Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso”

“Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso”

“Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso”

“Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.”—ZEFANAỊA 1:14.

1, 2. (a) Olee ụbọchị pụrụ iche Ndị Kraịst na-eche? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ, n’ihi gịnịkwa?

NWA agbọghọ ọṅụ juru obi na-atụsi nnọọ anya ụbọchị agbamakwụkwọ ya ike. Nwanyị dị ime na-eche nnọọ ka ụbọchị ọ ga-amụ nwa ruo. Onye ọrụ ike gwụrụla na-eche nnọọ ka ụbọchị ezumike ọ nọworo na-atụ anya ya ruo eruo. Olee ihe jikọtara ha nile? Ha nile na-eche otu ụbọchị pụrụ iche—ụbọchị ga-emetụta ndụ ha. Ha na-atụsi anya otu ụbọchị ike, ma ihe ha na-atụ anya ya abụghị otu. Ụbọchị ahụ ha na-atụ anya ya ga-emesị ruo, ha na-atụkwa anya na ha ga-adị njikere mgbe ụbọchị ahụ ga-eru.

2 N’otu aka ahụ, ezi Ndị Kraịst na-atụsikwa anya otu ụbọchị pụrụ iche ike. Ọ bụ oké “ụbọchị Jehova.” (Aịsaịa 13:9; Joel 2:1; 2 Pita 3:12) Olee ihe “ụbọchị Jehova” a na-abịanụ bụ, oleekwa otú ọbịbịa ya ga-esi metụta ụmụ mmadụ? Ọzọkwa, oleekwa otú anyị ga-esi jide n’aka na anyị dị njikere maka ọbịbịa ya? Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị chọta azịza nke ajụjụ ndị a ugbu a n’ihi na ihe àmà ndị e nwere na-egosi na okwu ndị na-esonụ Bible kwuru bụ eziokwu: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.”—Zefanaịa 1:14.

“Oké Ụbọchị Jehova”

3. Gịnị ka “oké ụbọchị Jehova” bụ?

3 Olee ihe “oké ụbọchị Jehova” bụ? N’ebe nile e jiri okwu ahụ bụ́ “ụbọchị Jehova” mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ, ọ na-ezo aka n’oge pụrụ iche mgbe Jehova mezuru ihe o kpere n’ikpe n’isi ndị iro ya ma bulie aha ukwu ya elu. “Ụbọchị Jehova” bịakwasịrị ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi bi na Juda na Jeruselem nakwa ndị mmegbu bi na Babilọn na Ijipt mgbe Jehova mezuru ihe o kpere n’ikpe n’isi ha. (Aịsaịa 2:1, 10-12; 13:1-6; Jeremaịa 46:7-10) Otú ọ dị, “ụbọchị Jehova” nke kasị ukwuu ka na-abịa n’ihu. Ọ bụ “ụbọchị” a ga-emezu ihe Jehova kpere n’ikpe n’isi ndị mebiri aha ya. Ọ ga-eji mbibi nke “Babilọn Ukwu ahụ,” alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, malite ma jiri mbibi a ga-ebibi akụkụ ndị fọrọ afọ nke ajọ ụwa a n’Amagedọn mechie.—Mkpughe 16:14, 16; 17:5, 15-17; 19:11-21.

4. Olee ihe mere ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ kwesịrị iji tụọ ụbọchị Jehova ji ọsọ na-abịa egwu?

4 Ma hà ghọtara ya ma ọ̀ bụ na ha aghọtaghị ya, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ kwesịrị ịtụ ụbọchị a ji ọsọ na-abịa egwu. N’ihi gịnị? Jehova si n’ọnụ Zefanaịa onye amụma zaa ajụjụ ahụ, sị: “Ụbọchị nrubiga ókè nke iwe ka ụbọchị ahụ bụ, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nke ime mkpọmkpọ ebe na ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na oké mgbachi, ụbọchị igwe ojii na oké ọchịchịrị.” Ọ bụ nnọọ ụbọchị dị egwu! Ọzọkwa, onye amụma ahụ kwuru, sị: “M ga-emekwa ka mkpa kpaa mmadụ . . . n’ihi na ọ bụ Jehova ka ha mehieworo megide.”—Zefanaịa 1:15, 17.

