Ị̀ Pụrụ Ịgbasapụ Ịhụnanya Gị?
Ị̀ Pụrụ Ịgbasapụ Ịhụnanya Gị?
CHEN na-ejide arịlịka ụgbọ mmiri na-agabiga ihe dị ukwuu iji mee ka mmiri ghara ibupụ ụgbọ ahụ. Ihe ga-enyere ya aka ime nke a bụ nanị ma ọ bụrụ na chen ahụ chiri nnọọ anya ma sie ike. Ma ọ́ bụghị ya, ọ ga-adọbi.
Otú a ka ọ dị ọgbakọ Ndị Kraịst. Ka ọgbakọ wee sie ike, ndị nọ na ya kwesịrị ịdị n’otu. Gịnị na-ejikọta ha n’otu? Ọ bụ ịhụnanya, nke bụ ihe kasị eme ka a dịrị n’otu. Ka a sịkwa ihe mere Jizọs Kraịst ji gwa ụmụazụ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” N’ezie, ụdị ịhụnanya ezi Ndị Kraịst nwere n’ebe ibe ha nọ karịrị nke ndị enyi nkịtị. Ezi Ndị Kraịst na-azụlite ịhụnanya nke pụrụ ọbụna ịkpali ha ịchụ onwe ha n’àjà n’ihi ibe ha.—Jọn 13:34, 35.
Iji Ndị Kwere Ekwe Ibe Anyị Akpọrọ Ihe
Ihe mejupụtara ọtụtụ ọgbakọ bụ ndị nọ n’afọ ndụ dị iche iche, ndị si n’agbụrụ, mba, omenala na asụsụ dị iche iche, ndị a zụlitekwara n’ebe dị iche iche. Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nwere ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-adịghị amasị ya, ihe ndị ọ na-atụ anya ha na ihe ndị ọ na-atụ ụjọ ha, onye ọ bụla nwekwara ibu ndị ọ ga-ebu n’onwe ya, eleghị anya nsogbu ahụ́ ike ma ọ bụ nsogbu akụnụba. Ndịrịta iche a nwere ike ịkpaghasị ịdị n’otu Ndị Kraịst. Oleezi ihe ga-enyere anyị aka ịgbasapụ ịhụnanya anyị ma nọgide na-adị n’otu n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị a? Iji mmadụ nile nọ n’ọgbakọ kpọrọ nnọọ ihe ga-enyere anyị aka ịhụkwu ha n’anya.
Olee otú anyị pụrụ isi jiri mmadụ kpọrọ ihe? Iji mmadụ akpọrọ ihe gụnyere ichebara onye ahụ echiche; ịkwanyere nnọọ onye ahụ ùgwù; ịghọta na onye ahụ dị mkpa ma baa ezigbo uru; inwe ekele maka mgbalị ya. Ọ bụrụ na anyị ji ndị kwere ekwe ibe anyị kpọrọ ihe, anyị ga na-echebara ha echiche, anyị ga na-akwanyere ha nnọọ ùgwù, anyị ga-amata na ha dị mkpa, anyị ga-enwekwa obi ụtọ na anyị na ha na-efekọ Jehova. Nke a na-eme ka anyị hụ ha nnọọ n’anya. Anyị ịtụletụ ihe Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nọ na Kọrint ga-enyere anyị aka ịma ụzọ anyị pụrụ isi hụ Ndị Kraịst ibe anyị n’anya n’ụzọ kasị zuo ezuo.
Ndị Kọrint “Enweghị Ohere”
Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ ozi mbụ ya na 55 O.A., degakwara ha nke abụọ ka otu afọ o ji dee nke mbụ gasịrị. Ihe ndị o dere gosiri na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Kọrint ejighị ndị kwere ekwe ibe ha kpọrọ ihe. Pọl ji okwu ndị na-esonụ kọwaa ọnọdụ ndị Kọrint nọ na ya: “Ndị Kọrint, e megheworo unu ọnụ anyị, obi anyị agbasapụwo. Unu nwere ohere n’ime anyị, ma unu enweghị ohere ma a bịa ná mmetụta dị nro nke unu.” (2 Ndị Kọrint 6:11, 12) Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru na Ndị Kọrint “enweghị ohere”?
