Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nhọrọ Ndị Ziri Ezi M Mere Ewetara m Ngọzi Na-adịgide Adịgide

Nhọrọ Ndị Ziri Ezi M Mere Ewetara m Ngọzi Na-adịgide Adịgide

Akụkọ Ndụ

Nhọrọ Ndị Ziri Ezi M Mere Ewetara m Ngọzi Na-adịgide Adịgide

Dị ka Paul Kushnir si kọọ

NA 1897, ndị mụrụ mama m si Ukraine kwaga Canada ma biri na nso Yorkton nke dị na Saskatchewan. Ha kpọ ụmụ anọ gaa ebe ahụ—ndị nwoke atọ na otu nwanyị. Na 1923, nke nwanyị ahụ aha ya bụ Marinka ghọrọ mama m; abụkwa m nwa ya nke asaa. Ndụ a na-ebi mgbe ahụ abụghị ndụ gbalụgbalụ, ahụ́ rukwara anyị nnọọ ala. Anyị na-eri ezigbo nri ma na-eyi uwe ndị na-achụ oyi, ndị gọọmenti nyekwara ndị mmadụ ihe ndị bụ́ isi dị ha mkpa. Ndị agbata obi na-adị njikere inyerịtara ibe ha aka ịrụ ọrụ ndị siri ike. N’oge oyi nke afọ 1925, otu n’ime Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, bịara leta anyị. Nleta ahụ mere ka anyị mee nhọrọ ndị ka na-enye m obi ụtọ.

Ndị Ezinụlọ Anyị Anakwere Eziokwu Bible

Mama m natara akwụkwọ nta ụfọdụ n’aka Onye Mmụta Bible ahụ ma chọpụta ozugbo na ihe ọ na-agụ bụ eziokwu ahụ. O nwere nnọọ ọganihu ime mmụọ ngwa ngwa, e mekwara ya baptizim na 1926. Mgbe mama m ghọrọ Onye Mmụta Bible, ndụ ezinụlọ anyị gbanwere. Ụlọ anyị ghọrọ ebe a na-eleta ndị ọbịa anya nke ọma. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ ndị a na-akpọ ndị pilgrim, na Ndị Mmụta Bible ndị ọzọ na-abịakarị anọnyere anyị. Na 1928, otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị gosiri anyị ihe nkiri “Eureka Drama,” nke bụ́ ụdị ihe nkiri “Photo-Drama of Creation” e mere ọ ka mfe nghọta. Ọ naara anyị bụ́ ụmụaka ihe anyị ji egwuri egwu yiri awọ nke na-eme ụṅara ma a pịtụ ya aka. Mgbe ọ bụla o mere ụṅara, ọ na-egosi na oge eruola ka a gafee n’ihe nkiri ọzọ. Obi dị nnọọ anyị bụ́ ụmụaka ụtọ na e jiri ihe anyị ji egwuri egwu mee ihe n’ihe nkiri ahụ!

Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị aha ya bụ Emil Zarysky na-ejikarị ụgbọala ya yiri ụlọ na-abịa eleta anyị. Mgbe ụfọdụ, ya na nwa ya nwoke torola eto na-eso abịa, nwa ya ahụ na-agbakarị anyị bụ́ ụmụaka ume iche echiche banyere ịghọ ndị ozi oge nile, ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ. Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ nọkwara n’ụlọ anyị. N’otu oge, mama m gbazinyere otu onye ọsụ ụzọ uwe mgbe ọ nọ na-akwachiri ya nke ya. Onye ọsụ ụzọ ahụ jiri uwe ahụ laa n’amaghị ama. Mgbe oge ụfọdụ gafetụrụ, o zilatara ya ma rịọ mgbaghara na ya ewelataghị ya n’oge. O dere, sị, “Ọ dịghịrị m mfe inweta cent iri m ga-eji zilata ya.” Ọ dị anyị nnọọ ka ya bụrụ na o zilataghachighị uwe ahụ. M na-atụ anya na otu ụbọchị m ga-eṅomi ndị ọsụ ụzọ dị otú a nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Enwere m nnọọ ekele maka mmụọ ile ọbịa mama m nwere, bụ́ nke mere ka ndụ anyị kakwuo mma ma mee ka anyị hụ òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ n’anya.—1 Pita 4:8, 9.