5. Olee echiche dị mma ọtụtụ nde mmadụ nwere banyere ụbọchị Jehova, n’ihi gịnịkwa?

5 Ma, ọtụtụ nde ndị ọzọ na-atụsi anya ọbịbịa nke ụbọchị Jehova ike. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha maara na ọ bụ oge a ga-azọpụta ma napụta ndị ezi omume, ụbọchị a ga-ebuli Jehova n’onwe ya elu ma doo aha ya dị ebube nsọ. (Joel 3:16, 17; Zefanaịa 3:12-17) Isi ihe ga-ekpebi ma mmadụ ọ̀ ga na-atụsi anya ụbọchị ahụ ike ka ọ̀ ga na-atụ ya egwu bụ otú o si na-ebi ndụ ya ugbu a. Olee otú i si ele ọbịbịa nke ụbọchị ahụ anya? Ị̀ dị njikere maka ya? Ịmara na ụbọchị Jehova dị nso ọ̀ na-emetụta otú i si ebi ndụ gị kwa ụbọchị ugbu a?

“Ndị Na-akwa Emo Ga-eji Ịkwa Emo Ha Bịa”

6. Olee otú ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ si ele “ụbọchị Jehova” anya, oleekwa ihe mere na nke a anaghị eju ezi Ndị Kraịst anya?

6 N’agbanyeghị na “ụbọchị Jehova” ji ọsọ na-abịa, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ụwa anadịghị echegbu onwe ha banyere ya. Ha na-achị ndị na-agwa ha na ọ ga-abịa n’isi nso ọchị ma na-akwa ha emo. Nke a anaghị eju ezi Ndị Kraịst anya. Ha na-echeta amụma a Pita onyeozi buru: “Unu bu ụzọ mara nke a, na n’ụbọchị ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa, na-aga n’ihu dị ka ọchịchọ nke aka ha si dị ma na-asị: ‘Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị ha dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide kpọmkwem dị ka hà dị site ná mmalite nke ihe e kere eke.’”—2 Pita 3:3, 4.

7. Gịnị ga-enyere anyị aka iburu ịdị nso nke ụbọchị Jehova n’uche?

7 Olee ihe ga-enyere anyị aka izere echiche dị otú ahụ hiere ụzọ ma nọgide na-eburu ịdị nso nke ụbọchị Jehova n’uche? Pita gwara anyị, sị: ‘M na-akpali ezi ikike iche echiche unu site n’ichetara unu ihe, ka unu wee cheta okwu ndị e kwuworo na mbụ site n’ọnụ ndị amụma dị nsọ na ihe Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị nyere n’iwu site n’ọnụ ndịozi unu.’ (2 Pita 3:1, 2) Anyị ịṅa ntị n’amụma ndị e buru iji dọọ anyị aka ná ntị ga-enyere anyị aka ‘ịkpali ezi ikike iche echiche anyị.’ Ma eleghị anya, e chetarala anyị ihe ndị a ugboro ugboro, ma ọ dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka anyị nọgide na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị a.—Aịsaịa 34:1-4; Luk 21:34-36.

8. Olee ihe mere ọtụtụ ndị ji eleghara ihe ndị Bible na-echetara anyị anya?

8 Olee ihe mere ụfọdụ anaghị eji ihe ndị a a na-echetara anyị akpọrọ ihe? Pita gara n’ihu ikwu, sị: “Dị ka ọchịchọ ha si dị, ha na-echezọ eziokwu a, na e nwere eluigwe nke sitere n’oge ochie na ụwa nke na-eguzopụta na mmiri nakwa n’etiti mmiri n’ụzọ kpụkọrọ ọnụ site n’okwu nke Chineke; sitekwa n’ihe ndị ahụ ka ụwa nke oge ahụ bịara ná mbibi mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya.” (2 Pita 3:5, 6) Ee, e nwere ndị na-achọghị ka ụbọchị Jehova bịa. Ha achọghị ihe ọ bụla ga-akwụsị ha ibi ndụ ha otú ha si na-ebi ya. Ha achọghị ka Jehova jụọ ha ajụjụ maka ndụ ịchọ ọdịmma onwe ha ha na-ebi! Dị ka Pita kwuru, ha na-ebi ndụ “dị ka ọchịchọ nke aka ha si dị.”

