Ebla—Obodo Ochie E Chefuru Echefu nke A Chọtara
Ebla—Obodo Ochie E Chefuru Echefu nke A Chọtara
N’oge okpomọkụ nke afọ 1962, Paolo Matthiae, bụ́ nwa okorobịa bụ́ ọkà mmụta ihe ochie n’Ịtali, ji obi abụọ nyochaa ala dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Siria, n’ihi na o cheghị na ọ dị ihe ọ ga-achọta. E weere ime ime Siria dị ka ebe a na-anaghị achọtakarị ihe ochie. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị mesịrị were ihe e gwupụtara n’afọ 1964 n’obodo Tell Mardikh, nke dị ihe dị ka kilomita 60 site n’ebe ndịda Aleppo, dị ka ‘ihe kasị mkpa e gwupụtara n’ala na narị afọ nke 20.’
IHE odide ochie gosiri na ọ dị obodo aha ya bụ Ebla. Ma, ọ dịghị onye maara ebe a ga-achọta obodo ahụ n’ime ọtụtụ mkpọmkpọ ebe ndị e nwere n’Etiti Ebe Ọwuwa Anyanwụ Ụwa. Otu ihe odide kwuru banyere mmeri Sagọn, bụ́ eze Akkad, meriri “Mari, Yarmuti, na Ebla.” N’ihe odide ọzọ, Eze Gudea nke Sumer kwuru banyere osisi ndị dị oké ọnụ ahịa o nwetara “n’ugwu ndị dị n’Ibla [Ebla].” A hụkwara aha ahụ bụ́ Ebla n’otu ihe odide dị na Karnak, Egypt, bụ́ ebe e depụtasịrị obodo oge ochie ndị Fero Thutmose nke atọ meriri. Ị pụrụ ịghọta ihe mere ndị okà mmụta ihe ochie ji gbalịa ịchọta Ebla.
E mechakwara gwupụta ihe ndị ọzọ n’ebe ahụ. N’afọ 1968, e gwupụtara otu akụkụ nke ihe oyiyi Ibbit-Lim, bụ́ otu eze chịrị Ebla. E ji asụsụ Akkadian dee otu nkwa n’ahụ́ ya nke na-egosi na a raara ya nye chi nwanyị bụ́ Ishtar, bụ́ chi “a ma ama n’Ebla.” Ee, ihe ndị e gwupụtara n’ala malitere ikpughe “asụsụ ọhụrụ, akụkọ ọhụrụ, na ọdịnala ọhụrụ.”
Ihe odide cuneiform e gwupụtara n’afọ 1974 na 1975 na Tell Mardikh bụ́ nke e dere Ebla n’ọtụtụ ebe na ya mere ka o doo anya na Tell Mardikh na obodo oge ochie ahụ bụ́ Ebla bụ otu ebe. Ihe ndị e gwupụtara n’obodo ahụ gosikwara na e nweela ọ dịkarịa ala obodo abụọ dịrịla ebe ahụ. Mgbe Ebla wusịrị ewu ruo oge ụfọdụ, e bibiri ya. E mesịrị wughachi Ebla, bibie ya ọzọ ma chefuo ya ruo ọtụtụ narị afọ.
Otu Obodo nke Nwere Ọtụtụ Akụkọ
E wuru obodo ndị kasị ochie n’ebe dịdebere mmiri, dị ka n’ógbè dị n’agbata osimiri Taịgris na Yufretis, bụ́ ebe a ga-enwe nnọọ ike ịrụ ọrụ ubi. Obodo ndị mbụ a kpọrọ aha na Bible dị na Mesopotemia. (Jenesis 10:10) O yiri ka aha ahụ bụ́ Ebla ọ̀ pụtara “Okwute Ọcha,” nke na-ezo aka n’okwute limestone dị n’ime ala n’okpuru obodo ahụ. O doro anya na a họọrọ iwu obodo ahụ ebe ahụ ọ dị n’ihi na okwute limestone dị n’ebe ahụ mere ka ọ dị mfe inweta mmiri, bụ́ ihe dị mkpa n’ógbè osimiri na-adighị nso na ya.
