Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ịhụ Onye Agbata Obi Anyị n’Anya Pụtara

Ihe Ịhụ Onye Agbata Obi Anyị n’Anya Pụtara

Ihe Ịhụ Onye Agbata Obi Anyị n’Anya Pụtara

“Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—MATIU 22:39.

1. Olee otú anyị si egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya?

GỊNỊ ka Jehova na-achọ n’aka ndị na-efe ya ofufe? Jizọs ji okwu dị nkenke ma gbaa ọkpụrụkpụ zaa ajụjụ a. Ọ sịrị na iwu kasị mkpa bụ iji obi dum, mkpụrụ obi dum, uche dum, na ume dum hụ Jehova n’anya. (Matiu 22:37; Mak 12:30) Dị ka anyị hụworo n’isiokwu bu ụzọ, ịhụ Chineke n’anya gụnyere irubere ya isi na idebe ihe ndị o nyere n’iwu iji gosi na anyị hụkwara ya n’anya dị ka o si hụ anyị. Ime uche Chineke abụghị ibu arụ nye ndị hụrụ ya n’anya; ọ na-ewetara ha obi ụtọ.—Abụ Ọma 40:8; 1 Jọn 5:2, 3.

2, 3. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ileba anya n’iwu ahụ e nyere ka anyị hụ onye agbata obi anyị n’anya, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa na-ebilite?

2 Jizọs kwuru na iwu nke abụọ kasị mkpa na nke mbụ ahụ nwere njikọ. Ọ sịrị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Ọ bụ iwu nke a ka anyị ga-atụle ugbu a, e nwekwara ezi ihe mere anyị ga-eji tụlee nke a. E ji mmadụ ịhụ nanị onwe ya n’anya na ịhụnanya na-abụghị ezigbo ya mara oge anyị bi n’ime ya. Ná nkọwa o nyere site n’ike mmụọ nsọ banyere “ụbọchị ikpeazụ” ndị a, Pọl onyeozi dere na ndị mmadụ ga na-ahụ nanị onwe ha, ego, na ihe ụtọ n’anya kama ịhụ ibe ha n’anya. Ọtụtụ ndị ga-abụ ndị “na-enweghị obi mmadụ,” ma ọ bụ dị ka Bible ọzọ si sụgharịa ya, ndị “na-ahụghị ndị ezinụlọ ha n’anya dị ha kwesịrị ime.” (2 Timoti 3:1-4) Jizọs Kraịst buru amụma, sị: ‘Ọtụtụ ndị ga-arara ibe ha nye, kpọọkwa ibe ha asị, ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.’—Matiu 24:10, 12.

3 Otú ọ dị, rịba ama na Jizọs ekwughị na ịhụnanya nke mmadụ nile ga-ajụ oyi. E nweela ndị gosipụtara ụdị ịhụnanya Jehova chọrọ na nke kwesịịrị ya, a ga-anọgidekwa na-enwe ndị ga na-eme otú ahụ. Ndị hụrụ Jehova n’anya n’ezie ga-agbalị ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha. Ònyedị bụ onye agbata obi anyị nke anyị ga-ahụ n’anya? Olee otú anyị kwesịrị isi gosi na anyị hụrụ onye agbata obi anyị n’anya? Akwụkwọ Nsọ pụrụ inyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a dị mkpa.

Ònye Bụ Onye Agbata Obi M?

4. Dị ka Levitikọs isi iri na itoolu si kwuo, olee ndị ka ndị Juu kwesịrị ịhụ n’anya?

4 Mgbe ọ na-agwa onye Farisii ahụ na iwu nke abụọ kasịnụ bụ mmadụ ịhụ onye agbata obi ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya, Jizọs nọ na-ezo aka n’otu iwu nke e nyere ụmụ Izrel. E dekọrọ ya na Levitikọs 19:18. N’amaokwu ọzọ nke isi iri na itoolu ahụ, a gwara ndị Juu na ha kwesịrị ile ndị na-abụghị ndị Izrel ibe ha anya dị ka ndị agbata obi ha. Amaokwu nke iri atọ na anọ na-asị: “Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ́ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu bụrịị n’ala Ijipt.” Ya mere, e kwesịrị ịhụ ọbụna ndị na-abụghị ndị Juu, karịsịa ndị na-eso ụzọ ndị Juu, n’anya.

