Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-anabata Ịdọ Aka ná Ntị Jehova Mgbe Nile

Na-anabata Ịdọ Aka ná Ntị Jehova Mgbe Nile

Na-anabata Ịdọ Aka ná Ntị Jehova Mgbe Nile

“Ajụla ịdọ aka ná ntị nke Jehova.”—ILU 3:11.

1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-anabata ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke?

EZE SOLOMỌN nke Izrel oge ochie gwara anyị ezi ihe mere onye nke ọ bụla n’ime anyị ga-eji na-anabata ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke. O kwuru, sị: “Nwa m, ajụla ịdọ aka ná ntị nke Jehova: ike agwụkwala gị n’ịba mba Ya: n’ihi na onye Jehova na-ahụ n’anya ka Ọ na-abara mba; ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.” (Ilu 3:11, 12) Ee, Nna gị nke eluigwe na-adọ gị aka ná ntị n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya.

2. Olee otú e si kọwaa “ịdọ aka ná ntị,” oleekwa otú a pụrụ isi dọọ mmadụ aka ná ntị?

2 “Ịdọ aka ná ntị” na-ezo aka n’ịba mba, mgbazi, ntụziaka, na ọzụzụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ dịghị ịdọ aka ná ntị ọ bụla na-eyi mgbe ahụ ka ọ bụ ihe ọṅụ, kama ihe mwute; ma n’ikpeazụ, nye ndị e jiworo ya zụọ, ọ na-amịrị ha mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11) Ịnabata ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke na ịgbaso ya pụrụ inyere gị aka ime ezi omume, ọ pụkwara ime ka ị bịarukwuo Chineke anyị dị nsọ, bụ́ Jehova, nso. (Abụ Ọma 99:5) E nwere ike ịgbazi anyị site n’aka ndị kwere ekwe ibe anyị, site n’ihe ndị anyị mụtara n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, nakwa site n’ihe anyị mụtara n’Okwu Chineke na n’akwụkwọ ndị sitere n’aka “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi.” (Luk 12:42-44) Lee ka i kwesịrị isi kelee Chineke mgbe e si otú ahụ gwa gị ebe i kwesịrị imeziwanye ihe! Ma olee ịdọ aka ná ntị ọ pụrụ ịdị mkpa ka e nye mmadụ ma ọ bụrụ na o mere mmehie dị oké njọ?

Ihe Mere E Ji Achụ Ụfọdụ Ndị n’Ọgbakọ

3. Olee mgbe a na-achụ mmadụ n’ọgbakọ?

3 Ndị ohu Chineke na-amụ Bible na akwụkwọ Ndị Kraịst. A na-akụziri ha ụkpụrụ Jehova n’ọmụmụ ihe na ná mgbakọ ha dị iche iche. N’ihi ya, Ndị Kraịst maara nnọọ ihe Jehova na-achọ n’aka ha. Nanị mgbe a na-achụ mmadụ n’ọgbakọ bụ mgbe mmadụ mere mmehie dị oké njọ n’enweghị nchegharị.

4, 5. Olee ihe atụ dị n’Akwụkwọ Nsọ a kọrọ n’ebe a banyere onye a chụrụ n’ọgbakọ, n’ihi gịnịkwa ka e ji gbaa ọgbakọ ume ịnabata nwoke ahụ?

4 Tụlee otu ihe atụ dị n’Akwụkwọ Nsọ banyere onye a chụrụ n’ọgbakọ. Ọgbakọ dị na Kọrint nabatara “ụdị ịkwa iko nke na-adịghị ọbụna n’etiti ndị mba ọzọ, na otu nwoke kpọọrọ nwunye nna ya.” Pọl gbara ndị Kọrint ume ka ha “nyefee nwoke dị otú ahụ n’aka Setan maka mbibi nke anụ ahụ́ ahụ, ka e wee chebe mmụọ ahụ.” (1 Ndị Kọrịnt 5:1-5) Mgbe a chụrụ nwoke ahụ n’ọgbakọ ma si otú ahụ nyefee ya n’aka Setan, onye mmehie ahụ laghachiri n’ụwa Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Ọchụchụ a chụrụ ya wepụrụ ọchịchọ anụ ahụ́ n’ọgbakọ ma mee ka “mmụọ,” ma ọ bụ àgwà kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke, dịgide n’ọgbakọ.—2 Timoti 4:22; 1 Ndị Kọrint 5:11-13.