9. Olee otú ndị mmadụ si kpaa àgwà n’oge Noa na Lọt?

9 N’ihi “ọchịchọ ha,” ndị a na-akwa emo họọrọ ichefu na ọ dịla oge ndị Jehova tinyere aka n’ihe ụmụ mmadụ na-eme. Ma Jizọs Kraịst ma Pita onyeozi zochara aka n’oge abụọ dị otú ahụ—‘ụbọchị Noa’ na ‘ụbọchị Lọt.’ (Luk 17:26-30; 2 Pita 2:5-9) Tupu Iju Mmiri ahụ, ndị mmadụ aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị Noa nyere ha. N’otu aka ahụ, tupu e bibie Sọdọm na Gọmọra, n’anya ndị ọgọ ya nwoke, Lọt “dị ka onye na-akwa emo.”—Jenesis 19:14.

10. Olee ihe Jehova ga-eme ndị na-aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị ya?

10 Ọ ka bụkwa otu ihe ahụ taa. N’agbanyeghị nke ahụ, lee ihe Jehova ga-eme ndị na-aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị ya: “M ga-ejikwa mmehie ndị ikom ahụ ndị rahụrụ arahụ n’ịdị ka mmanya vaịn doro edo leta ha, ndị na-asị n’obi ha, Jehova agaghị eme ezi ihe, Ọ gaghị emekwa ihe ọjọọ. Akụ̀ ha ga-aghọkwa ihe a pụnarawooro ha, ụlọ nile ha ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu: ee, ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, ma ha agaghị aṅụ mmanya vaịn ha.” (Zefanaịa 1:12, 13) Ndị mmadụ nwere ike ịnọgide na-arụ ihe ndị ha na-arụ kwa ụbọchị, ma o nweghị abamuru na-adịgide adịgide ha ga-enweta na ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ụbọchị Jehova ga-abịa na mberede, akụnụba ọ bụla ha kpakọtakwara agaghị azọ ha.—Zefanaịa 1:18.

“Chere Ya”

11. Olee ndụmọdụ anyị kwesịrị iburu n’uche?

11 Kama ịdị ka ụwa nke gbara anyị gburugburu, anyị aghaghị iburu ndụmọdụ nke onye amụma bụ́ Habakuk dekọrọ n’uche, nke bụ́: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3) Ya bụrụgodị na anyị elee ya anya na ụbọchị ahụ na-anọ ọdụ n’ihi ezughị okè anyị, anyị aghaghị icheta na Jehova anaghị anọ ọdụ n’ime uche ya. Ụbọchị ya ga-abịa kpọmkwem mgbe ọ kara aka, n’awa ụmụ mmadụ na-atụghị anya ya.—Mak 13:33; 2 Pita 3:9, 10.

12. Olee ihe Jizọs buru amụma na ọ ga-eme, oleekwa otú ndị na-eso ụzọ Jizọs siworo mee ihe dị iche na nke ahụ?

12 Mgbe Jizọs na-ekwu mkpa ọ dị ịnọgide na-echere ụbọchị Jehova, o kwuru na ọbụna ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ga-akwụsị iburu ịdị nso nke ụbọchị Jehova n’uche. O buru amụma banyere ha, sị: “Ọ bụrụ na e nwee ka ajọ ohu ahụ si kwuo n’obi ya, sị, ‘Nna m ukwu na-egbu oge,’ wee malite iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị aṅụrụma a ma ama na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya na n’awa ọ na-amaghị, ọ ga-enyekwa ya oké ahụhụ.” (Matiu 24:48-51) Kama ịdị ka ajọ ohu ahụ, ohu ahụ nke na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche na-anọgide na-eburu ịdị nso nke ụbọchị ahụ n’uche. Òtù ohu ahụ anọgidewo na nche ma dị njikere. Jizọs enyewo ya ọrụ ilekọta “ihe nile o nwere” n’ụwa ebe a.—Matiu 24:42-47.

Mkpa Ọ Dị Ịnọgide Na-eburu Ịdị Nso nke Ụbọchị Jehova n’Uche

13. Olee otú Jizọs si gosi mkpa ọ dị iburu ịdị nso nke ụbọchị Jehova n’uche?

13 Ọ dị ezigbo mkpa ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ nọgide na-eburu ụbọchị Jehova n’obi. Ọ dị ha mkpa ime ihe ngwa ngwa ma si na Jeruselem gbapụ mgbe ha hụrụ “ka usuu ndị agha mara ụlọikwuu gbara [obodo ahụ] gburugburu.” (Luk 21:20, 21) Nke ahụ mere n’afọ 66 O.A. Lee otú Jizọs si gosi otú ọ dịruru ná mkpa ka Ndị Kraịst nke oge ahụ nọgide na-eburu ịdị nso nke ụbọchị Jehova n’obi. O kwuru, sị: “Onye nọ n’elu ụlọ, ya ghara ịrịdata ibupụ ngwongwo n’ụlọ ya; onye nọ n’ubi, ya gharakwa ịlaghachi n’ụlọ ịga chịrị uwe elu ya.” (Matiu 24:17, 18) Ebe ọ bụ na akụkọ ihe mere eme gosiri na e bibighị Jeruselem ruo afọ anọ ọzọ, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na Ndị Kraịst mere ihe ahụ Jizọs gwara ha ngwa ngwa n’afọ 66 O.A.?

