Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Mata Onye ahụ Na-emegide Kraịst

A Mata Onye ahụ Na-emegide Kraịst

A Mata Onye ahụ Na-emegide Kraịst

OLEE otú ị ga-esi chebe onwe gị ma ọ bụrụ na ị mata na ọrịa na-efe efe na-akpa mkpamkpa n’ebe i bi? Eleghị anya ị ga-enye ahụ́ gị ihe dị ya mkpa iji lụsoo ọrịa ahụ ọgụ ma zere ndị buterela ọrịa ahụ. Anyị aghaghị ime nke ahụ n’ụzọ ime mmụọ. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na onye ahụ na-emegide Kraịst “nọrịị anọ n’ụwa.” (1 Jọn 4:3) Ọ bụrụ na anyị achọghị ibute “ọrịa” anyị aghaghị ịmata “ndị bu ọrịa,” ma zere ha. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Bible kọwara okwu ahụ n’ụzọ doro anya.

N’ụzọ sara mbara, okwu ahụ bụ́ “onye na-emegide Kraịst” na-ezo aka ná ndị nile na-emegide Kraịst ma ọ bụ ndị nile na-azọrọ na ha bụ Kraịst ma ọ bụ na ha na-anọchite anya ya. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m [ma ọ bụ, bụ onye na-emegide Kraịst], onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta na-ekposa ekposa.”—Luk 11:23.

N’ezie, Jọn dere banyere onye ahụ na-emegide Kraịst ihe karịrị iri afọ isii ka Jizọs nwụsịrị, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ gaa n’eluigwe. N’ihi ya, ihe a ga-eji mata ọrụ nke ndị ahụ na-emegide Kraịst bụ otú ọrụ ha si emetụta ụmụazụ Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ụwa.—Matiu 25:40, 45.

Onye ahụ Na-emegide Kraịst Na-emegide Ndị Kraịst

Jizọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị na ụwa n’ozuzu ga-akpọ ha asị. O kwuru, sị: “Ndị mmadụ ga-enyefe unu ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu, mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m. Ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-ebilikwa wee duhie ọtụtụ ndị.”—Matiu 24:9, 11.

Ebe ọ bụ na a na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs “n’ihi aha [Jizọs],” nke ahụ pụtara nnọọ na ndị ahụ na-akpagbu ha bụ ndị na-emegide Kraịst. “Ndị amụma ụgha” ahụ, ndị ụfọdụ n’ime ha bụbu Ndị Kraịst, sokwa ná ndị ahụ na-emegide Kraịst. (2 Jọn 7) Jọn dere, sị: ‘Ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst si n’ebe anyị nọ pụọ, ma ha abụghị ụdị anyị; n’ihi na a sị na ha bụrịị ụdị anyị, ha gaara eso anyị nọgide.’—1 Jọn 2:18, 19.

Ma ihe Jizọs kwuru ma nke Jọn kwuru mere nnọọ ka o doo anya na onye ahụ na-emegide Kraịst abụghị otu onye kama ọ bụ ọtụtụ ndị mejupụtara ya. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ha bụ ndị amụma ụgha, otu n’ime ihe ndị ha ji eme ihe bụ nkụzi ụgha nke okpukpe na-akụzi. Olee ụzọ ụfọdụ ha si eduhie ndị mmadụ?

Ịgbasa Ụgha nke Okpukpe Na-akụzi

Pọl onyeozi dọrọ onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti aka ná ntị ka o zere ozizi ndị dapụrụ n’ezi ofufe bụ́ nke ndị dị ka Haịmeniọs na Faịlitọs na-akụzi, bụ́ ndị “okwu ha ga-agbasakwa dị ka ure anụ ahụ́.” Pọl gbakwụnyere, sị: “Ndị a kpọmkwem ewezụgawo onwe ha n’eziokwu ahụ, na-asị na mbilite n’ọnwụ ewereworị ọnọdụ; ha na-ekpukwa okwukwe nke ụfọdụ ndị ihu.” (2 Timoti 2:16-18) O yiri ka ihe Haịmeniọs na Faịlitọs kụziri bụ na mbilite n’ọnwụ bụ n’ụzọ ihe atụ nakwa na a kpọlitelarịị Ndị Kraịst n’ọnwụ n’ụzọ ime mmụọ. N’eziokwu, Chineke na-ele onye ghọrọ ezi Onye Kraịst anya dị ka onye e mere ka ọ dịghachi ndụ, bụ́ ihe ọbụna Pọl n’onwe ya mere ka o doo anya. (Ndị Efesọs 2:1-5) Ka o sina dị, ihe Haịmeniọs na Faịlitọs kụziri megidere nkwa ahụ Jizọs kwere banyere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’ụzọ nkịtị n’oge ọchịchị Alaeze Chineke.—Jọn 5:28, 29.