Papa m aghọghị Onye Mmụta Bible; ma o megideghị anyị. O kwedịrị ka ụmụnna jiri nnukwu obí ya mee mgbakọ otu ụbọchị na 1930. Ọ bụ ezie na m dị nanị afọ asaa mgbe ahụ, ọṅụ e nwere n’oge mgbakọ ahụ na otú mgbakọ ahụ si dị ùgwù masịrị m. Papa m nwụrụ na 1933. Mama m ghọziri nwanyị di ya nwụrụ nke nwere ụmụ asatọ, ọ dịtụghịkwa mgbe ọ lara azụ ná mkpebi o mere ịhụ na ụmụ ya nile nọgidere n’ụzọ nke eziokwu ahụ. Ọ na-akpọ m aga ọmụmụ ihe mgbe nile. N’oge ahụ, ọ na-adị m ka ọmụmụ ihe ahụ adịghị agwụ agwụ, ya adịkwa m ka a hapụ m ka m gaa soro ụmụaka ndị ọzọ ndị ndị mụrụ ha hapụrụ ka ha na-egwuri egwu gaa gwuwe egwu n’èzí. Ma iji kwanyere mama m ùgwù, ana m anọ n’ime ebe ahụ a na-anọ amụ ihe. Ọ bụrụ na mama m ana-esi nri, ọ na-ehotakarị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma jụọ m ebe e dere ya na Bible. Na 1933, ihe anyị kụrụ n’ubi mere nnọọ nke ọma, mama m jikwara ego o retere na ya zụta ụgbọala. Ụfọdụ ndị agbata obi anyị sịrị na ọ lara ego ahụ n’iyi, ma mama m chere na ụgbọala ahụ ga-enyere anyị aka n’ịga nzukọ na ozi ọma. Echiche ya ziri ezi.

Ndị Ọzọ Nyeere M Aka Ime Mkpebi Ndị Ziri Ezi

E nwere oge mmadụ ga-etoru, ya ahọrọ ihe ndị ọ ga-eme ná ndụ. Mgbe ụmụnne m ndị nwanyị abụọ tọrọ m, bụ́ Helen na Kay, toruru oge ahụ, ha malitere ịsụ ụzọ. Otu n’ime ndị ọsụ ụzọ anyị lere ọbịa n’ụlọ anyị bụ otu ọmarịcha nwa okorobịa aha ya bụ John Jazewsky. Mama m rịọrọ John ka ọ nọrọtụkwuo n’ụlọ anyị ma nyere anyị aka n’ugbo anyị. Ka e mesịrị, John lụrụ Kay, ha rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’ebe na-adịchaghị anya site n’ebe anyị bi. Mgbe m dị afọ iri na abụọ, ha kpọrọ m ka m bịa soro ha gaa ozi ọma n’oge ezumike. Nke a mere ka m mata otú ọrụ ọsụ ụzọ na-adị.

Ka oge na-aga, mụ na nwanne m nwoke bụ́ John malitere ilekọta ugbo anyị otú ike anyị ha. Nke a nyere mama m ohere ijiri oge ọkọchị rụọ ihe a na-akpọ ọsụ ụzọ inyeaka ugbu a. O jiri ụgbọala ịnyịnya ibu na-adọkpụ jee ozi. Papa m kpọrọ ịnyịnya ahụ na-eme isi ike Saul, ma mama m lere ịnyịnya ahụ anya dị ka anụmanụ na-adịghị eme isi ike nke a pụrụ ịkụziri ihe. Mụ na John nwere nnọọ mmasị n’ọrụ ugbo, ma mgbe ọ bụla mama anyị lọtara ozi ọma ma kọọrọ anyị ahụmahụ ndị o nwetara, mmasị anyị nwere n’ịsụ ụzọ na-abịa kara nnọọ nke anyị nwere n’ọrụ ugbo. Na 1938, etinyekwuru m oge n’ozi ọma, e mekwara m baptizim na February 9, 1940.

