Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ

“ÒNYE ka m ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” Aịzaịa nwa Emọs zara ajụjụ a Jehova Chineke jụrụ, site n’ikwu, sị: “Lee m! Ziga m.” (Aịsaịa 1:1; 6:8) N’oge ahụ, e nyere Aịzaịa ọrụ dị ka onye amụma. E dekọrọ amụma ndị Aịzaịa buru n’akwụkwọ Bible bu aha ya.

Ọ bụ Aịzaịa onye amụma dere akwụkwọ Aịsaịa, bụ́ nke were afọ iri anọ na isii, malite n’ihe dị ka 778 T.O.A. ruo oge ụfọdụ ka 732 T.O.A. gasịrị. Ọ bụ ezie na akwụkwọ ahụ kwuru banyere ikpe a mara Juda, Izrel, na obodo ndị gbara ha gburugburu, isi ihe ọ na-ekwu okwu ya abụghị amamikpe. Kama, ọ bụ ‘nzọpụta Jehova Chineke.’ (Aịsaịa 25:9) N’ezie, aha ahụ bụ́ Aịzaịa pụtara “Nzọpụta Jehova.” N’isiokwu a, a ga-atụle isi ihe ndị sitere n’akwụkwọ Aịsaịa 1:1-35:10.

‘NDỊ FỌDỤRỤ GA-ALAGHACHI’

(Aịsaịa 1:1–12:6)

Bible ekwughị ma è buru amụma ndị ahụ e dekọrọ n’isi ise ndị mbụ nke akwụkwọ Aịsaịa tupu a họpụta Aịzaịa dị ka onye amụma ma ọ bụkwanụ mgbe a họpụtasịrị ya. (Aịsaịa 6:6-9) Ma otu ihe doro anya bụ na Juda na Jeruselem nọ n’ọrịa n’ụzọ ime mmụọ “site n’ọbọ ụkwụ wee ruo n’isi.” (Aịsaịa 1:6) Ikpere arụsị juru ebe nile. Ndị ndú ha na-eme ihe na-ezighị ezi. Ụmụ nwanyị ha ghọrọ ndị mpako. Ndị mmadụ adịghị efe ezi Chineke ahụ n’ụzọ ọ na-anakwere. E nyere Aịzaịa ọrụ ịga gwa ndị na-enweghị nghọta, ndị na-achọghịkwa inweta ihe ọmụma ọ bụla okwu ugboro ugboro.

Ndị agha Izrel na Siria jikọrọ aka yie Juda egwu ịwakpo ya. Site n’iji Aịzaịa na ụmụ ya meere ndị Juda ‘ihe ịrịba ama na ihe ebube,’ Jehova mesiri Juda obi ike na ndị Siria na Izrel jikọrọ aka imegide ha agaghị enwe ihe ịga nke ọma. (Aịsaịa 8:18) Ma, ọ bụ nanị ọchịchị “Onyeisi Udo” ga-eweta udo na-adịghị agwụ agwụ. (Aịsaịa 9:6, 7) Jehova ga-ekpekwa Asiria ikpe, bụ́ obodo o ji mee ihe dị ka “ndele nke iwe [ya].” A ga-emecha dọrọ Juda n’agha, ma ‘ndị fọdụrụ ga-alaghachi.’ (Aịsaịa 10:5, 21, 22) A ga na-ekpe ndị mmadụ ikpe ziri ezi n’oge ọchịchị nke ‘ome ihe atụ ahụ ga-esi n’ogwe osisi Jesi pụta.’—Aịsaịa 11:1.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:8, 9—Olee otú a ga-esi ‘hapụ ada Zaịọn dị ka ụlọ ntu n’ubi vaịn, dị ka ụlọ ịnọ ọnọdụ abalị n’ubi cucumber’? Nke a pụtara na oge Asiria ga-awakpo Jeruselem, Jeruselem agaghị enweli ike ọ bụla ịzọ onwe ya dị ka ụlọ ntu nke dị n’ubi vaịn ma ọ bụ dị ka ụlọ na-esighị ike nke dị n’ubi cucumber. Ma Jehova ga-agbatara ya ọsọ enyemaka, ọ gaghị ekwekwa ka ọ dị ka Sọdọm na Gọmọra.