Ọ bụ òtù kweere na ihe ọ bụla na-abụghị ihe ime mmụọ bụ ihe ọjọọ mesịrị wepụta echiche bụ́ na mbilite n’ọnwụ bụ nanị n’ụzọ ihe atụ. N’ikwere na a pụrụ inweta ihe ọmụma (bụ́ nke a na-akpọ gnoʹsis n’asụsụ Grik) site n’ụzọ ihe omimi, ha gwakọtara Iso Ụzọ Kraịst ụgha na ihe ọmụma ndị Grik na ihe omimi nke ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Dị ka ihe atụ, ha kweere na ihe nile bụ́ ihe anụ ahụ́ bụ ihe ọjọọ, n’ihi nke ahụkwa, ha sịrị na Jizọs abịaghị n’anụ ahụ́ kama o yiri ka o nwere ahụ́ mmadụ. Dị ka anyị hụrụla, nke a bụ kpọmkwem ihe Jọn onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị megide.—1 Jọn 4:2, 3; 2 Jọn 7.

Ụgha ọzọ a kụziri ka ọtụtụ narị afọ gasịrị bụ ozizi a na-akpọ Atọ n’Ime Otu, bụ́ nke na-ekwu na Jizọs bụ ma Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ma Ọkpara Chineke. N’akwụkwọ ya na-akọ banyere chọọchị e nwere na narị afọ atọ mbụ, Dr. Alvan Lamson kwuru na ozizi Atọ n’Ime Otu “adịghịdị n’ime Akwụkwọ Nsọ ndị Juu na nke Ndị Kraịst; o sitere n’aka ndị Nna na-agbaso ozizi Plato, bụ́ ndị malitere izi ya ma webata ya n’Iso Ụzọ Kraịst.” Ole ndị bụ “ndị Nna na-agbaso ozizi Plato”? Ha bụ ndị ụkọchukwu si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị ozizi nke ọkà ihe ọmụma Grik na-agọ mmụọ bụ́ Plato dọọrọ nnọọ mmasị ha.

Iwebata ozizi Atọ n’Ime Otu n’Iso Ụzọ Kraịst bụ ihe kasị njọ onye ahụ na-emegide Kraịst mere n’ihi na o mere ka ihe banyere Chineke dịrị mgbagwoju anya, meekwa ka a ghara ịmata ọdịiche dị n’etiti Chineke na Ọkpara Ya. (Jọn 14:28; 15:10; Ndị Kọlọsi 1:15) Cheedị nnọọ echiche, olee otú mmadụ pụrụ isi ‘bịaruo Chineke nso’ dị ka Akwụkwọ Nsọ gbara anyị ume ka anyị mee ma ọ bụrụ na Chineke bụ ihe omimi?—Jems 4:8.

Iji mekwuo ka ndị mmadụ nọrọ ná mgbagwoju anya n’ihe banyere Chineke, ọtụtụ ndị nsụgharị wepụrụ aha Chineke, bụ́ Jehova, ná nsụgharị Bible ha n’agbanyeghị na aha ahụ pụtara ihe karịrị ugboro puku asaa n’ihe odide mbụ! O doro nnọọ anya na ịgbalị ime ka Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ghọọ ihe omimi, nke kakwa njọ ka ọ ghọọ ihe omimi na-enweghị aha bụ nnọọ ịkparị Onye Okike anyị na Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ. (Mkpughe 22:18, 19) Ọzọkwa, iji utu aha ndị dị ka Onyenwe anyị na Chineke dochie anya aha ya bụ ime ihe megidere ekpere nlereanya Jizọs, bụ́ nke na-ekwu ná mgbubiri, sị: “Ka e doo aha gị nsọ.”—Matiu 6:9.

