Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Debe Onwe Gị n’Ịhụnanya Chineke!

Debe Onwe Gị n’Ịhụnanya Chineke!

Debe Onwe Gị n’Ịhụnanya Chineke!

“Ndị m hụrụ n’anya, . . . debenụ onwe unu n’ịhụnanya Chineke, . . . n’ile anya ndụ ebighị ebi.”—JUD 20, 21.

1, 2. Olee otú ị pụrụ isi nọgide n’ịhụnanya Chineke?

JEHOVA hụrụ ụwa nke ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ka ndị na-egosipụta okwukwe na ya wee nwee ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Lee ka o si magbuo onwe ya Chineke ịhụ gị n’anya otú ahụ! Ọ bụrụ na ị bụ ohu Jehova, ị ga-achọ nnọọ ka Chineke hụ gị n’anya ruo mgbe ebighị ebi.

2 Jud onye na-eso ụzọ kwuru otú ị pụrụ isi nọgide n’ịhụnanya Chineke. O dere, sị: “Site n’iwuli onwe unu elu n’okwukwe unu nke kasị dị nsọ, na ikpe ekpere site na mmụọ nsọ, debenụ onwe unu n’ịhụnanya Chineke, ka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’ile anya ndụ ebighị ebi.” (Jud 20, 21) Ịmụ Okwu Chineke na ikwusa ozi ọma na-enye aka iwuli gị elu ‘n’okwukwe nke kasị dị nsọ’—nke bụ́ ozizi Ndị Kraịst. Iji nọgide n’ịhụnanya Chineke, ị ghaghị ikpe ekpere “site na mmụọ nsọ,” ma ọ bụ bụrụ onye mmụọ nsọ na-eduzi n’ekpere gị. Iji nweta ndụ ebighị ebi, ị ghaghịkwa igosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta nke Jizọs Kraịst chụrụ.—1 Jọn 4:10.

3. Gịnị mere ụfọdụ ndị abụkwaghị Ndịàmà Jehova?

3 Ụfọdụ ndị nweburu okwukwe n’ebe Chineke nọ anọgideghị n’ịhụnanya ya. N’ihi na ha họọrọ ime mmehie, ha abụkwaghị Ndịàmà Jehova. Olee otú i nwere ike isi zere ihe dị otú ahụ ime gị? Ịtụgharị uche n’ihe ndị a na-esonụ nwere ike inyere gị aka izere ime mmehie ma nọgide n’ịhụnanya Chineke.

Gosipụta Ịhụnanya I Nwere n’Ebe Chineke Nọ

4. Olee otú irubere Chineke isi dịruru ná mkpa?

4 Gosipụta na ị hụrụ Chineke n’anya site n’irubere ya isi. (Matiu 22:37) Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) Ime ka irubere Chineke isi mara gị ahụ́ pụrụ iwusi gị ike imeri ọnwụnwa ma wetara gị ọṅụ. Ọbụ abụ kwuru, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu . . . Kama n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị.”—Abụ Ọma 1:1, 2.

5. Gịnị ka ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ ga-akpali gị ime?

5 Ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ ga-akpali gị izere ime mmehie dị oké njọ nke ga-ewetara aha ya nkọcha. Agua kpere ekpere, sị: “Enyela m ọnọdụ ogbenye ma ọ bụ akụ̀; mee ka m rie nri ruuru m: ka afọ wee ghara iju m, m wee gọọ agọ, sị, Ònye bụ Jehova? Ma ọ bụ ka e wee ghara ịnapụ m ihe nile, m wee zuo ohi, wee were aha Chineke m mee ihe ọjọọ.” (Ilu 30:1, 8, 9) Kpebisie ike ịghara ‘iwere aha Chineke mee ihe ọjọọ’ site n’iwetara Chineke nkọcha. Kama nke ahụ, na-agbalịsi ike mgbe nile ime ihe ndị ziri ezi ga-ewetara ya otuto.—Abụ Ọma 86:12.

6. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị kpachara anya na-eme mmehie?

6 Na-ekpegara Nna gị nke eluigwe na-ahụ n’anya ekpere mgbe nile maka enyemaka iji merie ọnwụnwa ime mmehie. (Matiu 6:13; Ndị Rom 12:12) Nọgide na-agbaso ndụmọdụ Chineke ka e wee ghara igbochi ekpere gị. (1 Pita 3:7) Ọ bụrụ na ị kpachara anya na-eme mmehie, ọ pụrụ ịkpatara gị ọdachi, n’ihi na Jehova anaghị ekwe ka ekpere nke ndị na-enupụ isi ruo ya ntị dị ka à ga-asị na o ji igwe ojii kpuchie onwe ya ka o wee ghara ịnụ ekpere ha. (Abụ Ákwá 3:42-44) N’ihi ya, dị umeala n’obi, na-ekpekwa ekpere ka ị ghara ime ihe ọ bụla ga-egbochi Chineke ịnụ ekpere gị.—2 Ndị Kọrint 13:7.

