Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mbilite n’Ọnwụ Mbụ ahụ” Na-aga n’Ihu Ugbu A!

“Mbilite n’Ọnwụ Mbụ ahụ” Na-aga n’Ihu Ugbu A!

“Mbilite n’Ọnwụ Mbụ ahụ” Na-aga n’Ihu Ugbu A!

“Ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu ga-ebukwa ụzọ bilie.”—1 NDỊ TESALONAỊKA 4:16.

1, 2. (a) Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị nwụrụ anwụ? (b) Gịnị mere obi ji sie gị ike na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

“NDỊ dị ndụ maara na ha ga-agwụ.” Nke a abụwo eziokwu kemgbe Adam mehiesịrị. Kemgbe ụwa, onye ọ bụla dị ndụ maara na ya ga-emecha nwụọ otu ụbọchị, ọtụtụ ndị echewokwa, sị: ‘Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ? Gịnị bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?’ Bible na-aza, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.”—Eklisiastis 9:5.

2 Ya bụrụ otú ahụ, è nwere olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ? Ee. A ghaghị inwe, ma ọ́ bụghị ya, ihe Chineke zubere ná mmalite maka ihe a kpọrọ mmadụ agaghị emezu. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi enwewo okwukwe na nkwa Jehova kwere banyere otu Mkpụrụ nke ga-ebibi Setan ma mezie ihe nile Setan mebiri, ga-emezu. (Jenesis 3:15) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha anwụwo. Ka ha wee nwee ike ịhụ mmezu nke nkwa ahụ na nkwa ndị ọzọ Jehova kwere, a ghaghị ịkpọlite ha n’ọnwụ. (Ndị Hibru 11:13) Nke ạ ọ̀ ga-ekwe omume? Ee, ọ ga-ekwe. Pọl onyeozi kwuru, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) O nwere mgbe Pọl kpọlitere otu nwa okorobịa aha ya bụ́ Yutikọs n’ọnwụ, bụ́ onye si n’okpukpu nke atọ nke windo ụlọ elu daa “e wee bulite ya n’ozu.” Nke a bụ nke ikpeazụ n’ime mbilite n’ọnwụ itoolu e dekọrọ na Bible.—Ọrụ 20:7-12. *

3. Olee otú okwu Jizọs nke e dekọrọ na Jọn 5:28, 29 si na-akasi gị obi, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

3 Mbilite n’ọnwụ itoolu ndị a mere ka obi sie anyị ike na ihe Pọl kwuru ga-emezu. Ha mere ka anyị kwenyesie ike n’ihe Jizọs kwuru mgbe ọ sịrị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Okwu ndị a na-enye obi ụtọ n’ezie. Ọ na-akasikwa nnọọ ọtụtụ nde mmadụ, bụ́ ndị ndị ha hụrụ n’anya daworo n’ụra ọnwụ, obi.

4, 5. Mbilite n’ọnwụ ndị dị aṅaa dịgasị iche ka Bible kwuru okwu ha, oleekwa nke anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-apụta ịdịghachi ndụ n’elu ala nke e meworo ka udo dịghachi na ya n’Alaeze Chineke. (Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Aịsaịa 11:6-9; 35:5, 6; 65:21-23) Otú ọ dị, e nwere mbilite n’ọnwụ ndị ọzọ ga-ewere ọnọdụ tupu nke ahụ. A ga-ebu ụzọ kpọlite Jizọs Kraịst ka o wee chee àjà ọ chụrụ n’ihi anyị n’ihu Chineke. Jizọs nwụrụ na 33 O.A., a kpọlitekwa ya n’ọnwụ.

5 Nke ahụ gasịa, ndị e tere mmanụ so ‘n’Izrel nke Chineke’ ga-esonyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’ebube eluigwe, bụ́ ebe ha na “Onyenwe anyị ga-anọ mgbe nile.” (Ndị Galeshia 6:16; 1 Ndị Tesalonaịka 4:17) A na-akpọ nke a “mbilite n’ọnwụ bu ụzọ” ma ọ bụ “mbilite n’ọnwụ mbụ.” (Ndị Filipaị 3:10, 11; Mkpughe 20:6) Mgbe mbilite n’ọnwụ ahụ gasịrị, oge ga-eruzi ka a kpọlite ọtụtụ nde mmadụ n’ọnwụ n’ụwa, bụ́ ndị ga-enwe olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs. N’ihi ya, ma olileanya anyị ọ̀ bụ ịga eluigwe ma ọ̀ bụ ịnọ n’ụwa, anyị ga-achọ nnọọ ịma banyere “mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ.” Ụdị mbilite n’ọnwụ dị aṅaa ka ọ bụ? Olee mgbe ọ ga-ewere ọnọdụ?