5 Tupu ogologo oge agafee, Pọl gbara Ndị Kraịst nọ na Kọrint ume ka ha nabataghachi nwoke ahụ mere ihe ọjọọ. N’ihi gịnị? Onyeozi ahụ kwuru na ọ bụ ka “Setan wee ghara ịghọgbu” ha. O doro anya na nwoke ahụ mere ihe ọjọọ echegharịala ma malite ịkpa àgwà ọma. (2 Ndị Kọrint 2:8-11) Ọ bụrụ na ndị Kọrint ajụ ịnabata nwoke a chegharịrị echegharị, Setan ga-aghọgbu ha n’ọnọdụ na ha ga-abụ ndị obi ọjọọ na ndị na-adịghị agbaghara mmadụ dị ka Ekwensu chọrọ ka ha bụrụ. O yikwara nnọọ ka hà ‘gbaghaara ma kasie nwoke ahụ chegharịrị echegharị obi,’ n’oge na-adịghị anya.—2 Ndị Kọrịnt 2:5-7.

6. Olee uru ịchụ mmadụ n’ọgbakọ pụrụ ịba?

6 Olee uru ịchụ mmadụ n’ọgbakọ na-aba? Ọ na-ewepụ aha nsọ Jehova n’ụta ma chebe aha ọma nke ndị ya. (1 Pita 1:14-16) Ịchụpụ onye mmehie na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ bụ ịgbaso ụkpụrụ Chineke, ọ na-emekwa ka ọgbakọ nọgide na-adị ọcha n’anya Chineke. O nwekwara ike ime ka onye ahụ na-enweghị nchegharị ghọta onwe ya.

Ihe Dị Mkpa Bụ Nchegharị

7. Olee ihe mere Devid mgbe ọ na-ekwupụtaghị mmehie ya?

7 Ihe ka ọtụtụ ná ndị mere mmehie dị oké njọ na-echegharị nnọọ site n’obi ha, a naghịkwa achụ ha n’ọgbakọ. N’eziokwu, ọ naghị adị mfe igosi ezi nchegharị. Tụlee ihe banyere Eze Devid nke Izrel, bụ́ onye dere Abụ Ọma nke 32. Abụ ahụ gosiri na ruo oge ụfọdụ, Devid ekwupụtaghị mmehie dị oké njọ o mere, ma eleghị anya nke ahụ ya na Batsheba mere. Ihe si na ya pụta bụ na nchegbu o nwere n’ihi mmehie ya mere ka ọ gharazie inwe ume, dị nnọọ ka okpomọkụ ọkọchị na-amịkpọ osisi. Devid tara ahụhụ n’anụ ahụ́ na n’uche ya, ma mgbe o ‘kwupụtara mmehie ya, Jehova gbaghaara ya.’ (Abụ Ọma 32:3-5) Mgbe ahụ, Devid bụrụ abụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ mmadụ nke Jehova na-adịghị agụrụ ya ajọ omume.” (Abụ Ọma 32:1, 2) Lee ka inweta ebere Chineke si mee ka o nwere onwe ya!

8, 9. Olee otú e si egosipụta nchegharị, oleekwa otú ọ dịruru ná mkpa n’ihe banyere ịnabataghachi mmadụ n’ọgbakọ?

8 Ya mere, o doro anya na onye mmehie aghaghị ichegharị ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka e meere ya ebere. Otú ọ dị, ma ihere ma mmadụ ịtụ ụjọ na a ga-agbabọ ya adịghị nke bụ́ nchegharị. “Nchegharị” pụtara “mmadụ ịgbanwe obi ya” banyere ihe ọjọọ o mere, n’ihi na ọ kwara ụta banyere ya. Onye chegharịrị echegharị na-enwe “obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa,” ọ na-achọkwa ‘imezi ihe ọjọọ ahụ o mere’ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume.—Abụ Ọma 51:17; 2 Ndị Kọrint 7:11.

