Iji “Obi Ike” Gbaa Àmà Zuru Ezu
“Anyị Aghaghị Irubere Chineke Isi Dị Ka Onye Na-achị Achị Karịa Mmadụ”
Iji “Obi Ike” Gbaa Àmà Zuru Ezu
OTU ìgwè ndị na-eme ihe ike achọọla nnọọ ịkụgbu otu ohu Chineke na-erube isi. Mgbe ọ fọrọ nnọọ obere ka ha gbuo ya, ndị agha Rom napụtara nwoke ahụ n’aka ha ma kpọchie ya. Nke a bụ otú otu ihe were ihe dị ka afọ ise si malite. N’ihi ya, ọtụtụ ndị ọchịchị Rom nọ n’ọkwá dị elu nụrụ ihe banyere Jizọs Kraịst.
Onye ahụ a chọrọ igbu egbu bụ Pọl onyeozi. N’ihe dị ka afọ 34 O.A., Jizọs kpughere na Pọl (Sọl) ga-eburu aha Ya gaa n’ihu “ndị eze.” (Ọrụ 9:15) N’afọ 56 O.A., nke a emezubeghị. Otú ọ dị, ka njem ozi ala ọzọ nke atọ nke onyeozi ahụ na-abịa ná njedebe, ihe na-aga ịgbanwe.
E Tiri Ya Ihe Ma Ọ Kwụsịghị Ozi Ya
Pọl gakwara n’ihu na njem ya ịga Jeruselem, Ndị Kraịst ụfọdụ ‘sitekwara na mmụọ nsọ’ dọọ ya aka ná ntị na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ nọ na-eche ya n’obodo ahụ. Pọl ji obi ike kwuo, sị: “Adị m njikere ọ bụghị nanị ịbụ onye a ga-eke agbụ kamakwa ịnwụ na Jeruselem n’ihi aha Onyenwe anyị Jizọs.” (Ọrụ 21:4-14) Ozugbo Pọl bịara n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, ndị Juu si Eshia bụ́ ndị maara otú onyeozi ahụ si enwe ihe ịga nke ọma n’ọrụ nkwusa ozi ọma ya n’Eshia kpaliri ìgwè na-eme ihe ike ịchọ igbu ya. Ndị agha Rom bịara ngwa ngwa iji zọpụta ya. (Ọrụ 21:27-32) Nzọpụta ahụ a zọpụtara Pọl nyere ya ohere pụrụ iche ikwusara ndị obi tara mmiri na ndị nọ n’ọkwá dị elu eziokwu banyere Kraịst.
Ikwusara Ndị Ọ Na-esi Ike Ịgakwuru Ozi Ọma
A kpụụrụ Pọl gbagoo steepụ nke otu ebe e wusiri ike a na-akpọ Ụlọ Elu Antonia bụ́ ebe ọ na-adịghị ihe ga-eme ya. * Onyeozi ahụ nọ na steepụ ahụ gbaara ìgwè ndị okpukpe ahụ na-eme ihe ike àmà kpụ ọkụ n’ọnụ. (Ọrụ 21:33–22:21) Ma ozugbo o kwuru na e nyere ya ọrụ ikwusara ndị Jentaịl ozi ọma, ọgba aghara malitere ọzọ. Ọchịagha bụ́ Laịsias nyere iwu ka e jiri ịpịa ihe gbaa Pọl ajụjụ iji mata ihe mere ndị Juu ji bo ya ebubo. Otú ọ dị, a pịaghịzi Pọl ihe mgbe o mere ka a mara na ya bụ nwa afọ Rom. N’echi ya, Laịsias kpọpụtara Pọl n’ihu Sanhedrin iji mara ihe mere ndị Juu ji bo ya ebubo.—Ọrụ 22:22-30.
Ka Pọl guzo n’ihu ụlọikpe ahụ, o nwetara ohere ọzọ mara mma iji gbaara ndị Juu ibe ya àmà. Onye a na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu mere ka a mara na o kweere ná mbilite n’ọnwụ. (Ọrụ 23:1-8) Ajọ ịkpọasị ndị Juu ebelataghị, a kpụgakwara Pọl n’ogige ndị agha. N’abalị ya, Onyenwe anyị gwara ya okwu a na-emesi obi ike, nke bụ́: “Nwee obi ike dị ukwuu! N’ihi na dị ka ị nọworo na-agba àmà nke ọma n’ihe ndị metụtara m na Jeruselem, otú ahụkwa ka ị na-aghaghị ịgba àmà na Rom”—Ọrụ 23:9-11.