“Ụdị Ahụ́ Dị Aṅaa?”

6, 7. (a) Gịnị ga-emerịrị tupu Ndị Kraịst e tere mmanụ agaa eluigwe? (b) Ụdị ahụ́ dị aṅaa ka a ga-eji kpọlite ha n’ọnwụ?

6 N’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrint, Pọl jụrụ ajụjụ banyere mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ, sị: “Olee otú a gaje isi kpọlite ndị nwụrụ anwụ? Ee, hà ga-abịa n’ụdị ahụ́ dị aṅaa?” Ọ zaziri ajụjụ ahụ n’onwe ya, sị: “A dịghị eme ka ihe ị kụrụ dị ndụ ọ gwụla ma ò bu ụzọ nwụọ . . . ma Chineke na-enye ya ahụ́ dị nnọọ ka o siworo dị ya ezi mma . . . Ma ebube ahụ́ nke eluigwe bụ otu ụdị, ahụ́ nke elu ala bụkwa ụdị dị iche.”—1 Ndị Kọrint 15:35-40.

7 Okwu Pọl na-egosi na Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ aghaghị ịnwụ tupu ha enweta ụgwọ ọrụ ha nke bụ́ ịga eluigwe. Mgbe ha nwụrụ, ahụ́ mmadụ nkịtị ha ga-alaghachi n’ájá. (Jenesis 3:19) Mgbe oge Chineke ruru, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ n’ụdị ahụ́ kwesịịrị ndụ eluigwe. (1 Jọn 3:2) Chineke ga-emekwa ka ha gharazie ịnwụ anwụ. Nke a abụghị ihe ha bu pụta ụwa, dị ka à ga-asị na e kunyere n’ime ha ihe a sị na ọ bụ mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Pọl kwuru, sị: “Ihe a nke pụkwara ịnwụ anwụ aghaghị iyikwasị anwụghị anwụ.” Anwụghị anwụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke, bụ́ nke ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ná mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ “ga-eyikwasị.”—1 Ndị Kọrint 15:50, 53; Jenesis 2:7; 2 Ndị Kọrint 5:1, 2, 8.

8. Olee otú anyị si mara na Chineke e sighị n’okpukpe dị iche iche họrọ narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ?

8 Ọ bụ nanị narị puku na iri puku anọ na anọ ka a ga-akpọlite ná mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ. Jehova malitere ịhọrọ ha na Pentikọst nke afọ 33 O.A., obere oge ka ọ kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ. E dere “aha [Jizọs] na aha Nna ya n’egedege ihu” ha nile. (Mkpughe 14:1, 3) N’ihi ya, a họrọghị ha site n’okpukpe dị iche iche. Ha nile bụcha Ndị Kraịst, ọ na-emekwa ha nile obi ụtọ na e dere aha Nna ahụ, bụ́ Jehova, n’ihu ha. Mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ, a na-enye ha ọrụ ha ga-arụ n’eluigwe. Olileanya nke ịnọ kpọmkwem n’ihu Chineke na-ejere ya ozi na-enye ha obi ụtọ.

Ọ̀ Na-aga n’Ihu Ugbu A?

9. Olee otú Mkpughe 2:7 na 17:14 si enyere anyị aka ịgụta mgbe o yiri ka ọ̀ bụ mgbe mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ malitere?

9 Olee mgbe mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ na-ewere ọnọdụ? E nwere ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ na-egosi na ọ na-aga n’ihu ugbu a. Dị ka ihe atụ, tụlee isiakwụkwọ abụọ dị ná Mkpughe. Ka anyị buru ụzọ tụlee Mkpughe isi iri na abụọ. N’ebe ahụ, anyị na-agụ na Jizọs Kraịst e chiri eze ọhụrụ, na ndị mmụọ ozi ya, busoro Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agha. (Mkpughe 12:7-9) Dị ka magazin Ụlọ Nche gosiworo ọtụtụ ugboro, agha ahụ malitere na 1914. * Otú ọ dị, rịba ama na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ụmụazụ Jizọs ndị e tere mmanụ a sị na ha nọ ya mgbe a lụrụ agha ahụ n’eluigwe. Ugbu a, tụlee isi iri na asaa nke akwụkwọ Mkpughe. Anyị na-agụ n’ebe ahụ na mgbe e bibisịrị “Babịlọn Ukwu ahụ,” Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri mba nile. Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ọzọ, ya na ndị a kpọrọ na ndị a họọrọ na ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-emekwa otú ahụ.” (Mkpughe 17:5, 14) Ọ ghaghị ịbụ na a kpọlitelarị ndị “a kpọrọ na ndị a họọrọ na ndị kwesịrị ntụkwasị obi” n’ọnwụ ebe e kwuru na ha ga-eso Jizọs merie ụwa Setan mmeri ikpeazụ. Ya bụrụ otú ahụ, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na a kpọlitere ndị e tere mmanụ nwụrụ tupu Amagedọn n’ihe dị ka n’agbata 1914 na Amagedọn.

