Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbalị Siri Ike Anyị Mere Iji Kwụsie Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ

Mgbalị Siri Ike Anyị Mere Iji Kwụsie Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ

Akụkọ Ndụ

Mgbalị Siri Ike Anyị Mere Iji Kwụsie Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ

Dị ka Rolf Brüggemeier si kọọ

Ọ bụ otu enyi m detaara m akwụkwọ ozi mbụ m nwetara mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ gwara m na e jidela mama m na ụmụnne m ndị nwoke m tọrọ—Peter, Jochen, na Manfred. Nke a mere ka ụmụnne anyị ndị nwanyị abụọ ka dị obere nọrọ n’enweghị nlekọta nke nne na nna ma ọ bụ ụmụnne. Gịnị mere ndị ọchịchị East Germany ji kpagbuo ezinụlọ anyị? Olee ihe nyeere anyị aka ịnọgidesi ike n’ụzọ ime mmụọ?

AGHA ỤWA NKE ABỤỌ tisasịrị udo anyị nwere n’oge anyị dị obere; agha ahụ mekpọrọ onye ọ bụla n’ime anyị ọnụ. Papa m sonyeere ndị agha Germany ma nwụọ dị ka onye a dọọrọ n’agha. Nke a pụtara na ọ bụzi nanị mama m, bụ́ Berta, ga na-elekọta ụmụ isii bụ́ ndị dị site n’otu afọ ruo afọ iri na isii.

Chọọchị mama m na-agabu mere ka ọ kwụsị inwe mmasị n’okpukpe, bụ́ nke mere ka ọ ghara ịchọ iji ntị anụ ihe ọ bụla ọzọ banyere Chineke. Ma otu ụbọchị n’afọ 1949, otu nwanyị pere mpe aha ya bụ́ Ilse Fuchs, kụrụ aka n’ọnụ ụlọ anyị iji gwa anyị banyere Alaeze Chineke. Ajụjụ ndị ọ jụrụ na otú o si kwuo okwu kpaliri mama m ịchọ ịmatakwu ihe. Ịmụ Bible mere ka mama m nwee olileanya.

Otú ọ dị, mụ na ụmụnne m ndị nwoke nwere obi abụọ na mbụ. Ndị ọchịchị Nazi kwere nnọọ nkwa ihe ndị ha ga-eme, e mechaakwa ndị ọchịchị Kọmunist ekwe ndị nke ha, ma ọ dịghị ndị nke mezuru nkwa ha. Ọ bụ ezie na anyị na-enyo nkwa ọhụrụ ọ bụla enyo, a kpaliri nnọọ mmasị anyị mgbe anyị matara na ụfọdụ Ndịàmà nọrọ n’ogige ịta ahụhụ n’ihi ịjụ ịkwado agha. N’afọ ọzọ sochirinụ, e mere mụ na mama m na Peter baptizim.

E mekwara nwanne anyị nwoke nke obere bụ́ Manfred baptizim, ma o yiri ka eziokwu Bible agbanyechabeghị mgbọrọgwụ n’obi ya. Mgbe ndị ọchịchị Kọmunist machibidoro ọrụ anyị iwu na 1950, Manfred gwara ndị uwe ojii nzuzo bụ́ ndị a maara dị ka ndị Stasi, ebe anyị na-anọ amụ ihe, mgbe ha rụgidere ya ka ọ gwa ha banyere anyị. Ihe a o mere mesịrị mee ka e jide mama m na ụmụnne m ndị nwoke ndị ọzọ.

Ije Ozi Mgbe A Machibidoro Ọrụ Anyị Iwu

Iwu a machibidoro ọrụ anyị mere ka anyị na-ezo ezo ewebata akwụkwọ ndị dabeere na Bible na East Germany. Ejere m ozi dị ka onye na-aga ebute akwụkwọ n’ebe ọdịda anyanwụ Berlin, bụ́ ebe a na-amachibidoghị akwụkwọ anyị iwu, m na-esizi ebe ahụ ebubata akwụkwọ na East Germany. Agbanahụrụ m ndị uwe ojii ihe karịrị otu ugboro, ma ha jidere m na November 1950.

