Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-enye “Ndị Na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ”

Jehova Na-enye “Ndị Na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ”

Jehova Na-enye “Ndị Na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ”

“Ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—LUK 11:13.

1. Olee mgbe karịsịa ka ọ dị anyị mkpa inweta enyemaka nke mmụọ nsọ?

‘AGAGHỊ m ebuli nsogbu a nanị m. Ọ bụ nanị site n’enyemaka nke mmụọ nsọ ka m ga-enwe ike idi ọnwụnwa a!’ Ọ̀ dịtụla mgbe i si n’ala ala obi gị kwuo okwu dị otú ahụ? Ihe ka ọtụtụ ná Ndị Kraịst ekwuola ya. Ma eleghị anya, i kwuru ya mgbe ị matara na ị na-arịa ajọ ọrịa. Ma ọ bụ ma eleghị anya ya abụrụ mgbe di ma ọ bụ nwunye gị gị na ya lụrụla ruo ọtụtụ afọ nwụnahụrụ gị. Ma ọ bụkwanụ mgbe ịda mbà n’obi nọchiri obi ụtọ ị na-enwebu. N’oge ndị ị nọ ná nsogbu, o nwere ike ịbụ na i chere na nanị ihe mere i ji nwee ike idi nsogbu gị bụ na mmụọ nsọ Jehova nyere gị “ike karịrị ike nkịtị.”—2 Ndị Kọrịnt 4:7-9; Abụ Ọma 40:1, 2.

2. (a) Olee nsogbu ezi Ndị Kraịst na-enwe? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ezi Ndị Kraịst aghaghị idi nsogbu na mmegide na-abawanye ụba bụ́ ndị ụwa nke oge a na-adịghị asọpụrụ Chineke na-akpata. (1 Jọn 5:19) Ọzọkwa, Setan bụ́ Ekwensu n’onwe ya na-emegide ndị na-eso ụzọ Kraịst, ọ na-alụso “ndị na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs,” agha kpụ ọkụ n’ọnụ. (Mkpughe 12:12, 17) N’ihi ya, o doro anya na enyemaka nke mmụọ Chineke dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji hụ na anyị nọgidere na-enweta mmụọ nsọ Chineke n’ụba? N’ihi gịnịkwa ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova dị nnọọ njikere inye anyị ume dị anyị mkpa n’oge ọnwụnwa? Anyị ga-achọta azịza nke ajụjụ ndị ahụ n’ihe atụ abụọ Jizọs nyere.

Na-ekpe Ekpere n’Esepụghị Aka

3, 4. Olee ihe atụ Jizọs nyere, oleekwa otú ọ sịrị o si metụta ekpere?

3 Ọ dị mgbe otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” (Luk 11:1) Mgbe Jizọs na-azaghachi ya, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ abụọ yiri ibe ha. Nke mbụ bụ banyere otu nwoke nwere onye ọbịa, nke abụọ kwanụ abụrụ banyere nna nke nyere nwa ya ihe ọ rịọrọ ya. Ka anyị tụlee nke ọ bụla n’ime ihe atụ abụọ a.

4 Jizọs kwuru, sị: “Ònye n’ime unu ga-enwe enyi, nke ga-agakwurukwa ya n’etiti abalị ma sị ya, ‘Enyi m, gbazinye m ogbe achịcha atọ, n’ihi na otu enyi m ka si nnọọ na njem bịa na nke m, enweghịkwa m ihe m ga-eche ya n’ihu’? Onye ahụ esikwa n’ime ụlọ kwuo ná nzaghachi, sị, ‘Kwụsị inye m nsogbu. A kpọchielarị m ụzọ, mụ na ụmụntakịrị m edinawokwa n’ihe ndina; apụghị m ibili nye gị ihe ọ bụla.’ Asị m unu, Ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọ bụla n’ihi na ọ bụ enyi ya, n’ezie n’ihi ịnọgidesi ike ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ndị ọ chọrọ.” Jizọs kọwaziri otú ihe atụ a si metụta ekpere, sị: “N’ihi ya asị m unu, Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu. N’ihi na onye ọ bụla na-arịọ na-anata, onye ọ bụla na-achọkwa na-achọta, a ga-emeghekwara onye ọ bụla nke na-akụ.”—Luk 11:5-10.