10, 11. (a) Olee ndị bụ ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ, gịnịkwa ka otu n’ime ha gwara Jọn? (b) Gịnị ka anyị na-aghọta site na nke a?

10 Ànyị pụrụ ikwu kpọmkwem mgbe mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ malitere? Anyị na-achọta ihe na-enyere anyị aka ịmata mgbe ọ malitere ná Mkpughe 7:9-15, bụ́ ebe Jọn onyeozi kọwara ọhụụ ọ nọ na ya hụ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ.” Ọ bụ otu n’ime ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ kpugheere Jọn nke a, ndị okenye ndị a na-anọchikwa anya narị puku na iri puku anọ na anọ bụ́ ndị ga-eso Kraịst chịa, ka ha nọ n’ebube eluigwe ha. * (Luk 22:28-30; Mkpughe 4:4) Jọn n’onwe ya nwere olileanya ịga eluigwe; ma ebe ọ bụ na ọ ka bụ mmadụ n’ụwa mgbe okenye ahụ gwara ya okwu n’ọhụụ ahụ, ọ ghaghị ịbụ na Jọn na-anọchi anya ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa bụ́ ndị na-enwetabeghị ụgwọ ọrụ ha nke bụ́ ịga eluigwe.

11 Gịnịzi ka anyị pụrụ ikwubi site n’ihe ahụ e kwuru na otu n’ime ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ gwara Jọn ndị bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ? O yiri ka ndị a kpọlitere n’ọnwụ so n’òtù ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ hà so na-agwa ụmụ mmadụ eziokwu nke Chineke taa. Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ ndị ohu Chineke e tere mmanụ nọ n’ụwa na 1935 ka a gwara kpọmkwem ndị bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ. Ebe ọ bụ otu n’ime ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ mere ka a mata eziokwu a dị mkpa, ọ ghaghị ịbụ na a kpọlitere ya n’ọnwụ, ya agaa eluigwe ma ọ dịkarịa ala tupu 1935. Nke a ga-egosi na ọ pụrụ ịbụ na mbilite n’ọnwụ ahụ malitere n’ihe dị ka n’agbata 1914 na 1935. Ànyị nwere ike ịkapịkwu okwu a ọnụ?

12. Kọwaa ihe mere a pụrụ iji lee oge opupu ihe ubi nke afọ 1918 anya dị ka mgbe ọ pụrụ ịbụ na mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ malitere.

12 Ọ ga-aka mma ugbu a ma anyị tụlee ihe e dere na Bible bụ́ nke a pụrụ ịsị na ya na okwu a yiri. N’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 29 O.A., e tere Jizọs Kraịst mmanụ dị ka Eze ga-achị n’Alaeze Chineke n’ọdịnihu. Mgbe afọ atọ na ọkara gasịrị, ya bụ n’oge opupu ihe ubi nke afọ 33 O.A., a kpọlitere ya n’ọnwụ ya aghọọ mmụọ dị ike. Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ma ọ bụrụ na e kwuo na ebe ọ bụ na e chiri Jizọs eze n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 1914, na a malitere ịkpọlite ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ n’ọnwụ mgbe afọ atọ na ọkara gasịrị, ya bụ n’oge opupu ihe ubi nke afọ 1918? O nwere ike ịbụ otú o si mee. Ọ bụ ezie na Bible ekwughị kpọmkwem na ọ bụ otú ahụ ka o si mee ma nke a kwekọrọ n’ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ kwuru, bụ́ ndị gosiri na mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ weere ọnọdụ n’oge na-adịghị anya ọnụnọ Kraịst malitesịrị.

13. N’ụzọ dị aṅaa ka 1 Ndị Tesalonaịka 4:15-17 si egosi na mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ malitere ná mmalite nke oge ọnụnọ Kraịst?