A họpụtara m dị ka ohu n’ọgbakọ ka oge ụfọdụ gasịrị. Ọ bụ m na-edekọ akụkọ ozi ubi ọgbakọ, obi na-atọkwa m ụtọ mgbe ọ bụla e nwere mmụba. Enwere m ebe nanị m na-aga ekwusa ozi ọma n’otu obodo dị kilomita iri na isii site n’ụlọ anyị. N’oge oyi, m na-eji ụkwụ aga ebe ahụ kwa izu ma na-ehi otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ n’ọnụ ụlọ a rụnyere n’uko ụlọ nke otu ezinụlọ nwere mmasị na Bible. Mgbe mụ na pastọ ndị chọọchị Lutheran kwurịtasịrị okwu—bụ́ nke o yiri ka ejichaghị m akọ mee ihe na ya—o yiri m egwu na ya ga-akpọ ndị uwe ojii ka ha jichie m ma ọ bụrụ na mụ akwụsịghị ikwusara ndị chọọchị ya ozi ọma. Nanị ihe nke a mere bụ ime ka m kpebisikwuo ike ịdị na-ekwusara ha ozi ọma.

Na 1942, nwanne m nwanyị bụ́ Kay na di ya, bụ́ John, mere atụmatụ ịga mgbakọ distrikti a ga-enwe na Cleveland, Ohio, nke dị na United States. Obi tọrọ m ụtọ mgbe ha kpọrọ m ka m bịa soro ha gaa. Mgbakọ ahụ so n’otu n’ime ihe ndị kachasịnụ metụrụla ná ndụ m. O mere ka atụmatụ ndị m mere maka ọdịnihu sikwuo ike. Mgbe Nwanna Nathan Knorr, bụ́ onye nọ na-eduzi ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ n’oge ahụ, kwuru okwu na-akpali akpali banyere puku mmadụ iri iwere ọrụ ọsụ ụzọ, ekpebiri m ozugbo ịbụ otu n’ime puku mmadụ iri ahụ.

Na January 1943, Henry, bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, letara ọgbakọ anyị. O kwuru okwu na-akpali akpali nke mere ka anyị nwekwuo ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ọma ahụ. Ụdị oyi nọ na-atụ n’ụbọchị sochiri ụbọchị o kwuru okwu ahụ ruru ịkpụkọ mmiri, oké ifufe sikwa n’ebe ndịda nke ebe ọdịda anyanwụ mekwara ka oyi ahụ ka njọ. Anyị adịghị apụ èzí mgbe oyi dị otú a na-atụ, ma Henry chọsiri ike ka anyị gaa ozi ọma. Ya na ndị ọzọ jiri ụgbọala yiri ụlọ nke ịnyịnya na-adọkpụ bụ́ nke a dọnyere stovu e ji osisi rụọ n’ime ya gaa otu ime obodo nke dị kilomita iri na otu. Nanị m gawara ịga leta otu ezinụlọ nwere ụmụ nwoke ise. Ha kwere ka m bịa mụwara ha Bible, ka oge na-aga, ha nabatara eziokwu ahụ.

