Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Anata Ntụziaka Na-eru n’Obi

Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Anata Ntụziaka Na-eru n’Obi

Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Anata Ntụziaka Na-eru n’Obi

NA SEPTEMBER 9, 2006, e mere ememe ngụsị akwụkwọ nke klas nke otu narị na iri abụọ na otu nke Watchtower Bible School of Gilead n’Ogige Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York. Ememe ahụ gbara nnọọ ndị bịara ya ume.

Geoffrey Jackson, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova meghere ihe omume ahụ site n’ịnabata mmadụ iri ise na isii na-agụsị akwụkwọ nakwa mmadụ puku isii narị atọ na iri isii na isii si mba dị iche iche bịa ememe ahụ. Ọ tụlere ihe e dere n’Abụ Ọma 86:11, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Zi m ụzọ Gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu Gị: mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.” Nwanna Jackson mere ka isi ihe atọ dị n’amaokwu ahụ pụta ìhè. Ọ sịrị: “Ahịrịokwu mbụ kwuru banyere izi ihe; nke abụọ kwuru banyere itinye ihe a mụtara n’ọrụ; nke atọ kwa kwuru banyere ịbụ onye a kpaliri ime ihe. Ihe atọ ndị a kasị dị unu bụ́ ndị ozi ala ọzọ mkpa ka unu na-aga n’ebe e kenyere unu ọrụ.” O mesịrị gụpụta ihe omume ndị a ga-eme na ajụjụ ọnụ ndị a ga-agba bụ́ ndị ga-eme ka isi ihe atọ ahụ pụta ìhè.

Okwu Ntụziaka Ndị Na-agba Ume

William Malenfant, bụ́ onye na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ kwuru okwu n’isiokwu bụ́, “Ndụ Kasị Mma.” Ọ dọọrọ uche gaa n’ihe atụ nke Meri, bụ́ nwanne Mata. Otu ụbọchị mgbe Jizọs bịara na nke ha, Meri họọrọ ịnọ n’ala n’ụkwụ Jizọs ma na-ege ya ntị, o weere ya dị ka ihe ka mkpa. Jizọs gwara Mata, sị: “Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.” (Luk 10:38-42) Ọkà okwu ahụ sịrị, “Chegodịnụ nnọọ ihe nke ahụ pụtara. Ọ dịghị mgbe Meri ga-echefu na e nwere mgbe o gere Jizọs ntị ka ọ na-akụzi eziokwu banyere Chineke. Ihe mere o ji nwee ọmarịcha ohere a bụ n’ihi na ọ họọrọ ihe ka mma.” Mgbe ọ jasịrị ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ mma maka ịhọrọ ijere Jehova ozi, ọ gwara ha, sị: “Ihe ndị unu họọrọ ime emewo ka unu nwee ike ibi ndụ kasị mma.”

Mgbe o kwusịrị, Anthony Morris, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu bụ́, “Yikwasịnụ Onyenwe Anyị Jizọs Kraịst,” nke dabeere ná Ndị Rom 13:14. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Nwanna Morris kwuru, sị: “Iyikwasị Onyenwe Anyị Jizọs Kraịst gụnyere iṅomi ya.” Nke a pụtara iṅomi ihe nlereanya na àgwà Jizọs. O kwukwara, sị: “Ahụ́ na-eru ndị mmadụ ala ma ha na Jizọs nọrọ n’ihi na o nwere ezi mmasị n’ebe ha nọ, ha achọpụtakwa nke ahụ.” Ọkà okwu ahụ kwuziri otú ụmụ akwụkwọ ahụ siworo nweta ihe ọmụma dị ukwuu n’ụlọ akwụkwọ Gilead iji “nwee ike. . . jiri uche ghọta ihe bụ́ ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” nke eziokwu ahụ, dị ka e dekọrọ ná Ndị Efesọs 3:18. Ma o chetaara ha ihe e dere n’amaokwu nke iri na itoolu bụ́ nke kwuru, sị: “Na ịmara ịhụnanya nke Kraịst ahụ bụ́ nke karịrị ihe ọmụma.” Nwanna Morris gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume, sị: “Ka unu na-amụ ihe, na-atụgharịnụ uche n’otú unu pụrụ isi ṅomie ịhụnanya na ọmịiko nke Kraịst ma ‘yikwasịnụ Kraịst n’ezie.’”