13 Dị ka ihe atụ, Pọl dere, sị: “Anyị ndị dị ndụ bụ́ ndị lanarịrị ruo ọnụnọ Onyenwe anyị [ọ bụghị ruo n’ọgwụgwụ nke ọnụnọ ya] agaghị ebu ndị ahụ daworo n’ụra ọnwụ ụzọ ma ọlị; n’ihi na Onyenwe anyị n’onwe ya ga-esite n’eluigwe rịdata na-eji ọkpụkpọ òkù na-ada ụda, na-eji olu onyeisi ndị mmụọ ozi, na-ejikwa opi nke Chineke, ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu ga-ebukwa ụzọ bilie. E mesịa a ga-ebupụ anyị ndị dị ndụ bụ́ ndị lanarịrị, anyị na ha, n’ígwé ojii izute Onyenwe anyị n’ikuku; otú a kwa, anyị na Onyenwe anyị ga-anọ mgbe nile.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:15-17) Ya mere, e bu ụzọ akpọlite Ndị Kraịst e tere mmanụ nwụrụ tupu oge ọnụnọ Kraịst ha agaa eluigwe tupu akpọlite ndị nke ka dị ndụ n’oge ọnụnọ Kraịst. Nke a pụtara na mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ ga-amaliteworị ná mmalite nke ọnụnọ Kraịst ma gaa n’ihu “n’oge ọnụnọ ya.” (1 Ndị Kọrint 15:23) Kama ịbụ ihe mere otu mgbe, mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ wetụrụ oge.

“E Wee Nye Onye Ọ Bụla n’Ime Ha Uwe Mwụda Ọcha”

14. (a) Olee mgbe ọhụụ ahụ e dekọrọ ná Mkpughe isi isii mezuru? (b) Gịnị ka ihe ahụ e kwuru ná Mkpughe 6:9 pụtara?

14 Tụleekwa ihe àmà dị ná Mkpughe isi isii. N’ebe ahụ, a hụrụ ka Jizọs na-agba ịnyịnya dị ka Eze nke na-emeri emeri. (Mkpughe 6:2) Mba dị iche iche nọ na-eburịta agha kpụ ọkụ ọnụ. (Mkpughe 6:4) Oké ụnwụ zuru ebe nile. (Mkpughe 6:5, 6) Ajọ ihe otiti nọ na-akpa ihe a kpọrọ mmadụ aka ọjọọ. (Mkpughe 6:8) Ihe ndị a nile e buru n’amụma bụ nnọọ ihe na-eme n’ụwa kemgbe 1914. Ma e nwere ihe ọzọ merenụ. A dọọrọ uche anyị gaa n’otu ebe ịchụàjà. N’okpuru ebe ịchụàjà ahụ, e nwere “mkpụrụ obi nke ndị e gburu n’ihi okwu Chineke na n’ihi ọrụ ịgba àmà ha nweburu.” (Mkpughe 6:9) Ebe ọ bụ na “ndụ [ma ọ bụ mkpụrụ obi] nke anụ ahụ́, n’ọbara ka ọ dị,” ihe ebe a na-ekwu na ọ dị n’okpuru ebe ịchụàjà ahụ bụ ọbara nke ndị ohu Jizọs na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị e gburu n’ihi na ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-agba àmà.—Levitikọs 17:11.

15, 16. Kọwaa ihe mere o ji bụrụ na ọ bụ mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ ka okwu ndị dị ná Mkpughe 6:10, 11 na-ezo aka.

15 Dị ka ọbara nke onye ezi omume bụ́ Ebel, ọbara nke Ndị Kraịst a e gburu n’ihi okwukwe ha na-ebeku Chineke ákwá ka o kpee ndị gburu ha ikpe. (Jenesis 4:10) “Ha wee tie mkpu n’oké olu, na-asị: ‘Ruo ole mgbe, Eze Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu, ka ị na-ahapụ ikpe ikpe na ịbọ ọbọ ọbara anyị n’isi ndị bi n’elu ụwa?’” Gịnị meziri? “E wee nye onye ọ bụla n’ime ha otu uwe mwụda ọcha; a gwakwara ha ka ha zutụkwuo ike ruo nwa oge, ruo mgbe ọnụ ọgụgụ nke ha na ndị ohu ibe ha na ụmụnna ha ga-ezu ezu, bụ́ ndị a na-aga igbu dị ka e gbuwokwara ha.”—Mkpughe 6:10, 11.