1:18—Gịnị ka okwu a bụ́: “Biko bịanụ, ka anyị rụrịta ụka” pụtara? Nke a abụghị oku a na-akpọ ka a bịa kwurịta okwu ma nwee nkwekọrịta site n’ileghara ihe ụfọdụ anya ka udo wee dị. Kama ihe amaokwu ahụ na-ekwu bụ otú Jehova bụ́ onye na-ekpe ikpe n’ezi omume ga-esi nye Izrel ohere ịgbanwe na ime onwe ya ka ọ dị ọcha.

6:8a—Gịnị mere e ji jiri nnọchiaha ndị bụ́ “m” na “anyị” mee ihe n’ebe a? Nnọchiaha ahụ bụ́ “m” na-anọchi anya Jehova Chineke. Ụbara ya bụ́ “anyị” na-egosi na e nwere onye ọzọ ya na Jehova nọ. N’eziokwu, onye ahụ ya na ya nọ bụ “Ọkpara ọ mụrụ nanị ya.”—Jọn 1:14; 3:16.

6:11—Gịnị ka Aịzaịa bu n’uche mgbe ọ jụrụ, sị: “Ruo olee mgbe, Onyenwe anyị?” Aịzaịa anọghị na-ajụ ogologo oge ọ ga-agwaru ndị na-adịghị aṅa ya ntị okwu Jehova. Kama, ọ chọrọ ịmara ogologo oge ọrịa ime mmụọ ndị ahụ na-arịa ga-anọgide na-ewetara aha Chineke nkọcha.

7:3, 4—Gịnị mere Jehova ji zọpụta ajọ Eze Ehaz? Ndị eze Siria na Izrel mere atụmatụ ịkwatu ọchịchị Eze Ehaz nke Juda, ma were onye ha ga na-atụrụ ihe ọ ga na-eme dochie ya, ya bụ, nwa Tabeel—nwoke na-esighị n’eriri Devid. Atụmatụ aghụghọ a nke Setan bụ́ Ekwensu mere ga-emebi ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ nke Jehova na Devid gbara. Jehova napụtara Ehaz iji mee ka usoro ọmụmụ a ga-esi mụta “Onyeisi Udo” ahụ e kwere ná nkwa dịgide.—Aịsaịa 9:6.

7:8—Olee otú e si “tipịa” Ifrem n’ime iri afọ isii na ise? Ọ bụ obere oge ka Aịzaịa buchara amụma a, “n’ụbọchị Peka bụ́ eze Izrel,” ka a malitere isi n’alaeze ebo iri kpọpụwa ndị Izrel, ma were ndị na-abụghị ndị Izrel mejuo ala ahụ. (2 Ndị Eze 15:29) A nọgidekwara na-eme nke a ruo mgbe eze ndị Asiria bụ́ Isa-hadọn, nwa Senakerib, nke nọchikwara ya nọ n’ọchịchị. (2 Ndị Eze 17:6; Ezra 4:1, 2; Aịsaịa 37:37, 38) Mkpọpụ a ndị Asiria si na Sameria kpọpụ ndị mmadụ ma kpọbata ndị ọzọ were iri afọ isii na ise ahụ a kpọtụrụ uche n’Aịsaịa 7:8.