9 Nchegharị dị nnọọ mkpa n’ihe banyere ịnabata mmadụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. O nweghị oge a kpọrọ aha ọ ga-abụ onye a chụrụ n’ọgbakọ nọruhaala, a nabata ya. Tupu a nabata ya, ọ ghaghị ịgbanwe nnọọ obi ya. Ọ ghaghị ịmata ókè mmehie ya dịruru ná njọ na aha ọjọọ o wetaara Jehova na ọgbakọ. Onye mmehie ahụ aghaghị ichegharị, kpesie ekpere ike maka mgbaghara, ma mee ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke. Mgbe ọ na-arịọ ka a nabataghachi ya, e kwesịrị ịhụ ihe àmà na-egosi na o chegharịala ma na-arụ “ọrụ kwesịrị nchegharị.”—Ọrụ 26:20.

N’ihi Gịnị Ka Mmadụ Ga-eji Kwupụta Mmehie Ya?

10, 11. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji gbalịa ikpuchi nnọọ mmehie anyị?

10 Ụfọdụ ndị mere mmehie nwere ike iche, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ agwa mmadụ ihe m mere, a ga-abịa jụwa m ajụjụ ndị na-eme ihere, e nwekwara ike chụọ m n’ọgbakọ. Ma ọ bụrụ na mụ emechie ọnụ m, m nwere ike izere ya, ọ dịghịkwa onye nọ n’ọgbakọ ga-amanụ.’ Echiche dị otú ahụ na-egosi na ọ dị ihe ụfọdụ dị mkpa onye ahụ chefuru. Gịnị ka ha bụ?

11 Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [otu puku] ọtụtụ ugboro ebere, Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-adọ ndị ya aka ná ntị “n’ikpe,” [ma ọ bụ, “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị”]. (Ọpụpụ 34:6, 7; Jeremaịa 30:11) Ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ, olee otú Chineke ga-esi meere gị ebere ma ị chọwa otú i si ezochi mmehie gị? Jehova maara mmehie ahụ, ọ naghịkwa eleghara ajọ omume anya otú ahụ.—Ilu 15:3; Habakuk 1:13.

12, 13. Gịnị pụrụ ime mgbe mmadụ na-agbalị ikpuchi mmehie ya?

12 Ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ, ikwupụta ya pụrụ inyere gị aka inwetaghachi ezi akọnuche. (1 Timoti 1:18-20) Ma ịghara ikwupụta ya nwere ike imerụ akọnuche gị ma duga gị n’ime mmehie ndị ọzọ. Cheta na ọ bụghị nanị mmadụ ma ọ bụ ọgbakọ ka i mehiere. Ọ bụ Chineke ka i mehiere. Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Jehova, n’eluigwe ka ocheeze Ya dị; anya Ya na-ahụ, mbubere anya Ya na-anwa, ụmụ mmadụ. Jehova na-anwa onye ezi omume.”—Abụ Ọma 11:4, 5.

13 Jehova agaghị agọzi onye ọ bụla kpuchiri mmehie dị oké njọ o mere ma nwaa ịnọgide n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị ọcha. (Jems 4:6) N’ihi ya, ọ bụrụ na i mere mmehie ma chọọ ime ezi ihe, egbula oge iji obi gị nile kwupụta ya. Ma ọ́ bụghị ya, obi gị ga na-ama gị ikpe, karịsịa mgbe ị gụrụ ma ọ bụ nụ mgbe a na-enye ndụmọdụ metụtara mmehie ndị dị otú ahụ dị oké njọ. Gịnị ma ọ bụrụ na Jehova anara gị mmụọ nsọ ya, otú ahụ ọ naara ya Eze Sọl? (1 Samuel 16:14) Mgbe Chineke naara gị mmụọ nsọ ya, i nwere ike ime mmehie ndị ọzọ dị oké njọ.

