Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ị Ga-abụkwa Onye Na-aṅụrị Nanị Ọṅụ”

“Ị Ga-abụkwa Onye Na-aṅụrị Nanị Ọṅụ”

“Ị Ga-abụkwa Onye Na-aṅụrị Nanị Ọṅụ”

“Ị ga-emere Jehova, bụ́ Chineke gị, ememe . . . ị ga-abụkwa onye na-aṅụrị nanị ọṅụ.”—DEUTERỌNỌMI 16:15.

1. (a) Olee ihe iseokwu ndị Setan welitere? (b) Gịnị ka Jehova buru n’amụma mgbe Adam na Iv nupụsịrị isi?

MGBE Setan dubara Adam na Iv n’inupụrụ Onye kere ha isi, ọ kpalitere ihe iseokwu abụọ dị oké mkpa. Nke mbụ, o kwuru na Jehova adịghị eme ihe n’eziokwu nakwa na ụzọ Jehova si achị ezighị ezi. Nke abụọ, Setan nyere echiche na nanị ihe mere ụmụ mmadụ ji na-ejere Chineke ozi bụ n’ihi ihe ha na-erite n’aka Chineke. O kwuru nke a hoo haa n’oge Job. (Jenesis 3:1-6; Job 1:9, 10; 2:4, 5) Ka o sina dị, Jehova mere ihe ngwa ngwa iji dozie ọnọdụ ahụ. Ọbụna mgbe Adam na Iv ka nọ n’ogige Iden, Jehova buru amụma otú ọ ga-esi dozie ihe iseokwu ndị ahụ. O buru amụma banyere ọbịbịa nke otu “mkpụrụ” bụ́ onye ga-echipịa Setan n’isi n’ụzọ ga-egbu Setan mgbe Setan chipịasịrị ya n’ikiri ụkwụ.—Jenesis 3:15.

2. Olee otú Jehova si mee ka a ghọtakwuo otú ọ ga-esi emezu amụma ahụ e dekọrọ na Jenesis 3:15?

2 Ka oge na-aga, Jehova mere ka a ghọtakwuo amụma ahụ, si otú a na-egosi na ọ dịghị ihe ga-egbochi amụma ahụ imezu. Dị ka ihe atụ, Chineke gwara Ebreham na “mkpụrụ” ahụ ga-esi n’usoro ọmụmụ ya pụta. (Jenesis 22:15-18) Nwa nwa Ebreham bụ́ Jekọb ghọrọ nna nke ebo iri na abụọ nke Izrel. Na 1513 T.O.A., bụ́ mgbe ebo ndị a ghọrọ mba, Jehova nyere ha iwu nke gụnyere ememe dị iche iche ha ga na-eme kwa afọ. Pọl onyeozi kwuru na ememe ndị ahụ “bụ onyinyo nke ihe ndị gaje ịbịa.” (Ndị Kọlọsi 2:16, 17; Ndị Hibru 10:1) E nwere ihe ndị ha na-anọchi anya ha n’ihe ndị metụtara nzube Jehova banyere Mkpụrụ ahụ. Ime ememe ndị a nyere ụmụ Izrel ọṅụ dị ukwuu. Ịtụle ihe banyere ememe ndị a ná mkpirikpi ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike na nkwa Jehova ga-emezu.

Mkpụrụ ahụ Apụta

3. Ònye bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, oleekwa otú e si chipịa ya n’ikiri ụkwụ?

3 Mgbe ihe karịrị puku afọ anọ gasịrị ka Jehova busịrị amụma mbụ ahụ, Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa pụtara. Ọ bụ Jizọs. (Ndị Galeshia 3:16) Dị ka nwoke zuru okè, Jizọs nọgidere na-eme ezi ihe ruo ọnwụ ma si otú a gosi na ebubo ndị ahụ Setan boro bụ ụgha. Tụkwasị na nke ahụ, ebe ọ bụ na Jizọs emeghị mmehie, ọnwụ ya bụ àjà nke bara uru dị ukwuu. Jizọs ji àjà ọ chụrụ mee ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ụmụ Adam na Iv nwee ohere nke ịbụ ndị a napụtara site ná mmehie na ọnwụ. Ọnwụ Jizọs nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ bụ ‘nchipịa ahụ a ga-echipịa Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa n’ikiri ụkwụ.’—Ndị Hibru 9:11-14.