Ndụmọdụ Ikpeazụ Sitere n’Aka Ndị Na-akụzi na Gilead

Ọ bụ Wallace Liverance onye na-akụzi na Gilead kwuru okwu sochirinụ nke isiokwu ya dabeere n’Ilu 4:7. O kwuru na ọ bụ ezie na inweta amamihe Chineke bụ ihe kasị mkpa, anyị kwesịkwara “inweta nghọta,” bụ́ nke gụnyere ịchịkọta ihe ndị anyị nụrụ banyere otu okwu ma gbalịa ịghọta ihe jikọtara ha na ibe ha iji mara ihe ha pụtara. Ọ kọwara na inweta nghọta na-eme ka anyị nwee ọṅụ. Dị ka ihe atụ, n’oge Nehemaịa, ndị Livaị ‘mere ka a mata isi Iwu ahụ’ ma ‘mee ka a ghọta ya.’ Mgbe e mesịrị, ndị Izrel wee ‘na-enwe oké ọṅụ n’ihi na ha ghọtara okwu nile nke e mere ka ha mara.’ (Nehemaịa 8:7, 8, 12) Ná mmechi nwanna Liverance sịrị: “Ịghọta Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ na-eweta ọṅụ.”

“Ònye n’Ezie Bụ Onye Iro Gị?” bụ isiokwu nke Mark Noumair, bụ́ onye ọzọ na-akụzi na Gilead kwuru. N’ọgbọ agha, ihe na-egbu ọtụtụ ndị agha bụ mgbọ onye òtù ha gbapụrụ. Ọ jụrụ, sị: “Gịnị banyere agha ime mmụọ nke anyị na-alụ? Ma anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike anyị agaghị ama onye bụ onye iro anyị n’ezie ma merụọ ndị agha ibe anyị ahụ́.” Anyaụfụ pụrụ ime ka o siere ụfọdụ ike ịmata onye bụ onye iro ha n’ezie. Anyaụfụ mere ka Eze Sọl gbalịa igbu Devid, bụ́ onye ya na ya so na-efe Jehova, ebe ọ bụkwanụ na ọ bụ ndị Filistia bụ ndị iro ya n’ezie. (1 Samuel 18:7-9; 23:27, 28) Ọkà okwu ahụ kwuziri, sị: “Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na gị na onye ozi ala ọzọ nke na-eme nke ọma karịa gị n’ọtụtụ ihe na-ejekọ ozi? Ị̀ ga-emerụ onye agha ibe gị ahụ́ site n’ịkatọgharị ya, ka ị̀ ga-eji obiọma nakwere eziokwu ahụ bụ́ na ndị ọzọ ga-aka gị eme nke ọma n’ihe ụfọdụ? Nanị ihe ilekwasị anya n’amaghị eme nke ndị ọzọ pụrụ ime bụ ime ka anyị ghara ịma onye bụ onye iro anyị n’ezie. Lụsoonụ Setan ọgụ, ọ bụ ya bụ onye iro unu n’ezie.”

Ahụmahụ Ndị Na-akpali Mmasị na Ajụjụ Ọnụ Ndị Na-akụzi Ihe

Lawrence Bowen bụ́kwa onye na-akụzi na Gilead kwuru okwu sochirinụ nke isiokwu ya bụ “Rụọ Ọrụ Onye Na-ezisa Ozi Ọma” bụ́ nke gụnyere ajụjụ ọnụ na ahụmahụ. Ọrụ bụ́ isi nke onye ozi ala ọzọ a zụrụ na Gilead bụ izisa ozi ọma, ụmụ klas a emewokwa nke ahụ n’ebe ọ bụla ha hụrụ mmadụ.” E mere ihe ngosi nke ahụmahụ ụfọdụ na-akpali mmasị ha nwere.

Ọ bụ Michael Burnett na Scott Shoffner, ndị bụ́ ndị ezinụlọ Betel, mere ihe omume ọzọ nke nwere akụkụ abụọ. Ha gbara ndị so na Kọmitii Alaka si Australia, Barbados, Korea, na Uganda ajụjụ ọnụ. Ihe ụmụnna ndị a a gbara ajụjụ kwuru gosiri mgbalị a na-eme ilekọta ndị ozi ala ọzọ. Ha kwukwara na ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị na-eme nke ọma na-adị njikere ime ka ndụ ha kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’ebe e zigara ha.

