Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Abụ nke Abụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Abụ nke Abụ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Abụ nke Abụ

“DỊ KA urodi n’etiti ogwu, otú a ka enyi m dị n’etiti ndị inyom.” “Dị ka osisi apụl n’etiti osisi oké ọhịa, otú a ka onye ihe ya na-atọ m ụtọ dị n’etiti ụmụ ndị ikom.” “Ònye bụ nwanyị a nke na-elepụ anya dị ka ụtụtụ, nke mara mma dị ka ọnwa, na-enwu ka anyanwụ?” (Abụ nke Abụ 2:2, 3; 6:10) Lee ka amaokwu ndị a sitere n’akwụkwọ Abụ nke Abụ si magbuo onwe ha! Akwụkwọ ahụ dum bụ abụ nke na-akụzi ihe na nke mara nnọọ mma nke na a na-akpọ ya “abụ kasị ụtọ.”—Abụ nke Abụ 1:1.

Abụ a bụ akụkọ banyere ịhụnanya dị n’etiti nwata nwoke na-azụ atụrụ na otu nwata nwanyị si n’ime obodo, nke bụ́ onye Shulam, nke Eze Solomọn nke Izrel oge ochie dere ma eleghị anya n’ihe dị ka afọ 1020 T.O.A., ná mbido nke ọchịchị afọ 40 ya. Nne na ụmụnne nwoke nke nwa agbọghọ ahụ, “ụmụ ndị inyom Jeruselem [ụmụ agbọghọ na-arụ n’obí eze],” na “ụmụ ndị inyom Zaịọn [ndị inyom Jeruselem]” so ná ndị a kpọrọ aha n’abụ a. (Abụ nke Abụ 1:5; 3:11) Ọ ga-esiri onye na-agụ Bible ike ịmata ndị nile kwuru okwu n’akwụkwọ Abụ nke Abụ, ma o nwere ike ịmata ha ma ọ bụrụ na ọ tụlee ihe ha na-ekwu na ihe a na-agwa ha.

Abụ nke Abụ dị n’Okwu Chineke, ozi dị na ya bakwara ezigbo uru n’ihi ihe abụọ. (Ndị Hibru 4:12) Nke mbụ, ọ na-akụziri anyị ihe ezi ịhụnanya na-adị n’etiti nwoke na nwanyị bụ. Nke abụọ, abụ ahụ na-enye anyị ihe atụ nke ụdị ịhụnanya dị n’etiti Jizọs Kraịst na ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ.—2 Ndị Kọrint 11:2; Ndị Efesọs 5:25-31.

‘AKPỌTELA ỊHỤNANYA N’IME M’

(Abụ nke Abụ 1:13:5)

“Ya were nsutụ nile nke ọnụ ya sutụ m: n’ihi na ịhụnanya gị nile dị mma karịa mmanya vaịn.” (Abụ nke Abụ 1:2) Mkparịta ụka dị n’Abụ nke Abụ ji okwu ndị a nke nwata nwanyị dị umeala n’obi si n’ime obodo kwuru, bụ́ onye a kpọbatara n’ụlọikwuu eze Solomọn, malite. Olee otú o si ruo ebe ahụ?

O kwuru, sị: “Ụmụ nke nne m wesara m iwe dị ọkụ. Ha doro m onye nche ubi vaịn ha nile.” Ụmụnne ya ndị nwoke wesara ya iwe n’ihi na nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ kpọrọ ya ka ya na ya soro kpagharịa n’otu ụbọchị dị jụụ n’oge opupu ihe ubi. Iji gbochie ya ịga, ha nyere ya ọrụ ịchụ “nkịta ọhịa dị nta, ndị na-emebi ubi vaịn nile.” Ọrụ a mere ka ọ bịa nso n’ọmụma ụlọikwuu Solomọn. A hụrụ mma ya mgbe ọ rịdara ‘n’ubi walnut [ụkpa] a gbara ogige,’ a kpọbatakwara ya n’ọmụma ụlọikwuu ahụ.—Abụ nke Abụ 1:6; 2:10-15; 6:11.