4. Gịnị ka e ji see onyinyo àjà Jizọs?

4 Jizọs nwụrụ na Naịsan 14, nke afọ 33 O.A. * N’Izrel, Naịsan 14 bụ ụbọchị ọṅụ bụ́ mgbe a na-eme ememe Ngabiga. Kwa afọ na Naịsan 14 ọ bụla, ezinụlọ dị iche iche na-erikọ nri ọnụ bụ́ nke gụnyere nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ. N’ụzọ dị otú a, ha na-echeta otú e si jiri ọbara nwa atụrụ napụta ụmụ nile e buru ụzọ mụọ n’Izrel mgbe mmụọ ozi ahụ e dunyere ịga gbuo ụmụ ndị Ijipt gburu ụmụ nile e buru ụzọ mụọ nke ndị Ijipt na Naịsan 14, 1513 T.O.A. (Ọpụpụ 12:1-14) Nwa atụrụ ememe Ngabiga ahụ sere onyinyo Jizọs, bụ́ onye Pọl onyeozi kwuru banyere ya, sị: “A chụwo Kraịst bụ́ àjà ememe ngabiga anyị n’àjà.” (1 Ndị Kọrịnt 5:7) Dị ka ọbara nke nwa atụrụ ememe Ngabiga ahụ mere, ọbara Jizọs a wụsịrị mere ka ọtụtụ ndị nwee olileanya nke ịbụ ndị a ga-azọpụta.—Jọn 3:16, 36.

‘Mkpụrụ Mbụ nke Ndị Nwụrụ Anwụ’

5, 6. (a) Olee mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, oleekwa ihe e ji see onyinyo mbilite n’ọnwụ ya n’Iwu ahụ? (b) Olee otú mbilite n’ọnwụ Jizọs si mee ka mmezu nke Jenesis 3:15 kwe omume?

5 N’ụbọchị nke atọ, a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ka o wee chee uru nke àjà ya n’ihu Nna ya. (Ndị Hibru 9:24) E nwere ememe ọzọ na-ese onyinyo mbilite n’ọnwụ ya. Ememe Achịcha Ekoghị Eko na-amalite n’ụbọchị na-esote Naịsan 14. N’echi ya, nke bụ́ Naịsan 16, ndị Izrel na-eweta ùkwù ọka bali mbụ ha wetara n’ubi, ya bụ, ihe mbụ ha wetara n’ubi, ka onye nchụàjà fegharịa ya n’ihu Jehova. (Levitikọs 23:6-14) Lee ka o si bụrụ ihe dabara nnọọ adaba na kpọmkwem na Naịsan 16 nke afọ 33 O.A., Jehova mebiri mgbalị Setan mere igbu ‘ezi onye àmà ya na-ekwesị ntụkwasị obi’ ka ọ nwụọ kpamkpam! Na Naịsan 16 nke afọ 33 O.A., Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ka ọ ghọọ mmụọ na-adịghị anwụ anwụ.—Mkpughe 3:14; 1 Pita 3:18.

6 Jizọs ghọrọ “mkpụrụ mbụ nke ndị daworo n’ụra ọnwụ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:20) N’adịghị ka ndị a kpọliteburu n’ọnwụ bụ́ ndị mesịrị nwụọ, Jizọs anwụghị ọzọ. Kama nke ahụ, ọ rịgoro n’eluigwe gaa nọrọ n’aka nri Jehova, bụ́ ebe o cheere ruo mgbe a ga-echi ya Eze nke Alaeze eluigwe nke Jehova. (Abụ Ọma 110:1; Ọrụ 2:32, 33; Ndị Hibru 10:12, 13) Kemgbe e chichara ya Eze, Jizọs nweziri ike ugbu a ichipịa onye iro ahụ kasịnụ, bụ́ Setan n’isi, bụ́ nke ga-egbu Setan kpamkpam, laakwa mkpụrụ Setan n’iyi.—Mkpughe 11:15, 18; 20:1-3, 10.