11:1, 10—Olee otú Jizọs Kraịst pụrụ isi bụrụ ‘ome ga-esi n’ogwe osisi Jesi pụta’ bụrụkwa ‘mgbọrọgwụ Jesi’? (Ndị Rom 15:12) Jizọs ‘si n’ogwe osisi Jesi’ n’usoro ọmụmụ ya dị ka mmadụ. Ọ bụ nwa Jesi bụ́ Devid mụrụ Jizọs. (Matiu 1:1-6; Luk 3:23-32) Otú ọ dị, ikike ọchịchị Jizọs natara metụtara mmekọrịta ya na ndị nna nna ya. N’ihi ikike e nyere Jizọs inye ụmụ mmadụ na-erube isi ndụ ebighị ebi n’elu ala, ọ ghọọrọ ha “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile Ebighị Ebi.” (Aịsaịa 9:6) N’ihi ya, ọ bụkwa “mgbọrọgwụ” ndị nna nna ya, tinyekwara Jesi.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

1:3. Ehi ma ọ bụ ịnyịnya ibu ma ihe karị anyị ma ọ bụrụ na anyị ajụ ibi ndụ kwekọrọ n’ihe Onye Okike anyị chọrọ anyị n’aka. N’aka nke ọzọ, inwe ekele n’ihi ihe nile Jehova na-emere anyị ga-eme ka anyị ghara ịkpa àgwà dị ka ndị na-enweghị nghọta, meekwa ka anyị ghara ịhapụ Jehova.

1:11-13. Ememe ndị okpukpe na-eme bụ́ nke na-egosi na ha na-ebi ndụ ihu abụọ na ekpere ha na-ekpe iji mezuo iwu na-agwụ Jehova ike. Ihe ndị anyị na-eme na ekpere ndị anyị na-ekpe kwesịrị isite anyị n’obi.

1:25-27; 2:2; 4:2, 3. Ịgba ohu na ntọgbọrọ n’efu nke Juda ga-akwụsị mgbe ndị ahụ chegharịrị echegharị fọdụrụnụ ga-alọghachi Jeruselem ma maliteghachi ife Jehova ezi ofufe. Jehova na-emere ndị mmehie chegharịrị echegharị ebere.

2:2-4. Anyị na-enyere ndị si n’ọtụtụ mba aka ịmụta ụzọ nke udo ma ghọọ ndị na-eme udo, site n’ikerechi òkè anya n’ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ.

4:4. Jehova ga-ewepụ, ma ọ bụ sachapụ, àgwà ọjọọ ma mee ka anyị bụrụ ndị ikpe ọbara na-amaghị.

5:11-13. Mmadụ ịghara ịchịkwa ntụrụndụ ndị ọ na-ahọrọ ma ọ bụ ghara ịdị na-emeru ha n’ókè bụ ime ihe amamihe na-adịghị na ya.—Ndị Rom 13:13.

5:21-23. Ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta, kwesịrị izere ịbụ ndị ‘maara ihe n’anya onwe ha.’ Ha kwesịkwara imeru ihe n’ókè mgbe ha “na-aṅụ mmanya,” ha ga-ezerekwa ile mmadụ anya n’ihu.

11:3a. Ihe nlereanya Jizọs na ihe ndị ọ kụziri gosiri na ịtụ egwu Jehova na-eweta ọṅụ.

“JEHOVA GA-ENWE OBI EBERE N’AHỤ́ JEKỌB”

(Aịsaịa 13:1–35:10)

Isi nke 13 ruo nke 23 nke akwụkwọ Aịsaịa na-ekwu banyere okwu ikpe Jehova megide mba dị iche iche. Ma, “Jehova ga-enwe obi ebere n’ahụ́ Jekọb” site n’ikwe ka ebo nile nke Izrel lọghachi. (Aịsaịa 14:1) Mgbe e kwuchara na Juda ga-atọgbọrọ n’efu n’isi nke 24 ruo nke 27, e kwere nkwa na a ga-eweghachi ya. Jehova wesara ndị “Ifrem [Izrel] na-aṅụbiga mmanya ókè” iwe n’ihi iso Siria jikọọ aka, o wesakwara ndị “nchụàjà na ndị amụma” Juda iwe n’ihi njikọ aka ha na Asiria. (Aịsaịa 28:1, 7) A kpọsara ahụhụ megide “Eriel [Jeruselem]” n’ihi na ha “na-eje ịrịda n’Ijipt” maka nchebe. (Aịsaịa 29:1; 30:1, 2) Ma e buru amụma na a ga-azọpụta ndị nwere okwukwe na Jehova.