Ka nwa agbọghọ ahụ na-ekwu otú o si agụ ya agụụ ịhụ onye ọzụzụ atụrụ ahụ ọ hụrụ n’anya, ụmụ agbọghọ na-arụ n’obí eze gwara ya ka ọ ‘pụọrọ onwe ya soo na nzọụkwụ nile nke ìgwè ewu na atụrụ’ jee chọọ ya. Ma Solomọn ekweghị ka ọ gaa. Solomọn gwara ya na ọ mara mma ma kwe ya nkwa “ihe ọkpụkpa dị iche iche nke ọlaedo . . . ya na mkpọchi ọlaọcha.” Ma nke ahụ adọrọghị mmasị nwata nwanyị ahụ. Nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ batara n’ọmụma ụlọikwuu Solomọn, chọta enyi ya nwanyị, ma tie, sị: “Lee, ị mara mma, enyi m; lee, ị mara mma.” Nwa agbọghọ ahụ gbara ụmụ agbọghọ ahụ na-arụ n’obí eze iyi, sị: “Unu akpọtela, unu emekwala ka ịhụnanya teta, ma ọlị, ruo mgbe ọ ga-atọ ya ụtọ.”—Abụ nke Abụ 1:8-11, 15; 2:7; 3:5.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:2, 3—Olee ihe mere icheta ịhụnanya nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ ji dị ka mmanya vaịn, icheta aha ya adịkwa ka mmanụ otite? Dị nnọọ ka mmanya na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa, ịwụsa mmadụ mmanụ n’isi emeekwa ka ahụ́ jụrụ ya, icheta ịhụnanya nwata nwoke ahụ nwere n’ebe ọ nọ na aha ya gbara nwa agbọghọ ahụ ume ma kasie ya obi. (Abụ Ọma 23:5; 104:15) Ezi Ndị Kraịst, karịsịa ndị e tere mmanụ, na-enwetakwa ike mgbe ha chetara ịhụnanya Jizọs Kraịst gosiri n’ebe ha nọ.

1:5—Olee ihe mere nwata nwanyị ahụ si n’ime obodo ji jiri oji ya tụnyere “ụlọikwuu nile nke Kida”? Ọ dị ọtụtụ ihe a na-eji ákwà e ji ajị ewu mee eme n’oge ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 31:20) Dị ka ihe atụ, e ji “ákwà nkwụba ajị ewu” rụọ “ụlọikwuu n’elu ebe obibi ahụ.” (Ọpụpụ 26:7) O nwere ike ịbụ na a na-eji ajị ewu ojii eme ákwà ụlọikwuu Kida, ọbụna dị ka a na-eji ya eme nke ndị Arab a na-akpọ ndị Bedouin taa.

1:15—Gịnị ka nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ bu n’obi mgbe o kwuru, sị: “Anya gị abụọ dị ka nduru”? Nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ na-ekwu na anya enyi ya nwanyị mara mma dị ka nke nduru.

2:7; 3:5—N’ihi gịnị ka e ji jiri “nne mgbada [na] nne ele ọhịa” gbaa ụmụ agbọghọ na-arụ n’obí eze iyi? A ma mgbada na ele ọhịa ama maka ịma mma ha. Anyị pụrụ ikwu na nwa agbọghọ Shulam ahụ ji ihe ọ bụla mara mma gbaa ụmụ agbọghọ ahụ na-arụ n’obí eze iyi ka ha ghara ime ka ịhụnanya teta n’ime ya.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

1:2; 2:6. Ezi ngosipụta nke ịhụnanya nwere ike ikwesị ekwesị mgbe mmadụ abụọ na-achọ ịlụ onwe ha ka na-akpa akpa. Otú ọ dị, ha kwesịrị ịkpachara anya iji hụ na ihe ha na-eme bụ igosipụta ezi ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ ọ bụghị igosipụta agụụ mmekọahụ na-ezighị ezi, bụ́ nke nwere ike iduga ha ná mmekọahụ rụrụ arụ.—Ndị Galeshia 5:19.

1:6; 2:10-15. Ụmụnne nwoke nke nwata nwanyị Shulam ahụ ekweghị nwanne ha nwanyị soro onye ọ hụrụ n’anya gaa n’ebe dịpụrụ adịpụ n’elu ugwu, ma ọ bụghị n’ihi na nwata nwanyị ahụ na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ n’ihi na o bu ihe ọjọọ n’obi. Kama nke ahụ, ha mere ihe ha bu n’obi ga-egbochi ya ịbanye n’ọnọdụ nwere ike iduba ya n’ọnwụnwa. Ihe ndị na-achọ ịlụ onwe ha ga-amụta na nke a bụ na ha kwesịrị izere ịnọ n’ebe zoro ezo.