Ikwusa Ozi Ọma Mgbe A Machibidoro Ọrụ Anyị Iwu

A machibidoro ọrụ nkwusa Alaeze anyị iwu na Canada n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Nke a pụtara na anyị ga na-edebe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ebe ndị mmadụ na-agaghị ahụ ha, ọ bụkwa n’ugbo anyị ka anyị zoro ọtụtụ n’ime ha. Ndị uwe ojii bịara n’ụlọ anyị ugboro ugboro ma ọ dịghị nke ha chọtara. Ọ bụ nanị Bible ka anyị na-eji ma anyị kwusawa ozi ọma. Anyị na-ezukọta n’ìgwè nta dị iche iche, a họpụtakwara mụ na nwanne m nwoke bụ́ John ka anyị na-aga ebute akwụkwọ na nzuzo.

N’oge agha ahụ, ọgbakọ anyị so ná ndị kesara akwụkwọ nta bụ́ End of Nazism, bụ́ nke e kesara n’ụwa nile. Anyị kesara ya n’etiti abalị. Ahụ́ na-ama m jijiji mgbe anyị nọ na-ekesa ya. Anyị zooro ezoro gaa n’ụlọ nke ọ bụla ma debe akwụkwọ nta ahụ n’ọnụ ụzọ ha. Nke a bụ ihe tụkarịsịrị ụjọ m metụrụla. Ahụ́ ruru m nnọọ ala mgbe anyị kesachara akwụkwọ nta ahụ. Anyị mere ngwa ngwa laghachi ebe anyị kwụwara ụgbọala anyị ma gụọ mmadụ nile kesara akwụkwọ nta ahụ ma hà zuru ezu, anyị jiziri etiti abalị ahụ lawa.

Ịsụ Ụzọ, Ịga Mkpọrọ, na Mgbakọ Ndị Anyị Nwere

Na May 1, 1943, ahapụrụ m ụlọ. Agawaziri m ebe mbụ m rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ, nanị ihe m ji bụ dọla iri abụọ na obere akpa e ji eme njem. Nwanna Tom Troop na ezinụlọ ya na-ahụ n’anya bụ́ ndị bi na Quill Lake, nke dị na Saskatchewan, nabatara m nke ọma. N’afọ sochiri ya, agara m ókèala dịpụrụ adịpụ nke dị na Weyburn, Saskatchewan. E jichiri m mgbe m na-agba àmà okporo ámá na December 24, 1944. Mgbe m nọsịrị oge ụfọdụ n’ụlọ mkpọrọ dị n’ebe ahụ, a kpọgara m n’ogige ndị mkpọrọ dị na Jasper, Alberta. E nwere Ndịàmà ndị ọzọ mụ na ha nọ n’ebe ahụ, ọmarịcha ihe Jehova kere, dị ka ugwu nke bụ́ okwute okwute nke dị na Canada, gbakwara anyị gburugburu. Ná mmalite nke afọ 1945, ndị na-arụ ọrụ n’ogige ahụ kwere ka anyị gaa otu nzukọ e nwere n’Edmonton, Alberta. Nwanna Knorr gụrụ akụkọ na-akpali akpali banyere ọganihu e nwere n’ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọ gụsiri anyị agụụ ike inwereghachi onwe anyị ka anyị wee nwee ike ikereghachi òkè anya n’ozi ọma ahụ.

Mgbe a tọhapụsịrị m, amaliteghachiri m ọrụ ịsụ ụzọ. Oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, a mara ọkwa na a ga-enwe Mgbakọ “Mmụba nke Mba Nile” na Los Angeles, California. Otu nwanna nwoke bi n’ebe ọhụrụ ahụ m na-eje ozi rụnyere oche ga-aba mmadụ iri abụọ n’ụgbọala ya. N’August 1, 1947, anyị malitere njem ahụ m na-agaghị echefu echefu nke dị puku kilomita asaa na narị abụọ n’ogologo, anyị gafekwara ọtụtụ ala ahịhịa, ịkpa, na ebe ndị mara nnọọ mma, gụnyere ogige ntụrụndụ ndị a na-akpọ Yellowstone na Yosemite bụ́ ndị dị na California. Njem ahụ were anyị ụbọchị iri abụọ na asaa ma ojije ma ọlụlọ, nke ahụ bụ nnọọ ahụmahụ pụrụ iche.

