Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Juda Ọ̀ Nọgidere Na-atọgbọrọ n’Efu?

Juda Ọ̀ Nọgidere Na-atọgbọrọ n’Efu?

Juda Ọ̀ Nọgidere Na-atọgbọrọ n’Efu?

BIBLE buru amụma na ndị Babilọn ga-ebibi alaeze Juda, na ọ ga-nọgidekwa na-atọgbọrọ n’efu ruo mgbe ndị Juu a dọọrọ n’agha ga-alọghachi. (Jeremaịa 25:8-11) Ihe ga-akasị mee ka anyị kwere na amụma a mezuru bụ ihe e dere n’ike mmụọ nsọ ihe dị ka afọ 75 mgbe ìgwè mbụ nke ndị a dọọrọ n’agha gaa mba ọzọ lọghachisịrị n’ala nna ha. O kwuru na eze Babilọn ‘mere ndị fọdụrụ site ná mma agha ka ha jee biri na Babilọn; ha wee ghọọrọ ya, ghọọkwara ụmụ ya, ndị ohu ruo ọbụbụeze alaeze Peshia.’ A kọkwara banyere ala ahụ, sị: “Ụbọchị nile nke ntọgbọrọ n’efu ya ọ kwụsịrị ọrụ.” (2 Ihe E Mere 36:20, 21) È nwere ihe ochie ọ bụla e gwupụtara n’ala nke kwadoro nke a?

Ephraim Stern, bụ́ prọfesọ nke ihe ochie ndị Palestaịn na Mahadum Hibru kwuru n’akwụkwọ bụ́ Biblical Archaeology Review, sị: “Ma ndị Asiria ma ndị Babilọn bibiri ọtụtụ ebe n’Izrel oge ochie, ma ihe e gwupụtara n’ala mgbe nke ọ bụla ná mbibi abụọ ahụ gasịrị kọrọ akụkọ dị iche.” Ọ kọwara, sị: “Ndị Asiria bichiri nnọọ Palestaịn mgbe ha bibisịrị ya, ma ọ dịghị onye biri na Palestaịn ruo ogologo oge mgbe ndị Babilọn bibisịrị ya. . . . Ọ dịghị ihe anyị hụrụ na-egosi na ndị mmadụ biri na ya ruo mgbe ndị Peshia malitere ịchị ya . . . Ọ dịtụghị ihe gosiri na mmadụ bi ebe ahụ n’oge ahụ. N’oge ahụ nile, ọ dịghị otu obodo ndị Babilọn bibiri nke mmadụ birighachiri na ya.”

Prọfesọ Lawrence E. Stager nke Mahadum Harvard kwenyeere ya. O kwuru na “iwu [eze Babilọn] nyere ka e bibie ebe ndị ha lụrụ agha kpamkpam mere ka akụkụ ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan na Filistia nile, nakwa mgbe e mesịrị na Juda nile, tọgbọrọ n’efu.” Stager kwukwara, sị: “Ọ bụ nanị n’oge ọchịchị Saịrọs Onye Ukwu, bụ́ onye kwaturu Babilọn, ka ndị mmadụ maliteghachiri ibi . . . na Jeruselem na Juda, bụ́ mgbe ọtụtụ ndị Juu a dọọrọ n’agha lọghachiri n’ala nna ha.”

Ee, okwu Jehova nke bụ́ na Juda ga-atọgbọrọ n’efu mezuru. Ihe ọ bụla Jehova buru n’amụma na-emezurịrị. (Aịsaịa 55:10, 11) Anyị pụrụ ịtụkwasị Jehova na nkwa ya nile e dere n’Okwu ya bụ́ Bible obi anyị nile.—2 Timoti 3:16.