Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka E Ji Kwesị Ịmata Onye ahụ Na-emegide Kraịst?

N’ihi Gịnị Ka E Ji Kwesị Ịmata Onye ahụ Na-emegide Kraịst?

N’ihi Gịnị Ka E Ji Kwesị Ịmata Onye ahụ Na-emegide Kraịst?

Otu onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ dere ogologo oge gara aga, sị: “Unu nụrụ na onye na-emegide Kraịst na-abịa.” (1 Jọn 2:18) Ihe a Jọn kwuru na-akpali nnọọ mmasị. Ndị mmadụ anọwo na-eche ihe okwu ahụ pụtara kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ònye bụ onye ahụ na-emegide Kraịst? Olee mgbe ọ ga-abịa? Olee ihe ọ ga-eme ma ọ bịa?

E NWEELA ọtụtụ ndị a sịrị na ha bụ ndị na-emegide Kraịst. N’oge gara aga, ndị a kpọrọ “ndị na-emegide Kraịst” gụnyere ndị Juu, ndị popu Katọlik, na ndị eze ukwu Rom. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Ukwu Frederick nke Abụọ (1194-1250) jụrụ iso n’Agha Ntụte a na-ebuso ndị a sị na ha jụrụ okwukwe, Popu Gregory nke Itoolu kpọrọ ya onye na-emegide Kraịst ma chụpụ ya. Onye nọchiri Gregory, bụ́ Innocent nke Anọ, chụpụkwara Frederick ọzọ. Iji megwara ya, Frederick kpọsara na ọ bụ Innocent bụ onye ahụ na-emegide Kraịst.

Ọ bụ nanị Jọn onyeozi bụ onye ji okwu ahụ bụ́ “onye na-emegide Kraịst” mee ihe n’ime ndị nile so dee Bible. Okwu ahụ pụtara ugboro ise n’abụọ n’ime akwụkwọ ozi ndị bu aha ya, ma n’ebe e jiri ya mee ihe n’ụdị na-egosi na ọ bụ otu onye ma n’ebe e jiri ya mee ihe n’ụdị na-egosi na ha dị ọtụtụ. E depụtara amaokwu ndị ha pụtara na ha n’igbe dị na peeji na-esonụ. Amaokwu ndị a gosiri na onye ahụ na-emegide Kraịst bụ onye ụgha na onye nduhie, nke na-agbalịsi ike imebi mmekọrịta mmadụ na Kraịst nakwa nke mmadụ na Chineke. N’ihi ya, onyeozi ahụ gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu nile sitere ná mkpali nke mmụọ, kama nwaleenụ okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ ịhụ ma hà sitere na Chineke, n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abawo n’ime ụwa.”—1 Jọn 4:1.

Jizọs dọkwara aka ná ntị banyere ndị nduhie, ma ọ bụ ndị amụma ụgha, na-asị: “[Ha] na-eyi ihe mgbokwasị atụrụ abịakwute unu, ma n’ime, ha bụ nkịta ọhịa agụụ ji. Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ [ma ọ bụ, ọrụ] ha.” (Matiu 7:15, 16) Jizọs ọ̀ nọ na-adọ ụmụazụ ya aka ná ntị banyere onye ahụ na-emegide Kraịst n’ụzọ ihe atụ? Ka anyị hụ otú anyị pụrụ isi mata onye bụ onye nduhie a obi fere azụ.