Mgbakọ ahụ n’onwe ya bụ ahụmahụ magburu onwe ya nke m na-agaghị echefu echefu. Iji kere òkè zuru ezu n’ihe omume ahụ, ejere m ozi dị ka onye atendantị n’ehihie ma jee ozi dị ka onye nche n’abalị. Mgbe m gasịrị nzukọ e nwere maka ndị nwere mmasị ije ozi ala ọzọ, e dejupụtara m akwụkwọ, ma atụghị m anya na a ga-akpọ m. Ka oge na-aga, na 1948, azara m oku a kpọrọ ndị ọsụ ụzọ ka ha bịa jee ozi n’ógbè Quebec nke dị na Canada.—Aịsaịa 6:8.

Ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Ihe Ndị Mere Mgbe nke ahụ Gasịrị

Na 1949, obi tọrọ m nnọọ ụtọ mgbe a kpọrọ m oku ịbịa soro na klas nke iri na anọ nke Watchtower Bible School of Gilead. Ọzụzụ ahụ mere ka okwukwe m sikwuo ike ma mee ka m bịarukwuo Jehova nso. John na Kay agụchaalarị akwụkwọ na klas nke iri na otu nke ụlọ akwụkwọ Gilead ma na-eje ozi ala ọzọ na Northern Rhodesia (nke bụzi Zambia). Nwanne m nwoke bụ́ John gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilead na 1956. Ya na nwunye ya, bụ́ Frieda, jere ozi na Brazil ruo afọ iri atọ na abụọ tupu John anwụọ.

Telegram abụọ m nwetara n’ụbọchị m na-agụsị akwụkwọ na February 1950 gbara m nnọọ ume, ọ bụ mama m zitere otu, ezinụlọ Troop bi na Quill Lake zitekwara nke abụọ. Isiokwu telegram nke si n’aka ezinụlọ Troop bụ “Ndụmọdụ Maka Onye Na-agụsị Akwụkwọ,” ọ na-agụkwa, sị: “Taa bụ ụbọchị pụrụ iche ná ndụ gị. Ụbọchị ị na-agaghị echefu echefu; nweekwa ọganihu na obi ụtọ ná ndụ gị.”

E kenyere m ije ozi na Quebec, ma anọrọ m oge ụfọdụ n’Ugbo Alaeze, nke dị na steeti New York, bụ́ ebe ụlọ akwụkwọ Gilead nọ mgbe ahụ. Otu ụbọchị, Nwanna Knorr jụrụ m ma m̀ ga-achọ ịga Belgium. Otú ọ dị, mgbe ụbọchị ole na ole gafesịrị, ọ jụrụ m ma m̀ ga-ekwe ije ozi na Netherlands. Mgbe m nwetara akwụkwọ ozi e ji kenye m ebe m ga-eje ozi, e kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ na m “ga-eje ozi dị ka ohu alaka ụlọ ọrụ.” Nke a riri m ọnụ.

N’August 24, 1950, amalitere m njem ga-ewe m ụbọchị iri na otu iji ruo Netherlands, bụ́ oge zuuru m iji gụchaa Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst a ka wepụtara ọhụrụ mgbe ahụ. Erutere m Rotterdam na September 5, 1950, ndị ezinụlọ Betel nabatakwara m nke ọma. N’agbanyeghị mkpamkpa Agha Ụwa nke Abụọ kpara ebe ahụ, ụmụnna ndị nọ ebe ahụ mere nnọọ nke ọma ime ka ozi Ndị Kraịst maliteghachi ịga n’ihu. Mgbe m na-ege ntị ka ha na-akọ otú ha si nọgidesie ike na-eme ezi ihe n’agbanyeghị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ a kpagburu ha, echere m na ọ ga-esiri ha ike ịgbaso ntụziaka nke ohu alaka ụlọ ọrụ na-enwechaghị ahụmahụ dị ka m. Otú ọ dị, ka oge na-aga, ọ bịara doo m anya na ekwesịdịghị m iche otú ahụ.