Ndị Ọzọ So ná Mkpụrụ Ebreham

7. Gịnị bụ Ememe Izu Asaa nke Ụbọchị Asaa?

7 Jizọs bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa n’Iden, bụ́ onye Jehova ga-esi n’aka ya “tipịasịa ọrụ Ekwensu.” (1 Jọn 3:8) Otú ọ dị, mgbe Jehova gwara Ebreham okwu, o gosiri na “mkpụrụ” Ebreham ahụ agaghị abụ nanị otu onye. Ọ ga-adị ka “kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.” (Jenesis 22:17) E nwere ememe ọzọ na-enye ọṅụ nke sere onyinyo mpụta nke ndị ọzọ so ná “mkpụrụ” ahụ. Ụbọchị iri ise site na Naịsan 16, Izrel mere Ememe Izu Asaa nke Ụbọchị Asaa. Iwu e nyere banyere nke a na-ekwu, sị: “Ruo echi nke ụbọchị izu ike nke asaa ka unu ga-agụ [ụbọchị iri ise]; unu ga-ewetakwa nso Jehova onyinye ịnata ihu ọma ọhụrụ. Unu ga-esite n’ebe obibi unu weta ogbe achịcha abụọ nke àjà ofufe, nke ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke ephah: ụtụ ọka flour ka ha ga-abụ, ihe na-eko achịcha ka a ga-eji sie ha, ịbụrụ Jehova mkpụrụ mbụ.” *Levitikọs 23:16, 17, 20.

8. Olee ihe omume dị ịrịba ama nke weere ọnọdụ na Pentikọst nke afọ 33 O.A.?

8 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, a na-akpọ Ememe Izu Asaa nke Ụbọchị Asaa ahụ Pentikọst (okwu ahụ bụ́ Pentikọst sitere n’okwu Grik nke pụtara “nke iri ise”). Na Pentikọst nke afọ 33 O.A., Nnukwu Onye Nchụàjà ahụ ka ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ, wụsara mmụọ nsọ n’ahụ́ obere ìgwè nke ndị na-eso ụzọ ya dị otu narị na iri abụọ bụ́ ndị gbakọtara na Jeruselem. N’ụzọ dị otú a, ndị ahụ na-eso ụzọ ghọrọ ụmụ Chineke e tere mmanụ na ụmụnna Jizọs Kraịst. (Ndị Rom 8:15-17) Ha ghọrọ mba ọhụrụ, “Izrel nke Chineke.” (Ndị Galeshia 6:16) Site n’ọnụ ọgụgụ dị nta ha dị ná mmalite, mba ahụ ga-emecha ruo narị puku na iri puku anọ na anọ.—Mkpughe 7:1-4.

9, 10. Olee ihe a na-eme na Pentikọst bụ́ nke na-ese onyinyo ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ?

9 Achịcha abụọ ahụ koro eko bụ́ ndị a na-efegharị n’ihu Jehova na Pentikọst ọ bụla na-ese onyinyo ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Okuko achịcha ndị ahụ koro na-egosi na Ndị Kraịst e tere mmanụ ka bu mmehie e ketara eketa, bụ́ nke dị ka ihe na-eko achịcha. Otú o sina dị, n’ihi àjà mgbapụta Jizọs, ha pụrụ ịbịakwute Jehova. (Ndị Rom 5:1, 2) Gịnị mere achịcha ndị ahụ ji dịrị abụọ? Ọ pụrụ ịbụ na ihe mere o ji dị otú ahụ bụ n’ihi na a ga-emecha si n’ìgwè abụọ nweta ụmụ Chineke e tere mmanụ—ná mbụ, site ná ndị Juu nkịtị, e mesịa, site ná ndị Jentaịl.—Ndị Galeshia 3:26-29; Ndị Efesọs 2:13-18.

10 Achịcha abụọ ahụ e fegharịrị na Pentikọst sitere ná mkpụrụ mbụ nke ọka wit e wetara n’ubi. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, a kpọrọ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta “otu ụdị nke mkpụrụ mbụ nke ihe ndị o kere eke.” (Jems 1:18) Ha bụ ndị mbụ a gbaghaara mmehie ha n’ihi ọbara Jizọs nke a wụsịrị, nke ahụ mekwara ka o kwe omume ime ka ha nwee ike ịdị ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe, bụ́ ebe ha ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze ya. (1 Ndị Kọrịnt 15:53; Ndị Filipaị 3:20, 21; Mkpughe 20:6) Ebe ọ bụ na ha bụ ụmụ Chineke, n’oge na-adịghị anya, ha ‘ga-eji mkpanaka ìgwè zụọ [mba nile] dị ka atụrụ’ hụkwa mgbe ‘a ga-egwepịa Setan n’okpuru ụkwụ ha.’ (Mkpughe 2:26, 27; Ndị Rom 16:20) Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ndị a bụ ndị nọgidere na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje. E si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ zụta ndị a dị ka mkpụrụ mbụ nye Chineke nakwa nye Nwa Atụrụ ahụ.”—Mkpughe 14:4.