5. Gịnị ka ihe atụ banyere nwoke ahụ nọgidere na-arịọ enyi ya ihe na-akụziri anyị banyere ihe anyị ga-eme mgbe anyị na-ekpe ekpere?

5 Ihe atụ a doro anya nke nwoke ahụ nọgidere na-arịọ enyi ya ihe na-egosi ihe anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-ekpe ekpere. Rịba ama na Jizọs kwuru na nwoke ahụ nwetara ihe ọ chọrọ “n’ihi ịnọgidesi ike ya.” (Luk 11:8) Okwu Bekee a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ịnọgidesi ike” pụtara nanị otu ugboro na Bible. E si n’okwu Grik pụtara n’ụzọ nkịtị “emeghị ihere” sụgharịa ya. Ọtụtụ mgbe, emeghị ihere na-abụ àgwà ọjọọ. Otú ọ dị, mgbe mmadụ na-emeghị ihere ma ọ bụ mgbe ọ nọgidesiri ike n’ezi ihe, o nwere ike ịbụ ezi àgwà. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ebe ihe atụ banyere nwoke ahụ nwere onye ọbịa dị. O meghị ihere ọ bụla n’ịnọgide na-arịọ enyi ya ka o nye ya ihe ọ chọrọ. Ebe ọ bụ na Jizọs ji nwoke a nwere onye ọbịa meere anyị ihe atụ, anyị kwesịkwara ịnọgidesi ike n’ekpere. Jehova chọrọ ka anyị ‘nọgide na-arịọ, nọgide na-achọ, nọgide na-akụ.’ Ná nzaghachi, ọ ‘ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’

6. Olee otú e si were omenala nke ile ọbịa n’oge Jizọs?

6 Ihe Jizọs gosiri anyị abụghị nanị otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere—ịdị na-anọgidesi ike—kama, o gosikwara anyị ihe mere anyị kwesịrị iji na-eme otú ahụ. Iji ghọta ihe ihe atụ ahụ na-akụziri anyị nke ọma, anyị kwesịrị ịtụle otú ndị gere ntị n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nwoke ahụ nwere onye ọbịa bụ́ onye nọgidesiri ike n’arịrịọ ya si were omenala nke ile ọbịa. Ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ gosiri na n’oge Bible, ilekọta ndị ọbịa anya nke ọma bụ omenala ndị mmadụ ji kpọrọ ihe, karịsịa ndị ohu Chineke. (Jenesis 18:2-5; Ndị Hibru 13:2) Ịghara ile ọbịa bụ ihe ihere. (Luk 7:36-38, 44-46) Ka anyị buru nke ahụ n’uche tụleghachi akụkọ ahụ Jizọs kọrọ.

7. N’ihi gịnị ka nwoke ahụ nwere onye ọbịa n’ihe atụ Jizọs ji ghara ime ihere ịkpọte enyi ya?

7 Nwoke ahụ a kọrọ banyere ya n’ihe atụ ahụ nwere onye ọbịa n’etiti abalị. Nwoke ahụ lere ya anya na ya kwesịrị inye onye ọbịa ya nri, ma, o nweghị ‘ihe ọ ga-eche ya n’ihu.’ O lere nke ahụ anya dị ka ihe dị oké mkpa! Ọ ghaghị inwetara ya achịcha, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ya. N’ihi ya, ọ gara na nke enyi ya ma kpọtee ya n’emeghị ihere. Ọ kpọrọ enyi ya ma sị ya: “Enyi m, gbazinye m ogbe achịcha atọ.” Ọ nọgidere na-arịọ ya ruo mgbe o nwetara ihe ọ chọrọ. Ọ bụ nanị mgbe o nwetara achịcha ahụ ka o nwere ike ịza onye na-ele ọbịa.