N’ezie, o nwere nnọọ ihe ụfọdụ ndị chọrọ ka e lebara ha anya. Erutere m ebe ahụ obere oge tupu ha enwee mgbakọ distrikti, ọ masịkwara m mgbe m hụrụ na ọtụtụ puku mmadụ bịara mgbakọ ahụ nwetara ụlọ n’ala mgbakọ. Atụrụ m aro na anyị ga-achọtara ndị ga-abịa mgbakọ distrikti anyị ga-enwe n’afọ ga-esochinụ ụlọ n’ụlọ ndị mmadụ. Ụmụnna ahụ chere na nke ahụ bụ ezigbo aro ma na ọ gaghị ekwe omume ná mba ha. Mgbe anyị tụlesịrị nke ahụ, anyị kwekọrịtara na ọkara ndị ga-abịa ga-ebi n’ala mgbakọ, ebe ọkara nke ọzọ ga-ebi n’ụlọ ndị na-abụghị nke Ndịàmà n’obodo ahụ a na-enwe mgbakọ ahụ. Mgbe Nwanna Knorr bịara mgbakọ ahụ, eji m nnọọ obi ụtọ gwa ya ezi ihe ndị anyị rụzuru. Otú ọ dị, obi ụtọ ahụ m nwere jụrụ oyi ozugbo m gụrụ akụkọ banyere mgbakọ anyị n’Ụlọ Nche, bụ́ nke sịrị: “Anyị chere na n’oge ọzọ, ọ ga-aka mma ma e jiri okwukwe buru ụzọ chọtara ndị bịara mgbakọ ụlọ n’ụlọ ndị mmadụ, bụ́ ebe ọ ga-akasị kwe omume ịgbara ndị mmadụ àmà.” Nke ahụ bụ nnọọ ihe anyị mere “n’oge ọzọ” anyị nwere mgbakọ.

Na July 1961, a kpọrọ mmadụ abụọ oku ka ha bịa nọchite anya alaka ụlọ ọrụ anyị ná nzukọ e nwere na London bụ́ nke ndị nọchitere anya alaka ụlọ ọrụ ndị ọzọ bịakwara. Nwanna Knorr mara ọkwa na a ga-asụgharịkwu New World Translation of the Holy Scriptures n’asụsụ ndị ọzọ, gụnyere asụsụ Dutch. Ọkwa ahụ mere anyị nnọọ obi ụtọ. Ọ ka nnọọ mma na anyị amabughị na ọ bụ nnukwute ọrụ. Afọ abụọ ka nke ahụ gasịrị, na 1963, obi dị m nnọọ ụtọ na m so mee ihe omume ná mgbakọ distrikti e nwere na New York, bụ́ nke a nọ na ya wepụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Dutch.

Mkpebi Ndị M Mere na Ọrụ Ndị Ọhụrụ E Nyere M

Alụrụ m Leida Wamelink n’August 1961. Ndị ezinụlọ ya nile natara eziokwu ahụ na 1942 n’oge ndị Nazi nọ na-akpagbu Ndịàmà. Leida malitere ịsụ ụzọ na 1950 ma malite ije ozi na Betel na 1953. Otú o si arụsi ọrụ ike na Betel na n’ọgbakọ mere ka m kweta na ọ ga-abụ onye ibe na-anọgidesi ike n’ihe n’ozi m.