Ụbọchị nke Na-ese Onyinyo Nnapụta

11, 12. (a) Gịnị na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie? (b) Uru dị aṅaa ka àjà e ji nwe ehi na ewu ndị ahụ chụọ baara ụmụ Izrel?

11 N’ụbọchị nke iri nke ọnwa Etanim (nke e mesịrị na-akpọ Tishri), * Izrel mere ememe nke sere onyinyo otú àjà mgbapụta Jizọs ga-esi baara ndị mmadụ uru. N’ụbọchị ahụ, mba ahụ dum gbakọtara maka Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ka e wee chụọ àjà n’aha ha iji kpuchiere ha mmehie ha.—Levitikọs 16:29, 30.

12 N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, nnukwu onye nchụàjà na-egbu nwa oké ehi ma fesa ọbara ya ugboro asaa n’ihu okwuchi Igbe ahụ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ, si otú ahụ na-eche ọbara ahụ n’ihu Jehova n’ụzọ ihe atụ. Àjà dị otú ahụ bụ maka mmehie nnukwu onye nchụàjà na “ụlọ ya,” ya bụ, ndị nchụàjà ndị ọzọ na ndị Livaị. Nnukwu onye nchụàjà na-ewerezi ewu abụọ, gbuo otu dị ka àjà mkpuchi mmehie maka ‘ndị Izrel.’ Ọ na-efesakwa ụfọdụ n’ime ọbara ewu ahụ n’ihu okwuchi Igbe ahụ nke dị n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ. Mgbe o mesịrị, ọ na-atụkwasị aka ya n’isi ewu nke abụọ ma kwupụta mmehie ụmụ Izrel. Ọ na-edubazi ewu ahụ n’ịkpa ka o bufuo mmehie mba ahụ n’ụzọ ihe atụ.—Levitikọs 16:3-16, 21, 22.

13. Olee otú ihe ndị e mere n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie si see onyinyo ọrụ ndị Jizọs na-arụ?

13 Dị ka ihe ndị ahụ a na-eme n’ụbọchị ahụ na-anọchi anya ya, Nnukwu Onyeisi Nchụàjà, bụ́ Jizọs, jiri ọbara ndụ nke ya onwe ya mee ka o kwe omume ịgbaghara ndị mmadụ mmehie ha. Ndị mbụ ọbara ya baara uru bụ “ụlọ ime mmụọ” ahụ bụ́ narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ e tere mmanụ, nke a mekwara ka o kwe omume ha na Jehova ịdị ná mma. (1 Pita 2:5; 1 Ndị Kọrint 6:11) Àjà e ji oké ehi ahụ chụọ na-eso onyinyo nke a. Nke a megheere ha ohere inweta ihe nketa ha nke bụ́ ịga eluigwe. Nke abụọ, e jikwa ọbara Jizọs mee ihe maka ọtụtụ nde ndị ọzọ nwere okwukwe na Kraịst, dị ka ewu ahụ e ji chụọ àjà sere onyinyo ya. A ga-eme ka ha dị ndụ ebighị ebi n’ụwa ebe a, bụ́ ihe nketa nke Adam na Iv tụfuru. (Abụ Ọma 37:10, 11) N’ihi ọbara ya nke a wụsịrị, Jizọs bupụrụ mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ, dị nnọọ ka ewu ahụ dị ndụ buuru mmehie nke ndị Izrel banye n’ịkpa.—Aịsaịa 53:4, 5.

Ịṅụrị Ọṅụ n’Ihu Jehova

14, 15. Gịnị ka a na-eme n’oge Ememe Ụlọ Ntu, gịnịkwa ka nke a na-echetara ụmụ Izrel?

14 Mgbe Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ gasịrị, ụmụ Izrel mere Ememe Ụlọ Ntu, bụ́ ememe kasị enye ndị Juu ọṅụ n’afọ. (Levitikọs 23:34-43) A na-eme ememe ahụ site n’abalị iri na ise ruo n’abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Etanim, ha na-enwekwa mgbakọ dị nsọ ná ngwụsị nke ememe ahụ. Ọ na-aka akara ngwụsị nke owuwe ihe ubi ma bụrụkwa oge e ji ekele Chineke ekele maka ịdị mma ya. N’ihi ya, Jehova nyere ndị na-eme ememe ahụ iwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, ga-agọzi gị n’ihe omume gị nile, na n’omume nile nke aka gị, ị ga-abụkwa onye na-aṅụrị nanị ọṅụ.” (Deuterọnọmi 16:15) Nke ahụ bụ nnọọ oge na-enye ọṅụ n’ezie!