2:1-3, 8, 9. N’agbanyeghị na nwa agbọghọ Shulam ahụ mara mma, o ji ịdị umeala n’obi lee onwe ya anya dị ka “rose [okooko osisi jupụtara ebe nile] nke Sherọn.” N’ihi ịma mma ya na ikwesị ntụkwasị obi ya nye Jehova, nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ lere ya anya dị ka “urodi n’etiti ogwu.” Oleekwanụ otú a pụrụ isi kọwaa nwata nwoke ahụ n’onwe ya? N’ihi na ọ mara mma nwoke, nye enyi ya nwanyị, o yiri “mgbada.” Ọ ghaghị ịbụkwa onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ma rara onwe ya nye Jehova. Nwa agbọghọ ahụ kwuru, sị: “Dị ka osisi apụl [nke na-enye ndò na mkpụrụ osisi a na-ara ara] n’etiti oké ọhịa, otú a ka onye ihe ya na-atọ m ụtọ dị n’etiti ụmụ ndị ikom.” Ọ̀ bụ na okwukwe na ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke abụghị ezi àgwà ndị mmadụ ga-achọ ka onye ga-alụ ya nwee?

2:7; 3:5. Nwa agbọghọ ahụ si n’ime obodo enweghị mmasị ọ bụla ịlụ Solomọn. Ọ gbakwara ụmụ agbọghọ na-arụ n’obí eze iyi ka ha ghara ịnwa ime ka ya hụ onye ọ bụla ọzọ na-abụghị nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ n’anya. Ọ bụghị onye ọ bụla mmadụ hụrụ ka ọ ga-enwe mmasị ịlụ, o kwesịkwanụghị ịdị otú ahụ. Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nke na-achọ ịlụ kwesịrị ịchọ nanị ohu Jehova nke kwesịrị ntụkwasị obi.—1 Ndị Kọrint 7:39.

“GỊNỊ MERE UNU GA-EJI LEKWASỊ NWANYỊ SHULAM ANYA”?

(Abụ nke Abụ 3:68:4)

Ọ dị ihe si “n’ọzara arịgota dị ka ogidi dị iche iche nke anwụrụ ọkụ.” (Abụ nke Abụ 3:6) Gịnị ka ndị inyom Jeruselem hụrụ mgbe ha pụrụ ịga hụ ihe ọ bụ? Ọ bụ Solomọn na ndị ohu ya ka ha na-alọghachi n’obodo ahụ! Eze ahụ kpọkwa nwa agbọghọ Shulam ahụ na-alọta.

Nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ sooro nwa agbọghọ ahụ, mesịakwa chọta otú ọ ga-esi hụ ya. Ka nwata nwoke ahụ na-emesi ya obi ike na ya ka hụrụ ya n’anya, nwata nwanyị Shulam ahụ kwuwere na ya chọrọ isi n’obodo ahụ pụọ, sị: “Ruo mgbe ifufe anyasị na-efe n’ụbọchị, mgbe onyinyo nile na-agbalagakwa, mụ onwe m ga-eje n’ugwu myrrh, na n’ugwu nta frankincense.” Ọ kpọrọ onye ọzụzụ atụrụ ahụ ka ọ “bata n’ubi ya a gbara ogige, wee rie mkpụrụ ya dị iche iche nke dị oké ọnụ ahịa.” Onye ọzụzụ atụrụ ahụ zara ya, sị: “Abatawo m n’ubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ nke m.” Ndị inyom Jeruselem sịrị ha abụọ: “Rienụ ihe ndị enyi m; ṅụọnụ ihe ọṅụṅụ, ee, ṅụjuonụ afọ unu ndị ihe unu na-atọ m ụtọ.”—Abụ nke Abụ 4:6, 16; 5:1.