5. Olee otú ndị Juu si ghọta okwu ahụ bụ́ hụ onye agbata obi gị n’anya?

5 Ma ndị ndú ndị Juu nke oge Jizọs ekwenyeghị na nke ahụ. Ụfọdụ n’ime ha kụziri na okwu ahụ bụ́ “enyi” na “onye agbata obi” na-ezo aka n’ebe nanị ndị Juu nọ. Ha chere na e kwesịrị ịkpọ ndị na-abụghị ndị Juu asị. Ndị ndú okpukpe a chere na ndị na-efe Chineke kwesịrị ịsọ ndị na-adịghị efe Chineke oyi. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “N’ihi echiche dị otú a, o siri ike ịkwụsị mkpọrọmasị. E nwere ọtụtụ ihe ga-eme ka ọ ghara ikwe nkwụsị.”

6. Olee isi ihe abụọ Jizọs mere ka ha pụta ìhè mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ịhụ onye agbata obi n’anya?

6 N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs lebaara okwu a anya, na-akọwa onye e kwesịrị ịhụ n’anya. Ọ sịrị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya ma kpọọ onye iro gị asị.’ Otú ọ dị, asị m unu: Nọgidenụ na-ahụ ndị iro unu n’anya ma na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee gosipụta na unu bụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe, ebe ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri na-ezokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:43-45) Jizọs mere ka isi ihe abụọ pụta ìhè n’ebe a. Nke mbụ, Jehova na-emesapụ aka, ọ na-emesokwa ma ndị ọma ma ndị ọjọọ ihe n’obiọma. Nke abụọ, anyị kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya ya.

7. Gịnị ka anyị na-amụta site n’akụkọ banyere onye Sameria ahụ bụ ezigbo onye agbata obi?

7 N’oge ọzọ, otu onye Juu maara Iwu Mozis nke ọma jụrụ Jizọs, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Jizọs zaghachiri site n’ịkọrọ ya akụkọ banyere onye Sameria nke zutere otu nwoke, bụ́ onye Juu, onye ndị ohi kụrụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma ma napụ ya ihe nile o nwere. Ọ bụ ezie na ndị Juu n’ozuzu ha kpọrọ ndị Sameria asị, onye Sameria ahụ hichara ọnyà nwoke ahụ ma kpọga ya n’ụlọ ndị ọbịa, bụ́ ebe ọ pụrụ ịnọ gbakee. Gịnị ka anyị na-amụta site na nke a? Ihe anyị na-amụta bụ na ndị agbata obi anyị kwesịrị ka a hụ ha n’anya gụnyere ndị agbụrụ ọzọ, ndị mba ọzọ, ma ọ bụ ndị ọzọ anyị na ha na-anọghị n’otu okpukpe.—Luk 10:25, 29, 30, 33-37.

Ihe Ịhụ Onye Agbata Obi Anyị n’Anya Pụtara

8. Gịnị ka Levitikọs isi iri na itoolu kwuru banyere otú a ga-esi na-egosi ịhụnanya?

8 Dị ka ọ dị n’ịhụ Chineke n’anya, ịhụ onye agbata obi n’anya ebighị nanị n’ọnụ; ọ chọrọ ka e gosipụta ya site n’omume. Ọ ga-adị mma ma anyị tụlekwuo iwu ahụ e dekọrọ na Levitikọs isi iri na itoolu bụ́ nke gbara ndị Chineke ume ịhụ ndị agbata obi ha n’anya dị ka onwe ha. N’ebe ahụ, anyị na-agụ na onye Izrel ga-ahapụ onye e wedara n’ala na ọbịa ka o soro wee ihe ubi ya. A gaghị enwe onye na-ezu ohi, onye nduhie, ma ọ bụ onye aghụghọ. Ndị Izrel ekwesịghị ikpelara onye ọ bụla ikpe. Ọ bụ ezie na ha ga-adọ ibe ha aka ná ntị mgbe ọ dị mkpa, a gwara ha, sị: “Akpọla nwanne gị asị n’obi gị.” A chịkọtara iwu a na ọtụtụ iwu ndị ọzọ n’okwu a: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.”—Levitikọs 19:9-11, 15, 17, 18.

9. N’ihi gịnị ka Jehova ji gwa ụmụ Izrel ka ha nọpụ iche n’ebe ndị mba ọzọ nọ?

9 Ọ bụ ezie na ndị Izrel ga-ahụ ndị ọzọ n’anya, ha kwesịkwara ịnọpụ iche n’ebe ndị na-efe chi ụgha nọ. Jehova dọrọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ dị n’iso ndị ọjọọ na-akpakọrịta nakwa ajọ ihe ndị na-esi na ya apụta. Dị ka ihe atụ, Jehova nyere mba Izrel iwu banyere mba ndị ha ga-eweghara ala ha, sị: “Gị na ha alụrịtakwala nwunye; enyela nwa ya nwoke nwa gị nwanyị, ekurukwala nwa ya nwanyị nye nwa gị nwoke. N’ihi na ọ ga-ewezụga nwa gị nwoke n’iso m n’azụ, ka ha wee fee chi ọzọ: iwe Jehova ga-adịkwa ọkụ megide unu.”—Deuterọnọmi 7:3, 4.

10. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịnọ ná nche megide?

10 N’ụzọ yiri nke ahụ, Ndị Kraịst na-ezere iso ndị pụrụ imebi okwukwe ha na-akpakọrịta. (1 Ndị Kọrint 15:33) A dụrụ anyị ọdụ, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ,” ya bụ, ndị na-esoghị n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (2 Ndị Kọrint 6:14) A dụkwara Ndị Kraịst ọdụ ka ha na-alụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) N’agbanyeghị ndụmọdụ ndị a, anyị ekwesịtụghị ịkpọ ndị na-ekweghị na Jehova dị ka anyị kweere asị. Kraịst nwụrụ n’ihi ndị mmehie, ọtụtụ ndị na-emebukwa ajọ omume agbanweela ndụ ha ma bụrụ ndị ha na Chineke dịzi ná mma.—Ndị Rom 5:8; 1 Ndị Kọrint 6:9-11.

11. Olee ụzọ kasị mma isi gosi na anyị hụrụ ndị na-adịghị efe Jehova ofufe n’anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

11 Mgbe anyị na-egosi ịhụnanya n’ebe ndị na-adịghị efe Chineke ofufe nọ, ọ ga-akasị mma ma anyị ṅomie Jehova n’onwe ya. Ọ bụ ezie na ọ kpọrọ ajọ omume asị, ọ na-egosi mmadụ nile obiọma site n’inye ha ohere isi n’omume ọjọọ ha chegharịa ma nweta ndụ ebighị ebi. (Ezikiel 18:23) Jehova “chọrọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Ọ bụ uche ya “ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ọ bụ ya mere Jizọs ji nye ụmụazụ ya iwu ka ha kwusaa ozi ọma, zie ndị mmadụ ihe ma “mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.” (Matiu 28:19, 20) Site n’ikere òkè n’ọrụ a, anyị na-egosi na anyị hụrụ ma Chineke ma ndị agbata obi anyị n’anya, ọbụna ndị iro anyị.

Ịhụ Ndị Kraịst Ibe Anyị n’Anya

12. Gịnị ka Jọn onyeozi dere banyere ịhụ nwanna anyị n’anya?

12 Pọl onyeozi dere, sị: “Ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Ndị Galeshia 6:10) Dị ka Ndị Kraịst, iwu ji anyị ịhụ ndị anyị na ha na-ekpe otu okpukpe n’anya—ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị. Olee otú ịhụnanya a dịruru ná mkpa? N’ime ka mkpa nke a dị pụta ìhè, Jọn onyeozi dere, sị: “Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ . . . Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo, sị: ‘Ahụrụ m Chineke n’anya,’ ma na-akpọkwa nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha. N’ihi na onye na-ahụghị nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụ anya, apụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-adịghị ahụ anya.” (1 Jọn 3:15; 4:20) Okwu ndị a gbara ọkpụrụkpụ. Jizọs jibu okwu ahụ bụ́ “ogbu mmadụ” na “onye ụgha” kọwaa Setan bụ́ Ekwensu. (Jọn 8:44) Anyị agaghị achọ ma ọlị ka e jiri ụdị okwu ndị a kọwaa anyị.

13. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosipụta na anyị hụrụ ndị kwere ekwe ibe anyị n’anya?

13 ‘Chineke na-akụziri ezi Ndị Kraịst ka ha na-ahụrịta ibe ha n’anya.’ (1 Ndị Tesalonaịka 4:9) Anyị agaghị na-ahụ n’anya “n’okwu ma ọ bụ site n’ire, kama n’omume na n’eziokwu.” (1 Jọn 3:18) Ịhụnanya anyị kwesịrị ịbụ “nke ihu abụọ na-adịghị na ya.” (Ndị Rom 12:9) Ịhụnanya na-akpali anyị ịdị obiọma, inwe ọmịiko, ịgbaghara ndị ọzọ mmehie, na inwe ogologo ntachi obi, ọ dịghịkwa akpali anyị ikwo ekworo, itu ọnụ, ịdị mpako, ma ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe anyị nanị. (1 Ndị Kọrint 13:4, 5; Ndị Efesọs 4:32) Ọ na-akpali anyị ‘ịgbara ibe anyị ohu.’ (Ndị Galeshia 5:13) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha hụ ibe ha n’anya dị ka ọ hụrụ ha n’anya. (Jọn 13:34) N’ihi ya, Onye Kraịst kwesịrị ịdị njikere ịnwụ n’ihi ndị kwere ekwe ibe ya ma ọ bụrụ na nke ahụ adị mkpa.

14. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya n’ime ezinụlọ?

14 E kwesịrị nnọọ igosipụta ịhụnanya n’ezinụlọ Ndị Kraịst, karịsịa n’etiti di na nwunye. Nkekọ alụmdi na nwunye kwesịrị nnọọ ichi anya nke na Pọl kwuru, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya.” (Ndị Efesọs 5:28) Pọl nyeghachiri ndụmọdụ a n’amaokwu ise ndị sochirinụ. Di nke hụrụ nwunye ya n’anya agaghị eṅomi ndị Izrel nke oge Malakaị bụ́ ndị ghọgburu ndị nwunye ha. (Malakaị 2:14) Ọ ga-eji nwunye ya akpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ ga-ahụ ya n’anya otú Kraịst si hụ ọgbakọ ya n’anya. Ịhụnanya ga-akpalikwa nwunye ịkwanyere di ya ùgwù.—Ndị Efesọs 5:25, 29-33.

15. Gịnị ka ịhụ ebe ụmụnna gosiri ịhụnanya n’ebe ụmụnna ha nọ kpaliri ndị mmadụ ikwu na ime?

15 N’ụzọ doro anya, ụdị ịhụnanya a bụ ihe e ji amata ezi Ndị Kraịst. Jizọs sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ibe anyị nọ na-adọta ndị mmadụ n’ebe Chineke nke anyị hụrụ n’anya ma na-anọchite anya ya nọ. Dị ka ihe atụ, otu akụkọ si Mozambique banyere otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà, na-asị: “Anyị ahụtụbeghị ihe dị ka ya. N’ehihie, otu oké ifufe malitere ife, oké mmiri ozuzo na akụ̀ mmiri igwe sochikwara ya. Oké ifufe ahụ mebiri ụlọ anyị e ji ahịhịa wuo, ma bupụ gbamgbam ya. Mgbe ụmụnna anyị nọ n’ọgbakọ ndị dị anyị nso bịara nyere anyị aka wughachi ụlọ anyị, ndị agbata obi anyị ndị nke a tụrụ n’anya kwuru, sị: ‘Okpukpe unu amaka. Ndị chọọchị anyị enyetụbereghị anyị aka otú a.’ Anyị meghere Bible ma gosi ha Jọn 13:34, 35. Ọtụtụ n’ime ndị agbata obi anyị na-amụ Bible ugbu a.”

Ịhụ Ndị Mmadụ n’Anya n’Otu n’Otu

16. Gịnị dị iche n’ịhụ ndị mmadụ n’anya n’ìgwè na ịhụ ha n’anya n’otu n’otu?

16 O sighị ike ịhụkọta ndị agbata obi anyị n’anya n’otu, ya bụ, dị ka otu ìgwè. Otú ọ dị, ọ pụrụ isi ike ịhụ ndị mmadụ n’anya n’otu n’otu. Dị ka ihe atụ, nanị otú ụfọdụ ndị si egosi na ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya bụ site n’inye ụfọdụ òtù ọrụ ebere onyinye. N’ezie, ọ dị mfe ikwu na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya karịa ịhụ onye ọrụ ibe anyị nke na-adịghị eche banyere anyị, onye agbata obi nke na-asọ anyị oyi, ma ọ bụ enyi nke na-eme ihe na-ewute anyị, n’anya.

17, 18. Olee otú Jizọs si gosi na ya hụrụ ndị mmadụ n’anya n’otu n’otu, gịnịkwa mere o ji mee otú ahụ?

17 A bịa n’okwu banyere ịhụ ndị mmadụ n’anya n’otu n’otu, anyị pụrụ ịmụta ihe site n’aka Jizọs, bụ́ onye ṅomiri nnọọ àgwà Chineke n’ụzọ na-enweghị atụ. Ọ bụ ezie na ọ bịara n’ụwa iji bupụ mmehie nke ụwa, o gosiri na ya hụrụ ụmụ mmadụ n’anya n’otu n’otu—nwanyị nke na-arịa ọrịa, onye ekpenta, na otu nwatakịrị. (Matiu 9:20-22; Mak 1:40-42; 7:26, 29, 30; Jọn 1:29) Dị ka Jizọs mere, anyị na-egosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya site n’otú anyị si emeso ndị anyị na-ezute site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị ihe.

18 Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ichefu na ịhụ onye agbata obi n’anya nwere ihe jikọrọ ya na ịhụ Chineke n’anya. Ọ bụ ezie na Jizọs nyeere ndị ogbenye aka, gwọọ ndị ọrịa, ma nye ndị agụụ na-agụ nri, ihe mere o ji mee ihe a nile, tinyere ịkụziri ìgwè mmadụ ihe, bụ iji nyere ndị mmadụ aka ime ka ha na Jehova dịghachi ná mma. (2 Ndị Kọrint 5:19) Jizọs mere ihe nile ka e wee nye Chineke otuto, ọ dịghị mgbe o chefuru na ya na-anọchite anya Chineke ọ hụrụ n’anya ma na-eme ka a mara onye Chineke ahụ bụ. (1 Ndị Kọrint 10:31) Site n’iṅomi ihe nlereanya Jizọs, anyị pụrụ igosipụta ezi ịhụnanya n’ebe ndị agbata obi anyị nọ ma n’otu oge ahụ ghara ịbụ akụkụ nke ụwa nke ụmụ mmadụ na-eme ajọ omume.

Olee Otú Anyị Si Ahụ Ndị Agbata Obi Anyị n’Anya Dị Ka Onwe Anyị?

19, 20. Gịnị ka ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị pụtara?

19 Jizọs sịrị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” Ọ dịghị njọ iche banyere onwe anyị na ịgbalị inwetụ ùgwù onwe onye. Ma ọ́ bụghị ya, iwu a dị n’elu agaraghị ekwe omume. Ịhụ onwe onye n’anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị otú a dị iche n’ịhụ nanị onwe onye n’anya bụ́ nke Pọl onyeozi kwuru banyere ya na 2 Timoti 3:2. Kama nke ahụ, ọ bụ mmadụ inwe ùgwù onwe onye ruo n’ókè kwesịrị ekwesị. Otu ọkà mmụta Bible kọwara ya dị ka ‘mmadụ ịhụ onwe ya n’anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, bụ́ nke na-abụghị mmadụ ịhụbiga onwe ya n’anya ókè nke ga-eme ka ọ dị ya ka ọ bụ Chineke, ọ gaghịkwa abụ mmadụ ile onwe ya anya dị ka onye na-abaghị uru.’

20 Ịhụ ndị ọzọ n’anya dị ka anyị hụrụ onwe anyị pụtara ile ndị ọzọ anya otú anyị ga-achọ ka ndị ọzọ siri na-ele anyị anya nakwa imeso ndị ọzọ ihe otú anyị ga-achọ ka ndị ọzọ siri na-emeso anyị. Jizọs sịrị: “Ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Rịba ama na Jizọs asịghị ka anyị cheta ihe ndị ọzọ mere anyị n’oge ndị gara aga ma megwara ha. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iche echiche banyere otú anyị ga-achọ ka e siri mesoo anyị ihe ma mesoo ndị ọzọ otú ahụ. Rịbakwa ama na Jizọs ekwughị na nanị ndị anyị ga-emeso otú a bụ ndị enyi na ụmụnna anyị. O ji okwu bụ “ndị mmadụ,” mee ihe ikekwe na-egosi na anyị kwesịrị isi otú a na-emeso mmadụ nile ihe, onye ọ bụla anyị zutere.

21. Gịnị ka anyị na-egosi mgbe anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya?

21 Ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya ga-egbochi anyị ime ihe ọjọọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe ndị e dere n’Iwu ahụ, bụ́ ‘Akwala iko, Egbula ọchụ, Ezula ohi, Enwela ọchịchọ anyaukwu,’ na ihe ọ bụla ọzọ dịnụ e nyere n’iwu, ka a chịkọtara n’okwu a, ya bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Ịhụnanya adịghị eme onye agbata obi mmadụ ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 13:9, 10) Ịhụnanya ga-akpali anyị ịchọ ụzọ anyị ga-esi meere ndị ọzọ ezi ihe. Mgbe anyị na-ahụ ụmụ mmadụ ibe anyị n’anya, anyị na-egosi na anyị hụkwara onye ahụ nke kere mmadụ n’onyinyo Ya, bụ́ Jehova Chineke, n’anya.—Jenesis 1:26.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ole ndị ka anyị kwesịrị ịhụ n’anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

• Olee otú anyị pụrụ isi hụ ndị na-adịghị efe Jehova ofufe n’anya?

• Olee otú Bible si kọwaa ụdị ịhụnanya anyị kwesịrị inwe n’ebe ụmụnna anyị nọ?

• Gịnị ka ịhụ onye agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị pụtara?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

“Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?”

[Foto dị na peeji nke 29]

Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya n’otu n’otu