Ihe o bu n’uche bụ na ha enweghị obi ịnabata mmadụ. Otu ọkà mmụta Bible chere na ọ bụ “nsogbu ndị dị ka inyo mmadụ enyo n’ụzọ
na-enweghị isi . . . na iwe” mere ka ndị Kọrint ghara igosi Pọl ịhụnanya.Pọl dụrụ ha ọdụ, sị: “Dị ka ihe nkwụghachi—m na-ekwu ka m na-agwa ụmụntakịrị—unu onwe unu kwa, gbasapụnụ.” (2 Ndị Kọrint 6:13) Pọl gbara ndị Kọrint ume ka ha gbasapụ ịhụnanya ha, ya bụ, ka ha hụkwuo ndị kwere ekwe ibe ha ndị ọzọ n’anya. Nke a pụtara na kama ịdị na-enyo ha enyo ma na-eleda ha anya, ha kwesịrị ịhụ ha n’anya ma na-enyere ha aka.
Ịgbasapụ Ịhụnanya Anyị Taa
Ọ bụ nnọọ ihe na-emesi obi ike ịhụ ka ndị ohu Chineke taa si na-etinye mgbalị dị ukwuu n’ịgbasapụ ịhụnanya ha n’ebe otu onye na ibe ya nọ. N’eziokwu, ọ chọrọ nnọọ mgbalị iji na-agbasapụ ịhụnanya anyị. Ịgbasapụ ịhụnanya anyị ebighị nanị na mmadụ ịma ihe o kwesịrị ime. Iji gbasapụ ịhụnanya anyị, àgwà anyị aghaghị ịdị iche na nke ndị na-adịghị agbaso ụkpụrụ Bible. Ndị dị otú a adịghị ejikarị ndị ọzọ akpọrọ ihe. Ha adịghị echebara ndị ọzọ echiche, ha adịghị akwanyere ha ùgwù, ha na-akparịkwa mmadụ. N’ihi ya, ya adịkwala mgbe anyị ga-ekwe ka e jiri ụdị àgwà ndị a mara anyị. Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka inyo mmadụ enyo gbochie anyị ịhụ ndị kwere ekwe ibe anyị n’anya, dị ka o mere ndị Kọrint. Nke a pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị na-adịkarị ngwa ịchọpụta ebe ndị nwanna anyị na-adịchaghị eme nke ọma ma ghara ịhụ ebe ndị ọ na-eme nke ọma. Ọ pụkwara ime ma ọ bụrụ na anyị ajụ ịhụ mmadụ n’anya nanị n’ihi na omenala onye ahụ dị iche.
Kama ime nke a, ohu Chineke nke na-agbasapụ ịhụnanya ya na-enwe nnọọ mmasị n’ebe ndị kwere ekwe ibe ya nọ. Ọ na-eji ha akpọrọ nnọọ ihe, na-akwanyere ha ùgwù, na-achọpụtakwa ihe ndị na-akpa ha. Ọbụna mgbe e nwere Jọn 13:35.
ihe e ji n’aka mere a ga-eji mee mkpesa, ọ na-adị njikere ịgbaghara, ọ dịghịkwa ebu iwe n’obi. Ọ dịghị enyo ndị kwere ekwe ibe ya enyo n’ihi na obi siri ya ike na ha agaghị aghọgbu ya. Àgwà imesapụ aka ya na-enyere ya aka igosi ụdị ịhụnanya ahụ Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Ịgbalị Imetakwu Ndị Ọzọ Enyi
Ezi ịhụnanya ga-eme ka anyị soro ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-abụghị ndị enyi anyị anyị na ha na-akpachi anya na-akpakọrịta. Ole ndị ka a na-ekwu okwu ha? Ọ bụ ụfọdụ ụmụnna anyị ndị na-eme ihere, ma ọ bụ ndị n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, nwere ndị enyi ole na ole. Na mbụ, anyị nwere ike iche na ọ dịghị ihe ọzọ jikọrọ anyị na ndị ahụ ma e wezụga na anyị na ha na-efekọ ofufe. Ma, ọbụbụenyi ndị kasị chie anya e dekọrọ na Bible ọ́ bụghị nke ndị na-enwechaghị ihe jikọrọ ha na ibe ha ma a bịa n’ihe anya na-ahụ?
