Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Hụ Chineke nke Hụrụ Gị n’Anya n’Anya

Hụ Chineke nke Hụrụ Gị n’Anya n’Anya

Hụ Chineke nke Hụrụ Gị n’Anya n’Anya

“Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—MATIU 22:37.

1, 2. Olee ihe ọ pụrụ ịbụ ya kpatara e ji jụọ ajụjụ ahụ metụtara iwu kasị mkpa?

OLEE nke kasị mkpa n’ime ihe karịrị narị iwu isii mejupụtara Iwu Mozis? O yiri ka ajụjụ a ọ nọ na-akpata oké arụmụka n’etiti ndị Farisii n’oge Jizọs. Ọ̀ bụ iwu nke metụtara ịchụ àjà kasị mkpa? A sị kwuwe, ihe mmadụ ji maka ya achụ àjà bụ ka e wee gbaghara ya mmehie ya nakwa iji nye Chineke ekele. Ka ọ̀ bụ iwu banyere ibi úgwù bụ ya kasị mkpa? Nke a dịkwa mkpa, ebe ibi úgwù bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị n’etiti Jehova na Ebreham.—Jenesis 17:9-13.

2 N’aka nke ọzọ, ndị na-agbasochi omenala anya chere ma eleghị anya na ebe ọ bụ na iwu nile Chineke nyere dịcha mkpa—ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ iyi ka ha adịchaghị mkpa ka ibe ha—ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ikwu na e nwere iwu ọ bụla kachasị ibe ya. Ndị Farisii kpebiri ịjụ Jizọs ajụjụ ahụ na-ese okwu. Ha chere na ma eleghị anya ọ ga-aza ihe ga-emebi aha ya. Otu n’ime ha bịakwutere Jizọs ma jụọ ya, sị: “Olee iwu kachasịnụ n’ime Iwu ahụ?”—Matiu 22:34-36.

3. Olee iwu Jizọs sị na ọ bụ ya kachasị mkpa?

3 Ihe Jizọs zara dị anyị oké mkpa taa. Mgbe ọ na-aza ajụjụ ahụ, o kwuru ihe kasị mkpa, nke ga-anọgidekwa na-abụ, ihe kasị mkpa n’ezi ofufe. N’ihota ihe e dere na Deuterọnọmi 6:5, Jizọs sịrị: “‘Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Nke a bụ ihe e nyere n’iwu nke kasịnụ, bụrụkwa nke mbụ.” Ọ bụ ezie na ọ bụ otu iwu ka onye Farisii ahụ jụrụ ajụjụ ya ma Jizọs gwakwara ya iwu ọzọ. N’ihotakwa ihe e dere na Levitikọs 19:18, ọ sịrị: “Nke abụọ, dị ka ya, bụ nke a, ‘Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’” Jizọs gosiziri na iwu abụọ a dị oké mkpa ma a bịa n’ezi ofufe. Iji gbochie mgbalị ọ bụla a pụrụ ime ịgwa ya ka ọ hazie iwu ndị ọzọ fọrọ afọ n’usoro ha si dị mkpa, Jizọs mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Ọ bụ n’iwu abụọ a ka Iwu ahụ dum nakwa akwụkwọ Ndị Amụma dabeere.” (Matiu 22:37-40) N’isiokwu a, anyị ga-atụle nke kasị mkpa n’iwu abụọ a. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji hụ Chineke n’anya? Olee otú anyị si egosipụta na anyị hụrụ Chineke n’anya? Oleekwa otú anyị pụrụ isi zụlite ịhụnanya dị otú a? Ọ dị oké mkpa ka anyị mara azịza nke ajụjụ ndị a n’ihi na iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, anyị aghaghị iji obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, na uche anyị dum hụ Jehova n’anya.

Mkpa Ịhụnanya Dị

4, 5. (a) Gịnị mere ihe Jizọs zara onye Farisii ahụ ejughị ya anya? (b) Gịnị dị oké mkpa nye Chineke karịa àjà?