Okwu Mmechi Na-akpali Akpali

Ọ bụ John E. Barr, onye nọterela aka n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu bụ́ isi nke isiokwu ya bụ “Na-atụnụ Chineke Egwu, Na-enyekwa Ya Otuto.” Ọ tụlere Mkpughe 14:6, 7, bụ́ nke na-agụ, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe, o nwekwara ozi ọma ebighị ebi ịkpọsa dị ka ozi obi ụtọ nye ndị bi n’elu ụwa, nyekwa mba na ebo na asụsụ na ndị ọ bụla, na-ekwu n’oké olu, sị: ‘Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka ya abịawo.’”

Nwanna Barr gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha buru ihe atọ metụtara mmụọ ozi ahụ n’uche. Nke mbụ, ọ ga-ezisa ozi ọma ebighị ebi ahụ bụ́ na Kraịst na-achị achị ugbu a n’Alaeze ya. Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Anyị kwenyesiri ike na e chiri Kraịst eze na 1914. Ya mere, a ghaghị ịkpọsa ozi ọma a n’ụwa nile.” Nke abụọ, mmụọ ozi ahụ sịrị: “Na-atụnụ Chineke egwu.” Ọkà okwu ahụ kọwara na ndị a na-agụsị akwụkwọ kwesịrị inyere ndị ha na-amụrụ Bible aka ịtụ egwu Chineke, ka ha wee nwee ike ịghara ime ihe ga-ewute ya. Nke atọ, mmụọ ozi ahụ nyere iwu, sị: ‘Na-enyenụ Chineke otuto.’ A gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume, sị: “Ya adịla mgbe unu ga-echefu na ozi anyị na-eje bụ iji wetara Chineke otuto, ọ bụghị onwe anyị.” Mgbe Nwanna Barr na-ekwu okwu banyere “oge awa nke ikpe,” ọ sịrị: “Oge a ga-eji kpee ikpe ikpeazụ ahụ nọzi n’ọbọ aka. Ọ ka dị oké mkpa ka ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị nụ ozi ọma ahụ tupu oge agwụ.”

Ozugbo o kwusịrị, e nyere mmadụ iri ise na isii ahụ akwụkwọ na-egosi na ha agụsịala akwụkwọ na Gilead ma zipụ ha ịga rụọ ọrụ ruo n’ebe ụwa sọtụrụ. Ndụmọdụ na-akpali akpali e nyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ n’oge ememe ahụ nke na-enye ọṅụ metụrụ ha na ndị bịara ige ntị n’ahụ́ nke ukwuu.

[Igbe dị na peeji nke 17]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 6

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 25

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 56

Nkezi afọ ndụ: 35.1

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 18.3

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 13.9

[Foto dị na peeji nke 18]

Klas nke Otu Narị na Iri Abụọ na Otu Na-agụsị Akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Fox, Y.; Kunicki, D.; Wilkinson, S.; Kawamoto, S.; Consolandi, G.; Mayen, C. (2) Santiago, N.; Clancy, R.; Fischer, M.; de Abreu, L.; Davis, E. (3) Hwang, J.; Hoffman, D.; Wridgway, L.; Ibrahim, J.; Dabelstein, A.; Bakabak, M. (4) Peters, M.; Jones, C.; Ford, S.; Parra, S.; Rothrock, D.; Tatlot, M.; Perez, E. (5) de Abreu, F.; Kawamoto, S.; Ives, S.; Burdo, J.; Hwang, J.; Wilkinson, D. (6) Fox, A.; Bakabak, J.; Cichowski, P.; Forier, C.; Mayen, S.; Consolandi, E.; Wridgway, W. (7) Parra, B.; Perez, B.; Tatlot, P.; Santiago, M.; Ibrahim, Y.; Kunicki, C. (8) Burdo, C.; Cichowski, B.; Ives, K.; Ford, A.; Rothrock, J.; Hoffman, D.; Davis, M. (9) Peters, C.; Dabelstein, C.; Jones, K.; Clancy, S.; Fischer, J.; Forier, S.