14, 15. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ mee ihe ozugbo ha hụrụ ka ndị agha mara ụlọikwuu gbara Jeruselem gburugburu?

14 Ọ bụ eziokwu na ndị agha Rom ebibighị Jeruselem ruokwa n’afọ 70 O.A., udo adịghị n’obodo ahụ n’afọ ndị ahụ gaferenụ tupu mbibi ahụ. Oge ahụ bụ nnọọ oge ọgba aghara! Ihe jupụtara ebe nile n’afọ ndị ahụ bụ ime ihe ike na nkwafu ọbara. Otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme kọwara oge ahụ na Jeruselem dị ka oge “a lụrụ ajọ agha a kwafuru nnọọ ọbara na ya, bụ́kwa oge ndị mmadụ mekpara nnọọ ibe ha ahụ́.” A chịkọtara ụmụ okorobịa ma nye ha ọrụ iwusikwu mgbidi obodo ahụ ike, iji ngwá agha alụ ọgụ, na ịghọ ndị agha. E nyere ha ọzụzụ ndị agha kwa ụbọchị. E lere ndị na-akwadoghị ime ihe ike ahụ anya dị ka ndị sabo. A sị na Ndị Kraịst nọtụkwuru n’obodo ahụ, ha gaara anọ nnọọ n’ọnọdụ ọjọọ.—Matiu 26:52; Mak 12:17.

15 Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Jizọs kwuru ka “ndị nọ na Judia,” ọ bụghị nanị ndị nọ na Jeruselem, malite ịgbapụ. Nke a dị mkpa n’ihi na nanị ọnwa ole na ole ndị agha Rom hapụchara Jeruselem, ha maliteghachiri agha ahụ. Ha buru ụzọ merie Galili n’afọ 67 O.A., mgbe nke ahụ gasịrị, ha jizi nwayọọ nwayọọ merie Judia n’afọ na-eso ya. Nke a kpataara ndị bi n’obodo ahụ nile oké ahụhụ. Ọ bịakwara na-esiwanye ike onye Juu ọ bụla isi na Jeruselem gbapụ. A na-eche ọnụ ụzọ mbata obodo ahụ nche, a na-ewerekwa ya na onye ọ bụla si n’obodo ahụ agbapụ na-achọ ịgbakwuru ndị Rom.

16. Olee àgwà ọ dị Ndị Kraịst oge mbụ mkpa inwe iji lanahụ oge ọgba aghara ahụ?

16 Iburu ihe ndị a nile n’uche ga-eme ka anyị ghọta ihe mere Jizọs ji kwusie okwu ike banyere mkpa ọ dị ime ihe ngwa ngwa n’oge ahụ. Ndị Kraịst dị ndụ n’oge ahụ aghaghị ịdị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ, ghara ikwe ka ihe onwunwe dọpụ uche ha. Ha aghaghị ịdị njikere ‘ịgbahapụ ihe nile ha nwere’ iji ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs. (Luk 14:33) A zọpụtara ndị rubeere Jizọs isi ozugbo ma gbaga n’ofe nke ọzọ nke Jọdan.

Ịnọgide Na-eburu Ịdị Nso nke Ụbọchị Jehova n’Obi

17. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji burukwuo ịdị nso nke ụbọchị Jehova n’obi?

17 Amụma ndị dị na Bible na-egosi nnọọ na anyị bi n’ime ime mgbe ọgwụgwụ. Ọ dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ iburukwu ịdị nso nke ụbọchị Jehova n’obi. N’oge udo, onye agha anaghị atụ anya ihe ize ndụ otú o si atụ n’oge agha. Ma, ya bụrụ na nke ahụ emee ka ọ gharazie ịmụ anya, a kpọọkwa ya na mberede ka ọ gaa agha, o nwere ike ọ gaghị adị njikere, nke ahụ nwekwara ike ịkpatara ya ọnwụ. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa n’agha anyị na-alụ dị ka Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị akwụsị ịmụrụ anya, anyị nwere ike ghara ịdị njikere imeri ọnwụnwa ndị anyị na-enweta, mgbe ụbọchị Jehova bịaziri, o nwere ike ịbịakwute anyị na mberede. (Luk 21:36; 1 Ndị Tesalonaịka 5:4) Ọ bụrụ na e nweela ndị “si n’iso Jehova laghachi azụ,” ugbu a bụ oge ha kwesịrị ịchọ ya ọzọ.—Zefanaịa 1:3-6; 2 Ndị Tesalonaịka 1:8, 9.