Dị ka ihe atụ, Rut na Naomi abụghị ọgbọ, ha esighị otu ebe, omenala ha dịkwa iche, ọbụna ha adịghị asụ otu asụsụ. Ma nke a emeghị ka ha ghara ịbụ enyi. A zụlitere Jonatan dị ka nwa onye eze, ma zụlite Devid dị ka onye ọzụzụ atụrụ. Jonatan tọgburu Devid atọgbu, n’agbanyeghị nke a ọbụbụenyi ha so n’otu n’ime ọbụbụenyi ndị kasị chie anya a kpọtụrụ uche n’Akwụkwọ Nsọ. Ma ọbụbụenyi Rut na Naomi ma nke Jonatan na Devid, mere ka onye nke ọ bụla n’ime ha nwee obi ụtọ, nyekwara onye nke ọ bụla n’ime ha aka n’ime ka ya na Chineke dị ná mma.—Rut 1:16; 4:15; 1 Samuel 18:3; 2 Samuel 1:26.
Taakwa, ezi Ndị Kraịst bụ́ ndị na-abụghị ọgbọ ma ọ bụ ndị ọnọdụ ha ná ndụ na-adịtụghịdị mgbe ha yitụwara, na-aghọ ezi ndị enyi. Dị ka ihe atụ, Regina bụ nne nanị ya na-azụ ụmụ nke mụrụ ụmụ abụọ. * Ọ na-eji nnọọ ọrụ n’aka mgbe nile, ọ dịghịkwa enwecha ohere iso ndị ọzọ na-akpakọrịta. Harald na Ute bụ di na nwunye merela agadi ma ha amụghị ụmụ. E nwere ike ịsị na ezinụlọ abụọ a adịchaghị ihe ha nwekọrọ ọnụ. Ma, Harald na Ute tinyere ndụmọdụ Bible ahụ bụ ka anyị na-agbasapụ ịhụnanya anyị n’ọrụ. Ha na-akpọ Regina na ụmụ ya ka ha bịa sonyere ha n’ọtụtụ ihe omume ha, ha na-esokwa ha aga ozi ọma, ma na-atụrụkọ ndụ ọnụ.
Ànyị pụrụ imetakwu ndị ọzọ na-abụghị ndị enyi anyị enyi? Gịnịkwanụ ma i soro ndị kwere ekwe ibe gị si mba ọzọ, ndị omenala ha dị iche, ma ọ bụkwanụ ndị na-abụghị ọgbọ gị na-akpachikwu anya?
Igboro Ndị Ọzọ Mkpa Ha
Inwe àgwà imesapụ aka ga-akpali anyị ilebara mkpa ndị ọzọ anya. Olee ụdị mkpa ọ bụ? Ọdịmma, leruo ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst anya. Ndị na-eto eto chọrọ nduzi, ndị agadi chọrọ agbamume, ndị nọ n’ozi oge nile chọrọ ka a na-aja ha mma ma na-akwado ha, ndị kwere ekwe ibe anyị nwere nkụda mmụọ chọkwara onye ha ga na-akọrọ mkpa ha. Onye ọ bụla nwere mkpa. Anyị kwesịrị ịgbalị igbo mkpa ndị a ruo n’ókè ọ bụla ike kwere anyị.
Ịgbasapụ ịhụnanya anyị pụtakwara na anyị ga na-echebara ndị nwere mkpa pụrụ iche echiche. Ọ̀ dị onye ị maara nọ n’ute ọrịa ma ọ bụ nwere ihe ịma aka ndị ọzọ ọ na-eche ihu ná ndụ? Ịgbasapụ ịhụnanya gị na inwe àgwà imesapụ aka ga-enyere gị aka ịmata ndị nwere mkpa ma nyere ha aka.
Ka amụma ndị dị na Bible banyere ọdịnihu dị nso na-eru ná mmezu ha, ịdị n’otu e nwere n’ọgbakọ kwesịrị ịdị oké mkpa karịa ihe onwunwe anyị, nkà ọ bụla anyị nwere ma ọ bụ ihe ndị anyị rụzuru. (1 Pita 4:7, 8) Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inye aka n’ime ka ịdị n’otu nke ọgbakọ anyị na-anọ amụ ihe sikwuo ike site n’ịgbasapụ ịhụnanya anyị ka o rutekwuo ndị kwere ekwe ibe anyị ndị ọzọ. Obi siri anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị n’ụba n’ihi na anyị na-eme ihe Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, kwuru, bụ́ onye sịrị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya.”—Jọn 15:12.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 17 A gbanweela ụfọdụ aha.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]
Anyị kwesịrị iji ụmụnna anyị akpọrọ ihe, na-enwe nnọọ mmasị n’ebe ha nile nọ, na-akwanyere ha ùgwù ma na-amara mkpa ha.