Ndị Na-emegide Kraịst Ajụ Alaeze Chineke

Ndị ahụ na-emegide Kraịst na-akpa ike karịsịa “n’ụbọchị ikpeazụ,” nke bụ́ oge a anyị bi na ya. (2 Timoti 3:1) Nzube bụ́ isi nke ndị nduhie a e nwere n’oge a bụ imegharị ndị mmadụ anya ka ha ghara ịma ọrụ Jizọs na-arụ dị ka Eze nke Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị eluigwe nke ga-achị ụwa nile n’oge na-adịghị anya.—Daniel 7:13, 14; Mkpughe 11:15.

Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ndú okpukpe na-akụzi na Alaeze Chineke dị n’obi mmadụ, bụ́ echiche na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ. (Daniel 2:44) Ndị ọzọ na-akụzi na Kraịst ji ọchịchị na òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ na-arụ ọrụ. Ma, Jizọs kwuru, sị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a.” (Jọn 18:36) N’ezie, ọ bụ Setan ọ bụghị Kraịst bụ “onye na-achị ụwa” na “chi nke usoro ihe a.” (Jọn 14:30; 2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ bụ nke a mere Jizọs ga-eji kpochapụ ọchịchị ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya, nanị ya achịwazie ụwa. (Abụ Ọma 2:2, 6-9; Mkpughe 19:11-21) Ndị mmadụ na-ekpe ekpere ka nke a mee mgbe ha na-ekwughachi Ekpere Onyenwe Anyị ahụ, na-asị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa.”—Matiu 6:10.

Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-etinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa, ha na-emegide, ọbụnakwa na-akpagbu ndị na-akpọsa eziokwu banyere Alaeze Chineke. N’ụzọ na-akpali akpali, akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe kwuru banyere nwanyị akwụna ihe atụ—“Babilọn Ukwuu ahụ”—bụ onye ‘ọbara nke ndị nsọ na ọbara nke ndị àmà Jizọs na-egbu dị ka mmanya.’ (Mkpughe 17:4-6) Ọ na-akwakwa iko ime mmụọ site n’ịkwado “ndị eze” nke ụwa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma na-enweta ihu ọma ha. Ọ dịghị ndị ọzọ nwanyị ihe atụ a nọchiri anya ha ma ọ bụghị okpukpe ụgha ndị dị n’ụwa. Ọ bụ ya bụ akụkụ bụ́ isi nke onye ahụ na-emegide Kraịst.—Mkpughe 18:2, 3; Jems 4:4.

Onye ahụ Na-emegide Kraịst ‘Na-eme Ka Ntị Na-akọ Ọkọ’

E wezụga ịjụ eziokwu Bible, ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst ajụla ụkpụrụ omume ndị dị na Bible ma nakwere echiche ọtụtụ ndị nwere banyere omume. Okwu Chineke buru amụma na nke a ga-eme mgbe o kwuru, sị: “A ga-enwe oge mgbe ha [ndị na-azọrọ na ha na-ejere Chineke ozi] na-agaghị anagide ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha, ha ga-akpọkọjuru onwe ha ndị ozizi iji mee ka ntị ha na-akọ ha ọkọ.” (2 Timoti 4:3) A kpọkwara ndị okpukpe a na-eduhie ndị mmadụ “ndịozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, na-enwogha onwe ha ịbụ ndịozi nke Kraịst.” Bible gara n’ihu ikwu, sị: “Ọgwụgwụ ha ga-abụ dị ka ọrụ ha si dị.”—2 Ndị Kọrint 11:13-15.

Ọrụ ndị a gụnyere “omume rụrụ arụ,” nke bụ́ iji nkamanya leghara ụkpụrụ omume ndị dị elu anya. (2 Pita 2:1-3, 12-14) Ọ̀ bụ na anyị adịghị ahụ ka ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị ndú okpukpe na ụmụazụ ha na-etinye aka—ma ọ dịghị ihe ọzọ na-agbachi nkịtị—n’omume ndị na-ekwesịghịrị Ndị Kraịst, dị ka nwoke idina nwoke ibe ya na nwanyị idina nwanyị ibe ya na ịkwa iko? Biko wepụta oge tụlee echiche ndị a ọtụtụ ndị nakweere na ụzọ ha si ebi ndụ na ihe Bible kwuru na Levitikọs 18:22; Ndị Rom 1:26, 27; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Hibru 13:4; na Jud 7.