Gosi na Ị Hụrụ Ọkpara Chineke n’Anya

7, 8. Olee otú ịgbaso ndụmọdụ Jizọs ga-esi nyere mmadụ aka ịjụ mmehie?

7 Gosi na ị hụrụ Jizọs Kraịst n’anya site n’irube isi n’iwu ya, n’ihi na nke a ga-enyere gị aka ịghara ime mmehie. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu edebe ihe ndị m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debeworo ihe ndị Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.” (Jọn 15:10) Olee otú ime ihe Jizọs kwuru ga-esi nyere gị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke?

8 Ichebara okwu Jizọs echiche pụrụ inyere gị aka ịnọgide na-eme ihe ziri ezi. Iwu Chineke nyere ndị Izrel kwuru, sị: “Gị akwala iko.” (Ọpụpụ 20:14) Ma Jizọs gwara anyị ụkpụrụ nke iwu ahụ dabeere na ya site n’ikwu, sị: “Onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.” (Matiu 5:27, 28) Pita onyeozi kwuru na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ narị afọ mbụ nwere “anya jupụtara n’ịkwa iko” ma ‘raa mkpụrụ obi ndị na-akwụsighị ike ụrà.’ (2 Pita 2:14) Ma, kama ịdị ka ha, i nwere ike izere ịkwa iko ma ọ bụrụ na ị hụrụ Chineke na Kraịst n’anya ma na-erubere ha isi ma kpebisie ike ichebe mmekọrịta nke gị na ha.

Kwee Ka Mmụọ Nsọ Jehova Na-edu Gị

9. N’ihe banyere mmụọ nsọ, gịnị nwere ike ime ma mmadụ nọgide na-eme mmehie?

9 Kpegara Chineke ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ ya, kwerekwa ka mmụọ ahụ na-edu gị. (Luk 11:13; Ndị Galeshia 5:19-25) Ọ bụrụ na ị nọgide na-eme mmehie, Chineke nwere ike ịnara gị mmụọ ya. Mgbe Devid mechara mmehie ya na Bat-sheba, ọ rịọrọ Chineke, sị: “Atụpụla m n’ihu Gị; anarakwala m Mmụọ Nsọ Gị.” (Abụ Ọma 51:11) Chineke naara Eze Sọl mmụọ ya n’ihi ịbụ onye mmehie na-enweghị nchegharị. Sọl mehiere site n’ịchụ àjà nsure ọkụ na site n’ịhapụ ìgwè ewu na atụrụ, ìgwè ehi, na eze ndị Amalek ndụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, Jehova naara Sọl mmụọ nsọ ya.—1 Samuel 13:1-14; 15:1-35; 16:14-23.

10. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji ghara ichetụdị echiche ịnọgide na-eme mmehie?

10 Echetụdịla echiche ịnọgide na-eme mmehie. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị elezie anya nọgide na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịworo ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ maka mmehie.” (Ndị Hibru 10:26-31) Lee nnọọ ọdachi ọ ga-abụrụ gị ma ọ bụrụ na i meruo mmehie otú ahụ!

Nwee Ezi Ịhụnanya n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ

11, 12. Olee ụzọ ịhụnanya na nkwanye ùgwù ga-esi mee ka mmadụ ghara ịkwa iko?

11 Ịhụnanya ị hụrụ ụmụ mmadụ ibe gị ga-eme ka ị ghara ịkwa iko. (Matiu 22:39) Ụdị ịhụnanya ahụ ga-akpali gị iche obi gị nche ka ọ ghara ime ka i rie di ma ọ bụ nwunye onye ọzọ obi. Nke ahụ nwere ike iduga n’ịkwa iko. (Ilu 4:23; Jeremaịa 4:14; 17:9, 10) Ṅomie onye ezi omume bụ́ Job, bụ́ onye jụrụ ilekwasị nwanyị ọ bụla na-abụghị nwunye ya anya.—Job 31:1.