15 N’oge ememe ahụ, ụmụ Izrel na-ebi n’ụlọ ntu ruo ụbọchị asaa. E si otú a chetara ha na o nwere mgbe ha biri n’ụlọ ntu n’ịkpa. Oge ememe ahụ na-echetara ha nnọọ na Jehova na-elekọta ha dị ka nna na-ahụ n’anya. (Deuterọnọmi 8:15, 16) Ebe ọ bụ na mmadụ nile, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye, na-ebi n’otu ụdị ụlọ ntu, nke a na-echetara ụmụ Izrel na ha nile ha otu ma a bịa n’ihe metụtara ememe ahụ.—Nehemaịa 8:14-16.

16. Gịnị ka Ememe Ụlọ Ntu ahụ sere onyinyo ya?

16 Ememe Ụlọ Ntu ahụ bụ ememe a na-eme n’oge owuwe ihe ubi, ọ bụkwa ememe na-enye ọṅụ nke e ji achịkọta ihe site n’ubi, bụ́ nke na-ese onyinyo nchịkọta na-enye ọṅụ nke a na-achịkọta ndị nwere okwukwe na Jizọs Kraịst. Nchịkọta ahụ malitere na Pentikọst nke afọ 33 O.A., bụ́ mgbe e tere otu narị na iri mmadụ abụọ na-eso ụzọ Jizọs mmanụ iso ‘n’òtù ndị nchụàjà dị nsọ.’ Dị ka ndị Izrel si bie n’ụlọ ntu ruo ụbọchị ole na ole, ndị ahụ e tere mmanụ maara na ha bụ nanị “ndị ala ọzọ na-ebi nwa oge” n’ụwa a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke. Olileanya ha bụ ịga eluigwe. (1 Pita 2:5, 11) Nchịkọta nke Ndị Kraịst e tere mmanụ ruru n’ọgwụgwụ ya “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a, bụ́ mgbe a na-achịkọta ndị ikpeazụ so na narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ.—2 Timoti 3:1.

17, 18. (a) Gịnị na-egosi na ndị ọzọ, ma e wezụga Ndị Kraịst e tere mmanụ, ga-eso erite uru n’àjà Jizọs? (b) Ole ndị taa na-erite uru site n’Ememe Ụlọ Ntu ihe atụ ahụ, oleekwa mgbe ememe ahụ na-enye ọṅụ ga-abịa ná njedebe?

17 O kwesịrị ịrịba ama na a na-achụ oké ehi iri asaa n’àjà n’oge ememe a a na-eme n’oge ochie. (Ọnụ Ọgụgụ 29:12-34) Nọmba ahụ bụ́ iri asaa bụ asaa e ji iri mụbaa, ha bụkwa nọmba ndị e ji mee ihe na Bible, ndị na-anọchi anya ihe zuru ezu n’eluigwe na n’ụwa. N’ihi ya, àjà Jizọs ga-abara ndị kwesịrị ntụkwasị obi sitere n’ụmụ iri asaa nke ụmụ Noa uru. (Jenesis 10:1-29) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, n’oge anyị, e nwekwuola ndị ọzọ a na-achịkọta, ha gụnyere ndị nile si ná mba nile bụ́ ndị nwere okwukwe na Jizọs ma nwee olileanya nke ịdị ndụ na paradaịs elu ala.

18 Jọn onyeozi hụrụ nchịkọta nke oge a n’ọhụụ. O bụ ụzọ nụ ọkwa a mara banyere ndị ikpeazụ a ga-aka akara n’ime narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ hụrụ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ,” ka ha ji ‘igu nkwụ n’aka ha’ na-eguzo n’ihu Jehova na Jizọs. Ndị a “si n’oké mkpagbu ahụ na-apụta” ma na-abanye n’ụwa ọhụrụ ahụ. Ka ọ dị ugbu a, ha onwe ha bụkwa ndị ala ọzọ na-ebi nwa oge n’ụwa ochie a, ha na-atụkwa anya mgbe “Nwa atụrụ ahụ . . . ga-azụ ha dị ka atụrụ, ọ ga-edugakwa ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.” N’oge ahụ, “Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha.” (Mkpughe 7:1-10, 14-17) Ememe Ụlọ Ntu ihe atụ ahụ ga-abịa ná njedebe n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst mgbe a ga-eme ka oké ìgwè mmadụ ahụ na ndị e si n’ọnwụ kpọlite zuo okè.—Mkpughe 20:5.