4 O yiri ka ihe Jizọs zara onye Farisii ahụ jụrụ ya ajụjụ ejughị onye Farisii ahụ anya. Ọ maara na ịhụ Chineke n’anya bụ ihe dị oké mkpa n’ezi ofufe, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị adịghị egosipụta ịhụnanya dị otú ahụ. N’ụlọ nzukọ ndị e nwere n’oge ahụ, a na-agụpụta Shema, ma ọ bụ nkwupụta nke okwukwe, n’olu dara ụda mgbe nile, nke a gụnyekwara ihe e dere na Deuterọnọmi 6:4-9 bụ́ nke Jizọs hotara. Dị ka ihe ndekọ nke Mak si kwuo, onye Farisii ahụ gwaziri Jizọs, sị: “Onye Ozizi, i kwuru nke ọma n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu, ‘Ọ bụ Otu, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị Ya’; nke a kwa bụ́ mmadụ iji obi ya dum nakwa nghọta ya dum nakwa ike ya dum hụ ya n’anya nakwa nke a bụ́ mmadụ ịhụ onye agbata obi ya n’anya dị ka onwe ya dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa àjà nkịtị na àjà ndị a na-esurecha n’ọkụ.”—Mak 12:32, 33.

5 N’ezie, n’agbanyeghị na n’Iwu ahụ, a chọrọ ka a na-achụ àjà dị iche iche, ihe dị Chineke mkpa n’ezie bụ ka ndị ohu ya jiri obi ha dum hụ ya n’anya. Nwa nza e ji ịhụnanya nye Chineke iji nye ya otuto, dị oké ọnụ ahịa n’anya ya karịa ọtụtụ puku ebulu e bu ihe na-ezighị ezi n’obi nye. (Maịka 6:6-8) Cheta ihe atụ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ bụ́ onye Jizọs hụrụ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Mkpụrụ ego nta abụọ ahụ o tinyere n’igbe onyinye agaghịdị azụtali otu nza. N’agbanyeghị nke ahụ, onyinye ahụ, bụ́ nke o nyere n’ihi otú o si jiri obi ya dum hụ Jehova n’anya, bara uru n’anya Jehova karịa nnukwu onyinye ndị ọgaranya nyere n’ihi na ha nwere ego mafọọrọ ha. (Mak 12:41-44) Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịma na Jehova ji otu ihe nke anyị nile pụrụ igosipụta n’agbanyeghị ọnọdụ anyị kpọrọ ihe—ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ!

6. Gịnị ka Pọl dere banyere mkpa ịhụnanya dị?

6 N’imesi ike mkpa ịhụnanya dị n’ezi ofufe, Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na m na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche nke ụmụ mmadụ na nke ndị mmụọ ozi ma enweghị m ịhụnanya, aghọwo m ngwá egwú bras na-ada ụda ma ọ bụ ngwá egwú simbal na-akụkọta ọnụ. Ọ bụrụkwa na m nwere onyinye ibu amụma, marakwa ihe nzuzo dị nsọ nile na ihe ọmụma nile, ọ bụrụkwa na m nwere okwukwe nile iji bufee ugwu n’ebe ọzọ, ma enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị ihe m bụ. Ọ bụrụkwa na m na-enye ihe nile m nwere iji zụọ ndị ọzọ, ọ bụrụkwa na mụ enyefee ahụ́ m, ka m wee nyaa isi, ma enweghị m ịhụnanya, eriteghị m uru ma ọlị.” (1 Ndị Kọrint 13:1-3) N’ụzọ doro anya, ịhụnanya dị oké mkpa ka ofufe anyị wee dị Chineke ezi mma. Olee otú anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya?

Otú Anyị Si Egosi na Anyị Hụrụ Jehova n’Anya

7, 8. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ?