12 Ịkwanyere ịdị nsọ nke alụmdi na nwunye ùgwù pụrụ inyere gị aka izere ime mmehie dị oké njọ. Nzube Chineke bụ ka alụmdi na nwunye dị ùgwù na mmekọahụ bụrụ ụzọ isi mụta ụmụ. (Jenesis 1:26-28) Cheta na akụkụ ahụ́ ndị e ji amụ nwa metụtara ndụ, bụ́kwanụ ihe dị nsọ. Ndị na-akwa iko, ma ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ndị na-alụghị, na-enupụrụ Chineke isi, na-elelị mmekọahụ anya, ha anaghị akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù dị ka ihe dị nsọ, ha na-emehiekwa megide ahụ́ nke onwe ha. (1 Ndị Kọrint 6:18) Ma ịhụnanya mmadụ nwere n’ebe Chineke na onye agbata obi ya nọ, ya na irubere Chineke isi, ga-eme ka ọ ghara ime omume nwere ike ime ka a chụpụ ya n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

13. Olee ụzọ onye na-akwa iko si “na-ala akụ̀ ya n’iyi”?

13 Ọ dị anyị mkpa ịdị na-ewepụ echiche ọjọọ n’uche anyị ka anyị ghara ịkpatara ndị anyị hụrụ n’anya obi mgbawa. Ilu 29:3 na-ekwu, sị: “Onye bụ́ enyi nke ndị inyom na-akwa iko na-ala akụ̀ ya n’iyi.” Di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko n’enweghị nchegharị na-emebi mmekọrịta nke ya na Chineke, ọ na-emebikwa ịhụnanya dị n’ezinụlọ ya. Nwunye ya nwere ihe ọ pụrụ iji gbaa ya alụkwaghịm. (Matiu 19:9) Ma ọ̀ bụ di ma ọ̀ bụ nwunye kwara iko, ntisa nke alụmdi na nwunye nwere ike ịkpatara nnọọ di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha, ụmụ ha, na ndị ọzọ oké obi mgbawa. Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ịmara otú omume rụrụ arụ pụrụ isi mebie ihe kwesịrị ịkpali anyị imeri ọnwụnwa nke itinye aka na ya?

14. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere omume ọjọọ n’Ilu 6:30-35?

14 Ịmara na ọ dịghị otú anyị pụrụ isi mezie ihe anyị mebiri site n’ịkwa iko kwesịrị ịkpali anyị izere àgwà a na-egosi nnọọ anyaukwu. Ilu 6:30-35 na-egosi na ndị mmadụ nwere ike imere onye zuru ohi n’ihi agụụ ebere, ma ha agaghị emere onye na-akwa iko ebere n’ihi na o bu ihe ọjọọ n’obi. Ọ “na-emebi mkpụrụ obi [ma ọ bụ, ndụ] nke aka ya.” Ọ bụrụ n’Iwu Mozis, a gaara egbu ya egbu. (Levitikọs 20:10) Di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko na-akpatara ndị ọzọ obi mgbawa nanị iji mejụọ agụụ mmekọahụ ya, di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko n’enweghị nchegharị adịghịkwa anọgide n’ịhụnanya Chineke, kama a na-achụpụ ya n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị ọcha.

Nọgide Na-enwe Akọnuche Dị Ọcha

15. Gịnị bụ ọnọdụ akọnuche e gbunyere akara “dị ka e ji ígwè ọkụ” daa ya?

15 Iji nọgide n’ịhụnanya Chineke, anyị agatụghị eji mmehie gbuo akọnuche anyị. O doro nnọọ anya na anyị aghaghị ịjụ ụkpụrụ omume rụrụ arụ nke ụwa, ọ dịkwa anyị mkpa ịkpachapụ anya ma a bịa n’ụdị ndị enyi anyị na-ahọrọ, ụdị akwụkwọ ndị anyị na-agụ na ụdị ntụrụndụ ndị anyị na-enwe. Pọl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “N’oge ikpeazụ, ụfọdụ ga-esi n’okwukwe dapụ, na-aṅa ntị n’okwu nduhie ndị sitere ná mkpali nke mmụọ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ, site n’ihu abụọ nke ndị na-ekwu okwu ụgha, ndị e gbunyere akara n’akọ na uche ha dị ka e ji ígwè ọkụ.” (1 Timoti 4:1, 2) Akọnuche e gbunyere akara “dị ka e ji ígwè ọkụ” daa ya yiri anụ ahụ́ gbasiri agbasi na nke ihe na-anaghị emetụta. Akọnuche dị otú ahụ agazighị na-adọ anyị aka ná ntị izere ndị si n’ezi ofufe dapụ na izere ọnọdụ ndị nwere ike ime ka anyị dapụ n’okwukwe.

