Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị bụ akara ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 7:3?

Mkpughe 7:1-3 na-ekwu, sị: “Ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha na-eguzo na nkuku anọ nke ụwa, na-ejidesi ifufe anọ nke ụwa ike, ka ifufe ọ bụla wee ghara ifekwasị ụwa ma ọ bụ oké osimiri ma ọ bụ osisi ọ bụla. M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka o si n’ọwụwa anyanwụ na-arịgo, na-enwe akara nke Chineke ahụ dị ndụ; o wee jiri oké olu tikuo ndị mmụọ ozi anọ ahụ bụ́ ndị e nyere ikike imebi ụwa na oké osimiri, na-asị: ‘Unu emebila ụwa ma ọ bụ oké osimiri ma ọ bụ osisi, ruo mgbe anyị kasịworo ndị ohu nke Chineke anyị akara n’egedege ihu ha.’”

Mgbe a ga-atọhapụ “ifufe anọ” ahụ, ihe ga-esi na ya pụta ga-abụ ‘oké mkpagbu ahụ,’ ya bụ, mbibi nke okpukpe ụgha na akụkụ ndị ọzọ nke ajọ ụwa. (Mkpughe 7:14) “Ndị ohu nke Chineke anyị” bụ ụmụnna Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa. (1 Pita 2:9, 16) Ya mere, amụma a na-egosi na a ga-akazuworị ụmụnna Kraịst akara mgbe oké mkpagbu ahụ ga-etiwapụ. Otú ọ dị, amaokwu ndị ọzọ dị na Bible na-egosi na e nwere akara mbụ nke a na-aka ndị e tere mmanụ. Ọ bụ ya mere anyị ji ekwu mgbe ụfọdụ banyere akara nke mbụ na nke ikpeazụ. Olee ihe dị iche n’akara abụọ a?

Ka anyị tụlee ihe okwu ahụ bụ́ “akara” pụtara. N’oge ochie, a na-eji mgbaaka akara akanye akara n’akwụkwọ. Okwu ahụ pụkwara izo aka n’akara ahụ e ji mgbaaka akara kanye. N’oge ahụ, a na-akanyekarị akara n’akwụkwọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ iji gosi na ha bụ ezigbo ya ma ọ bụkwanụ iji gosi onye nwe ha.—1 Ndị Eze 21:8; Job 14:17.

Pọl ji mmụọ nsọ tụnyere akara mgbe o kwuru, sị: “Onye ahụ nke na-enye ihe mmesi obi ike na anyị na unu bụ ndị nke Kraịst nakwa onye teworo anyị mmanụ bụ Chineke. Ọ kakwasịwokwa anyị akara ya, o nyewokwa anyị ihe àmà nke ihe gaje ịbịa, ya bụ, mmụọ nsọ, n’ime obi anyị.” (2 Ndị Kọrịnt 1:21, 22) Ya mere, Jehova ji mmụọ nsọ ya tee Ndị Kraịst a mmanụ iji gosi na ha bụ ndị nke ya.

Otú ọ dị, a ga-aka ndị ahụ e tere mmanụ akara ugboro abụọ. Akara nke mbụ ahụ ga-adị iche na nke ikpeazụ n’ihe banyere (1) ihe e bu n’uche kaa ya nakwa (2) n’oge a kara ya. Akara nke mbụ ahụ bụ iji họrọ onye ọhụrụ a ga-eji mejupụta ọnụ ọgụgụ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ. Akara nke ikpeazụ ahụ bụ iji mee ka o doo anya na onye ahụ a họọrọ ma kaa akara egosila nnọọ na ya na-eguzosi ike n’ihe. Ọ bụ nanị n’akara nke ikpeazụ ka a ga-aka onye ahụ e tere mmanụ akara ga-adịgide adịgide ‘n’egedege ihu ya,’ na-eme ka o doo onye ọ bụla anya na ọ bụ “ohu nke Chineke anyị” kwesịrị ntụkwasị obi nke a nwalerela. Akara ahụ e kwuru banyere ya ná Mkpughe isi nke 7 na-ezo aka n’agba nke ikpeazụ a nke ịka akara ahụ.—Mkpughe 7:3.

Banyere oge a na-aka akara nke mbụ ahụ, Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ ozi, sị: “Unu nwekwara olileanya na ya mgbe unu nụsịrị okwu nke eziokwu ahụ, bụ́ ozi ọma banyere nzọpụta unu. Sitekwa na ya, mgbe unu kweresịịrị, e ji mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa kaa unu akara.” (Ndị Efesọs 1:13, 14) Ọtụtụ mgbe, ihe ndekọ Bible gosiri na a kara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akara obere oge ka ha nụsịrị ozi ọma ahụ ma kwere na Kraịst. (Ọrụ 8:15-17; 10:44) Akara a a kara ha na-egosi na Chineke nabatara ha. Otú ọ dị, nke ahụ adịghị egosi na Chineke anabatachaala ha. Gịnị mere e ji kwuo otú a?

Pọl kwuru na ‘a kara Ndị Kraịst e tere mmanụ akara maka ụbọchị ntọhapụ.’ (Ndị Efesọs 4:30) Nke a na-egosi na ogologo oge, ihe dị ka ọtụtụ afọ, ga-agafe site ná mgbe a kasịrị ha akara nke mbụ ahụ. Ọ dị Ndị Kraịst e tere mmanụ mkpa ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi site n’ụbọchị e jiri mmụọ nsọ kaa ha akara ruo ‘n’ụbọchị a tọhapụrụ ha’ n’anụ ahụ́—ya bụ, ruo ọnwụ ha. (Ndị Rom 8:23; Ndị Filipaị 1:23; 2 Pita 1:10) Ya mere, ọ bụ nanị mgbe ọnwụ Pọl ruru nso ka ọ pụrụ ikwu, sị: “Agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ. Malite ugbu a gaa n’ihu e debeere m okpueze ezi omume.” (2 Timoti 4:6-8) Ọzọkwa, Jizọs gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: ‘Gosipụtanụ na unu na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ, m ga-enyekwa unu okpueze bụ́ ndụ.’—Mkpughe 2:10; 17:14.

Okwu ahụ bụ́ “okpueze” mekwuru ka a mata na oge ụfọdụ ga-agafe malite mgbe a kara akara nke mbụ ahụ ruo mgbe a kara akara nke ikpeazụ. N’ihi gịnị ka o ji dị otú a? N’oge ochie, a na-enye onye meriri n’ọsọ okpueze. Ọ bụrụ na ọ ga-enweta okpueze, ọ ga-eme ihe karịrị isonye n’asọmpi ahụ. Ọ ghaghị ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụ nanị mgbe Ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ gbaruru ọsọ ndụ ahụ n’isi—malite mgbe a kara ha akara nke mbụ ruo mgbe a kara ha akara nke ikpeazụ—ka a ga-enye ha ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe.—Matiu 10:22; Jems 1:12.

Olee mgbe a ga-aka Ndị Kraịst e tere mmanụ fọdụrụ n’ụwa bụ́ ndị a karala akara nke mbụ akara nke ikpeazụ? A ga-aka onye ọ bụla n’ime ha ka dị ndụ n’ụwa akara ‘n’egedege ihu ya’ tupu oké mkpagbu ahụ etiwapụ. N’agbanyeghị na ole na ole n’ime ha ka ga-anọ ndụ n’anụ ahụ́, ha ka ga-ejechakwa ozi elu ala ha, a ga-akachaworị ndị nile so n’Izrel ime mmụọ akara tupu a tọhapụ ifufe anọ nke oké mkpagbu ahụ.