7 Ọtụtụ ndị kweere na ịhụnanya bụ mmetụta na-esi ezigbo ike nchịkwa; ndị mmadụ na-ekwukarị na ịhụnanya na-egbu ka mmanya. Ma, ezigbo ịhụnanya ebighị ná mmetụta nkịtị. A na-egosipụta ya site n’omume. Bible kwuru na ịhụnanya bụ “ụzọ kasị mma” nakwa na ọ bụ ihe anyị kwesịrị ‘ịchụso.’ (1 Ndị Kọrint 12:31; 14:1) A gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-ahụ n’anya, ọ bụghị nanị “n’okwu ma ọ bụ site n’ire, kama n’omume na n’eziokwu.”—1 Jọn 3:18.

8 Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali anyị ime ihe na-amasị ya na ịgbachitere ya nakwa igosipụta na ọ bụ ya ka o ruuru ịbụ eze, ma n’okwu ọnụ anyị ma n’omume anyị. Ọ na-akpali anyị izere ịhụ ụwa na omume ndị na-adịghị amasị Chineke juru n’ụwa n’anya. (1 Jọn 2:15, 16) Ndị hụrụ Chineke n’anya na-akpọ ihe ọjọọ asị. (Abụ Ọma 97:10) Ịhụ Chineke n’anya gụnyekwara ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya, bụ́ ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ. Tụkwasị na nke ahụ, inwe ịhụnanya n’ebe Chineke nọ chọrọ ka anyị na-erubere ya isi. Bible na-ekwu, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu.”—1 Jọn 5:3.

9. Olee otú Jizọs si gosipụta na ya hụrụ Chineke n’anya?

9 Jizọs gosipụtara n’ụzọ pụrụ iche ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara. Ịhụnanya kpaliri ya ịhapụ ebe obibi ya bụ́ eluigwe ịbịa biri n’ụwa dị ka mmadụ. Ọ kpaliri ya inye Nna ya otuto site n’ihe ndị o mere na ihe ndị ọ kụziri. Ịhụnanya kpaliri ya ‘irube isi ruo ọnwụ.’ (Ndị Filipaị 2:8) Nrubeisi ahụ, bụ́ ihe na-egosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe nna ya nọ, mere ka ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi nwee ohere nke ịbụ ndị ha na Chineke dị ná mma. Pọl dere, sị: “Site ná nnupụisi nke otu onye ahụ [Adam], e debere ọtụtụ mmadụ n’ọnọdụ ndị mmehie, n’otu aka ahụkwa, site ná nrubeisi nke otu onye ahụ [Jizọs Kraịst], a ga-edebe ọtụtụ mmadụ n’ọnọdụ ndị ezi omume.”—Ndị Rom 5:19.

10. N’ihi gịnị ka ịhụ Chineke n’anya ji gụnye irubere ya isi?

10 Dị ka Jizọs mere, anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya site n’irubere ya isi. Onyeozi Jizọs ọ hụrụ n’anya bụ́ Jọn dere, sị: “Nke a bụkwa ihe ịhụnanya pụtara, ka anyị nọgide na-ejegharị dị ka ihe ndị o nyere n’iwu si dị.” (2 Jọn 6) Ndị hụrụ Jehova n’anya n’ezie na-achọsi nduzi ya ike. Ebe ha ghọtara na ha apụghị iduzi nzọụkwụ ha n’ụzọ ga-aga nke ọma, ha na-atụkwasị Chineke obi n’ihi amamihe ya ma na-anakwere nduzi o ji ịhụnanya na-enye ha. (Jeremaịa 10:23) Ha dị ka ndị Beria oge ochie nwere ezi obi bụ́ ndị “ji ọchịchọ obi siri nnọọ ike” nakwere ozi sitere n’aka Chineke ma na-enwe ọchịchọ siri ike ime uche Chineke. (Ọrụ 17:11) Ha jiri nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ iji ghọta ihe bụ uche Chineke nke ọma, bụ́ nke nyeere ha aka igosipụtakwu na ha hụrụ Chineke n’anya site n’irubere ya isi.