Tụkwasị Ụmụnna Gị Kwesịrị Ntụkwasị Obi Obi

14. N’ihi gịnị ka onye mere mmehie kwesịrị iji gbasoo ndụmọdụ ahụ dị na Jems 5:14, 15?

14 N’ihi ya, gịnị ka onye mmehie chegharịrị echegharị kwesịrị ime? “Ka ọ kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere, na-ete ya mmanụ n’aha Jehova. Ekpere nke okwukwe ga-emekwa ka ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma, Jehova ga-emekwa ka o bilie.” (Jems 5:14, 15) Ịkọrọ ya ndị okenye bụ otu ụzọ mmadụ si ‘amị mkpụrụ kwesịrị nchegharị.’ (Matiu 3:8) Ndị ikom a na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-ahụ n’anya ‘ga-ekpere ya ekpere ma tee ya mmanụ n’aha Jehova.’ Dị ka mmanụ na-akụjụ ahụ́, ndụmọdụ ha ga-esi na Bible nye ga-akasi onye mmehie ọ bụla chegharịrị nnọọ echegharị obi.—Jeremaịa 8:22.

15, 16. Olee otú Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye si agbaso ihe nlereanya Chineke setịpụụrụ anyị, bụ́ nke e dere n’Ezikiel 34:15, 16?

15 Lee nnọọ ezi ihe nlereanya Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị bụ́ Jehova ji ịhụnanya setịpụrụ anyị mgbe ọ tọhapụrụ ndị Juu a dọọrọ n’agha gaa na Babilọn n’afọ 537 T.O.A. na mgbe ọ napụtara Izrel nke Chineke pụọ na “Babịlọn Ukwu ahụ” n’afọ 1919 O.A.! (Mkpughe 17:3-5; Ndị Galeshia 6:16) O si otú ahụ mezuo nkwa ya nke bụ́: “Mụ onwe m ga-azụ ìgwè ewu na atụrụ nke m, Mụ onwe m ga-emekwa ka ha makpuo amakpuo . . . Nke furu efu ka M ga-achọ, ọ bụkwa nke a chụfuru achụfu ka M ga-ewelata, ọkpụkpụ a gbajiri agbaji ka M ga-ekezikwa, nke ahụ́ ya na-adịghị ike ka M ga-emekwa ka ọ dị ike.”—Ezikiel 34:15, 16.

16 Jehova nyere atụrụ ihe atụ ya nri, mee ka ha makpuru n’atụghị egwu ihe ọjọọ ọ bụla, ma chọọ ndị nke furu efu. N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ nnọọ na ha ji Okwu Chineke na-enyeju atụrụ Ya afọ ma hụ na ọ dịghị ihe mere ha. Ndị okenye na-achọ atụrụ ndị si n’ọgbakọ kpafuo. Dị nnọọ ka Chineke ‘keziri ọkpụkpụ atụrụ gbajiri agbaji,’ ndị okenye ‘na-ekezi’ atụrụ ndị okwu onye ọzọ gwara ha ma ọ bụ ihe ha onwe ha mere merụrụ ahụ́. Otú ahụ Chineke sikwa mee ka ‘atụrụ ahụ́ na-adịghị ike dị ike,’ otú ahụ ka ndị okenye si enyere ndị mmekọrịta ha na Chineke na-esikwaghị ike, ma eleghị anya n’ihi ihe ọjọọ ha mere, aka.

Otú Ndị Ọzụzụ Atụrụ Si Enye Aka

17. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji laa azụ ịchọ enyemaka ndị okenye ga-esi n’Akwụkwọ Nsọ nye anyị?

17 Ndị okenye na-eji obi ụtọ agbaso ndụmọdụ a bụ́: “Nọgidenụ na-emere ndị [mmadụ] ebere, na-eme otú ahụ n’egwu.” (Jud 23) Ụfọdụ Ndị Kraịst emewo mmehie dị oké njọ site n’ịkwa iko. Ma ọ bụrụ n’ezie na ha echegharịala, obi pụrụ isi ha ike na ndị okenye dị njikere iji ịhụnanya na obi ebere mesoo ha ihe ma nyere ha aka ime ka ha na Chineke dịghachi ná mma. Pọl gụnyere onwe ya mgbe o kwuru banyere ndị ikom dị otú ahụ, sị: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nna ukwu n’ebe okwukwe unu dị, kama anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu.” (2 Ndị Kọrint 1:24) N’ihi ya, ya adịla mgbe ị ga-ala azụ ịchọ enyemaka ha ga-esi n’Akwụkwọ Nsọ nye gị.

