Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova ‘Ga-eme Ka E Kpee Ikpe Ziri Ezi’

Jehova ‘Ga-eme Ka E Kpee Ikpe Ziri Ezi’

Jehova ‘Ga-eme Ka E Kpee Ikpe Ziri Ezi’

“Chineke ọ́ gaghị eme ka e kpeere ndị ọ họọrọ ikpe ziri ezi, bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị?”—LUK 18:7.

1. Olee ndị ihe nlereanya ha na-agba gị ume, n’ihi gịnịkwa?

N’ETITI Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, e nwere ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị feworo Jehova n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ. Ị̀ maara ụfọdụ n’ime ezi ụmụnna ndị a? Ikekwe i chetala otu nwanna nwanyị merela agadi, bụ́ onye e mere baptizim ọtụtụ afọ gara aga ma ya ana-abịachi ọmụmụ ihe anya. Ma ọ bụ gị echeta otu nwanna nwoke merela agadi, bụ́ onye na-akwadosi ozi ubi ọgbakọ ike kwa izu, ọ nọwokwa na-eme nke ahụ ruo ọtụtụ iri afọ ugbu a. N’ezie, ọtụtụ n’ime ndị a kwesịrị ntụkwasị obi chere na Amagedọn ekwesịla ịbịa. N’agbanyeghị nke ahụ, na ụwa a na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi ka dị emebeghị ka obi ike ha nwere ná nkwa Jehova daa mbà, ma ọ bụkwanụ mee ka mkpebi ha mere ‘ịtachi obi ruo ọgwụgwụ’ nyụọ ka ọkụ. (Matiu 24:13) Okwukwe siri ike nke ndị ohu Jehova dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwere na-agba mmadụ nile nọ n’ọgbakọ ume.—Abụ Ọma 147:11.

2. Olee otu ọnọdụ nke na-ewute anyị?

2 Ma, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịhụ ndị kwụsịrị ife Jehova. Ụfọdụ Ndịàmà jere ozi ruo ọtụtụ afọ, ma okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ jiri nwayọọ nwayọọ nyụọ ka ọkụ, ha akwụsịkwa iso ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ na-ewute anyị na ndị bụbu ụmụnna anyị hapụrụ Jehova, ọ bụkwa ọchịchọ obi anyị ịnọgide na-enyere “atụrụ nke [ọ bụla] furu efu” aka ịlaghachi n’ìgwè atụrụ ahụ. (Abụ Ọma 119:176; Ndị Rom 15:1) N’agbanyeghị nke ahụ, ịhụ na ụfọdụ ka kwesịrị ntụkwasị obi ebe ndị ọzọ na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi na-akpali anyị ịjụ ajụjụ ụfọdụ. Gịnị na-eme ka ọtụtụ Ndịàmà nọgide na-enwe okwukwe n’ebe nkwa ndị Jehova kwere dị ebe ndị ọzọ na-enwekwaghị okwukwe na ha? Gịnị ka onye nke ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime iji hụ na nkwenye anyị kwenyere na “oké ụbọchị Jehova” dị nso nọgidere na-esi ike? (Zefanaịa 1:14) Ka anyị tụlee otu ihe atụ nke dị n’Oziọma Luk.

Ịdọ Aka ná Ntị Maka Ndị Dị Ndụ “Mgbe Nwa nke Mmadụ Ga-abịarute”

3. Ole ndị karịsịa pụrụ irite uru n’ihe atụ banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ na ọkàikpe ahụ, n’ihi gịnịkwa?