16. N’ihi gịnị ka o ji dị nnọọ mkpa inwe akọnuche dị ọcha?

16 Nzọpụta anyị dabeere n’anyị inwe akọnuche dị ọcha. (1 Pita 3:21) Site n’okwukwe anyị nwere n’ọbara Jizọs wụsịrị, akọnuche anyị adịla ọcha pụọ n’ọrụ nwụrụ anwụ, “ka anyị wee na-ejere Chineke ahụ dị ndụ ozi dị nsọ.” (Ndị Hibru 9:13, 14) Ọ bụrụ na anyị akpachara anya na-eme mmehie, akọnuche anyị ga-arụ arụ, anyị agaghịzi adị ọcha ma ruo eruo ijere Chineke ozi. (Taịtọs 1:15) Ma site n’enyemaka Jehova, anyị pụrụ inwe akọnuche dị ọcha.

Ụzọ Ndị Ọzọ Ị Pụrụ Isi Zere Omume Ọjọọ

17. Gịnị bụ uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na i ‘sozuo Jehova n’azụ’?

17 ‘Sozuo Jehova n’azụ,’ dị ka Keleb nke Izrel oge ochie mere. (Deuterọnọmi 1:34-36) Na-eme ihe Chineke na-achọ n’aka gị, ya adịkwala mgbe ị ga-eche echiche iri nri na “tebụl ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Ndị Kọrint 10:21) Kpọọ ndapụ n’ezi ofufe asị. Jiri obi ekele na-eri nanị nri sitere na tebụl Jehova, ndị ozizi ụgha ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ agaghịkwa eduhie gị. (Ndị Efesọs 6:12; Jud 3, 4) Lekwasị anya n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke, dị ka ọmụmụ Bible, ịga ọmụmụ ihe na ozi ubi. Ị ga-enwerịrị obi ụtọ ma ọ bụrụ na i sozuo Jehova n’azụ ma na-enwe ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị.—1 Ndị Kọrint 15:58.

18. Olee otú egwu Jehova ga-esi emetụta omume gị?

18 Kpebisie ike ịdị ‘na-ejere Chineke ozi dị nsọ site n’egwu Chineke na ụjọ.’ (Ndị Hibru 12:28) Ịtụ Jehova egwu ga-akpali gị ịjụ omume ọjọọ ọ bụla. Ọ ga-enyere gị aka ime ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Pita nyere ndị e tere mmadụ ibe ya, nke bụ́: “Ọ bụrụ na unu na-akpọku Nna nke na-ekpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu dị ka ọrụ onye nke ọ bụla si dị, jirinụ egwu na-eme omume n’oge unu bi dị ka ndị ala ọzọ.”—1 Pita 1:17.

19. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji na-eme ihe ị na-amụta n’Okwu Chineke eme mgbe nile?

19 Na-eme ihe ndị ị na-amụta n’Okwu Chineke eme mgbe nile. Nke a ga-enyere gị aka izere ime mmehie dị oké njọ n’ihi na ị ga-eso ná “ndị siteworo n’iji ikike nghọta ha eme ihe zụọ ikike a ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) Kama ikwu okwu na ịkpa àgwà n’echeghị echiche, mụrụ anya ka i wee na-eje ije dị ka onye maara ihe, “na-azụpụtara onwe [gị] oge kwesịrị ekwesị” n’ụbọchị ọjọọ ndị a. ‘Nọgide na-aghọta ihe uche Jehova bụ,’ ma nọgide na-eme ya eme.—Ndị Efesọs 5:15-17; 2 Pita 3:17.

20. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere anyaukwu?

20 Enwela anyaukwu n’ebe ihe ndị ọzọ nwere dị. Otu n’ime Iwu Iri ahụ kwuru, sị: “Gị enwela anyaukwu n’ebe ụlọ mmadụ ibe gị dị, gị enwela anyaukwu n’ebe nwunye mmadụ ibe gị nọ, ma ọ bụ n’ebe ohu ya nwoke nọ, ma ọ bụ n’ebe ohu ya nwanyị nọ, ma ọ bụ n’ebe ehi ya dị, ma ọ bụ n’ebe ịnyịnya ibu ya dị, ma ọ bụ n’ebe ihe ọ bụla dị nke mmadụ ibe gị nwere.” (Ọpụpụ 20:17) Iwu a chebere ụlọ mmadụ, nwunye ya, ohu ya, anụmanụ ya na ihe ndị ọzọ o nwere. Ma nke kasị mkpa bụ okwu Jizọs nke bụ́ na anyaukwu na-emerụ mmadụ.—Mak 7:20-23.