18. Olee otú ndị okenye si emeso ndị kwere ekwe ibe ha mere ihe ọjọọ ihe?

18 Ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ, n’ihi gịnị ka ị pụrụ iji nwee obi ike na ndị okenye ga-enyere gị aka? Ọrụ bụ́ isi ha na-arụ bụ ịzụ atụrụ Chineke. (1 Pita 5:1-4) Ọ dịghị onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya ga-eti atụrụ dị nwayọọ nke na-ebe ákwá ihe maka imerụ onwe ya ahụ́. N’ihi ya, mgbe ndị okenye na-emeso ndị kwere ekwe ibe ha mere ihe ọjọọ ihe, ihe ha na-eme abụghị ịta ha ahụhụ kwesịrị mpụ ha mere, kama ọ bụ inyere ndị ahụ mere mmehie aka ka ha na Chineke dịghachi ná mma ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume. (Jems 5:13-20) Ndị okenye aghaghị ikpe ikpe n’ezi omume ma ‘na-emeso ìgwè atụrụ ahụ ihe n’ụzọ dị nro.’ (Ọrụ 20:29, 30; Aịsaịa 32:1, 2) Dị ka Ndị Kraịst nile ọzọ, ndị okenye ‘ga-eme ihe e kpere n’ikpe, hụ ebere n’anya, ma jiri obi umeala soro Chineke ha na-eje ije.’ (Maịka 6:8) Àgwà ndị dị otú ahụ dị mkpa mgbe ha na-eme mkpebi ndị metụtara ndụ na ozi dị nsọ nke “ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ [Jehova].”—Abụ Ọma 100:3.

19. Olee mmụọ ndị okenye na-eji agbalị ịgbazigharị mmadụ?

19 E ji mmụọ nsọ họpụta Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ, ha na-agbalịsikwa ike ịhụ na ọ na-edu ha. Ọ bụrụ na “mmadụ azọhie ụkwụ tupu ya amara banyere ya”—dị ka à ga-asị na ihe mere ya na mberede—ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ ga-agbalị “ịgbazigharị onye dị otú ahụ na mmụọ nke ịdị nwayọọ.” (Ndị Galeshia 6:1; Ọrụ 20:28) Ndị okenye na-eji obiọma agbazi echiche ya ma kwụsie ike n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ka ha na-eme nke ahụ, dị nnọọ ka onye na-agba ọkpụkpụ nke na-echebara mmadụ echiche na-eji nnọọ nlezianya agbazi ọkpụkpụ gbajiri agbaji iji zere ịkpatara onye ahụ merụrụ ahụ́ ahụ́ ụfụ na-ekwesịghị ekwesị, ma gbaziekwa ọkpụkpụ ahụ. (Ndị Kọlọsi 3:12) Ebe ọ bụ na ebere ọ bụla ndị okenye ga-emere onye ahụ ga-adabere n’ekpere na n’Akwụkwọ Nsọ, mkpebi ha ga-eme ga-ekwekọ n’uche Chineke.—Matiu 18:18.

20. Olee mgbe ọ pụrụ ịdị mkpa ka a maara ọgbakọ ọkwa na a dọọla mmadụ aka ná ntị?

20 Ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ maara banyere mmehie ahụ ma ọ bụ ya abụrụ na ọ ga-emesịrịrị pụta ìhè, o yikarịrị ka ọ̀ ga-ekwesị ekwesị ịmara ọgbakọ ọkwa iji chebe aha ọma ya. A ga-amakwa ya n’ọkwa ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka ọgbakọ mara banyere ya. N’oge onye ahụ òtù ikpe dọrọ aka ná ntị ka na-enwetaghachi onwe ya, a pụrụ iji ya tụnyere onye merụrụ ahụ́ nke na-agbake agbake, bụ́ nke ga-egbochi ya ime ihe ụfọdụ ruo nwa oge. Ruo oge ụfọdụ, o yiri nnọọ ka ọ̀ ga-abara onye ahụ chegharịrị echegharị uru ịṅa ntị n’ọmụmụ ihe kama ịza ajụjụ. Ndị okenye nwere ike ime ndokwa ka otu onye duziere ya ọmụmụ Bible iji wusie ya ike n’ebe ọ na-adịghị ike, ka o wee ‘dịghachi ike n’okwukwe.’ (Taịtọs 2:2) A na-eme ihe nile a n’ịhụnanya ọ bụghị iji taa onye ahụ mere ihe ọjọọ ahụhụ.