Ụkọ mmiri ozuzo a na-enwe n’Ebla mere ka ọ bụrụ nanị mkpụrụ akụ́kụ́, osisi vaịn, na nke oliv ka a na-akụkarị n’ebe ahụ. Ebe ahụ dịkwa mma maka ịzụ anụ ụlọ, karịsịa atụrụ. Ebe dị mma Ebla dị—n’agbata Ebe Dị Larịị na Mesopotemia na Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian—mere ka a na-azụ ahịa osisi, nkume ndị na-adịchaghị oké ọnụ, na ụdị ọla dị iche iche na ya. Obodo ahụ chịrị ógbè nke ihe dị ka narị puku mmadụ abụọ bi na ya, ihe rukwara otu ụzọ n’ụzọ iri n’ime ha bi n’isi obodo ya.
Nnukwu obí eze dakasịrị adakasị a hụrụ n’ebe ahụ gosiri na Ebla wuru ezigbo owuwu n’oge ahụ. Ọnụ ụzọ ámá e si abanye n’obí eze
ahụ dị ihe dị ka mita 12 ma ọ bụ 15 n’elu. E wusara obí eze ahụ ka oge na-aga n’ihi na ọchịchị nke eze na-achị n’ebe ahụ nọgidere na-agbasa agbasa. Ndị na-arụrụ eze ọrụ nwere ọtụtụ ndị ha na-anọ n’okpuru ha—“ndị isi” na “ndị okenye” na-enyere eze na nwunye ya aka n’ọchịchị.A chọtala mbadamba ihe e ji ụrọ kpụọ na iberibe ihe ndị ọzọ karịrị puku iri na asaa. Na mbụ, a chọtara ikekwe mbadamba ihe ndị e ji ụrọ kpụọ karịrị puku anọ ka zuru ezu, bụ́ ndị e ji nlezianya dokwasịchaa n’elu shelf osisi. Mbadamba ihe ndị a e dere ihe na ha gosiri na Ebla na ọtụtụ obodo zụkọrịtara ahịa. Dị ka ihe atụ, arịa ndị a hụrụ n’Ebla bụ́ ndị bú akara nke ndị fero abụọ gosiri na obodo ahụ na Ijipt zụkọrịtara ahịa. Ọtụtụ ihe ndị e dere ná mbadamba ụrọ ndị ahụ dị n’ụdị ihe odide cuneiform nke ndị Sumer. Ma e dere ụfọdụ n’asụsụ Eblaite, bụ́ asụsụ ụmụ Shem a sụrụ n’oge ochie, ihe odide ndị a nyekwara aka ịkọwa ihe ihe ndị e dere na ha pụtara. Ọ tụrụ ndị ọkà mmụta ihe banyere ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’anya na ha chọtara ụdị asụsụ ụmụ Shem oge ochie dị otụ́ ahụ. O nwere ike ịmasị gị ịnụ na ụfọdụ n’ime mbadamba ihe ndị ahụ nwere ihe odide n’asụsụ Sumerian na nke Eblaite. Akwụkwọ bụ́ Ebla—Alle origini della civiltà urbana (Ebla—Ebe Mmepe Obodo Malitere) kpọrọ ha “akwụkwọ ọkọwa okwu ndị kasị ochie anyị maara.”
Ihe àmà na-egosi na Ebla bụ obodo a ma ama n’agha, n’ihi na ihe ndị e gwupụtara n’ala na-egosi ebe ndị dike Ebla na-egbu ndị iro ha ma ọ bụ ebe ha na-egosi isi ndị ha gburu egbu. Ma, ike Ebla nyụrụ ka ọkụ mgbe a malitere ịnụ aha ndị Asiria na ndị Babilọn. Ọ dịghị mfe ịmata kpọmkwem otú ihe ndị ahụ si mee, ma o yiri ka Sagọn nke mbụ (ọ bụghị Sagọn nke dị n’Aịsaịa 20:1) na nwa nwa ya bụ́ Naram-Sin hà lụsoro Ebla agha. Ihe ndị e gwupụtara n’ala gosiri na e gburu ọtụtụ ndị n’agha ahụ, nakwa na ihe a kwakọọrọ n’Ebla buru ibu.