Mgbe ọ gafetụrụ otu afọ anyị lụrụ, a kpọrọ m oku ka m bịa na Brooklyn inwetakwu ọzụzụ nke ga-ewe ọnwa iri. E meghị ndokwa ka ndị nwunye anyị soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ahụ́ adịchaghị Leida, o jiri ịhụnanya kwe ka m gaa nara ọzụzụ ahụ. Ka e mesịrị, ọrịa Leida bịara ka njọ. Anyị gbalịrị ịnọgide na Betel, ma anyị mechaziri kpebie na ọ ga-akara anyị mma ịnọgide na-eje ozi oge nile n’ebe ọzọ na-abụghị Betel. Ya mere, anyị malitere ịrụ ọrụ njegharị. Obere oge ka e mesịrị, a wara nwunye m ahụ́. Enyemaka ịhụnanya nke ụmụnna anyị nyeere anyị aka ịnagide ọnọdụ ahụ, mgbe otu afọ gasịkwara anyị nakweere ịrụ ọrụ distrikti.

Anyị rụrụ ọrụ njegharị ruo afọ asaa, ọ tọkwara anyị ụtọ. Oge rukwara ka anyị mee mkpebi tara akpụ mgbe a kpọrọ m ka m bịa kụzie ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere na Betel. Anyị kwetara n’agbanyeghị na o siiri anyị ike ime mgbanwe ndị dị na ya n’ihi na anyị nwere mmasị n’ozi njegharị. Ụlọ akwụkwọ ahụ nwere klas iri anọ na asaa, nke ọ bụla n’ime ha were izu abụọ, nke ahụ nyekwara m ohere iso ndị okenye ọgbakọ kwurịta ihe ndị metụtara ozi Chineke.

N’oge ahụ, anọ m na-eme ndokwa ịga leta mama m na 1978. Anyị nwetara telegram mgbe anyị na-atụghị anya ya n’April 29, 1977 bụ́ nke e ji gwa anyị na mama m anwụọla. O wutere m nke ukwuu mgbe m ghọtara na agaghịzi m adị na-anụ olu ụtọ ya ma ọ bụkwanụ ịgwa ya na m nwere obi ụtọ maka ihe nile o meere m.

Mgbe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi ahụ gasịrị, a gwara anyị ka anyị jewezie ozi na Betel. N’afọ ndị sochirinụ, ejiri m afọ iri jee ozi dị ka onye nhazi nke Kọmitii Alaka. Ka oge na-aga, Òtù Na-achị Isi họpụtara onye nhazi ọhụrụ, bụ́ onye ga-arụ ọrụ ahụ nke ọma karịa mụ. Enwere m nnọọ ekele maka nke ahụ.

Ije Ozi Otú Anyị Nwere Ike

Mụ na Leida agbaala afọ iri asatọ na atọ ugbu a. Ejirila m ihe karịrị afọ iri isii jee ozi oge nile, mụ na nwunye m na-anọgidesi ike n’ihe jiri afọ iri anọ na ise ndị ikpeazụ nke afọ ndị ahụ jekọọ ozi. O lere nkwado o nyere m n’akụkụ nile nke ozi m anya dị ka ozi o jeere Jehova. Ka ọ dị ugbu a, anyị na-eme otú ike kwere anyị na Betel nakwa n’ọgbakọ.—Aịsaịa 46:4.

Ọ na-amasị anyị icheta ihe ndị dị oké mkpa mere ná ndụ anyị site n’oge ruo n’oge. Anyị adịghị akwa ụta ọ bụla maka ihe ndị anyị mere n’ozi Jehova, anyị kwenyesikwara ike na nhọrọ ndị anyị mere n’oge anyị dị obere bụ nhọrọ ndị kachasị mma ná ndụ. Anyị kpebisiri ike ịnọgide jiri ume anyị nile na-ejere Jehova ozi ma na-asọpụrụ ya.

[Foto dị na peeji nke 13]

Mụ na Bill, bụ́ nwanne m nwoke nke tọrọ m, na Saul, bụ́ ịnyịnya ibu anyị

[Foto dị na peeji nke 15]

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ, August 1961

[Foto dị na peeji nke 15]

Mụ na Leida taa