3 Na Luk isi 18, anyị hụrụ ihe atụ Jizọs nyere banyere otu nwanyị di ya nwụrụ na otu ọkàikpe. O yiri ihe atụ nke nwoke ahụ nwere onye ọbịa, bụ́ onye nọgidesiri ike n’arịrịọ ya, bụ́ nke anyị tụlere n’isiokwu bu nke a ụzọ. (Luk 11:5-13) Otú ọ dị, ihe ndị ọzọ e kwuru n’ebe ahụ e nyere ihe atụ banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ na ọkàikpe ahụ na Bible na-egosi na ndị o metụtara karịsịa bụ ndị dị ndụ “mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute” n’ike Alaeze, bụ́ nke malitere n’afọ 1914.—Luk 18:8. *

4. Gịnị ka Jizọs kọrọ banyere ya tupu ya enye ihe atụ ahụ dị na Luk isi 18?

4 Tupu Jizọs enye ihe atụ ahụ, o kwuru na mmadụ nile ga-enwe ike ịghọta ọnụnọ ya n’ike Alaeze “dị ka àmụ̀mà” nke ‘na-enwu site n’otu akụkụ n’okpuru eluigwe ruo n’akụkụ ọzọ n’okpuru eluigwe.’ (Luk 17:24; 21:10, 29-33) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” agaghị echebara ihe àmà ahụ doro anya echiche. (Daniel 12:4) N’ihi gịnị? N’ihi otu ihe ahụ mere ka ndị bi n’oge Noa na n’oge Lọt leghara ịdọ aka ná ntị Jehova anya. N’oge ndị ahụ, ndị mmadụ ‘nọ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-azụ, na-ere, na-akụ ihe, na-ewukwa ihe ruo ụbọchị ahụ e bibiri ha.’ (Luk 17:26-29) Ihe mere ha ji nwụọ bụ na ha mikpuru onwe ha n’ihe ndị ahụ nke na ha emeghị uche Chineke. (Matiu 24:39) N’otu aka ahụ taa, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-etinye nnọọ oge ha nile n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị nke na ha adịghị ahụ ihe àmà ndị na-egosi na ọgwụgwụ nke ụwa a na-adịghị asọpụrụ Chineke dị nso.—Luk 17:30.

5. (a) Olee ndị Jizọs dọrọ aka ná ntị, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ihe mere ka ụfọdụ ndị kwụsị inwe okwukwe?

5 O doro anya na nchegbu Jizọs nwere bụ na ụwa Setan nwere ike ịdọpụkwa uche ndị na-eso ụzọ ya, ọbụna ruo n’ókè nke na ha pụrụ ‘ịlaghachi n’ihe ndị ha hapụworo.’ (Luk 17:22, 31) N’ezie, nke ahụ emewokwa ụfọdụ Ndị Kraịst. Ruo ọtụtụ afọ, ọ gụrụ nnọọ ndị dị otú ahụ agụụ ịhụ mgbe Jehova ga-ebibi ụwa ajọ omume a. Otú ọ dị, mgbe Amagedọn na-abịaghị mgbe ha tụrụ anya ya, okwukwe ha nyụrụ ka ọkụ. Obi esikwaghị ha ike na ụbọchị ikpe Jehova dị nso. Ha kwụsịlatara ozi ha ma jiri nwayọọ nwayọọ tinye isi n’ihe ụwa nke na ha enwechakwaghị oge maka ofufe Chineke. (Luk 8:11, 13, 14) Ka oge na-aga, ha ‘laghachiri n’ihe ndị ha hapụworo’—nke ahụ na-ewute nnọọ ewute!

Mkpa Ọ Dị “Ikpe Ekpere Mgbe Nile”

6-8. (a) Kọọ ihe atụ Jizọs nyere banyere nwanyị di ya nwụrụ na otu ọkàikpe. (b) Olee otú Jizọs si kọwaa ihe atụ a?

6 Gịnị ka anyị pụrụ ime iji hụ na obi ike anyị nwere na nkwa Jehova ga-emezurịrị ajụghị oyi? (Ndị Hibru 3:14) Jizọs zara ajụjụ ahụ ozugbo ọ dọsịrị ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha ghara ịlaghachi n’ụwa ajọ omume nke Setan.