18, 19. Olee ihe ga-enyere anyị aka iburu nnọọ “ọnụnọ nke ụbọchị Jehova” n’uche?

18 Ka a sịkwa ihe mere Pita onyeozi ji dụọ anyị ọdụ ka anyị buru “ọnụnọ nke ụbọchị Jehova” n’uche! Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Otu ụzọ bụ site n’imikpu onwe anyị “n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:11, 12) Imikpu onwe anyị n’ihe ndị dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ịtụsi anya ọbịbịa nke “ụbọchị Jehova” ike. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘na-eburu n’uche’ pụtara n’ụzọ nkịtị “ịgbapụ ihe ọsọ.” Anyị agaghị agbapụli ụbọchị ndị fọrọ tupu ụbọchị Jehova abịa ọsọ n’ụzọ nkịtị. N’agbanyeghị nke ahụ, ka anyị na-eche ụbọchị ahụ, ọ ga-eyi ka oge ọ̀ na-agafe ọsọ ọsọ karị ma ọ bụrụ na anyị ji ọrụ n’aka n’ozi Chineke.—1 Ndị Kọrint 15:58.

19 Ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na iche echiche banyere ihe ndị ọ na-echetara anyị ga-enyekwara anyị aka ime nke a—“ịtụsi anya ọbịbịa [nke ụbọchị ahụ] ike (ịgbapụ ya ọsọ),” ee, “ịnọ na-eche [ya] mgbe nile.” (2 Pita 3:12, The Amplified Bible; The New Testament, nke William Barclay sụgharịrị) Ọtụtụ amụma ndị na-ekwu banyere ma ọbịbịa nke ụbọchị Jehova ma ọtụtụ ngọzi a ga-awụkwasị ndị ‘na-echere ụbọchị Jehova’ so n’ihe ndị a a na-echetara anyị.—Zefanaịa 3:8.

20. Olee ndụmọdụ anyị kwesịrị iburu n’uche?

20 Ugbu a bụ oge anyị nile kwesịrị iburu n’uche agbamume nke e nyere anyị site n’ọnụ Zefanaịa onye amụma, nke bụ́: “Mgbe ọnụma nke iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu, mgbe ụbọchị iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu. Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—Zefanaịa 2:2, 3.

21. Olee ihe ndị Chineke ga-ekpebisi ike ime n’afọ 2007?

21 N’ihi ya, isiokwu dịịrị afọ a họọrọ maka afọ 2007 kwesịrị nnọọ ekwesị, nke bụ́: “Oké ụbọchị Jehova dị nso.” Ndị Chineke ji n’aka na “ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” (Zefanaịa 1:14) “Ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3) Ya mere, ka anyị na-echere ụbọchị ahụ, ka anyị mụrụ anya mgbe nile n’ihe banyere oge anyị bi na ya, ebe anyị maara na mmezu nke amụma ndị a dị ezi nso!

Ị̀ Ga-azali Ajụjụ Ndị A?

• Gịnị ka “oké ụbọchị Jehova” bụ?

• N’ihi gịnị ka ụfọdụ na-ejighị mara na e kwesịrị ime ihe ngwa ngwa n’oge anyị a?

• N’ihi gịnị ka o ji dị Ndị Kraịst narị afọ mbụ mkpa ime ihe ngwa ngwa?

• Olee otú anyị pụrụ isi burukwuo ịdị nso nke ụbọchị Jehova n’uche?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Isiokwu dịịrị afọ nke 2007 ga-abụ: “Oké ụbọchị Jehova dị nso.”—Zefanaịa 1:14.

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Dị ka ọ dị n’oge Noa, ọ ga-eju ndị na-akwa emo anya mgbe Jehova ga-eme ihe

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị Kraịst aghaghị ime ihe n’egbughị oge mgbe ha hụrụ Jeruselem ka “ndị agha na-ama ụlọikwuu gbara ya gburugburu”