A kụsara atụmatụ e mere igbu Pọl mgbe e zopụrụ ya ngwa ngwa ma kpọga ya Sesaria, nke bụ́ isi obodo ndị Rom na-achị Judia. (Ọrụ 23:12-24) Na Sesaria, ohere ọzọ ndị bara uru dapụtara, Pọl jikwa ha gbaara “ndị eze” àmà. Ma, nke mbụ, onyeozi ahụ gosiri Gọvanọ Filiks na ọ dịghị ihe a ga-eji kwado ebubo ndị e boro ya. Ka e mesịrị, Pọl kwusaara ya na nwunye ya bụ́ Drusila ozi ọma banyere Jizọs, njide onwe onye, ezi omume, na ikpe nke na-abịanụ. Otú ọ dị, Pọl nọgidere n’ụlọ mkpọrọ ruo afọ abụọ, n’ihi na Filiks chere na ya ga-enweta ego aka azụ bụ́kwanụ nke ọ na-enwetaghị.—Ọrụ 23:33–24:27.
Mgbe Festọs nọchiri Filiks n’ọchịchị, ndị Juu Ọrụ 25:1-11, 20, 21) Ka ụbọchị ole na ole gasịrị, mgbe onyeozi ahụ kọchaara Eze Herọd Agrịpa nke Abụọ ihe mere e ji jichie ya, eze ahụ kwuru, sị: “Ná mkpirikpi oge ị ga-eme ka m kweta ịghọ onye Kraịst.” (Ọrụ 26:1-28) N’ihe dị ka afọ 58 O.A., e zigara Pọl na Rom. Mgbe onyeozi ahụ nọ dị ka onye mkpọrọ n’ebe ahụ, o jiri ohere ọ bụla ọ hụrụ nọgide na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma banyere Kraịst ruo afọ abụọ ọzọ. (Ọrụ 28:16-31) O yiri ka Pọl ò mesịrị pụta n’ihu Eze Ukwu Nero, ikpe alaara Pọl, ya emesịakwa maliteghachi ozi ala ọzọ ya dị ka onye nweere onwe ya. Ọ dịghị ihe ndekọ gosiri na ọ dị onyeozi ọzọ nwetara ohere ikwusara ndị a ma ama otú ahụ ozi ọma.
maliteghachiri mgbalị ndị ha na-eme iji hụ na a mara Pọl ikpe ọnwụ ma gbuo ya. E kpere ikpe ahụ ọzọ na Sesaria, ijikwa mee ka a ghara ibuga ikpe ahụ na Jeruselem, Pọl kwuru, sị: “Ana m eguzo n’ihu oche ikpe Siza . . . Ana m arịọ ka Siza kpegharịa ikpe m.” (Dị ka ihe ndị a kọrọla gosiri, Pọl onyeozi gbasoro ụkpụrụ Ndị Kraịst ibe ya kwupụtara mgbe ha nọ n’ihu ụlọikpe ndị Juu, nke bụ́: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Lee nnọọ ihe nlereanya magburu onwe ya o setịpụụrụ anyị! N’agbanyeghị mgbalị ndị mmadụ nọgidere na-eme ịkwụsị ozi ya, onyeozi ahụ rubere nnọọ isi n’iwu ahụ e nyere ka a gbaa àmà zuru ezu. N’ihi isi dị otú ahụ Pọl nọgidere na-erubere Chineke, ọ rụzuru ọrụ ya dị ka ‘arịa a họọrọ’ iburu aha Jizọs “gakwuru ndị mba ọzọ, gakwurukwa ndị eze na ụmụ Izrel.”—Ọrụ 9:15.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Lee 2006 Calendar of Jehovah’s Witnesses, November/December.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]
IHE BỤ́ MKPA PỌL Ọ̀ BỤ NANỊ ỊZỌRỌ ISI YA?
Mgbe onye na-ede akwụkwọ bụ́ Ben Witherington nke Atọ na-ekwu okwu banyere ajụjụ a, o dere, sị: “Site n’otú Pọl si lee ihe anya . . . ihe bụ́ mkpa abụghị Pọl ịzọrọ isi ya, kama nke ahụ, ihe ka ya mkpa bụ ya ịgbara ndị ọchịchị, ma ndị nke ndị Juu ma ndị nke ndị Jentaịl, àmà banyere ozi ọma ahụ. . . . N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe a na-ekpe ikpe n’ezie bụ ozi ọma ahụ.”