21, 22. Olee ihe Onye Kraịst nwere ike ime iji zere ime mmehie?

21 Mee ihe i nwere ike ime iji mee ka ọchịchọ gị ghara iduga gị n’ime mmehie. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “A na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà. Ọchịchọ ahụkwa, mgbe ọ tụrụwooro ime, na-amụpụta mmehie; mmehie, n’aka nke ya, mgbe e mechaworo ya, na-eweta ọnwụ.” (Jems 1:14, 15) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ nwere nsogbu ịṅụ mmanya n’oge gara aga, o nwere ike ikpebi ịghara ịdị na-enwe ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ụlọ ya mgbe nile. Iji zere ọnwụnwa metụtara onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya, o nwere ike ịdị Onye Kraịst mkpa ịgbanwe ebe ọ na-anọ arụ ọrụ ma ọ bụ ọrụ ya.—Ilu 6:23-28.

22 Gbaara ihe ọ bụla nwere ike ọbụna iduga gị n’ime mmehie ọsọ. Ịchụ nwoke ma ọ bụ nwanyị na iche echiche na-ezighị ezi pụrụ iduga n’ịkwa iko. Ịgha obere ụgha pụrụ ime ka anya kaa mmadụ ịgha nnukwu ụgha, ọ pụkwara ime ka onye ahụ daba ná mmehie nke ịgha ụgha mgbe nile. Izu obere ihe nwere ike igbu akọnuche mmadụ ruo n’ókè nke onye ahụ ịmalitezi izu ihe buru ibu. Ọbụna mmadụ ịnabatatụ echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ pụrụ ime ka ọ dapụ n’ezi ofufe kpamkpam.—Ilu 11:9; Mkpughe 21:8.

Gịnịkwanụ Ma Ọ Bụrụ na I Mere Mmehie?

23, 24. Olee nkasi obi anyị pụrụ inweta site ná 2 Ihe E Mere 6:29, 30 na Ilu 28:13?

23 Ọ dịghị onye zuru okè. (Eklisiastis 7:20) Ma ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ, ekpere Eze Solomọn kpegaara Jehova mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ Jehova nye Ya nwere ike ịkasị gị obi. Solomọn kpegaara Chineke ekpere, sị: “Ekpere ọ bụla, arịrịọ amara ọ bụla, nke ga-adịrị mmadụ ọ bụla, ma ọ bụ nke ga-adịrị ndị Gị nile, bụ́ Izrel, ndị ga-amara, nwoke ọ bụla ihe otiti ya na ihe mgbu ya, o wee gbasaa ọbụ aka ya abụọ n’ebe ụlọ a dị: Gị onwe gị sikwa n’eluigwe, bụ́ ọnọdụ obibi Gị guzosiri ike, nụrụ, gbaghara, nye nwoke ọ bụla dị ka ụzọ ya nile si dị, onye Ị maara obi ya; (n’ihi na Gị onwe gị amawo obi ụmụ mmadụ, nanị Gị;).”—2 Ihe E Mere 6:29, 30.

24 Ee, Chineke maara obi ụmụ mmadụ ma na-agbaghara mmehie. Ilu 28:13 na-ekwu, sị: “Onye na-ekpuchi njehie ya nile, ọ gaghị agara ya: ma onye na-ekwupụta ha, nke na-ahapụkwa ha, a ga-enwe obi ebere n’ahụ́ ya.” Chineke nwere ike imere mmadụ ebere ma ọ bụrụ na onye ahụ echegharịa, kwupụta mmehie ya, ma hapụ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ị datụrụ mbà n’okwukwe, olee ihe ọzọ pụrụ inyere gị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke?

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú anyị pụrụ isi debe onwe anyị n’ịhụnanya Chineke?

• Olee otú ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na Kraịst nọ si enyere anyị aka ịghara ime mmehie?

• Olee ihe mere ezi ịhụnanya anyị hụrụ ndị ọzọ ga-eji mee ka anyị ghara ịkwa iko?

• Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi zere omume ọjọọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Jud gosiri anyị otú anyị ga-esi debe onwe anyị n’ịhụnanya Chineke

[Foto dị na peeji nke 23]

Ntisa nke alụmdi na nwunye nwere ike ịkpatara nnọọ di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha na ụmụ ha obi mgbawa

[Foto dị na peeji nke 24]

Dị ka Keleb, ì kpebisiri ike ‘isozu Jehova n’azụ’?

[Foto dị na peeji nke 25]

Na-ekpegara Chineke ekpere mgbe nile ka o nyere gị aka imeri ọnwụnwa