7 Luk kọrọ na Jizọs ‘malitere inye ha otu ihe atụ banyere mkpa ọ dị ha ikpe ekpere mgbe nile ma ghara ịda mbà.’ Jizọs kwuru, sị: “N’otu obodo, e nwere otu ọkàikpe nke na-adịghị atụ egwu Chineke, nke na-adịghịkwa akwanyere mmadụ ùgwù. Ma e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ n’obodo ahụ, ọ nọgidekwara na-agakwuru ọkàikpe ahụ, na-asị, ‘Hụ na m nwetara ikpe ziri ezi n’aka onye na-emegide m n’okwu ikpe.’ O kweghịkwa ruo oge ụfọdụ, ma e mesịa ọ gwara onwe ya, sị, ‘Ọ bụ ezie na adịghị m atụ Chineke egwu ma ọ bụ na-akwanyere mmadụ ùgwù, ka o sina dị, n’ihi nsogbu nwanyị a di ya nwụrụ nọgidere na-enye m, m ga-ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka o wee ghara ịnọgide na-abịa enyegbu m ná nsogbu.’”

8 Mgbe Jizọs nyechara ihe atụ a, ọ kọwara ya, sị: “Nụrụnụ ihe ọkàikpe ahụ kwuru, ọ bụ ezie na ọ bụ onye ajọ omume! Ya mere, n’ezie, Chineke ọ́ gaghị eme ka e kpeere ndị ọ họọrọ ikpe ziri ezi, bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị, n’agbanyeghị na o nwere ogologo ntachi obi n’ebe ndị ahụ nọ? Asị m unu, Ọ ga-eme ka e kpeere ha ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ. Otú o sina dị, mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ okwukwe ahụ n’elu ụwa?”—Luk 18:1-8.

“Hụ na M Nwetara Ikpe Ziri Ezi”

9. Olee isi ihe a na-ekwu banyere ya n’ihe atụ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ na ọkàikpe ahụ?

9 Isi ihe a na-ekwu n’ihe atụ a doro nnọọ anya. Ma mmadụ abụọ ahụ e kwuru banyere ha n’ihe atụ ahụ ma Jizọs kpọtụchara ya aha. Nwanyị ahụ di ya nwụrụ rịọrọ, sị: “Hụ na m nwetara ikpe ziri ezi.” Ọkàikpe ahụ kwuru, sị: “M ga-ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi.” Jizọs jụrụ, sị: ‘Chineke ọ́ gaghị eme ka e kpee ikpe ziri ezi?’ Jizọs kwukwara banyere Jehova, sị: “Ọ ga-eme ka e kpeere ha ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ.” (Luk 18:3, 5, 7, 8) Olee mgbe kpọmkwem ka Chineke ‘ga-eme ka e kpee ikpe ziri ezi’?

10. (a) Olee mgbe e mere ihe e kpere n’ikpe na narị afọ mbụ? (b) Olee mgbe a ga-ekpere ndị ohu Chineke nke oge a ikpe ziri ezi, oleekwa otú a ga-esi kpeere ha ya?

10 Na narị afọ mbụ, “ụbọchị ime ihe e kpere n’ikpe” (ma ọ bụ “ụbọchị ịbọ ọbọ,” Kingdom Interlinear) bịara n’afọ 70 O.A. mgbe e bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya. (Luk 21:22) A ga-ekpere ndị ohu Chineke taa ikpe ziri ezi ‘n’oké ụbọchị Jehova.’ (Zefanaịa 1:14; Matiu 24:21) N’oge ahụ, Jehova ga-eji ‘mkpagbu kwụghachi ndị ahụ na-eme ka ndị ya nwee mkpagbu’ “ka [Jizọs Kraịst] na-eweta ịbọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.”—2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8; Ndị Rom 12:19.