16 È nyere ọbara nkịtị ndị wụsara n’ebe ịchụàjà ákwà ọcha ndị a? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ ndị a kwafuru ọbara ha n’ebe ịchụàjà, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka e nyere uwe mwụda ndị ahụ. Ha ji ndụ ha chụọ àjà n’ihi ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, a na-akpọlitekwa ha n’ọnwụ ịghọ ndị mmụọ. Olee otú anyị si mara nke a? N’isi akwụkwọ ndị bu ụzọ n’akwụkwọ Mkpughe, anyị na-agụ, sị: “A ga-esikwa otú ahụ yikwasị onye na-emeri emeri uwe elu na-acha ọcha; m gaghịkwa ehichapụ aha ya ma ọlị n’akwụkwọ nke ndụ.” Chetakwa na ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ “yi uwe elu na-acha ọcha . . . okpueze ọlaedo dịchakwa n’isi ha.” (Mkpughe 3:5; 4:4) Ya mere, mgbe agha, ụnwụ nri, na ọrịa na-efe efe malitere ịkpa ụwa aka ọjọọ ka a ga na-akpọlite ndị so na narị puku na iri puku anọ na anọ ndị nke nwụworo anwụ, bụ́ ndị ọbara nke dị n’ebe ịchụàjà na-anọchi anya ha, n’ọnwụ ịdị ndụ n’eluigwe ma yikwasị ha uwe elu ihe atụ na-acha ọcha.

17. N’echiche dị aṅaa ka ndị ahụ natara uwe elu na-acha ọcha ‘ga-ezu ike’?

17 Ndị ahụ a ka kpọlitere nnọọ n’ọnwụ aghaghị ‘izu ike.’ Ha aghaghị iji ndidi chere ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke. “Ndị ohu” ibe ha, bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nke ka nọ n’ụwa, e gosipụtachabeghị ikwesị ntụkwasị obi nke ha n’okpuru ule. Mgbe oge ikpe Chineke ruru, ha ga-akwụsị ‘izu ike.’ (Mkpughe 7:3) N’oge ahụ, ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-eso Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bibie ndị ajọ omume, tinyere ndị ahụ kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha.—2 Ndị Tesalonaịka 1:7-10

Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị

18, 19. (a) Gịnị mere ị pụrụ iji kwubie na mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ na-aga n’ihu ugbu a? (b) Olee otú nghọta a ị ghọtara ihe banyere mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ dị gị?

18 Okwu Chineke ekwughị kpọmkwem ụbọchị mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ weere ọnọdụ, ma o gosiri na o wetụrụ oge, na o mere n’oge ọnụnọ Kraịst. Ndị mbụ a kpọlitere bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nwụrụ tupu oge ọnụnọ Kraịst ebido. Ka oge ọnụnọ Kraịst na-aga n’ihu, Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi jesịa ozi elu ala ha, ga-abụ ndị a gbanwere “n’otu ntabi anya” ka ha ghọọ ndị mmụọ dị ike. (1 Ndị Kọrint 15:52) Ndị nile e tere mmanụ hà ga-enwetacha ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe tupu agha Amagedọn amalite? Anyị amaghị. Otú ọ dị, ihe anyị maara bụ na mgbe oge Chineke ruru, ndị nile so ná narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ ga-eguzo n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe.

19 Anyị makwa na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị so na narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ na Kraịst anọrọlarị. Ọ bụ nanị ole na ole n’ime ha ka nọ n’ụwa. Nke a bụ ihe àmà na-egosi nnọọ na oge eruwela ka e mezuo ihe Chineke kpere n’ikpe. N’isi nso, a ga-ebibi ụwa Setan dum. A ga-atụkpu Setan n’onwe ya n’abis. Mgbe nke a gasịrị, a ga-amalitezi ịkpọlite ọtụtụ ndị ọzọ fọdụrụnụ n’ọnwụ, a ga-akpọlitekwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnwụ ka ha wee zuo okè dị ka Adam zuru, n’ihi àjà mgbapụta Jizọs. Amụma Jehova nke e dekọrọ na Jenesis 3:15 na-emezu ugbu a n’ụzọ dị ebube. Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù magburu onwe ya ịnọ ya n’oge a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke na-egosi na ọnụnọ Kraịst malitere na 1914, lee akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 215-218, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 10 Iji nweta ihe ọmụma banyere otú anyị si mara na ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ na-anọchi anya Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ọnọdụ ha n’eluigwe, lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! peeji nke 77, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

Olee otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ si enyere anyị aka ịmata mgbe “mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ” weere ọnọdụ?

Mkpughe 12:7; 17:14

Mkpughe 7:13, 14

1 Ndị Kọrint 15:23; 1 Ndị Tesalonaịka 4:15-17

Mkpughe 6:2, 9-11

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Olee mbilite n’ọnwụ nke ga-ewere ọnọdụ tupu a kpọlite ndị ọzọ nile fọdụrụnụ n’ọnwụ?

[Foto dị na peeji nke 29]

N’ụzọ dị aṅaa ka e si nye ụfọdụ ndị ka nọ n’ụra ọnwụ uwe mwụda na-acha ọcha?