Ndị Stasi tinyere m n’ụlọ mkpọrọ a rụrụ n’ime ala na-enweghị windo. A dịghị ekwe ka m hie ụra n’ehihie, a na-agbakwa m ajụjụ ọnụ n’abalị, kụọkwa m ihe mgbe ụfọdụ. Mụ na ezinụlọ m ahụghị ruo March 1951 bụ́ mgbe mama m, Peter, na Jochen bịara mgbe a na-ekpe m ikpe. A mara m ikpe ịga mkpọrọ afọ isii.

E jidekwara Peter, Jochen, na mama m abalị isii ka e kpesịrị m ikpe. Otu nwanna nwanyị mechara kpọrọ nwanne m nwanyị bụ́ Hannelore, onye dị afọ iri na otu, nwanne mama m kpọkwaara Sabine, bụ́ onye dị afọ asaa. Ndị nche Stasi ahụ mesoro mama m na ụmụnne m ihe dị ka ndị omekome, ọbụna nara ha eriri ndị ha na-eji ekechi akpụkpọ ụkwụ ha. Ha na-eguzo ọtọ n’oge nile a na-agba ha ajụjụ ọnụ. A makwara onye ọ bụla n’ime ha ikpe ịga mkpọrọ afọ isii.

Na 1953, e kenyere mụ na ụfọdụ Ndịàmà ndị ọzọ bụkwa ndị mkpọrọ ịrụ ebe ụgbọ elu ndị agha na-ada, bụ́ nke anyị jụrụ ịrụ. Iji taa anyị ahụhụ, ha dopụrụ anyị iche ruo abalị iri abụọ na otu, bụ́ nke pụtara na anyị agaghị na-arụ ọrụ, anyị agaghị anata akwụkwọ ozi, nri a ga na-enyekwa anyị ga na-adị nnọọ obere. Ụfọdụ ụmụnna nwanyị na-esite n’obere nri nke a na-enye ha wepụtara anyị bred ma zobatara anyị ya. Nke a mere ka m mata Anni, bụ́ otu n’ime ụmụnna nwanyị ndị ahụ, ma lụọ ya mgbe a tọhapụsịrị ya na 1956, tọhapụkwa m na 1957. Anyị mụrụ nwa anyị nwanyị bụ́ Ruth otu afọ ka anyị lụchara. Peter na Jochen lụrụ nwanyị n’otu oge, Hannelore lụkwara di n’otu oge ahụ.

Ihe dị ka afọ atọ ka a tọhapụsịrị m, e jichiri m ọzọ. Otu n’ime ndị Stasi ahụ gbalịrị ịmanye m ịghọrọ ha onye mgbaàmà. Ọ gwara m, sị: “Maazị Brüggemeier, biko kpaa àgwà dị ka onye maara ihe. Ị maara ihe ịnọ n’ụlọ mkpọrọ dị ka ya, anyị achọghịkwa ka ị taa ụdị ahụhụ ahụ ọzọ. Ị ka pụkwara ịbụ Onyeàmà, na-amụ ihe gị, ma soro ndị mmadụ na-ekwurịta banyere Bible otú ọ bụla o si masị gị. Nanị ihe anyị chọrọ bụ ka ị na-agwa anyị otú ihe si na-aga. Chetakwa na i nwere nwunye na obere nwa nwanyị.” Okwu ikpeazụ a o kwuru wutere m. Ma, amaara m na ọ bụrụ na m anọrọ n’ụlọ mkpọrọ, Jehova ga-elekọta ndị ezinụlọ m karị ka m ga-elekọta ha, Jehova mekwara otú ahụ.