19. Olee uru anyị na-erite site n’ịtụle ihe banyere ememe ndị e mere n’Izrel?

19 Anyị onwe anyị pụkwara ịbụ ndị “na-aṅụrị nanị ọṅụ” ka anyị na-atụgharị uche n’ihe ememe ndị Juu oge ochie pụtara. Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na Jehova mere ka anyị matatụ otú amụma o buru n’Iden ga-esi mezuo, ọ bụkwa ihe na-enye obi ụtọ ịhụ ka o ji nwayọọ nwayọọ na-emezu. Taa, anyị maara na Mkpụrụ ahụ apụtala nakwa na e chipịawo ya n’ikiri ụkwụ. Ugbu a, ọ bụ Eze na-achị achị n’eluigwe. Tụkwasị na nke ahụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ ekwesịwo ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Gịnịzi fọdụrụ ka e mee? Olee mgbe amụma ahụ ga-emezucha? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Naịsan dabara n’ọnwa March na April na kalenda nke oge anyị.

^ par. 7 N’àjà a nke a na-efegharị ogbe achịcha abụọ koro eko, ihe onye nchụàjà na-emekarị bụ itinye achịcha ndị ahụ n’ọbọ aka ya, welie ha elu, ma bugharịa ha site n’otu akụkụ gaa n’akụkụ ọzọ. Ime otú a na-egosi iche ihe ahụ e ji chụọ àjà n’ihu Jehova.—Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peeji nke 528, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 11 Etanim, ma ọ bụ Tishri, dabara na September na October na kalenda nke oge a.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị ka nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ sere onyinyo ya?

• Ọrụ nchịkọta dị aṅaa ka Ememe Pentikọst sere onyinyo ya?

• Olee ihe e mere n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie bụ́ nke na-egosi uru àjà Jizọs bara?

• N’ụzọ dị aṅaa ka Ememe Ụlọ Ntu ahụ si see onyinyo nchịkọta nke Ndị Kraịst?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Chaatị dị na peeji nke 22, 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ihe Ndị Merenụ: Ihe Ndị Ha Na-eso

Ememe Naịsan 14 Onyinyo Ha

Ngabiga E gbuo nwa atụrụ A chụọ Jizọs

e ji eme Ememe n’àjà

Ngabiga

Ememe Naịsan 15 Ụbọchị Izu Ike

Achịcha

Na-ekoghị Naịsan 16 E nye ọka bali A kpọlite Jizọs

Eko n’ọnwụ

(Naịsan 15-21)

Ụbọchị iri ise

Ememe Izu E nye ogbe Jizọs egosi Jehova

Asaa nke Sivan 6 achịcha abụọ ụmụnna ya e tere

Ụbọchị Asaa mmanụ

(Pentikọst)

Ụbọchị Tishri 10 A chụọ otu oké Jizọs e jiri ọbara

Mkpuchi ehi na ewu abụọ ya chụọ àjà maka

Mmehie n’àjà ihe nile a kpọrọ

mmadụ

Ememe Tishri 15-21 Ndị Izrel ejiri Nchịkọta nke ndị e

Ụlọ Ntu ọṅụ biri n’ụlọ tere mmadụ na

(Nchịkọta, ntu, ma ṅụrịa “oké ìgwè mmadụ”

Ụlọikwuu) ọṅụ n’ihi ihe

ndị ha wetara

n’ubi, a chụọ

oké ehi iri

asaa n’àjà

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Dị ka ọbara nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ mere, ọbara Jizọs a wụsịrị wetaara ọtụtụ mmadụ nzọpụta

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Mkpụrụ mbụ nke ọka bali e nyere na Naịsan 16 sere onyinyo mbilite n’ọnwụ nke Jizọs

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Achịcha abụọ ahụ e nyere na Pentikọst na-ese onyinyo ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ememe Ụlọ Ntu ahụ sere onyinyo nchịkọta nke ndị e tere mmanụ nakwa nke “oké ìgwè mmadụ” ndị sitere ná mba nile