Dị ka ‘nne ọdụm si ede inwu n’elu anụ ọ dọgbutara,’ Jehova ga-eche “Ugwu Zaịọn” nche. (Aịsaịa 31:4) E kwekwara nkwa, sị: “Lee! n’ezi omume ka otu eze ga-abụ eze.” (Aịsaịa 32:1) Ọ bụ ezie na egwu Asiria yiri Juda mere ọbụna ka ‘ndị ozi udo ha kwasie ákwá ike,’ Jehova kwere nkwa na a ga-agwọ ndị ya, ‘gbaghara ha njehie ha.’ (Aịsaịa 33:7, 22-24) “Iwe ka Jehova na-ewesa mba nile, Ọ na-ejidekwa ọnụma n’ahụ́ ụsụụ nile nke ndị agha ha.” (Aịsaịa 34:2) Juda agaghị anọgide n’enweghị onye bi ya. “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose.”—Aịsaịa 35:1.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

13:17—N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Midia si agụ ọlaọcha dị ka ihe na-adịghị ihe ọ bụ, ọlaedo adịghị atọkwa ha ụtọ? Ndị Midia na ndị Peshia na-eji otuto ha na-enweta n’agha ha meriri akpọrọ ihe karị ihe ndị ha lụtara n’agha. Nke a pụtara ìhè n’ebe Saịrọs nọ, bụ́ onye nyeghachiri ndị ahụ a dọọrọ n’agha na-alaghachinụ arịa ọlaọcha na ọlaedo nke Nebukadneza bukọọrọ n’ụlọ nsọ Jehova.

14:1, 2—Olee otú ndị Jehova si ghọọ “ndị na-adọta ndị na-adọta ha rịị n’agha n’agha,” ndị “ga-enwekwa ike n’ahụ́ ndị na-achị ha rịị n’ihe ike”? Nke a mezuru n’ahụ́ ndị dị ka Daniel, bụ́ onye nọ n’ọkwà dị elu na Babilọn n’ọchịchị ndị Midia na ndị Peshia; Esta, bụ́ onye ghọrọ eze nwanyị Peshia; nakwa Mọdekaị, bụ́ onye e mere praịm minista n’Alaeze Ukwu Peshia.

20:2-5—Aịzaịa ò jegharịrị afọ atọ n’enwetụghị ihe ọ bụla o yi? Ikekwe ihe Aịzaịa yipụrụ bụ uwe elu ya, ma yiri nanị nke ime na-ejegharị.—1 Samuel 19:24.

21:1—Olee obodo a kpọrọ “ọzara nke oké osimiri”? Ọ bụ ezie na ọ dịghị oké osimiri ọ bụla dị Babilọn nso, a kọwara ya dị ka ọzara nke oké osimiri. Nke a bụ n’ihi na mmiri ndị si n’osimiri Yufretis na Taịgris jufere ejufe na-asọju n’ógbè Babilọn n’afọ ọ bụla, na-eme ka e nwee “oké osimiri.”

24:13-16—Olee otú ndị Juu ga-esi dị ‘n’etiti ndị nile, ka ntisịsị nke osisi oliv, dị ka mkpụrụ nke fọdụrụ ịtụtụkọ, mgbe ọghụghọ mkpụrụ vaịn gwụsịworo’? Dị nnọọ ka e si ahapụ mkpụrụ ụfọdụ n’elu osisi ma ọ bụ n’osisi vaịn ma a ghọọ ya, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ga-alanarị mbibi Jeruselem na Juda. Ebe ọ sọkwara ha kpọrọ ndị ahụ lanarịrịnụ gaa, ma hà kpọọrọ ha gaa “n’ala nke ìhè nile [Babilọn bụ́ nke dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ]” ma ọ bụkwanụ gaa “n’ala nile nke dị oké osimiri [Mediterenian] gburugburu,” ha ga-eto Jehova.