Ndị ọchịchị ahụ nwara ịmanye nwunye m ịdị na-arụ ọrụ mgbe nile ma kpọnye ndị ọzọ Ruth ka ha na-elekọta n’oge ndị ahụ ọ na-arụ ọrụ. Nwunye m jụwapụrụ isi ma na-arụ ọrụ n’abalị, ka o nwee ike ilekọta Ruth n’ehihie. Ụmụnna anyị n’ọgbakọ kasị nyere nwunye m aka, ha nyekwara ya ọtụtụ onyinye nke na o weere ụfọdụ n’ime ha nye ndị ọzọ. Ka ọ dịgodị, anọrọ m ihe fọrọ nke nta ka o ruo afọ isii ọzọ n’ụlọ mkpọrọ.

Otú Anyị Si Nọgidesie Ike Mgbe Anyị Nọ n’Ụlọ Mkpọrọ

Mgbe m laghachiri n’ụlọ mkpọrọ, ndị mkpọrọ ibe m bụ́ Ndịàmà chọsiri ike ịmata ihe ọhụrụ ndị e bipụtara. Enwere m obi ụtọ na amụrụ m magazin Ụlọ Nche ndị e bipụtara nke ọma ma gachie ọmụmụ ihe nile anya, ka m wee nwee ike ịgba ha ume n’ụzọ ime mmụọ.

Mgbe anyị gwara ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ ka ha nye anyị Bible, ha zara anyị, sị: “Inye Ndịàmà Jehova Bible dị ka inye onye ohi a tụrụ mkpọrọ ngwá ọrụ ọ ga-eji mepee ụzọ ọ ga-esi gbapụ.” N’ụbọchị ọ bụla, ụmụnna ndị na-eduzi ụbọchị ahụ na-ahọrọ otu akụkụ Bible ma kọwaa ya. Mgbe oge ruru maka ijegharị gburugburu ụlọ mkpọrọ ahụ iji megara ahụ́ ma kuru ikuku ndụ, bụ́ nke anyị na-eji ọkara awa eme n’ụbọchị ọ bụla, ọ na-atọ anyị ụtọ ịgụ akụkụ Bible dịịrị ụbọchị karịa ịga megara ahụ́. Ọ bụ ezie na onye ọ bụla na-anọ amaụkwụ iri na ise site n’ebe onye ọzọ nọ, a dịghịkwa ekwe anyị kwuo okwu, anyị chọtara ụzọ ndị anyị pụrụ isi kọọrọ ibe anyị akụkụ Akwụkwọ Nsọ e nwere ịtụle n’ụbọchị ahụ. Ọ bụrụ na anyị abaghachi n’ime ụlọ mkpọrọ, onye ọ bụla na-ekwu ihe ọ nụrụ, mgbe ahụzi, anyị na-ekwurịta ya dị ka anyị na-eme kwa ụbọchị.

Onye na-agbara ha àmà mechara chọpụta ihe na-aganụ, e tinyekwara m n’ụlọ mkpọrọ otu onye na-anọ. Obi dị m nnọọ ụtọ na m ebuola ọtụtụ narị akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’isi ka ọ na-erule mgbe ahụ. Apụrụ m iji oge ndị ahụ na-adịghị ihe m na-eme tụgharịa uche n’akụkụ Bible dị iche iche. E mechara kpọfee m n’ụlọ mkpọrọ ọzọ, bụ́ ebe onye nche ụlọ mkpọrọ tinyekọrọ mụ na Ndịàmà abụọ ọzọ n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ, ma ihe kasị nye anyị obi ụtọ bụ na o nyere anyị Bible. Ka m nọsịrị n’ụlọ mkpọrọ otu onye na-anọ ruo ọnwa isii, enwere m obi ụtọ isoroghachi ndị kwere ekwe ibe m na-ekwurịta ihe ndị dị na Bible.