11. Olee ụzọ a ga-esi kpee ikpe ziri ezi “ọsọ ọsọ”?

11 Otú ọ dị, olee otú anyị kwesịrị isi ghọta nkwa siri ike Jizọs kwere anyị na Jehova ga-eme ka e kpee ikpe ziri ezi “ọsọ ọsọ”? Okwu Chineke na-egosi na “n’agbanyeghị na [Jehova] nwere ogologo ntachi obi,” ọ ga-emezu ihe e kpere n’ikpe ọsọ ọsọ mgbe oge ya zuru. (Luk 18:7, 8; 2 Pita 3:9, 10) N’oge Noa, mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, e bibiri ndị ajọ omume n’egbughị oge. N’otu aka ahụ, n’oge Lọt, mgbe ọkụ si n’eluigwe zoo ka mmiri, ndị ajọ omume lara n’iyi. Jizọs kwuru, sị: “Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị ahụ mgbe a gaje ikpughe Nwa nke mmadụ.” (Luk 17:27-30) Ọzọkwa, “mbibi mberede” gaje ịbịakwasị ndị ajọ omume. (1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 3) N’ezie, anyị pụrụ inwe obi ike na ikpe ziri ezi ga-eme ka Jehova ghara ikwe ka ụwa Setan jiri otu ụbọchị gafee ụbọchị e kwesịrị ibibi ya.

“Ọ Ga-eme Ka E Kpeere Ha Ikpe Ziri Ezi”

12, 13. (a) Olee otú a pụrụ isi mụta ihe n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ na ọkàikpe ahụ? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova ga-anụ ekpere anyị ma mee ka e kpeere anyị ikpe ziri ezi?

12 Ihe atụ Jizọs nyere banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ na ọkàikpe ahụ na-akụziri anyị eziokwu ndị ọzọ dị mkpa. N’ịkọwa ihe atụ ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Nụrụnụ ihe ọkàikpe ahụ kwuru, ọ bụ ezie na ọ bụ onye ajọ omume! Ya mere, n’ezie, Chineke ọ́ gaghị eme ka e kpeere ndị ọ họọrọ ikpe ziri ezi?” N’ezie, Jizọs ejighị Jehova tụnyere ọkàikpe ahụ dị ka à ga-asị na Chineke ga-emeso ndị kwere ekwe ihe n’otu ụzọ ahụ. Kama nke ahụ, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otu ihe banyere Jehova site n’igosi ha ọdịiche dị n’etiti Chineke na ọkàikpe ahụ. Olee ụzọ ụfọdụ ha si dịrị iche?

13 Ọkàikpe ahụ Jizọs kọrọ banyere ya n’ihe atụ ya bụ “onye ajọ omume,” ebe “Chineke bụ onyeikpe na-eme ezi omume.” (Abụ Ọma 7:11; 33:5) Ọkàikpe ahụ enweghị mmasị ọ bụla n’ebe nwanyị ahụ di ya nwụrụ nọ, ma Jehova nwere mmasị n’ebe onye nke ọ bụla n’ime anyị nọ. (2 Ihe E Mere 6:29, 30) Ọkàikpe ahụ enweghị mmasị inyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ aka, ma Jehova nwere mmasị—ee, dịrị njikere—inyere ndị na-efe Ya aka. (Aịsaịa 30:18, 19) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta na ya? Ọ bụrụ na ọkàikpe ahụ bụ́ onye ajọ omume gere nwanyị ahụ di ya nwụrụ ntị ma mee ka e kpeere ya ikpe ziri ezi, Jehova ga-anụ ekpere ndị ya na-ekpegara ya ma mee nnọọ ka e kpeere ha ikpe ziri ezi karị!—Ilu 15:29.

14. N’ihi gịnị ka obi kwesiri iji sie anyị ike na ụbọchị ikpe Jehova ga-abịa?

14 N’ihi ya, ndị na-enwekwaghị okwukwe n’ọbịbịa nke ụbọchị ikpe Chineke hiere nnọọ ụzọ. N’ihi gịnị? Site n’ịghara ikwenyesikwa ike na “oké ụbọchị Jehova” dị nso, obi esikwaghị ha ike na Jehova ga-emezuli nkwa nile o kwere. Ma ọ dịghị onye nwere ezi ihe ọ ga-eji kwuo na Chineke ekwesịghị ntụkwasị obi. (Job 9:12) Ajụjụ dị mkpa bụ, Ànyị ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’otu n’otu? Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Jizọs kwuru banyere ya mgbe o nyechara ihe atụ banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ na ọkàikpe ahụ.

“Ọ̀ Ga-ahụ Okwukwe ahụ n’Elu Ụwa?”