11. Gịnị ka iji obi anyị dum, uche anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, na ume anyị dum na-ahụ Chineke n’anya pụtara?

11 Dị ka Jizọs kwuru, anyị aghaghị iji obi anyị dum, uche anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, na ume anyị dum hụ Chineke n’anya. (Mak 12:30) Ịhụnanya dị otú ahụ na-esite n’obi, ọ na-agụnye mmetụta, ọchịchọ, na echiche anyị ndị kasị mie emie, anyị ga-achọsikwa ike ịdị na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ. Anyị na-ejikwa uche anyị ahụ ya n’anya. Anyị araraghị onwe anyị nye Jehova n’ebughị ụzọ mara onye ọ bụ; anyị maara Jehova—àgwà ya, ụkpụrụ ya, na nzube ya. Anyị na-eji mkpụrụ obi anyị dum, onwe anyị dum na ndụ anyị, na-ejere ya ozi ma na-eto ya. Anyị na-ejikwa ume anyị dum eme nke ahụ.

Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịhụ Jehova n’Anya

12. N’ihi gịnị ka Chineke ji chọọ ka anyị hụ ya n’anya?

12 Otu ihe mere anyị ji kwesị ịhụ Jehova n’anya bụ n’ihi na ọ chọrọ ka anyị na-akpa àgwà ka ya. Ịhụnanya sitere n’ebe Chineke nọ, ọ bụkwa Jehova kasị bụrụ ihe nlereanya n’igosipụta ịhụnanya. E nyere Jọn onyeozi ike mmụọ nsọ ide na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) E kere ụmụ mmadụ n’onyinyo Chineke; e mere anyị ka anyị na-ahụ n’anya. N’ezie, ọbụbụeze Jehova hiwere isi n’ịhụnanya. Ndị ọ chọrọ ka ha nọrọ n’okpuru ọchịchị ya bụ ndị na-ejere ya ozi n’ihi na ha hụrụ ya n’anya ma chọọ ka ọchịchị ezi omume ya na-achị ha. N’ezie, ịhụnanya dị mkpa ka ihe nile e kere eke wee dịrị n’udo ma dịrị n’otu.

13. (a) N’ihi gịnị ka e ji gwa ndị Izrel, sị: ‘Hụnụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya’? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya na Jehova ga-atụ anya ka anyị hụ ya n’anya?

13 Ihe ọzọ mere anyị ga-eji hụ Jehova n’anya bụ ekele anyị nwere maka ihe ndị o meere anyị. Cheta na Jizọs gwara ndị Juu, sị: ‘Unu ga-ahụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya.’ A naghị atụ anya ka ha hụ chi nke na-enweghị mmetụta na nke a na-amaghị ama n’anya. A na-atụ anya ka ha hụ Onye gosiworo ha ịhụnanya n’anya. Jehova bụ Chineke ha. Ọ bụ Onye ahụ nke kpọpụtara ha n’Ijipt ma kpọba ha n’Ala Nkwa ahụ, Onye ahụ nke chebere ha, gbooro ha mkpa ha, ma gosi ha ịhụnanya, Onye ahụ nke ji ịhụnanya nye ha ntaramahụhụ. Taakwa, Jehova bụ Chineke anyị, onye nyere Ọkpara ya dị ka ihe mgbapụta ka anyị wee nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. N’ezie, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na Jehova ga-atụ anya ka anyị hụkwa ya n’anya dị ka ọ hụrụ anyị. Anyị hụrụ ya n’anya n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya; ihe a gwara anyị mee bụ ka anyị hụ Chineke nke hụrụ anyị n’anya n’anya. Ọ bụ Onye ahụ nke “bu ụzọ hụ anyị n’anya” ka anyị na-ahụ n’anya.—1 Jọn 4:19.