Ma, dị ka e kwurula, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, obodo ahụ bilitere ọzọ, ọbụnakwa maliteghachi iwu ewu n’ógbè ahụ. E wuru obodo ọhụrụ ahụ dabere kpọmkwem n’atụmatụ e leziri anya mee, bụ́ nke mere ka ọ maa nnọọ mma. N’ebe ndịda nke obodo ahụ, e nwere otu ebe a raara nye chi nwanyị bụ́ Ishta, bụ́ chi ndị Babilọn weere dị ka chi
na-eme ka ihe ubi mee. Ọ pụrụ ịbụ na ị nụla banyere Ọnụ Ụzọ Ámá Ishta ahụ a ma ama, bụ́ nke e gwupụtara ná mkpọmkpọ ebe nke Babilọn. Ọ dị otu nnukwu ụlọ dị n’Ebla nke yiri ka ọ̀ bụ ebe a na-edowebu ọdụm, bụ́ anụ a sịrị dị nsọ nye chi nwanyị bụ́ Ishta. Ka anyị kwuzie banyere okpukpe ndị Ebla.Okpukpe Ndị Ebla
Dịkwa ka ebe ndị ọzọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge ochie, Ebla nwere ụlọ arụsị maka chi ndị dị n’ebe ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Bel, Hedad (bụ́ ebe e si nweta aha nke ndị eze ụfọdụ nke ndị Siria), na Dagan. (1 Ndị Eze 11:23; 15:18; 2 Ndị Eze 17:16) Ndị Ebla kwanyeere ha nile ùgwù. Ha kwanyeere ọbụnadị chi ndị mba ọzọ ùgwù. Ihe ndị e gwupụtara n’ala gosiri na ha fekwara ndị nna nna ha bụ́ ndị eze ofufe dị ka chi, karịsịa na narị afọ nke iri abụọ T.O.A.
Ndị Ebla adabereghị nanị na chi ha. Ebla ọhụrụ ahụ nwekwara nnukwu mgbidi abụọ gbara ya gburugburu, bụ́ nke nwere ike imenye onye iro ọ bụla egwu. Gburugburu mgbidi nke nọ ná mpụta fọrọ obere ka o ruo kilomita atọ. A ka na-ahụ ha anya nke ọma.
Otú ọ dị, ọbụnadị Ebla ahụ e wughachiri ewughachi pụkwara n’anya. Ma eleghị anya ndị Het meriri mba a siburu ike kpamkpam n’ihe dị ka afọ 1600 T.O.A. Otu uri a gụrụ n’oge ochie kwuru na “e tipịara [Ebla] dị ka ite ájá.” N’oge na-adịghị anya ọ malitere ịpụ n’akụkọ ihe mere eme. Ihe odide ndị agha ntụte gara Jeruselem dere n’afọ 1098 kwuru ebe Ebla dịbu, kwuokwa na ọ bụ obodo dịpụrụ adịpụ nke nọ ná mpụga mpụga, nke aha ya bụ Mardikh. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e chefuchaala Ebla, ma e mesịrị chọtaghachi ya ka ọtụtụ narị afọ gasịrị.