15. (a) Olee ajụjụ Jizọs jụrụ, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

15 Jizọs jụrụ ajụjụ ahụ na-adọrọ mmasị, bụ́: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ okwukwe ahụ n’elu ụwa?” (Luk 18:8) Okwu ahụ bụ́ “okwukwe ahụ” na-egosi na okwukwe Jizọs na-ekwu okwu ya abụghị okwukwe ọ bụla, kama otu ụdị okwukwe—ụdị okwukwe ahụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ nwere. Jizọs azaghị ajụjụ ahụ ọ jụrụ. Ọ jụrụ ajụjụ ahụ iji mee ka ndị na-eso ụzọ ya chebara ụdị okwukwe ha nwere echiche. Okwukwe ha ò ji nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ, nke na ha nwere ike ịlaghachi n’ihe ndị ha hapụworo? Ka hà nwere ụdị okwukwe nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ nwere? Taa, anyị kwesịkwara ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ụdị okwukwe dị aṅaa ka “Nwa nke mmadụ” na-ahụ n’obi m?’

16. Olee ụdị okwukwe nwanyị ahụ di ya nwụrụ nwere?

16 Ka anyị wee soro ná ndị Jehova ga-ekpere ikpe ziri ezi, ọ dị anyị mkpa inwe ụdị okwukwe nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ nwere. Olee ụdị okwukwe o nwere? O gosipụtara okwukwe ya site n’ịnọgide “na-agakwuru ọkàikpe ahụ, na-asị, ‘Hụ na m nwetara ikpe ziri ezi.’” Nwanyị ahụ di ya nwụrụ nọgidere n’arịrịọ ya iji nweta ikpe ziri ezi n’aka nwoke bụ́ onye ajọ omume. N’otu aka ahụ, ndị ohu Chineke taa pụrụ inwe obi ike na ha ga-enweta ikpe ziri ezi n’aka Jehova—ọ bụrụgodị na o wee oge karịa otú ha tụrụ anya ya. Ọzọkwa, ha na-egosi obi ike ha nwere ná nkwa Chineke site n’ịnọgidesi ike n’ekpere—ee, site ‘n’itiku ya ehihie na abalị.’ (Luk 18:7) N’ezie, ọ bụrụ na Onye Kraịst akwụsị ikpe ekpere ka Chineke kpee ikpe ziri ezi, ọ na-egosi na obi esikwaghị ya ike na Jehova ga-enyere ndị ohu ya aka.

17. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji na-ekpe ekpere n’esepụghị aka ma nọgide na-enwe okwukwe na ụbọchị ikpe Jehova ga-abịarịrị?

17 Ọnọdụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ nọ na ya na-egosi anyị ihe ndị ọzọ mere anyị kwesịrị iji nọgide na-ekpe ekpere. Tụlee ọdịiche ụfọdụ dị n’etiti ọnọdụ ya na nke anyị. Nwanyị ahụ di ya nwụrụ nọgidere na-agakwuru ọkàikpe ahụ ọ bụ ezie na ọ dịghị onye gbara ya ume ka o mee otú ahụ, ma Okwu Chineke na-agba anyị nnọọ ume ‘ịnọgidesi ike n’ekpere.’ (Ndị Rom 12:12) Ọ dịghị onye mesiri nwanyị ahụ di ya nwụrụ obi ike na a ga-emere ya ihe ọ na-arịọ, ma Jehova emesiela anyị obi ike na ya ga-ekpere anyị ikpe ziri ezi. Jehova si n’ọnụ onye amụma ya kwuo, sị: “Ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3; Abụ Ọma 97:10) Nwanyị ahụ di ya nwụrụ enweghị onye na-ekpere ya ọnụ ya iji mesikwuo arịrịọ ya ike. Ma anyị nwere onye enyemaka dị nnọọ ike, bụ́ Jizọs, “onye nọ n’aka nri nke Chineke, onye na-arịọkwara anyị arịrịọ.” (Ndị Rom 8:34; Ndị Hibru 7:25) N’ihi ya, ọ bụrụ na nwanyị ahụ di ya nwụrụ, n’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ ọ nọ na ya, nọgidere na-arịọ ọkàikpe ahụ arịrịọ, na-enwe olileanya na ọ ga-eme ka e kpeere ya ikpe ziri ezi, anyị onwe anyị kwesịrị nnọọ ịnọgide na-enwe okwukwe karị na ụbọchị ikpe Jehova ga-abịarịrị!

