Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Otú Jizọs si gwa nne ya okwu n’oriri agbamakwụkwọ ahụ e mere na Kena ò gosiri na Jizọs adịghị akwanyere nne ya ùgwù ma ọ bụ na ọ na-akparị nne ya?—Jọn 2:4.

Obere oge ka e mesịrị Jizọs baptizim, a kpọrọ ya na ndị na-eso ụzọ ya oku ịbịa oriri agbamakwụkwọ e nwere na Kena. Nne ya bịakwara ememe ahụ. Mgbe mmanya ha gwụrụ, Meri gwara Jizọs, sị: “Ha enweghị mmanya.” Jizọs zaghachiri nne ya, sị: “Nwanyị, gịnị ka mụ na gị nwekọrọ? Oge awa m erubeghị.”—Jọn 2:1-4.

Taa, a pụrụ ile onye kpọrọ nne ya “nwanyị” ma kwuo, sị, “gịnị ka mụ na gị nwekọrọ?” anya dị ka onye na-adịghị asọpụrụ mmadụ, nakwa onye na-akparị mmadụ. Ma onye sịrị na Jizọs adịghị asọpụrụ nne ya aghọtaghị ọdịnala ndị Juu na asụsụ e ji dekọọ ihe ahụ merenụ. Ịghọta otú e si eji okwu ndị a eme ihe n’oge e dere Bible ga-enye aka.

Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị e ji mee ihe na Bible na-ekwu banyere okwu ahụ bụ́ “nwanyị,” sị: “Ọ bụrụ na e jiri ya mee ihe n’ebe nwanyị nọ, ọ na-egosi onye a hụrụ n’anya ma ọ bụ onye a na-akwanyere ùgwù, ọ bụghị okwu mkparị ma ọ bụ okwu mba.” Akwụkwọ ndị ọzọ kwetakwara n’ihe a akwụkwọ a kwuru. Dị ka ihe atụ, The Anchor Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụghị okwu mba, ọ bụghị okwu mkparị, ọ bụghịkwanụ okwu na-egosi na Jizọs ahụghị nne ya n’anya . . . Ọ bụ ụzọ na-egosi nkwanye ùgwù Jizọs si agwa ụmụ nwanyị okwu kwa ụbọchị.” Akwụkwọ ọzọ na-akọwa okwu e ji mee ihe na Bible na-akọwa na “e ji okwu ahụ eme ihe n’ụzọ na-adịghị egosi mkparị.” Akwụkwọ ọkọwa okwu nke Gerhard Kittel dere kwukwara na otú e si jiri ya mee ihe n’ebe a “abụghị n’ụzọ mkparị.” N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwubi na Jizọs kparịrị nne ya mgbe ọ kpọrọ ya “nwanyị.”—Matiu 15:28; Luk 13:12; Jọn 4:21; 19:26; 20:13, 15.

Oleekwanụ maka okwu ahụ bụ́ “gịnị ka mụ na gị nwekọrọ?” Nke a yiri ka ọ̀ bụ akpaala okwu ndị Juu maara nke ọma bụ́ nke pụtara ọtụtụ ugboro n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, na 2 Samuel 16:10, anyị gụrụ ebe Devid nọ na-akwụsị Abishaị ka ọ ghara igbu Shimaị site n’ịgwa ya, sị: “Gịnị ka mụ na unu nwekọrọ, ụmụ Zeruaịa? Mgbe ọ na-akọcha, mgbe Jehova sịwokwara ya, Kọchaa Devid.” Anyị na-agụkwa ná 1 Ndị Eze 17:18 na mgbe nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ sịrị Ịlaịja: “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, gị onye nke Chineke? Ị̀ bịakwutewo m ime ka e cheta mmehie m, na ime ka nwa m nwoke nwụọ?”

Site n’ihe atụ ndị a dị n’ime Bible, anyị pụrụ ịhụ na a na-ejikarị okwu ahụ bụ́ “gịnị ka mụ na gị nwekọrọ?” eme ihe ọ bụghị iji gosipụta nlelị ma ọ bụ mpako, kama ọ bụ iji gosipụta na mmadụ ekwetaghị n’aro ụfọdụ ndị a tụrụ ma ọ bụ iji gosi na echiche ya dị iche n’echiche onye nke ọzọ. Gịnịkwanụ ka a pụrụ ikwu banyere ihe Jizọs gwara Meri?

Mgbe Meri gwara, Jizọs, sị, “Ha enweghị mmanya,” o doro anya na ọ nọghị na-agwa Jizọs ka Jizọs mara na mmanya ha agwụla kama ọ na-agwa Jizọs ka o mee ihe banyere ya. Jizọs ji akpaala okwu ahụ mee ihe iji gwa Meri na ya ekwenyeghị n’aro ahụ o ji akọ na-atụrụ ya, ihe ọzọ o kwukwara bụ́, “Oge awa m erubeghị,” nyeere anyị aka ịghọta ihe mere o ji kwuo otú ahụ.

Site ná mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, teekwa ya mmanụ n’afọ 29 O.A., ọ maara nnọọ na ọ bụ uche Jehova na ya, dị ka Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa, ga-agbaso ụzọ ndụ nke ịnọgide na-eme ezi ihe bụ́ nke ga-eduga n’ọnwụ ya, mbilite n’ọnwụ ya, nakwa inye ya otuto. O kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi nakwa ka o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Ka oge ọnwụ ya na-eru nso, Jizọs mere ka nke a doo anya site n’ikwu, sị: “Oge awa eruwo.” (Jọn 12:1, 23; 13:1) N’ihi ya, n’ekpere o kpere n’abalị bọtara ụbọchị ahụ ọ nwụrụ, Jizọs sịrị: “Nna, awa ahụ abịawo; mee ka ọkpara gị dị ebube, ka ọkpara gị wee mee ka ị dị ebube.” (Jọn 17:1) N’ikpeazụkwa, mgbe ígwè mmadụ bịara ịnwụchi ya na Getsemeni, Jizọs kpọtere ndịozi ya n’ụra ma sị ha: “Oge awa ahụ abịawo! Lee! A na-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie.”—Mak 14:41.

Otú ọ dị, n’oge ahụ ọ gara agbamakwụkwọ ahụ na Kena, Jizọs ka malitere ozi ya dị ka Mezaịa ahụ, “oge awa” ya aka-erubeghịkwa. Nzube ya bụ́ isi bụ ime uche Nna ya na ime ya n’oge Nna ya chọrọ ka o mee ya, ọ dịghịkwa onye pụrụ imeghasị ihe a Jizọs kpebisiri ike ime. Jizọs e zoghị ọnụ mgbe ọ na-eme ka nne ya mata nke a, ma nke a apụtaghị na ọ kparịrị nne ya. Meri echeghịkwanụ na nwa ya nwoke kparịrị ya. N’ezie, mgbe Meri ghọtara ihe ihe ahụ Jizọs zara ya pụtara, ọ gwara ndị na-eje ozi n’agbamakwụkwọ ahụ, sị: “Ihe ọ bụla ọ gwara unu, meenụ ya.” Kama ileghara nne ya anya, Jizọs rụrụ ọrụ ebube mbụ ya dị ka Mezaịa ahụ—ime ka mmiri ghọọ mmanya dị ụtọ—si otú ahụ gosi na o mere uche Nna ya ma lebara ihe nne ya kwuru anya n’ekweghị ka nke ọ bụla gbochie ibe ya.—Jọn 2:5-11.

[Foto dị na peeji nke 31]

Jizọs ji obiọma gwa nne ya okwu ma kwụsie ike n’ime uche Nna ya