Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kụziere Ụmụ Gị Ịza Ajụjụ

Kụziere Ụmụ Gị Ịza Ajụjụ

Kụziere Ụmụ Gị Ịza Ajụjụ

PERLA bụ́ nwanyị bi na Mexico na-echeta na mgbe ya ka bụ obere nwa, nne ya na-enyere ya aka ịkwadebe azịza ndị dị nkenke ọ ga-aza n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ugbu a Perla nwere nwa nwoke dị afọ ise. Olee otú o si enyere ya aka? “Aghaghị m ibu ụzọ kwadoo. Mgbe m na-akwado, m na-achọpụta paragraf nke nwa m ga-enwe ike ịghọta, nke ọ ga-enwe ike iji okwu nke aka ya kọwaa. Anyị na-elekwasịzi anya n’ihe anyị na-akpọ ‘paragraf m.’ M na-agwa ya ka o jiri ihe ndị na-eme kwa ụbọchị kọwaa ya. Anyị na-amụgharịzi azịza ya ugboro ugboro. Ọ na-ejide ihe ha ka maịkrofon ka o nwee ike ịma otú ọ ga-esi eji ya mgbe ọ na-aza ajụjụ. Obi dị m ụtọ na ọ dịghị ọmụmụ ihe ọ na-anaghị aza ajụjụ na ya ma ọ bụ welie aka. Ọtụtụ mgbe, ọ na-agakwuru onye ga-eduzi ọmụmụ ihe tupu a malite ma gwa ya paragraf nke ọ ga-achọ ịza ajụjụ ya.”

Jens, bụ́ okenye nke na-eje ozi n’otu ìgwè na-asụ Hindi, nwere ụmụ nwoke abụọ, otu dị afọ abụọ, nke ọzọ dị afọ anọ. Mgbe ya na nwunye ya na ụmụ ha na-akwado ọmụmụ ihe, ha na-eji usoro Jens mụtara n’aka ndị mụrụ ya eme ihe. O kwuru, sị: “Anyị na-ekpebi ihe ụmụ anyị ga-aghọtali n’ihe a ga-amụ. Anyị na-agbalịzi ịkọwara ha isi ihe dị n’ihe ahụ a ga-amụ, mgbe anyị mesịrị nke ahụ, anyị na-ajụ ha ajụjụ ndị anyị bu n’uche ka ha zaa n’ọmụmụ ihe. Mgbe mgbe, ajụjụ ndị ha na-eji nnọọ okwu nke aka ha aza na-atụ anyị n’anya. Ihe ndị ha na-ekwu na-egosi nnọọ ihe ha ghọtara. N’ihi ya, azịza ha na-enye Jehova otuto ma bụrụ nkwupụta nke okwukwe ha.”