[Igbe dị na peeji nke 14]
EBLA NA BIBLE
Otu isiokwu e bipụtara n’afọ 1976 na magazin bụ́ Biblical Archeologist kpaliri mmasị nke ndị ọkà mmụta Bible. Onye kọwara ihe e dere ná mbadamba ihe odide ndị a chọtara n’Ebla kwuru na o nwere ike ịbụ na ihe odide ndị ahụ nwekwara aha nke ndị mmadụ na ebe ndị a kpọrọ aha na Bible ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị. Ikekwe, site n’ikwu ihe karịrị ihe akwụkwọ ahụ kwuru, ụfọdụ malitere ide na ihe e gwutere n’Ebla emeela ka e nwee ihe akaebe na-egosi na ihe ndị e dere na Jenesis bụ eziokwu. * Onye Jesuit bụ́ Mitchell Dahood kwuru na “mbadamba ihe odide ụrọ ndị ahụ [e gwupụtara n’Ebla] na-akọwa ihe ndị Bible na-akọwaghị.” Dị ka ihe atụ, o kweere na ha nwere ike ime ka a ghọtakwuo “na e ji aha Chineke Izrel mee ihe n’oge ochie.”
Ugbu a, e jirikwuola nlezianya na-enyocha ihe odide ndị a. Ebe ọ bụ na ma asụsụ Hibru ma nke Eblaite bụcha asụsụ ụmụ Shem oge ochie, o kwere omume na aha obodo ụfọdụ na mmadụ ụfọdụ na ndị nke dị na Bible ga-abụ otu ụdị aha. Ma nke a apụtaghị na aha ndị a na-ekwu maka otu obodo ma ọ bụ otu onye. A hụbeghị otú ihe ndị a chọtara n’Ebla nwere ike isi nyere anyị aka n’ịmụ Bible. N’ihe banyere aha Chineke, onye dere akwụkwọ bụ́ Biblical Archeologist gọrọ agọ na ọ dịghị mgbe ya kwuru na a kpọrọ “Yahweh” aha n’ihe odide ndị ahụ e nwetara n’Ebla. Ma nye ọtụtụ ndị ọkà mmụta, akara cuneiform ahụ a kọwara dị ka ja bụ nnọọ aha otu n’ime ọtụtụ chi ndị dị n’ụlọ arụsị nke ndị Ebla, ebe ọtụtụ ndị ọkachamara kọwara ya dị ka akara na-enye aka n’ịkpọzi okwu akpọzi. N’agbanyeghị nke ọ bụ n’ime ha abụọ, ọ naghị ekwu banyere otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.—Deuterọnọmi 4:35; Aịsaịa 45:5.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 19 Iji hụ otú nkà mmụta ihe ochie si akwado ihe dị na Bible, lee peeji nke 14-17 nke broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Map/Foto dị na peeji nke 12]
Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
OSIMIRI UKWU
KENAN
SIRIA
Aleppo
Ebla (Tell Mardikh)
Osimiri Yufretis
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ọkà mmụta ihe ochie: Missione Archeologica Italiana a Ebla - Università degli Studi di Roma ‘La Sapienza’
[Foto dị na peeji nke 12, 13]
Ihe osise nke ihe olu ọlaedo e mepụtara n’ihe dị ka afọ 1750 T.O.A.
[Foto dị na peeji nke 13]
Nnukwu obí eze dakasịrị adakasị
[Foto dị na peeji nke 13]
Mbadamba ihe odide e ji ụrọ kpụọ bụ́ ndị e debere n’ebe ndebe ihe mgbe ochie
[Foto dị na peeji nke 13]
Mbadamba ihe odide “cuneiform”
[Foto dị na peeji nke 13]
Mkpara ndị eze Ijipt, 1750-1700 T.O.A.
[Foto dị na peeji nke 13]
Onye dike Ebla na isi ndị iro ha
[Foto dị na peeji nke 14]
Otu ogidi e dere ihe na ya bụ́ nke a raara nye chi nwanyị bụ́ Ishta
[Ebe E Si Nweta Foto]
Missione Archeologica Italiana a Ebla - Università degli Studi di Roma ‘La Sapienza’
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 13]
Ihe osise nile (ma e wezụga obí eze ahụ dakasịrị adakasị): Missione Archeologica Italiana a Ebla - Università degli Studi di Roma ‘La Sapienza’