Nwanne m nwoke bụ́ Peter kọrọ ihe nyeere ya aka ịtachi obi n’ụlọ mkpọrọ nke e tinyere ya, o kwuru, sị: “Echetara m otú ndụ ga-adị n’ime ụwa ọhụrụ, ma na-atụgharị uche na Bible mgbe nile. Anyị bụ́ Ndịàmà wusiritara ibe anyị ike site n’ịjụ ajụjụ ndị dabeere na Bible ma ọ bụ site n’ịdị na-ekwu ihe ndị anyị gụtara n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ dịghịrị anyị mfe. Mgbe ụfọdụ, a na-etinye mmadụ iri na otu n’ime anyị n’otu ọnụ ụlọ akụkụ ya anọ dịcha mita iri na abụọ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka anyị na-anọ eme ihe nile—eri nri, ehi ụra, asa ahụ́, ọbụna anyụ nsị na mamịrị. Anyị bịara taa nnọọ ahụ́ ma na-asọ oyi.”

Otu n’ime ụmụnne m ndị nwoke bụ́ Jochen chetara ahụmahụ ndị o nwere mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, o kwuru, sị: “Abụrụ m abụ ndị m pụrụ icheta site n’akwụkwọ abụ anyị. Atụgharịrị m uche kwa ụbọchị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị m bu n’isi. Mgbe a tọhapụrụ m, anọgidere m jiri ihe ndị metụtara ihe ime mmụọ na-akpọrọ ihe. N’ụbọchị ọ bụla, mụ na ezinụlọ m na-agụ akụkụ Bible maka ụbọchị ahụ. Anyị na-akwadebekwa maka ọmụmụ ihe nile.”

Ịtọhapụ Mama M n’Ụlọ Mkpọrọ

A tọhapụrụ mama m ka ọ nọfetụrụ afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ. O jiri oge ndị a a tọhapụrụ ya mụọrọ Hannelore na Sabine Bible, nyere ha aka n’ime ka okwukwe ha bụrụ a kwaa akwụrụ. Ọ kụzikwaara ha ihe ha ga-eme ma okwu ndị metụtara ihe ndị ha kweere bilite n’ụlọ akwụkwọ. Hannelore kwuru, sị: “Anyị adịghịdị eche banyere ihe isi ike ha na ya so n’ihi na anyị na-agbarịta onwe anyị ume n’ụlọ. Mmekọrịta siri ike anyị nwere n’ezinụlọ anyị karịrị nsogbu ọ bụla anyị zutere.”

Hannelore kwukwara, sị: “Anyị wegakwaara ụmụnna anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ nri ime mmụọ. Anyị na-eji aka akwụkwọ gbara kịrịkịrị edenye isiokwu nile gbara n’Ụlọ Nche n’akwụkwọ wax. Anyị na-eji akwụkwọ mmiri na-adịghị aba kechie ha ma zutuo ha n’ime ngwugwu ihe ndị a na-eri eri bụ́ ndị anyị na-eziga kwa ọnwa. Obi tọrọ anyị ụtọ mgbe anyị natara ozi na ngwugwu nri ime mmụọ ndị ahụ ‘dị nnọọ ezigbo ụtọ.’ Anyị tinyere nnọọ uche n’ọrụ anyị nke na m pụrụ ikwu na oge ndị ahụ magburu nnọọ onwe ha.”

Otú Ọ Dịịrị Anyị Mgbe A Machibidoro Ọrụ Anyị Iwu

Peter kọrọ otú ịnọ ná mmachibido iwu n’ọchịchị ndị East Germany ruo ọtụtụ iri afọ na-adị, o kwuru, sị: “Anyị na-ezukọ n’ụlọ ụmụnna n’obere ìgwè dị iche iche, na-abịa ọmụmụ ihe ma na-ala n’oge dị iche iche. Anyị na-anọ n’ọmụmụ ihe nke ọ bụla hazie mgbe ọzọ anyị ga-enwe ọmụmụ ihe. Anyị jiri ihe mgbaàmà na ihe ndị e dere ede mee nke a n’ihi na anyị na-atụ ụjọ na ndị Stasi na-eji ígwè ọrụ ha ege ihe ndị anyị na-ekwu.”

