Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Ka Ị Na-ewere Ka Onye Ihe Na-agara nke Ọma?

Ònye Ka Ị Na-ewere Ka Onye Ihe Na-agara nke Ọma?

Ònye Ka Ị Na-ewere Ka Onye Ihe Na-agara nke Ọma?

ỤFỌDỤ ndị weere Jesse Livermore, bụ́ onye a maara dị ka onye na-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha ma a bịa n’ihe banyere azụmahịa, dị ka ọchụnta ego kasịnụ e nwetụrụla na Wall Street. N’ihi mkpebi ndị amamihe dị na ha o mere, ọ bịara baa nnọọ ọgaranya. Ọ na-eyi uwe ndị kasị mma, biri n’ọmarịcha ụlọ nwere ọnụ ụlọ iri abụọ na itoolu ma nwee ụgbọala bụ́ ọkpọka nke ọkwọ ụgbọala ya na-eji akwọgharị ya.

David * gbakwara mbọ inwe ihe ịga nke ọma dị ka Jesse Livermore. Ọ bụ ya na-esote onyeisi nke otu nnukwu ụlọ ọrụ a ma ama, a na-achọkwa ime ya ọga kpata kpata nke ngalaba ọzọ nke ụlọ ọrụ ahụ. O nwere ohere nke ịba ọgaranya na ịbụ onye a ma ama. Otú ọ dị, David mere mkpebi nke dugara ya n’ịgba arụkwaghịm. David kwuru, sị: “Amaara m na ọ dịghị mgbe ọzọ m ga-anọ n’ọkwá dị elu n’ụlọ ọrụ.” Ì chere na ezi uche dị n’ihe a David mere?

Ọtụtụ ndị chere na ịkpakọta akụnụba, ịbụ onye a ma ama ma ọ bụ onye na-ewu ewu na-egosi na ihe na-agara mmadụ nke ọma. Otú ọ dị, ndị bara ọgaranya ka nwekwara ike ịdị na-eche na ndụ ha enweghị isi. Nke a bụ nnọọ ọnọdụ Maazị Livermore nọ na ya. N’agbanyeghị na o nwere akụnụba, ndụ ya jupụtara n’ihe ndị na-agbawa obi, ọdachi, na iru uju. Ọ dara mba n’obi, alụmdi na nwunye ya tisara ugboro ugboro, ya na ụmụ ya adịghịkwa ná mma. Maazị Livermore mechara kwaa arịrị otu ụbọchị n’ihi ihe ndị a funahụrụ ya ka ọ nọ n’ebe a na-aṅụ mmanya n’otu họtel ndị oké ozu. O kwuru ka e wetere ya mmanya ma dọkapụta otu ibe akwụkwọ o ji deere nwunye ya ozi ikpeazụ. Ka ọ ṅụchara mmanya ya, ọ bara n’otu ọnụ ụlọ gbatụrụ itiri ebe ndị mmadụ na-adọwa ibu ha ma gbagbuo onwe ya.

Ọ bụ ezie na a pụghị ikwu kpọmkwem na ọ bụ n’ihi ọgaranya Maazị Livermore bara mere o ji gbuo onwe ya, akụkọ a na-egosi na ihe a Bible kwuru bụ eziokwu: ‘Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya ejiriwo ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.’— 1 Timoti 6:9, 10.

Ọ̀ ga-abụ na ndị na-ewere onye bara ọgaranya, onye nọ n’ọkwá dị elu, ma ọ bụ onye a ma ama dị ka onye ihe na-agara nke ọma na-ehie ụzọ? Ị̀ na-ele onwe gị anya ka onye ihe na-agara nke ọma? Gịnị mere i ji ele onwe gị anya otú a? Olee otú i si mara na ihe na-agara gị nke ọma? Gịnị ka i ji ama onye ihe na-agara nke ọma? Isiokwu na-esonụ kwuru ndụmọdụ ndị bụ́ ịgba nyerela ọtụtụ nde mmadụ aka inwe ihe ịga nke ọma. Ka anyị hụ otú ị pụkwara isi nwee ihe ịga nke ọma.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanweela aha ahụ.