Ka Ọ Dịruru Gị ná Mkpa—Otú ahụ Ka Ị Ga Na-arịọ Maka Ya

8. Gịnị ga-akpali anyị ikpe ekpere n’esepụghị aka maka mmụọ nsọ?

8 Gịnị ka ihe atụ a na-egosi banyere ihe mere anyị ji ekpe ekpere n’esepụghị aka? Nwoke ahụ nọgidere na-arịọ maka achịcha n’ihi na o lere ya anya na inweta achịcha ndị ahụ dị nnọọ mkpa iji rụọ ọrụ ya dị ka onye na-ele ọbịa. (Aịsaịa 58:5-7) Ma ó nweghị achịcha, ọ gaghị abụ onye na-ele ọbịa. N’iji ya tụnyere anyị, n’ihi na anyị ghọtara na inweta mmụọ nsọ Chineke dị anyị nnọọ mkpa iji jee ozi anyị dị ka ezi Ndị Kraịst, anyị na-anọgide na-ekpegara Chineke ekpere, na-arịọ ya maka mmụọ nsọ ya. (Zekaraịa 4:6) Ma anyị enweghị ya, anyị agaghị abụ ezi Ndị Kraịst. (Matiu 26:41) Ị̀ hụrụ ihe dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ a? Ọ bụrụ na anyị ewere mmụọ nsọ Chineke dị ka ihe dị anyị nnọọ mkpa, o yiri ka ànyị ga-anọgidesi ike na-arịọ maka ya.

9, 10. (a) Nye ihe atụ na-egosi mkpa ọ dị anyị ịnọgide na-arịọ Chineke maka mmụọ nsọ ya. (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, n’ihi gịnịkwa?

9 Ka anyị jiri ihe nwere ike ime n’oge a kọwaa ihe anyị na-amụta n’ihe atụ a, ka e were ya na otu onye ezinụlọ gị malitere ịrịa ọrịa n’etiti abalị. Ị̀ ga-akpọte dọkịta iji rịọ ya maka enyemaka? Ị gaghị akpọte ya ma ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ na-arịa obere ọrịa. Ma, ọ bụrụ na obi kuchiri ya, ị gaghị eme ihere ịkpọ dọkịta. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na onye ahụ nọ n’ọnụ ọnwụ. Ị maara na enyemaka onye ọkachamara dị ya nnọọ mkpa. Achọghị enyemaka nke onye ọkachamara nwere ike ime ka onye ahụ nwụọ. N’otu aka ahụ, a pụrụ ikwu na ezi Ndị Kraịst na-anọ n’ọnụ ọnwụ mgbe nile. A sị ka e kwuwe, Setan na-ejegharị dị ka “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” na-achọ iripịa anyị. (1 Pita 5:8) Ka anyị wee nọgide ná mmekọrịta anyị na Chineke, enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke dị anyị ezigbo mkpa. Arịọghị Chineke maka enyemaka nwere ike ịkpatara anyị ọnwụ. N’ihi ya, anyị ga-anọgide na-arịọ Chineke maka mmụọ nsọ ya. (Ndị Efesọs 3:14-16) Ọ bụ nanị ime otú ahụ ga-eme ka anyị nọgide na-enwe ume dị anyị mkpa iji ‘tachie obi ruo ọgwụgwụ.’—Matiu 10:22; 24:13.

10 N’ihi ya, ọ dị mkpa anyị iche echiche mgbe ụfọdụ ma jụọ onwe anyị, sị, ‘Ana m anọgidesi nnọọ ike n’ekpere?’ Cheta na ọ bụ mgbe anyị ghọtara nnọọ na enyemaka Chineke dị anyị mkpa ka anyị ga-anọgidekwu na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ.