Mgbe nwa agbọghọ Shulam ahụ kọsịịrị ụmụ agbọghọ na-arụ n’obí eze otu nrọ, ọ sịrị ha: “Onye ọrịa ịhụnanya na-arịa ka m bụ.” Ha jụrụ ya, sị: “Gịnị ka onye ihe ya na-atọ gị ụtọ bụ karịa onye ọzọ ihe ya na-atọ mmadụ ụtọ?” Ọ zara ha, sị: “Onye ihe ya na-atọ m ụtọ dị ọcha na-achakwa uhie uhie, onye e meworo ka ọ dị elu dị ka ọkọlọtọ karịa [puku mmadụ iri].” (Abụ nke Abụ 5:2-10) Ka Solomọn ji ọtụtụ okwu ụtọ na-eto nwa agbọghọ ahụ, o ji obi umeala zaghachi, sị: “Gịnị mere unu ga-eji lekwasị nwanyị Shulam anya?” (Abụ nke Abụ 6:4-13) Eze ahụ lere nke a anya dị ka ohere ọ ga-eji nweta ịhụnanya nwata nwanyị a, n’ihi ya, o tokwuru ya. Ma, nwata nwanyị ahụ nọgidere na-ahụ nwata nwoke ahụ na-azụ atụrụ n’anya. Solomọn mechaziri hapụ ya ka ọ laa.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

4:1; 6:5—N’ihi gịnị ka e ji jiri agịrị isi nwa agbọghọ ahụ tụnyere “ìgwè ewu”? Nke ahụ yiri ka ọ̀ na-egosi na agịrị isi ya dị ogologo ma na-eji oji ka ajị ewu.

4:11—Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site ‘n’egbugbere ọnụ nwa agbọghọ Shulam ahụ ịbụsị mmanụ aṅụ si n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ’ na ‘mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi ịdị n’okpuru ire ya’? Mmanụ aṅụ dị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ na-esi ísì ụtọ ma na-atọ ụtọ karịa mmanụ aṅụ ikuku barala. Iji mbụsị mmanụ aṅụ tụnyere egbugbere ọnụ nwa agbọghọ ahụ na ikwu na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi dị n’okpuru ire ya na-egosi nnọọ otú nwata nwanyị Shulam ahụ si ekwu okwu dị ụtọ ná ntị.

5:12—Olee ihe okwu ahụ bụ́ na “anya ya abụọ dị ka nduru n’akụkụ mmiri iyi; na-asa onwe ha n’ime mmiri ara ehi” pụtara? Nwa agbọghọ ahụ na-ekwu banyere anya mara mma nke onye ọ hụrụ n’anya. Ma eleghị anya, o ji abụ jiri nwa anya ya na-eji oji nke anya ọcha gbara gburugburu tụnyere nduru na-acha ntụ ntụ bụ́ ndị na-asa ahụ́ ná mmiri ara ehi.

5:14, 15—N’ihi gịnị ka e ji kọwaa aka na ụkwụ onye ọzụzụ atụrụ ahụ otú a? O doro anya na nwa agbọghọ ahụ na-ezo aka ná mkpịsị aka onye ọzụzụ atụrụ ahụ dị ka mgbaaka ọlaedo ma na-ezo aka ná mbọ ya dị ka beryl. O ji ụkwụ ya tụnyere “ogidi mabụl” n’ihi na ha siri ike ma maa mma.

6:4—N’ihi gịnị ka e ji jiri nwa agbọghọ ahụ tụnyere Tiaza? Jọshụa meriri obodo ndị Kenan a, mgbe oge Solomọn gasịkwara, ọ ghọrọ isi obodo mbụ nke alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu. (Joshua 12:7, 24; 1 Ndị Eze 16:5, 6, 8, 15) Otu akwụkwọ kwuru, sị: “O yiri ka obodo ahụ ọ̀ mara mma dị egwu, bụ́ ihe mere e ji kpọtụ ya aha ebe a.”

6:13—Gịnị bụ “otite egwú nke Mahanaim”? A pụkwara ịkpọ okwu a “otite egwú nke ọmụma ụlọikwuu abụọ.” Obodo nwe aha ahụ dị n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan n’ebe dịdebere ndagwurugwu mmiri iyi Jabọk. (Jenesis 32:2, 22; 2 Samuel 2:29) “Otite egwú nke ọmụma ụlọikwuu abụọ” pụrụ ịdị na-ezo aka n’otu ụdị egwu a na-agba n’obodo ahụ n’oge ememe.

