Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-eme Ihe Ziri Ezi?

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-eme Ihe Ziri Ezi?

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-eme Ihe Ziri Ezi?

OTU nwoke nke gụrụ oké akwụkwọ nwere mgbe o kwuru, sị: “Enwere m ikike ịchọ ime ihe, ma enweghị m ikike ịrụpụta ihe dị mma. N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ka m na-adịghị eme, kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị ka m na-eme.” Gịnị mere o ji siere nwoke a ike ime ezi ihe nke ọ chọrọ ime? Ọ kọwara, sị: “Ya mere, m na-ahụta iwu a n’ebe m nọ: na mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ihe ọjọọ na-anọ n’ebe m nọ. N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.”—Ndị Rom 7:18, 19, 21-23.

Okwu a Pọl onyeozi kwuru, bụ́ nke e dekọrọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, kọwara ihe mere o ji esiri ụmụ mmadụ na-ezughị okè ike ime ihe ziri ezi. Ịgbaso ụkpụrụ ziri ezi, karịsịa mgbe ihe siri ike, na-achọ mmadụ ikpebisi ike ime ezi ihe. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ, sị, Olee ihe kasị mkpa mere anyị ga-eji na-eme ihe ziri ezi?

Tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ihe ga-abụ ọdịnihu nke onye omume ya ziri ezi. N’Abụ Ọma 37:37, 38, anyị na-agụ, sị: “Rịba onye zuru okè ama, leekwa onye ziri ezi: n’ihi na ọdịnihu dịịrị onye udo. Ma ndị njehie, a na-ekpochapụ ha n’otu: a ga-ebipụ ọdịnihu nke ndị na-emebi iwu.” Ilu 2:21, 22 na-agwa anyị, sị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”

Ọ bụ ezie na nkwa ndị a na ndị ọzọ dị n’ime Bible na-akpali anyị ime ihe Chineke na-achọ, ọ bụghị ha bụ ihe kasị mkpa mere anyị ga-eji mee otú ahụ. Ihe ahụ mere anyị ga-eji na-eme uche Chineke nwere ihe jikọrọ ya na esemokwu ahụ nke gbasara ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe esemokwu ahụ bụ na otú o si gbasa anyị.