Hannelore kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, anyị na-enweta kaseti ndị e tinyere okwu ndị e kwuru ná mgbakọ. Nke a na-emekarị ka ọmụmụ ihe na-atọ ụtọ. Obere ìgwè anyị na-abịakọ ọnụ iji gere okwu ndụmọdụ ndị sitere na Bible, bụ́ nke na-ewe ọtụtụ awa. Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịhụ ndị ọkà okwu ahụ, anyị jiri nlezianya na-ege ntị n’ihe omume ahụ ma na-edetu ihe.”

Peter kwuru, sị: “Ụmụnna anyị nọ ná mba ọzọ tipụtara ahụ́ ha ọnyá iji bubatara anyị akwụkwọ ndị dabeere na Bible. N’ihe dị ka afọ iri ma ọ bụ karịa tupu Mgbidi Berlin a daa na 1989, ha nọ na-ebiri anyị akwụkwọ ndị pụrụ iche pere mpe. Ụfọdụ tinyere ụgbọala ha, ego ha, ọbụna nnwere onwe ha n’ihe ize ndụ iji bubata nri ime mmụọ na East Germany. Otu abalị, anyị ahụghị otu di na nwunye anyị nọ na-eche. Ndị uwe ojii chọtara akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’aka ha ma jichie ụgbọala ha. N’agbanyeghị ihe ize ndụ ndị dị na ya, ọ dịtụghị mgbe anyị chetụrụ ịkwụsị ọrụ ahụ iji bie ndụ dị jụụ.”

Nwanne m nwoke nke obere bụ́ Manfred, bụ́ onye ranyere anyị n’aka ndị iro laa azụ n’afọ 1950, kwuru ihe nyeere ya aka ịbataghachi n’ọgbakọ na ịnọgidesi ike n’ihe ndị o kweere, o kwuru, sị: “Ka e jichisịrị m ruo ọnwa ole na ole, agafere m West Germany ma pụọ n’ọgbakọ. Alọghachiri m East Germany na 1954 ma lụọ nwanyị n’afọ sochirinụ. N’oge na-adịghị anya, nwunye m nakweere eziokwu Bible, e meekwa ya baptizim na 1957. Ka oge na-aga, akọnuche m malitere inye m nsogbu, sitekwa n’enyemaka nwunye m, abataghachiri m n’ọgbakọ.

“Ụmụnna ndị maara m tupu mụ apụọ n’ọgbakọ jiri ịhụnanya nabataghachi m, dị ka à ga-asị na ọ dịghị ihe merenụ. O nyere m obi ụtọ nke ukwuu mgbe ha ji ihu ọchị na mmakụ na-ekpo ọkụ nabata m. Enwere m nnọọ obi ụtọ na mụ na Jehova na ụmụnna m dịghachiri ná mma.”

Ịga n’Ihu n’Ọgụ Ime Mmụọ

Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị agbalịsiwo ike iji kwụsie ike n’okwukwe ya. Nwanne m nwoke bụ́ Peter kwuru, sị: “Taa, ihe ndị na-adọpụ uche na ọchịchọ ịdị ka ibe n’ihe banyere akụnụba gbara anyị gburugburu karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Mgbe ahụ a machibidoro ọrụ anyị iwu, afọ juru anyị n’ihe ndị anyị nwere. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị onye n’ime anyị chọrọ ịnọ n’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ ọzọ nanị n’ihi na ebe a na-enwe ya amasịghị ya, ọ dịghịkwa onye mere mkpesa na ebe ndị a na-enwe ọmụmụ ihe dị anya ma ọ bụ na a na-enwe ha n’ime abalị. Obi dị anyị nile ụtọ ịbịakọ ọnụ asịbedị na ụfọdụ n’ime anyị ga-echere ruo elekere anya iri na otu nke abalị tupu ha alawa mgbe e mechisịrị ọmụmụ ihe ahụ.”

