ndị ọrụ isii. A bịara mara ya n’ebe nile ndị Spen na-achị dị ka onye bụ́ ọkaibe n’ibi akwụkwọ.

Ka ọ dịgodị, a nọgidere na-emegidewanye ọchịchị ndị Spen n’Ógbè Ndị Dị n’Ebe Dị Ala. Antwerp sonyere n’ọgba aghara ahụ. N’afọ 1576, ndị agha ndị Spen goro ịlụrụ ha agha bụ́ ndị a na-akwụbeghị ụgwọ ọnwa ha nupụụrụ ọchịchị Spen isi ma kwakọrọ ihe ndị mmadụ n’obodo ahụ. A gbara ihe karịrị narị ụlọ isii ọkụ, e gbukwara ọtụtụ puku ndị bi n’Antwerp. Ndị ahịa gbapụrụ n’obodo ahụ. Nke a kpataara nnọọ Plantin ọghọmahịa. E wezụga nke ahụ, a gwara ya na ọ ghaghị ịdị na-atụrụ ndị nnupụisi ahụ nnukwu ụtụ.

N’afọ 1583, Plantin kwagara Leiden, bụ́ obodo nke dị ihe dị ka otu narị kilomita site n’Antwerp n’ebe ugwu. O wuru ụlọ obibi akwụkwọ ebe ahụ, a họpụtakwa ya ịbụ onye na-ebiri Mahadum Leiden akwụkwọ, bụ́ ụlọ akwụkwọ ndị Protestant nọ n’Okpukpe Calvin hiwere. A maliteghachiri ibo ya ebubo ahụ a na-ebobu ya kemgbe ụwa na ọ na-emegide Chọọchị Katọlik. N’ihi ya, Plantin lọghachiri Antwerp n’ọgwụgwụ afọ 1585, obere oge ndị Spen maliteghachiri ịchị obodo ahụ. Mgbe ahụ, ọ gbaala ihe karịrị afọ 60, ụlọ ọrụ Compass Ọlaedo ya nwezikwara nanị mmadụ anọ na-arụ ọrụ na ya ma nwee nanị otu ígwè obibi akwụkwọ. Plantin malitere iwuliteghachi ụlọ obibi akwụkwọ ya. Ma ọ dịghị mgbe o wururu otú o si wuo na mbụ, Plantin nwụkwara na July 1, 1589.

N’ime afọ 34, Christophe Plantin biri otu puku akwụkwọ, narị asatọ na iri isii na atọ dị iche iche, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ 55 n’otu afọ. Ọbụna taa, a ga-eto nnọọ onye na-ebi akwụkwọ nke kwụụrụ onwe ya ma ọ bụrụ na o biruo akwụkwọ otú ahụ! Ọ bụ ezie na Plantin akwụnyesighị ike n’otu okpukpe, ọrụ ya kwalitere ọ bụghị nanị obibi akwụkwọ na akwụkwọ ndị mkpụrụ akwụkwọ ha mara mma, kamakwa ọmụmụ nke Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ. (2 Timoti 3:16) N’ezie, Plantin na ndị na-ebi akwụkwọ ya na ha dịkọrọ ndụ tụnyere ụtụ dị ukwuu n’ịhụ na ndị nkịtị nwere ike ịgụ Bible.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Okwu ahụ bụ́ “Ógbè Ndị Dị n’Ebe Dị Ala” na-ezo aka n’ógbè dị n’akụkụ oké osimiri dị n’agbata Germany na France, nke jikọtara Belgium, Netherlands, na Luxembourg.

^ par. 11 E bipụtara Bible a nwere ọtụtụ asụsụ n’afọ 1517. O nwere ihe odide Bible na Hibru, Grik, nakwa na Latin na akụkụ Bible ụfọdụ n’Aramaic. Lee isiokwu bụ́ “Complutensian Polyglot—Ngwá Ọrụ Nsụgharị Mere Ihe Akụkọ,” nke dị n’Ụlọ Nche nke April 15, 2004, peeji nke 28-31.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

EBE NDEBE IHE OCHIE NKE PLANTIN NA MORETUS

E mepeere ọhaneze ụlọ ebe Plantin na ụmụ ya biri ma rụọ ọrụ n’Antwerp dị ka ebe ndebe ihe ochie n’afọ 1877. Ọ dịghị ụlọ obibi akwụkwọ ọzọ a rụrụ n’oge ahụ nke ka kpakọrọ ọnụ. E nwere ígwè obibi akwụkwọ ise ndị a rụrụ na narị afọ nke 17 na ndị a rụrụ na narị afọ nke 18 n’ebe ahụ. A rụrụ abụọ ndị ọzọ—bụ́ ndị kacha ochie a maara n’ụwa—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’oge Plantin. Ebe ndebe ihe ochie ahụ nwere puku ihe iri na ise e ji akpụ mkpụrụ akwụkwọ, puku ibe osisi iri na ise a tụrụ mkpụrụ akwụkwọ na ihe osise n’elu ha, na puku mbadamba ọla kọpa atọ a tụrụ mkpụrụ akwụkwọ n’elu ha. Ọ́bá akwụkwọ nke ebe ndebe ihe ochie ahụ nwere narị ihe odide oge ochie nke Bible isii na iri atọ na asatọ bụ́ ndị e dere malite na narị afọ nke 9 ruo na nke 16 nakwa otu narị akwụkwọ na iri ise na anọ ndị e biri tupu afọ 1501. Ha gụnyere Bible Gutenberg n’onwe ya biri tupu afọ 1461 nakwa otu n’ime Bible Polyglot Antwerp Plantin a ma ama.

[Foto dị na peeji nke 15]

Arias Montano

[Foto dị na peeji nke 16]

Polyglot Antwerp nwere ihe odide Hibru, “Vulgate” Latin, na “Septuagint” Grik, tinyere “Peshitta” Syriac na Targum Aramaic na nsụgharị ha na Latin

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike a natara ndị na-elekọta Ebe Ndebe Ihe Ochie nke Plantin na Moretus/Stedelijk Prentenkabinet Antwerpen

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 15]

Ihe osise abụọ ahụ: Site n’ikike a natara ndị na-elekọta Ebe Ndebe Ihe Ochie nke Plantin na Moretus/Stedelijk Prentenkabinet Antwerpen