Gịnị Na-eme Ka Obi Sie Anyị Ike Mgbe Anyị Na-ekpe Ekpere?

11. Olee otú Jizọs si jiri ihe atụ ahụ o nyere banyere nna na nwa ya mee ihe n’ihe banyere ekpere?

11 Ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nwoke ahụ nwere onye ọbịa na-egosi otú mmadụ—onye kwere ekwe—kwesịrị isi na-ekpe ekpere. Ihe atụ nke ọzọ ana-egosikwanụ àgwà nke onye na-anụ ekpere—bụ́ Jehova Chineke. Jizọs jụrụ, sị: “N’ezie, olee nna ọ bụ n’etiti unu, onye, ọ bụrụ na nwa ya nwoke arịọ ya azụ, nke ga-enye ya agwọ n’ọnọdụ azụ, ma eleghị anya? Ma ọ bụ nke ga-enye ya akpị ma ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá?” Jizọs gara n’ihu ịkọwa ihe ihe atụ ahụ pụtara site n’ikwu, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—Luk 11:11-13.

12. Olee otú ihe atụ banyere nna nke nyere nwa ya ihe ọ rịọrọ ya si egosi njikere Jehova dị ịnụ ekpere anyị?

12 Jizọs ji ihe atụ a nke nna nyere nwa ya ihe ọ rịọrọ ya gosi otú obi na-adị Jehova n’ebe ndị na-ekpegara ya ekpere nọ. (Luk 10:22) Nke mbụ, rịba ọdịiche dị n’etiti ihe atụ abụọ ahụ ama. N’adịghị ka nwoke ahụ a kọrọ banyere ya n’ihe atụ nke mbụ ahụ, bụ́ onye na-achọghị ige ntị n’arịrịọ a rịọrọ ya maka enyemaka, Jehova yiri nna bụ́ mmadụ nke na-ahụ n’anya, bụ́ onye dị njikere inye nwa ya ihe ọ rịọrọ ya. (Abụ Ọma 50:15) Jizọs mekwuru ka anyị mata àgwà Jehova site n’ibu ụzọ kwuo banyere nna nke bụ́ mmadụ tupu ya ana-ekwu banyere nna nke eluigwe. O kwuru na ọ bụrụ na nna bụ́ mmadụ, ọ bụ ezie na ‘ọ bụ onye ajọ omume’ n’ihi mmehie e ketara eketa, na-enye nwa ya ezi onyinye, anyị ga-atụ nnọọ anya na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye nwere obiọma, ga-enye ndị ezinụlọ ya na-efe ya mmụọ nsọ karị!—Jems 1:17.

13. Gịnị ka anyị ga-ejide nnọọ n’aka mgbe anyị na-ekpegara Jehova ekpere?

13 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta na ya? Anyị pụrụ inwe obi ike na mgbe anyị na-arịọ Nna anyị nke eluigwe arịrịọ maka mmụọ nsọ, ọ dị nnọọ njikere inye anyị ihe anyị na-arịọ ya. (1 Jọn 5:14) Mgbe anyị na-ekpegara ya ekpere ugboro ugboro, Jehova agaghị asị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya: “Kwụsị inye m nsogbu. A kpọchielarị m ụzọ.” (Luk 11:7) Kama nke ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu.” (Luk 11:9, 10) Ee, Jehova ‘ga-aza anyị n’ụbọchị anyị kpọkuru Ya.’—Abụ Ọma 20:9; 145:18.

14. (a) Olee echiche na-ezighị ezi na-enye ụfọdụ ndị a na-anwa ọnwụnwa nsogbu n’obi? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jiri obi ike kpegara Jehova ekpere mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa?

