Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmụọ Krismas À Na-enwe Ya n’Oge Nile n’Afọ?

Mmụọ Krismas À Na-enwe Ya n’Oge Nile n’Afọ?

Mmụọ Krismas À Na-enwe Ya n’Oge Nile n’Afọ?

“Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu, udo adịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị a nwapụtaworo.”—Luk 2:14.

ỌTỤTỤ nde mmadụ maara ọkwa a ndị mmụọ ozi Chineke maara ndị na-azụ atụrụ banyere ọmụmụ Jizọs ka ha na-eche atụrụ ha nche n’abalị. N’oge ọtụtụ okpukpe weere na ọ bụ oge a mụrụ Jizọs, ọtụtụ ndị na-aza Ndị Kraịst n’elu ọnụ na-eme mgbalị pụrụ iche ịkpazi àgwà. A na-akpọkarị àgwà a ndị mmadụ na-akpaziwanye n’oge a bụ́ nke na-eme ka ha gosipụtawa ọṅụ, udo, na nnwapụta n’oge Krismas—bụ́ àgwà ndị mmụọ ozi ahụ mara n’ọkwa—mmụọ Krismas.

Àgwà ọma ndị dị otú ahụ na-amasịdị ndị na-echeghị na o nwere ihe jikọrọ Krismas na okpukpe. Obi ụtọ nke o yiri ka ememe ahụ ọ̀ na-enye na-amasịkwa ha. N’ebe ndị oge Krismas bụ oge ụmụ akwụkwọ ma ọ bụ ndị ọrụ na-eji enwe ezumike, ọ na-eme ka ndị mmadụ nwee ohere iji zuru ike, soro ikwu na ibe ha nọkọọ, ma ọ bụ jiri nnọọ oge ahụ mee onwe ha obi ụtọ. N’ezie, ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu na-ewere nnọọ oge Krismas dị ka oge a ga-eji kwanyere Jizọs Kraịst ùgwù.

N’agbanyeghị otú ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ si lee Krismas anya, ha na-ekweta na obi ụtọ ọ bụla oge ezumike ahụ na-enye anaghị adịtekarị aka. Ndị mmadụ na-amaliteghachi ịkpa àgwà otú ha si akpabu ozugbo Krismas gafere. Otu ihe odide isiokwu ya bụ “Mmụọ Krimas,” nke Ụlọ Akụ̀ Royal nke Canada bipụtara, kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-akpọ onwe ha Ndị Kraịst na-abụ ya nanị ruo izu ole na ole kwa afọ, na-emere ụmụ mmadụ ibe ha ihe ọma ruo mgbe Afọ Ọhụrụ gafere, bụ́ mgbe ha ga-enwe ike ịlaghachi ná ndụ onye ike kwere mere nke ya na nke echebaraghị ọnọdụ ụmụ mmadụ ibe ha echiche.” Ihe odide ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Isi ihe dị njọ” ná mmụọ Krismas bụ na ndị mmadụ anaghị enwe ya “n’oge nile n’afọ.”

Ma ì kweere ihe ahụ e kwuru ma ọ bụ na i kweghị, ọ na-akpali anyị ịjụ ajụjụ ụfọdụ dị mkpa. Ọ̀ dị mgbe mmadụ nile ga-enwe ike ịdị na-emesapụ aka ma soro ibe ha na-anọ n’udo n’akwụsịghị akwụsị? Ànyị ji n’aka na ọkwa ahụ ndị mmụọ ozi mara n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs ga-emezu? Ka olileanya maka ezi udo ọ̀ bụ nrọ nkịtị?