Na 1959, mama m kpebiri ịkpọrọ Sabine, bụ́ onye dị afọ iri na isii mgbe ahụ gaa West Germany. Ebe ọ bụ na ha chọrọ ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze, alaka ụlọ ọrụ gwara ha ka ha gaa Ellwangen, Baden-Württemberg. Ịnụ ọkụ n’obi mama m nwere n’agbanyeghị na ahụ́ esichaghị ya ike kpaliri Sabine ịmalite ọrụ ịsụ ụzọ mgbe ọ dị afọ iri na asatọ. Mgbe Sabine lụrụ di, mama m mụrụ otú e si akwọ ụgbọala mgbe ọ dị afọ iri ise na asatọ iji mụbaa òkè ọ na-ekere n’ọrụ ime nkwusa ahụ. O ji ozi a kpọrọ ihe ruo mgbe ọ nwụrụ na 1974.

Mgbe ọ fọrọ obere ka m nọzuo afọ isii n’ụlọ mkpọrọ nke ugboro abụọ m gara, a gbaara m ụgbọ nwa mkpi na 1965 gaa West Germany n’emeghị ka ezinụlọ m mara banyere ya. Otú ọ dị, ka oge na-aga, nwunye m bụ Anni, na nwa anyị nwanyị bụ́ Ruth kwakwutere m n’ebe ahụ. Ajụrụ m alaka ụlọ ọrụ ma ànyị nwere ike ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze, ha gwara anyị ka anyị gaa Nördlingen, Bavaria. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Ruth na nwanne ya nwoke bụ́ Johannes, nọ tolite. Nwunye m malitere ọrụ ịsụ ụzọ. Ezi ihe nlereanya ya kpaliri Ruth ịmalitekwa ịsụ ụzọ ozugbo ọ gụsịrị akwụkwọ. Ụmụ anyị abụọ ahụ lụchara ndị ọsụ ụzọ. Ha nwere ezinụlọ nke ha ugbu a, e jirikwala ọmarịcha ụmụ ụmụ isii gọzie anyị.

Eji m oge ezumike nká m lara n’oge na 1987 sonyere nwunye m n’ọrụ ịsụ ụzọ. Afọ atọ ka e mesịrị, a kpọrọ m ịga nye aka n’ime ka alaka ụlọ ọrụ dị na Selters bukwuo ibu. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị nyere aka wuo Ụlọ Mgbakọ mbụ nke Ndịàmà Jehova n’ebe bụbu East Germany, na Glauchau, bụ́ ebe anyị mechara jee ozi dị ka ndị na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi nsogbu ahụ́ ike, anyị lakwuuru nwa anyị nwanyị n’Ọgbakọ Nördlingen, bụ́ ebe anyị na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ.

Ihe kasị enye m ọṅụ bụ na ụmụnne m nile na ọtụtụ n’ime ndị ezinụlọ anyị nọgidere na-ejere Chineke anyị dị ebube bụ́ Jehova ozi. Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị amụtala na ọ bụrụhaala na anyị anọgidesie ike n’ụzọ ime mmụọ, anyị ga-ahụ na ihe a e kwuru n’Abụ Ọma 126:3 bụ eziokwu: “Jehova emeworo anyị ihe ukwu; anyị na-aṅụrị ọṅụ.”

[Foto dị na peeji nke 13]

N’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ na 1957

[Foto dị na peeji nke 13]

Mụ na ezinụlọ m na 1948: (n’ihu, site n’aka ekpe gaa n’aka nri) Manfred, Berta, Sabine, Hannelore, Peter; (n’azụ, site n’aka ekpe gaa n’aka nri) mụ na Jochen

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Akwụkwọ pere mpe nke e jiri mee ihe n’oge ahụ a machibidoro ọrụ anyị iwu; ígwè ọrụ ndị “Stasi” ji ege ihe ndị anyị na-ekwu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Forschungs- und Gedenkstätte NORMANNENSTRASSE

[Foto dị na peeji nke 16]

Mụ na ụmụnne m: (n’ihu, site n’aka ekpe gaa n’aka nri) Hannelore na Sabine; (n’azụ, site n’aka ekpe gaa n’aka nri) mụ, Jochen, Peter, na Manfred