18. Olee otú ekpere ga-esi wusikwuo okwukwe anyị ike ma nyere anyị aka inweta ikpere ziri ezi?

18 Ihe atụ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ na-akụziri anyị na okwukwe na ekpere nwere nnọọ njikọ nakwa na anyị ịnọgide na-ekpe ekpere pụrụ ime ka anyị zere ihe ndị pụrụ ime ka okwukwe anyị jụọ oyi. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ekpere elu ọnụ ga-eme ka anyị nọgide na-enwe okwukwe. (Matiu 6:7, 8) Mgbe ihe na-akpali anyị ikpe ekpere bụ na anyị ghọtara na anyị dabeere nnọọ n’ebe Chineke nọ, mgbe ahụ ekpere anyị ga-eme ka anyị bịaruo Chineke nso ma wusikwuo okwukwe anyị ike. Ebe ọ bụkwa na okwukwe dị mkpa maka nzọpụta, Jizọs gbara nnọọ ndị na-eso ụzọ ya ume “ikpe ekpere mgbe nile ma ghara ịda mbà”! (Luk 18:1; 2 Ndị Tesalonaịka 3:13) N’ezie, ọbịbịa nke “oké ụbọchị Jehova” adabereghị n’ekpere ndị anyị na-ekpe—ọ ga-abịarịrị ma anyị na-ekpe ekpere maka ya ma ọ bụ na anyị anaghị ekpe. Otú ọ dị, ma ànyị ga-enweta ikpe ziri ezi ma lanahụ agha Chineke ma ọ bụ ghara ịlanahụ ga-adabere nnọọ n’okwukwe anyị nakwa n’otú anyị si ekpe ekpere.

19. Olee otú anyị si egosi na anyị kwenyesiri ike na Chineke ga-eme ‘ka e kpee ikpe ziri ezi’?

19 Ka anyị cheta na Jizọs jụrụ, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ okwukwe ahụ n’elu ụwa?” Gịnị bụ azịza nke ajụjụ ahụ na-akpali mmadụ iche echiche nke ọ jụrụ? Obi dị anyị nnọọ ụtọ na ọtụtụ nde ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi gburugburu ụwa taa na-eji ekpere, ntachi obi, na nnọgidesi ike ha egosi na ha nwere ụdị okwukwe a! N’ihi ya, a pụrụ nnọọ ịza ee n’ajụjụ ahụ Jizọs jụrụ. Ee, n’agbanyeghị ikpe na-ezighị ezi ụwa Setan ji na-ata anyị ahụhụ ugbu a, anyị kwenyesiri ike na Chineke ga-eme “ka e kpeere ndị ọ họọrọ ikpe ziri ezi.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Iji ghọta nnọọ ihe ihe atụ a pụtara, gụọ Luk 17:22-33. Rịba ama otú “Nwa nke mmadụ” a kpọtụrụ aha na Luk 17:22, 24, 30 si enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ a jụrụ na Luk 18:8.

Ì Chetara?

• Gịnị meworo ka okwukwe nke ụfọdụ Ndị Kraịst nyụọ ka ọkụ?

• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee okwukwe siri ike na ụbọchị ikpe Jehova ga-abịarịrị?

• Olee ihe ndị mere anyị ga-eji nọgidesie ike n’ekpere?

• Olee otú ịnọgidesi ike n’ekpere ga-esi mee ka okwukwe anyị ghara ịnyụ ka ọkụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Olee ihe ihe atụ banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ na ọkàikpe ahụ na-egosi?

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Ọtụtụ nde mmadụ taa kwenyesiri ike na Chineke ga-eme ‘ka e kpee ikpe ziri ezi’