24:21—Olee ndị bụ “ụsụụ ndị agha nke ebe dị elu” na “ndị eze nke ụwa”? “Ụsụụ ndị agha nke ebe dị elu” dabara nnọọ adaba iji kọwaa ndị ajọ mmụọ dị ike. “Ndị eze nke ụwa” bụ ndị ọchịchị, bụ́ ndị ndị ajọ mmụọ ji na-akpa nnọọ ike dị egwu.—1 Jọn 5:19.

25:7—Gịnị bụ “ihu ihe mfụchi ahụ e ji afụchi ndị nile dị iche iche, na ihe mkpuchi ahụ e ji ekpuchi mba nile”? Ntụnyere a na-adọrọ uche anyị gaa ná ndị iro abụọ dị ike nke mmadụ—mmehie na ọnwụ.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

13:20-22; 14:22, 23; 21:1-9. Amụma ọ bụla Jehova buru na-emezukarị, dịkwa ka nke o buru banyere Babilọn si mezuo.

17:7, 8. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’Izrel egeghị Jehova ntị, ụfọdụ legaara ya anya maka nnapụta. N’otu aka ahụ, ụfọdụ ndị nọ na Krisendọm na-anabata ozi ọma nke Alaeze ahụ.

28:1-6. Asiria ga-ebibi Izrel, ma Chineke ga-ahụ na ndị kwesịrị ntụkwasị obi lanarịrị. Ikpe Jehova na-eme ka ndị ezi omume nwee olileanya.

28:23-29. Jehova na-agbazi ndị obi ha ziri ezi n’otu n’otu dị ka mkpa ha na ọnọdụ ha si dị.

30:15. Iji nweta nzọpụta Jehova, anyị kwesịrị igosipụta okwukwe site “n’izu ike,” ma ọ bụ site n’ịghara ịchọ nzọpụta n’aka mmadụ. Anyị na-egosikwa na anyị tụkwasịrị ikike Jehova nwere ichebe anyị obi site “n’ịnọ jụụ,” ma ọ bụ ghara ịtụ ụjọ.

30:20, 21. Anyị “na-ahụ” Jehova, “na-anụkwa” olu nzọpụta ya site n’ime ihe o kwuru n’Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Bible, nakwa site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.”—Matiu 24:45.

Amụma Aịzaịa Na-eme Ka Obi Ike Anyị Nwere n’Okwu Chineke Sikwuo Ike

Anyị kwesịrị inwe nnọọ ekele n’okwu Chineke bụ́ nke dị n’akwụkwọ Aịsaịa! Amụma ndị ahụ e mezurula na-eme ka obi sikwuo anyị ike na ‘okwu ọ bụla Jehova kwuru agaghị alaghachikwute ya n’efu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe o zigara ya.’—Aịsaịa 55:11.

Gịnịkwanụ banyere amụma ndị metụtara Mezaịa ahụ, dị ka ndị nke a a na-achọta n’Aịsaịa 9:7 na 11:1-5, 10? Ọ̀ bụ na ha adịghị ewusikwu okwukwe anyị nwere ná ndokwa Jehova mere maka ịzọpụta anyị ike? Akwụkwọ ahụ nwekwara ọtụtụ amụma, bụ́ ndị na-emezu n’ụzọ ka ukwuu n’oge anyị ma ọ bụkwanụ ndị ka ga-emezu emezu. (Aịsaịa 2:2-4; 11:6-9; 25:6-8; 32:1, 2) N’eziokwu, akwụkwọ Aịsaịa na-agbakwu akaebe na “okwu Chineke dị ndụ”!—Ndị Hibru 4:12.

[Foto dị na peeji nke 8]

Aịzaịa na ụmụ ya dị ka ‘ihe ịrịba ama na ọrụ ebube n’Izrel’

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Jeruselem ‘ga-adị ka ụlọ ntu n’ubi vaịn’

[Foto dị na peeji nke 10]

Olee otú e si na-enyere ndị si ná mba dị iche iche aka ‘ịkpụgharị mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè’?