“Nwaleenụ Okwu Ndị Sitere ná Mkpali nke Mmụọ”

N’ihi ihe ndị a e kwurula, anyị kwesịrị ige ntị n’ihe ahụ Jọn onyeozi kwuru ka anyị ghara iwere ozizi okpukpe anyị na-akụzi dị ka ihe na-enweghị ihe o mere. Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu ekwerela okwu nile sitere ná mkpali nke mmụọ, kama nwaleenụ okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ ịhụ ma hà sitere na Chineke, n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abawo n’ime ụwa.”—1 Jọn 4:1.

Tụlee ezigbo ihe nlereanya nke ụfọdụ ndị nwere “obi sara mbara” bụ́ ndị bi na Biria na narị afọ mbụ. Ha “ji ọchịchọ obi siri nnọọ ike nabata okwu ahụ, jiri nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a [Pọl na Saịlas kwuru] hà dị otú ahụ.” (Ọrụ 17:10, 11) Ọ bụ ezie na ha nwere ọchịchọ nke ịmụ ihe, ndị Biria mere ihe iji jide n’aka na ihe ha nụrụ ma nakwere gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’Akwụkwọ Nsọ.

Taakwa, ezi Ndị Kraịst adịghị ekwe ka echiche na-agbanwe agbanwe nke ọtụtụ ndị nwere banyere omume megharịa ha anya, kama nke ahụ, ha na-agbasosi eziokwu dị na Bible ike. Pọl onyeozi dere, sị: “Nke a bụkwa ihe m nọgidere na-ekpe n’ekpere, ka ịhụnanya unu wee na-amụbawanye n’ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu.”Ndị Filipaị 1:9.

Mee ka ihe mgbaru ọsọ gị bụrụ inweta ‘ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu’ site n’ịmụ ihe Bible na-akụzi n’ezie ma ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ. A naghị eji “okwu nrafu” nke ndị na-emegide Kraịst eduhie ndị na-eṅomi ndị Biria. (2 Pita 2:3) Kama iduhie ha, eziokwu Bible nke na-akụzi banyere ezi Kraịst ahụ na ezigbo ụmụazụ ya na-eme ka ha pụọ n’ohu.—Jọn 8:32, 36.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

IHE BIBLE KWURU BANYERE ONYE AHỤ NA-EMEGIDE KRAỊST

“Ụmụntakịrị, ọ bụ awa ikpeazụ [ihe ama na-egosi na nke a na-ezo aka n’ọgwụgwụ nke oge ndịozi], dịkwa nnọọ ka unu nụrụ na onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọbụna ugbu a e nwewo ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst.”1 Jọn 2:18.

“Ònye bụ onye ụgha ahụ ma ọ bụghị onye nke na-agọnarị na Jizọs bụ Kraịst ahụ? Nke a bụ onye na-emegide Kraịst, onye ahụ nke na-agọnarị Nna ahụ na Ọkpara ya.”1 Jọn 2:22.

“Okwu ọ bụla sitere ná mkpali nke mmụọ nke na-adịghị ekwupụta Jizọs esiteghị na Chineke. Ọzọkwa, nke a bụ okwu sitere ná mkpali nke mmụọ nke onye ahụ na-emegide Kraịst bụ́ onye unu nụworo na ọ na-abịa, ugbu a kwa ọ nọrịị anọ n’ụwa.”1 Jọn 4:3.

“Ọtụtụ ndị nduhie abawo n’ụwa, bụ́ ndị na-adịghị ekwupụta Jizọs Kraịst dị ka onye bịara n’anụ ahụ́. Nke a bụ onye nduhie ahụ na onye ahụ na-emegide Kraịst.”2 Jọn 7.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 5]

ONYE NDUHIE NKE ỌTỤTỤ NDỊ MEJUPỤTARA

Okwu ahụ bụ́ “onye na-emegide Kraịst” na-ezo aka ná ndị nile jụrụ ihe Bible kwuru banyere Jizọs Kraịst, ndị nile na-emegide Alaeze ya, na ndị nile na-emeso ụmụazụ ya mmeso ọjọọ. Ọ gụnyekwara ndị mmadụ n’otu n’otu, òtù dị iche iche na mba nile na-azọrọ na ha na-anọchite anya Kraịst ma ọ bụ ndị nile na-akụrụ ọrụ ndị Mezaịa ahụ ga-arụ site n’iji mpako na-ekwe nkwa ndị ọ bụ nanị Kraịst ga-emezuli—iweta ezi udo na ntụkwasị obi.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Augustine: ©SuperStock/age fotostock

[Foto dị na peeji nke 7]

Dị ka ndị Biria, anyị kwesịrị ịdị “na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị”