Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ihe n’Eziokwu Na-aba Nnọọ Uru

Ime Ihe n’Eziokwu Na-aba Nnọọ Uru

Ime Ihe n’Eziokwu Na-aba Nnọọ Uru

EMEGHỊ ihe n’eziokwu malitere n’ogige Iden. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ọtụtụ ebe, a na-ele ime ihe n’eziokwu anya dị ka ihe dị mma ma na-ele ịtụ asị na ịghọ aghụghọ anya dị ka ihe na-adịghị mma. Ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi bụ ihe e ji eme ọnụ. Ma n’ụzọ na-arị nnọọ elu taa, ọha mmadụ na-ekwu na emeghị ihe n’eziokwu dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma. Gịnị ka i chere banyere ya? Ime ihe n’eziokwu ọ̀ bụ àgwà e kwesịrị ịzụlite azụlite? Olee otú i si ekpebi ihe bụ́ ime ihe n’eziokwu na nke bụ́ emeghị ihe n’eziokwu?

Iji mee ihe na-amasị Chineke, anyị ga-egosi site n’okwu anyị na n’otú anyị si ebi ndụ na anyị na-eme ihe n’eziokwu. Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” (Ndị Efesọs 4:25) Pọl dekwara, sị: “Anyị na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Ihe mere anyị ji eme ihe n’eziokwu abụghị ka ndị mmadụ na-eto anyị. Anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihi na anyị na-akwanyere Onye Okike anyị ùgwù, anyị chọkwara ime ihe na-amasị ya.

Ezochila Ụdị Onye Ị Bụ

N’ọtụtụ mba, ndị mmadụ na-ezochi ndị ha bụ iji nweta ihe ịga nke ọma ná ndụ. Ha na-enweta akwụkwọ, diplọma, na kaadị e ji amata mmadụ bụ́ ndị na-abụghị ezigbo ya iji banye n’obodo ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị ma ọ bụ iji nweta ọrụ ma ọ bụ ọkwá ha na-erughị eru inweta. Ụfọdụ ndị nne na nna na-edegharị satifiketi e ji dee ụbọchị a mụrụ ụmụ ha ka ụmụ ha nwee ike ịgụkwu akwụkwọ.

Otú ọ dị, iji mee ihe na-amasị Chineke, anyị ekwesịghị ịdị na-aghọ aghụghọ. Bible kwuru na Jehova bụ “Chineke nke eziokwu” nakwa ọ na-atụ anya ka ndị ha na ya na-emekọ ihe na-eme ihe n’eziokwu. (Abụ Ọma 31:5) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide soro Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya, anyị ekwesịghị iṅomi “ndị ụgha” bụ́ “ndị na-ezochi ihe ha bụ.”—Abụ Ọma 26:4, NW.

Ndị mmadụ na-atụkarịkwa asị mgbe o yiri ka à ga-ata ha ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ha mere. Ọbụna n’ọgbakọ Ndị Kraịst, a pụrụ ịnwa mmadụ ime otú a. Dị ka ihe atụ, n’otu ọgbakọ, otu nwa okorobịa gwara ndị okenye na ya mere mmehie. Ma o kwetaghị na ya zuru ohi, ọ bụ ezie na e nwere ihe àmà na-egosi na o zuru ohi. E mechara chọpụta na o zuru ohi ma chụpụ ya n’ọgbakọ. Ọ̀ garaghị akara ya mma ikwu nnọọ eziokwu ma nweta enyemaka nke ga-emezi mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke ya na Jehova? N’ezie, Bible kwuru, sị: “Eledala ịdọ aka ná ntị nke sitere n’aka Jehova anya, adakwala mbà mgbe ọ na-abara gị mba; n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.”—Ndị Hibru 12:5, 6.

Mgbe ụfọdụ, nwanna nwoke chọrọ inweta ihe ùgwù n’ọgbakọ nwere ike ịgbalị izochi nsogbu ndị o nwere ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị o mere n’oge ndị gara aga. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-edejupụta akwụkwọ maka ihe ùgwù ije ozi pụrụ iche, o nwere ike ọ gaghị enyecha azịza doro anya n’ajụjụ ndị metụtara ahụ́ ike ya na omume ya, na-eche na ikwu eziokwu n’okwu ndị dị otú a nwere ike ime ka ọ ghara iru eru maka ihe ùgwù ndị ahụ. O nwere ike ịdị na-ekwu n’obi ya sị, ‘Aghaghị m ụgha,’ ma ihe ahụ ọ̀ na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu? Tụlee isi ihe e mere ka ọ pụta ìhè n’Ilu 3:32: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye sihiere esihie bụ: ma n’aka ndị ziri ezi ka izu nzuzo Ya dị.”

Ime ihe n’eziokwu pụtara mmadụ ibu ụzọ na-agwa onwe ya eziokwu. Anyị na-ekwerekarị ihe anyị chọrọ ikwere kama ikwere ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe bụ eziokwu. Ọ na-adịkarị mfe anyị ịtawa onye ọzọ ụta kama ịta onwe anyị. Dị ka ihe atụ, Eze Sọl gbalịrị ime ka o yie ka o mere ihe ziri ezi site n’ibugara ndị ọzọ ụta dịịrị ya. N’ihi ya, Jehova jụrụ na ọ gaghị abụkwa eze. (1 Samuel 15:20-23) Nke a dị nnọọ iche n’ebe Eze Devid nọ, bụ́ onye gwara Jehova n’ekpere, sị: “Ana m emerị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; Gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.”—Abụ Ọma 32:5.