14 Ihe ọzọ ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nna nke na-ahụ n’anya na-akụzikwara anyị bụ na obiọma Jehova karịrị nnọọ obiọma nke nna ọ bụla bụ́ mmadụ. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị ekwesịtụghị iche na ihe isi ike ndị anyị na-enwe aghaghị ịbụ n’ihi na Chineke na-eweso anyị iwe. Ọ bụ onye iro ukwu anyị, bụ́ Setan, bụ onye chọrọ ka anyị na-eche otú ahụ. (Job 4:1, 7, 8; Jọn 8:44) Ọ dịghị ebe echiche dị otú ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ. Jehova apụghị “iji ihe ọjọọ” nwaa anyị. (Jems 1:13) Ọ naghị eji ihe yiri agwọ nwaa anyị ọnwụnwa, ma ọ bụ jiri ihe yiri akpị lee anyị ule. Nna anyị nke eluigwe na-enye “ndị na-arịọ ya arịrịọ ihe ọma.” (Matiu 7:11; Luk 11:13) N’ezie, ka anyị na-aghọtakwu obiọma Jehova na njikere ọ dị inyere anyị aka, otú ahụ ka a ga-akpalikwu anyị iji obi ike na-ekpegara ya ekpere. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-enwekwa ike ikwu dị ka onye ọbụ abụ kwuru, bụ́ onye dere, sị: “N’ezie Chineke anụwo olu m; Ọ ṅawo ntị olu ekpere m.”—Abụ Ọma 10:17; 66:19.

Otú Mmụọ Nsọ Si Enyere Anyị Aka

15. (a) Olee nkwa Jizọs kwere banyere mmụọ nsọ? (b) Olee otu ụzọ mmụọ nsọ si enyere anyị aka?

15 Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o kweghachiri nkwa na-emesi obi ike o kwere n’ihe atụ ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere mmụọ nsọ, ọ gwara ndịozi ya, sị: “M ga-arịọkwa Nna ahụ, ọ ga-enyekwa unu ihe inyeaka ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi.” (Jọn 14:16) Jizọs si otú ahụ kwe ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ihe inyeaka ahụ ma ọ bụ mmụọ nsọ ga-adịnyere ndị na-eso ụzọ ya n’ọdịnihu, nke gụnyere oge anyị a. Olee otu ụzọ dị mkpa anyị si enweta enyemaka dị otú ahụ taa? Mmụọ nsọ na-enyere anyị aka idi ọnwụnwa dị iche iche. Olee otú o si eme ya? Pọl onyeozi, bụ́ onye e lekwara ule, kọwara n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrint otú mmụọ nsọ Chineke si nyere ya aka. Ka anyị tụletụ ihe o dere.

16. Olee otú ọnọdụ anyị pụrụ isi yie nke Pọl?

16 Pọl bu ụzọ gwa ndị kwere ekwe ibe ya hoo haa na ya nwere ‘ogwu n’anụ ahụ́ ya,’ ya bụ ọnwụnwa. O kwuziri, sị: “Ugboro atọ ka m rịọsiri Onyenwe anyị [Jehova] arịrịọ ike ka ihe a wee si n’ebe m nọ pụọ.” (2 Ndị Kọrint 12:7, 8) Ọ bụ ezie na Pọl rịọrọ Chineke arịrịọ ka o wepụrụ ya nsogbu ahụ, nsogbu ahụ nọgidere. Ma eleghị anya, ị nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ taa. Dị ka Pọl, o nwere ike ịbụ na i jiwo obi ike kpegara Jehova ekpere n’esepụghị aka, na-arịọ ya ka o wepụrụ gị otu nsogbu. Otú ọ dị, n’agbanyeghị na ị rịọla Chineke arịrịọ ọtụtụ ugboro ka o wepụrụ gị nsogbu ahụ, nsogbu ahụ ka nọgidere. Nke ahụ ọ̀ pụtara na Jehova azaghị ekpere gị nakwa na mmụọ ya anaghị enyere gị aka? Ọ bụtụghị ihe ọ pụtara! (Abụ Ọma 10:1, 17) Tụlee ihe ọzọ Pọl onyeozi kwuru.

17. Olee otú Jehova si zaa Pọl ekpere ya?

17 N’ịza Pọl ekpere ya, Chineke gwara ya, sị: “Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo gị; n’ihi na a na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” Pọl kwuru, sị: “Ya mere, n’ụzọ kasị enye ọṅụ, ọ kara m mma ịnya isi n’ihe metụtara adịghị ike m, ka ike nke Kraịst ahụ wee nọgide na-ekpuchi m dị ka ụlọikwuu.” (2 Ndị Kọrint 12:9; Abụ Ọma 147:5) N’ihi ya, Pọl hụrụ na Chineke si n’aka Kraịst jiri ikike ya dị ukwuu chebe ya ka à ga-asị na o ji ụlọikwuu kpuchie ya. Taa, Jehova na-aza ekpere anyị n’ụzọ yiri nke ahụ. Ọ na-echebe ndị ohu ya ka à ga-asị na o ji ụlọikwuu kpuchie ha.

18. Gịnị mere anyị ji enwe ike idi ọnwụnwa?

18 Ọ bụ ezie na ụlọikwuu anaghị eme ka mmiri kwụsị izo ma ọ bụ ka ifufe kwụsị ife, ma ọ na-eme ka ihe ndị ahụ ghara irucha mmadụ ahụ́. N’otu aka ahụ, mkpuchi “ike nke Kraịst ahụ” na-ekpuchi anyị anaghị eme ka ọnwụnwa ghara ịdakwasị anyị ma ọ bụ mee ka ihe ghara isiri anyị ike. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-eme ka ndị ọjọọ nọ n’ụwa na onye na-achị ya, bụ́ Setan, ghara imebi mmekọrịta anyị na Chineke. (Mkpughe 7:9, 15, 16) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na ọ dị nsogbu i nwere nke na-achọghị isi ‘n’ebe ị nọ pụọ,’ ị pụrụ ijide n’aka na Jehova maara ihe ị na-edi nakwa na ọ nụwo ‘olu iti mkpu gị.’ (Aịsaịa 30:19; 2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Pọl dere, sị: “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide, kama mgbe ọnwụnwa ahụ bịara ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrint 10:13; Ndị Filipaị:6, 7.

19. Gịnị ka i kpebisiri ike ime, n’ihi gịnịkwa?

19 N’eziokwu, ihe e ji mara ‘ụbọchị ikpeazụ ndị a’ nke ụwa a na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ “oge pụrụ iche nke siri ike obibi.” (2 Timoti 3:1) N’agbanyeghị nke ahụ, oge a abụghị oge na-agaghị ekwe ndị Chineke obibi. N’ihi gịnị? N’ihi nkwado na nchebe nke mmụọ nsọ Chineke, bụ́ ihe Jehova ji afọ ofufo na-enye ndị nile ji obi ike nọgide na-arịọ ya maka ya n’ụba. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịnọgide na-ekpe ekpere kwa ụbọchị maka mmụọ nsọ.—Abụ Ọma 34:6; 1 Jọn 5:14, 15.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị ka ọ dị anyị mkpa ime iji nweta mmụọ nsọ Chineke?

• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na Jehova ga-aza ekpere anyị na-ekpegara ya maka mmụọ nsọ?

• Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka idi ọnwụnwa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta site n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nwoke ahụ mmadụ bịara na nke ya nke nọgidere na-arịọ enyi ya arịrịọ?

[Foto dị na peeji nke 22]

Ị̀ na-ekpe ekpere n’esepụghị aka maka mmụọ nsọ Chineke?

[Foto dị na peeji nke 23]

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere Jehova n’ihe atụ nke nna nyere nwa ya ihe ọ rịọrọ ya?