14. Olee otú ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ ji yie nke nna na-ahụ n’anya?

14 Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya dị nnọọ ka nna na-ahụ n’anya si hụ ụmụ ya n’anya. Ọ bụ ezie na ha ezughị okè, ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-agba mbọ ruo ọtụtụ afọ iji lekọta ụmụ ha, ime nke ahụ na-efukwa ha ọtụtụ ego na ihe ndị ọzọ. Ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha ihe, na-agba ha ume, na-enye ha nkwado, ma na-enye ha ntaramahụhụ n’ihi na ha chọrọ ka ha nwee obi ụtọ na ọganihu. Gịnịkwanụ ka ndị nne na nna chọrọ ka ụmụ ha meere ha? Ha chọrọ ka ụmụ ha hụ ha n’anya, nakwa ka ha mụta ihe a na-akụziri ha bụ́ nke ga-abara ụmụ ahụ uru. Ọ́ bụghị ihe kwesịrị ekwesị na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya chọrọ ka anyị gosi ekele maka ihe nile o mewooro anyị site n’ịhụ ya n’anya?

Ịmụta Ịhụ Chineke n’Anya

15. Olee nzọụkwụ mbụ a na-ewere n’ịhụ Chineke n’anya?

15 Anyị ahụtụbeghị Chineke mbụ ma ọ bụ nụ olu ya. (Jọn 1:18) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-agwa anyị ka anyị bịa ghọọ ndị enyi ya. (Jems 4:8) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Nzọụkwụ mbụ a na-ewere n’ịhụ mmadụ n’anya bụ ịmara onye ahụ; o siri ike ịhụ onye ị na-amaghị n’anya. Jehova enyewo anyị Okwu ya, bụ́ Bible, ka anyị wee nwee ike ịmụta banyere ya. Ọ bụ nke a mere Jehova ji site n’ọgbakọ ya na-agba anyị ume ịdị na-agụchi Bible anya. Ọ bụ Bible na-akụziri anyị banyere Chineke, àgwà ya, ụdị onye ọ bụ, nakwa otú o siworo na-emeso ndị mmadụ ihe kemgbe ọtụtụ puku afọ. Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe ndekọ ndị dị otú ahụ, anyị ga-enwekwu ekele n’ebe Chineke nọ ma hụkwuo ya n’anya.—Ndị Rom 15:4.

16. Olee otú ịtụgharị uche ná ndụ na n’ozi Jizọs si eme ka anyị na-ahụkwu Chineke n’anya?

16 Otu ụzọ bụ́ isi anyị pụrụ isi hụkwuo Jehova n’anya bụ site n’ịtụgharị uche ná ndụ na n’ozi Jizọs. A sị kwuwe, Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya ruo n’ókè nke na ọ pụrụ ikwu, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) Ọmịiko Jizọs gosipụtara site n’ịkpọlite otu mkpụrụ nwa nke otu nwanyị di ya nwụrụ ọ́ dịghị emetụ gị n’ahụ́? (Luk 7:11-15) Ọ́ bụghị ihe na-akpali mmasị ịmara na Ọkpara Chineke nke bụ́ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ, ji obi umeala saa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya? (Jọn 13:3-5) Ọ́ dịghị emetụ gị n’ahụ́ ịmara na n’agbanyeghị na ọ ka mmadụ nile ukwuu ma karakwa ha mara ihe, na o mere ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ịbịakwute ya, gụnyere ụmụaka? (Mak 10:13, 14) Ka anyị ji obi ekele na-atụgharị uche n’ihe ndị a nile, anyị na-abịa dịrị ka Ndị Kraịst bụ́ ndị Pita onyeozi dere banyere ha, sị: “Ọ bụ ezie na unu ahụtụghị [Jizọs] anya, unu hụrụ ya n’anya.” (1 Pita 1:8) Ka anyị na-ahụkwu Jizọs n’anya, otú ahụkwa ka anyị ga na-ahụkwu Jehova n’anya.