7:4—Olee ihe mere Solomọn ji jiri olu nwa agbọghọ Shulam ahụ tụnyere “ụlọ elu nke ọdụ́”? E burula ụzọ too nwata nwanyị ahụ, sị: “Dị ka ụlọ elu Devid . . . otú a ka olu gị dị.” (Abụ nke Abụ 4:4) Ụdị ụlọ elu a na-ekwu okwu ya ebe a na-adị ogologo ma ghara ibu ibu, ọdụ́ na-akwọkwa mụrụmụrụ. Olu nwata nwanyị ahụ nke na-ebughị ibu ma kwọọ mụrụmụrụ masịrị Solomọn.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

4:1-7. Site na nwata nwanyị Shulam ahụ ịghara ikwe ka Solomọn rata ya, o gosiri na o nweghị àgwà ọjọọ, n’agbanyeghị na ọ bụ onye na-ezughị okè. N’ihi ya, àgwà ọma ya mere ka mma ya pụtakwuo ìhè. Otú ahụ ka ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịdị.

4:12. Dị ka ubi mara mma nke a gbara ogige ma ọ bụ nke nwere mgbidi gburugburu, bụ́ nke a pụrụ isi nanị n’ọnụ ụzọ a gbachiri agbachi banye na ya, nwa agbọghọ Shulam ahụ mere ka ịhụnanya ya dịrị nanị onye ọ gaje ịlụ n’ọdịnihu. Lee ka o si bụrụ ezi ihe nlereanya nye ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị bụ́ Ndị Kraịst na-alụbeghị di na nwunye!

“IRE ỌKỤ NKE JAA”

(Abụ nke Abụ 8:5-14)

Mgbe ụmụnne nwoke nke nwata nwanyị Shulam ahụ hụrụ ka ọ na-alọta, ha jụrụ, sị: “Ònye bụ nwanyị a nke na-esi n’ọzara arịgota, dabere n’ahụ́ onye ihe ya na-atọ ya ụtọ?” Tupu mgbe ahụ, otu n’ime ha sịrị: “Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, anyị ga-ewukwasị ya ụlọ elu nke ọlaọcha: ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ, anyị ga-eji ibo cedar mechibido ya.” Ugbu a e lerela ịhụnanya nwata nwanyị Shulam ahụ ule, ya egosikwa na ọ dịịrị nanị enyi ya nwoke, nwata nwanyị ahụ kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ mgbidi, ara m abụọ dịkwa ka ụlọ elu ya: mgbe ahụ adị m n’anya ya dị ka onye na-achọta udo.”—Abụ nke Abụ 8:5, 9, 10.

Ezi ịhụnanya bụ “ire ọkụ nke Jaa.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ịhụnanya dị otú ahụ sitere n’aka Jehova. Ọ bụ ya tinyere n’ime anyị ikike nke ịhụ n’anya. Ọ bụ ire ọkụ nke a na-apụghị imenyụ ọkụ ya emenyụ. Abụ nke Abụ gosiri n’ụzọ magburu onwe ya na ịhụnanya dị n’etiti nwoke na nwanyị nwere ike ịdị “ike [ịdịgide adịgide] dị ka ọnwụ.”—Abụ nke Abụ 8:6.

Abụ nke abụ nke Solomọn na-emekwa ka anyị ghọtakwuo ịhụnanya dị n’etiti Jizọs Kraịst na ndị so na “nwanyị [ọ] na-alụ ọhụrụ” n’eluigwe. (Mkpughe 21:2, 9) Ịhụnanya Jizọs hụrụ Ndị Kraịst e tere mmanụ karịrị ịhụnanya ọ bụla dị n’etiti nwoke na nwanyị. Ndị so n’òtù nwanyị ahụ ọ na-alụ ọhụrụ na-ekwesị nnọọ ntụkwasị obi nye ya. Ịhụnanya kpaliri Jizọs inye ndụ ya maka “atụrụ ọzọ” ahụ kwa. (Jọn 10:16) N’ihi ya, ndị nile na-efe Chineke ezi ofufe pụrụ iṅomi ịhụnanya na-adịgide adịgide nke nwata nwanyị Shulam ahụ na ikwesị ntụkwasị obi ya.

[Foto dị na peeji nke 18, 19]

Olee ihe Abụ nke Abụ na-akụziri anyị ka anyị chọọ n’onye anyị ga-alụ?