Ị Pụrụ Imeri Ihe Isi Ike
Ị Pụrụ Imeri Ihe Isi Ike
N’OGE a siri ike obibi, ọtụtụ ndị na-edi ihe isi ike ndị tara akpụ. Nye Ndị Kraịst, ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na ịnọgide na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya na-enyere ha aka idi ihe isi ike. N’ụzọ dị aṅaa? A pụrụ ịchọta azịza ya n’otu ihe atụ Jizọs Kraịst nyere. O jiri ndị na-eso ụzọ ya na-erube isi tụnyere “nwoke nwere uche, bụ́ onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume.” Jizọs kwuru, sị: “Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ, ma ọ daghị, n’ihi na a tọwo ntọala ya n’elu oké nkume.”—Matiu 7:24, 25.
Rịba ama na ọ bụ ezie na nwoke ahụ nọ n’ihe atụ Jizọs maara ihe, o nwetara ihe isi ike—bụ́ ndị mmiri ozuzo, idei mmiri na ifufe na-emebi ihe nọchiri anya ya. Ya mere, Jizọs ekwughị na ndị na-eso ụzọ ya agaghị enwe nsogbu nakwa na ha ga na-ebi ndụ obi ụtọ na nke dị jụụ. (Abụ Ọma 34:19; Jems 4:13-15) Ma o kwuru na ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ịkwadebe onwe ha ịnagide ihe isi ike na nsogbu ndị pụrụ ịbịara ha nakwa na ha pụrụ imeri ha.
Jizọs malitere ihe atụ ya site n’ikwu, sị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma na-eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, bụ́ onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume.” N’ezie, ihe Jizọs na-ekwu okwu ya abụghị banyere iwu ụlọ nkịtị, kama ọ bụ banyere ibi ndụ dị ka Ndị Kraịst. Ndị na-erube isi n’okwu Kraịst na-eji nghọta na ezi uche eme ihe. Ha na-ekwe ka ndụ ha dabere n’ozizi Jizọs nke e ji tụnyere oké nkume, site n’itinye ihe a kụziiri ha n’ọrụ. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na a dịghị achọta oké nkume ihe atụ a n’elu ájá. Nwoke a e kwuru okwu ya n’ihe atụ a aghaghị ‘igwumi ala’ iji ruo n’ebe nkume ahụ dị. (Luk 6:48) N’ụzọ yiri nke a, ndị na-eso ụzọ Jizọs na-anọgide na-agbalịsi ike ịzụlite àgwà ndị na-adịgide adịgide bụ́ ndị ga-eme ka ha bịarukwuo Chineke nso.—Matiu 5:5-7; 6:33.
Gịnị na-eme mgbe ihe isi ike ndị tara akpụ bịaara ụmụazụ Jizọs iji mata otú okwukwe ha haruru? Njikere ha dị irubere ozizi Kraịst isi na àgwà Ndị Kraịst bụ nnọọ ihe ndị na-enyere ha aka n’oge ihe isi ike ndị dị otú ahụ, karịsịakwa n’oge agha Amagedọn nke na-abịanụ. (Matiu 5:10-12; Mkpughe 16:15, 16) Ọtụtụ ndị emeriela ihe isi ike ndị bịara ha site n’ịgbaso ihe Kraịst na-akụzi. Ị pụkwara ime otú ahụ.—1 Pita 2:21-23.