17, 18. Ịtụgharị uche n’ihe ndị dị aṅaa Jehova ji ịhụnanya nye anyị pụrụ ime ka anyị hụkwuo ya n’anya?

17 Ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi hụkwuo Chineke n’anya bụ site n’ịtụgharị uche n’ọtụtụ ihe ndị o nyere anyị iji mee ka anyị nwee ike ịnụ ụtọ ndụ—ihe ndị mara mma o kere, ọtụtụ ihe ndị na-atọ ụtọ a na-eri eri, ezigbo ndị enyi, nakwa ọtụtụ ọmarịcha ihe ndị ọzọ na-enye anyị obi ụtọ na afọ ojuju. (Ọrụ 14:17) Ka anyị na-amụtakwu banyere Chineke, otú ahụ ka anyị na-enwekwu ihe mere anyị ga-eji na-enwe ekele maka ịdị mma ya na-enweghị atụ na mmesapụ aka ya. Chee banyere ihe nile Jehova mewooro gị. Í kweghị na o kwesịrị ka ị hụ ya n’anya?

18 Otu n’ime ọtụtụ onyinye ndị Chineke nyere anyị bụ ohere nke anyị nwere ịbịakwute ya n’ekpere n’oge ọ bụla, na-amara na “Onye na-anụ ekpere” ga-anụ olu anyị. (Abụ Ọma 65:2) Jehova enyewo Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ikike nke ịchị achị na nke ikpe ikpe. Otú ọ dị, ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ, ọbụnadị Ọkpara ya, nke o nyefere ọrụ nke ịnụ ekpere. Ọ bụ ya onwe ya na-anụ ekpere anyị. N’ụzọ dị otú a, ịhụnanya na mmasị Jehova nwere n’ebe anyị nọ na-adọta anyị nso n’ebe ọ nọ.

19. Olee nkwa ndị Jehova kwere bụ́ ndị na-adọta anyị nso n’ebe ọ nọ?

19 A na-adọtakwa anyị n’ebe Jehova nọ mgbe anyị tụlere ihe ndị o zubere imere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. O kwewo nkwa ime ka ọrịa, iru ùjú na ọnwụ bịa ná njedebe. (Mkpughe 21:3, 4) Ozugbo e mere ka ụmụ mmadụ zuo okè, ọ dịghịkwa onye ga-enwe nkụda mmụọ, ịda mba n’obi, ma ọ bụ ọdachi. Agụụ, ịda ogbenye, na agha agaghị adịkwa ọzọ. (Abụ Ọma 46:9; 72:16) A ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. (Luk 23:43) Jehova ga-eweta ngọzi ndị a, ọ bụghị n’ihi na iwu ji ya ime otú a, kama n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya.

20. Gịnị ka Mozis kwuru na ọ bụ abamuru dị n’ịhụ Jehova n’anya?

20 N’ihi ya, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji hụ Chineke n’anya ma kwe ka ịhụnanya ahụ na-esiwanye ike. Ị̀ ga-ekwe ka ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ na-esiwanye ike, na-ekwe ka Chineke na-eduzi gị? Ọ bụ gị ka ọ dịịrị ikpebi. Mozis ghọtara abamuru dị n’ịmalite ịhụ Jehova n’anya na ịnọgide na-eme otú ahụ. Mozis gwara ndị Izrel oge ochie, sị: “Gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị: ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ́ Ya: n’ihi na Ya onwe ya bụ ndụ gị, na ogologo nke ụbọchị gị.”—Deuterọnọmi 30:19, 20.

Ì Chetara?

• N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị hụ Jehova n’anya?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya?

• Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị ịhụ Jehova n’anya?

• Olee otú anyị pụrụ isi mụta ịhụ Chineke n’anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 20]

Jehova ji ihe anyị nile pụrụ igosipụta, ya bụ, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ, kpọrọ ihe n’ezie

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

“Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.”—Jọn 14:9