21. Olee otú a pụrụ isi lebara mmehie ụfọdụ e mere anya?

21 Ndị okenye pụrụ inyere ụmụnna ha aka n’ụzọ dị iche iche n’ofufe ha na-efe Chineke. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwanna na-aṅubu oké mmanya ṅụbigara mmanya ókè otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ mgbe nanị ya nọ n’ụlọ. Ma ọ bụ ya abụrụ na onye kwụsịrịla ise siga ogologo oge gara aga sere siga mgbe nanị ya nọ otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ mgbe ọ na-ejidelighị onwe ya. Ọ bụ ezie na o kpeela ekpere ma kweta na Chineke agbagharala ya, o kwesịrị ịkọrọ ya otu okenye ka o nyere ya aka iji mee ka mmehie dị otú ahụ ghara ịma ya ahụ́. Otu okenye ma o bụ ndị okenye abụọ pụrụ ịhụ maka okwu ahụ. Otú ọ dị, okenye ahụ ma ọ bụ ndị okenye ahụ ga-akọrọ ya onyeisi oche ndị nlekọta, ebe ọ bụ na o nwere ike inwe ihe ndị ọzọ o metụtara.

Nọgide Na-anabata Ịdọ Aka ná Ntị Sitere n’Aka Chineke

22, 23. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji nọgide na-anabata ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke?

22 Iji bụrụ onye Chineke gọziri, Onye Kraịst nke ọ bụla aghaghị ịnabata ịdọ aka ná ntị Jehova. (1 Timoti 5:20) N’ihi ya, tinye mgbazi ọ bụla i nwetara mgbe ị na-amụ Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ Ndị Kraịst ma ọ bụ ndụmọdụ ndị e nyere n’ọmụmụ ihe, na ná mgbakọ dị iche iche nke ndị Jehova, n’ọrụ. Mụrụ anya iji na-eme uche Jehova mgbe nile. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke ga-enyere gị aka ichebe mmekọrịta gị na ya site n’igbochi gị ime mmehie.

23 Ịnabata ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke ga-enyere gị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na a chụọla ụfọdụ ndị n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ma nke ahụ agaghị eme gị ma ọ bụrụ na i “chebe obi gị” ma ‘jee ije dị ka onye maara ihe.’ (Ilu 4:23; Ndị Efesọs 5:15) Otú ọ dị, ọ bụrụ na a chụrụ gị n’ọgbakọ ugbu a, rụọnụ ọrụ iji mee ka a nabata gị. Chineke chọrọ ka ndị nile raarala onwe ha nye ya fee ya n’ikwesị ntụkwasị obi na “n’obi ụtọ.” (Deuterọnọmi 28:47) Ị pụrụ ime nke ahụ ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụrụ na ị na-anabata ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Jehova mgbe nile.—Abụ Ọma 100:2.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka e ji achụ ụfọdụ ndị n’ọgbakọ Ndị Kraịst?

• Gịnị ka ezi nchegharị gụnyere?

• N’ihi gịnị ka e kwesịrị iji kwupụta mmehie dị oké njọ?

• Olee ụzọ dị iche iche ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst si enyere ndị mmehie chegharịrị echegharị aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

N’ihi gịnị ka Pọl onyeozi ji nye ndị Kọrint ntụziaka banyere ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ?

[Foto dị na peeji nke 29]

Dị nnọọ ka ndị ọzụzụ atụrụ nke oge ochie, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ‘na-ekezi’ ụkwụ nke atụrụ Chineke merụrụ ahụ́