Ime Ihe n’Eziokwu Na-eweta Ụgwọ Ọrụ

Ime ihe n’eziokwu ma ọ bụ emeghị ihe n’eziokwu na-emetụta otú ndị ọzọ si ele anyị anya. Ọ bụrụ na ndị mmadụ achọpụta na ị ghọgburu ha ọbụna nanị otu ugboro, ha agakwaghị adị na-atụkwasị gị obi, ọ ga-esikwara ha ike ịtụkwasị gị obi ọzọ. Ọ bụrụkwanụ na ị na-ekwu eziokwu ma na-eme ihe n’eziokwu, ị ga-emere onwe gị aha dị ka onye na-eguzosi ike n’ezi ihe, onye ruru eru ka a tụkwasị ya obi. Ndịàmà Jehova emeworo onwe ha ụdị aha a. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Otu onye na-elekọta otu ụlọ ọrụ chọpụtara na ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ na-egwu ụlọ ọrụ ahụ wayo, n’ihi ya ọ kpọọrọ ha ndị uwe ojii. Mgbe ọ chọpụtara na otu n’ime ndị ọrụ ya nke bụ́ Onyeàmà Jehova so ná ndị a kpụụrụ, ọ gara hụ ndị uwe ojii ahụ iji gbapụta Onyeàmà ahụ ozugbo. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na onye ahụ na-elekọta ụlọ ọrụ ahụ maara na Onyeàmà a na-eme ihe n’eziokwu, ọ makwaara na aka ya dị ọcha. Onyeàmà ahụ nọgidere na-arụrụ ụlọ ọrụ ahụ ọrụ, ma a chụrụ ndị ọzọ n’ọrụ. Ndịàmà ibe ya ṅụrịrị ọṅụ, n’ihi na ha maara na àgwà ọma ya ewetarala aha Jehova otuto.

Ndị mmadụ na-ahụtakarị ezigbo àgwà. N’otu ógbè dị n’Africa, a chọrọ ịrụzi otu àkwà a na-esi agafe otu nnukwu ọwara mmiri, n’ihi na ndị mmadụ ezuola ụfọdụ osisi ndị e ji rụọ ya. Ndị bi n’ógbè ahụ kpebiri ịtụ ego iji zụta osisi ndị ọhụrụ ha ga-eji dochie ndị nke ahụ e zuru ezu, ma ònye ka a ga-enye ego ndị ahụ a tụkọtara, ya aghara iri ya? Ha nile kwekọrịtara ka e nye ya otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Mgbe otu mba dị n’Africa nwere oké ọgba aghara n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ịkpa ókè agbụrụ, otu ụlọ ọrụ nwere ngalaba ná mba ndị ọzọ zigara otu Onyeàmà na-ahazi ego ụlọ ọrụ ahụ ịga obodo ọzọ n’ihi na ndụ ya nọ n’ihe ize ndụ. Ụlọ ọrụ ahụ mere ndokwa ka ọ gaa rụọ ọrụ ha onwe ha ga-akwụ ya ụgwọ ruo ọtụtụ ọnwa n’obodo ọzọ ruo mgbe nsogbu ahụ ga-ebelata. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Onyeàmà ahụ jụrụ isonyere ndị mere atụmatụ igwu ụlọ ọrụ ahụ wayo n’oge ndị gara aga. Ndị na-elekọta ụlọ ọrụ ahụ maara na ọ na-eme ihe n’eziokwu. Hà gaara adị njikere inyere onye ọrụ a aka ma a sị na a maara ya dị ka onye na-adịghị eme ihe n’eziokwu?

Ilu 20:7 kwuru, sị: ‘Onye ezi omume na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe ya,’ (NW). Onye na-eme ihe n’eziokwu na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ọ dịtụghị aghọgbu mmadụ ibe ya ma ọ bụ duhie ya. Nke a ọ̀ bụghị otú ị chọrọ ka ndị ọzọ siri na-emeso gị ihe? Ime ihe n’eziokwu bụ akụkụ dị mkpa nke ezi ofufe. Ọ na-egosi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. Mgbe anyị na-eme ihe n’eziokwu, anyị na-egosi na anyị na-agbaso ụkpụrụ omume ahụ Jizọs kwuru banyere ya, sị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—Matiu 7:12; 22:36-39.

Ime ihe n’eziokwu mgbe nile pụrụ ịkpatara mmadụ nsogbu mgbe ụfọdụ, ma akọnuche dị ọcha a na-enweta site n’ime ihe n’eziokwu bara nnọọ uru karị ihe ọ bụla o nwere ike ifu anyị. Ime ihe n’eziokwu ga-emecha weta ụgwọ ọrụ kasịnụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị ihe a pụrụ iji tụnyere iso Jehova na-enwe mmekọrịta dị mma. Gịnị mere ị ga-eji mebie mmekọrịta gị na Jehova site n’ịghọ aghụghọ iji mechapụ onwe gị ihu ma ọ bụ iji nweta ihe ụfọdụ n’ụzọ na-ezighị ezi? Ihe ịma aka ọ bụla ọ sọkwara anyị zute, anyị pụrụ inwe obi ike n’okwu ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye kwuru, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ nwoke nke meworo Jehova ka Ọ bụrụ ihe ntụkwasị obi ya, o cheghịkwa ndị nganga ihu, ma ọ bụ ndị na-ejehie n’ụzọ okwu ụgha.”—Abụ Ọma 40:4.

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ezi Ndị Kraịst adịghị azụ akwụkwọ wayo ma ọ bụ jiri ya na-eme ihe