Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwoke Hụrụ Ndụ na Ndị Mmadụ n’Anya

Nwoke Hụrụ Ndụ na Ndị Mmadụ n’Anya

Nwoke Hụrụ Ndụ na Ndị Mmadụ n’Anya

DANIEL SYDLIK, bụ́ onye nọtere aka n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, jesịrị ozi elu ala ya na Tuesday, April 18, 2006. Ọ gbara iri afọ asatọ na asaa, o jikwara ihe fọrọ obere ka o ruo iri afọ isii jee ozi n’ezinụlọ Betel dị na Brooklyn, New York.

Nwanna Dan, nke bụ́ aha ezigbo ndị enyi ya na-akpọ ya, bịara Betel na 1946. Tupu ya abịa Betel, o jere ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na California, nọọkwa afọ ụfọdụ n’ụlọ mkpọrọ n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Ihe mere e ji tụọ ya mkpọrọ bụ n’ihi na ọ dịghị akụkụ nke ọ bụla n’ime ndị ahụ na-alụ agha ọ kwadoro. A kọrọ ahụmahụ ndị o nwere n’oge ahụ n’akụkọ ndụ ya bụ́ nke pụtara n’Ụlọ Nche nke December 1, 1985, n’isiokwu bụ́ “Lee Ka Ịbụ Enyi Gị Si Dị Oké Ọnụ, Chineke!”

A maara Nwanna Sydlik dị ka onye na-ekwu ihe otú ọ dị ya n’obi nakwa onye ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ijekwuru. Mgbe ọ bụla ọ na-eduzi ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ezinụlọ Betel, ọ na-ejikarị okwu na-egosi na obi siri ya ike na ihe ga-adị mma nakwa na ọ hụrụ ndụ n’anya amalite, ọ na-ekwukarị, sị: “Ọ bụ nnọọ ihe magburu onwe ya na anyị dị ndụ iji jeere ezi Chineke ahụ nke dị ndụ ozi.” Mgbe ọ na-ekwu okwu ihu ọha, ọ na-eme ka ndị ọzọ nwee ụdị echiche a, site n’ikwu okwu n’isiokwu ndị dị ka “Ndị Chineke Ha Bụ Jehova Bụ Ndị Obi Ụtọ,” “Igosipụta na Anyị Nwere Ọṅụ Jehova,” “Emenyụla Ọkụ nke Mmụọ Nsọ Chineke,” na “Ihe Kasị Mma Ka Na-abịa.”

Na 1970, Nwanna Sydlik lụrụ Marina Hodson, bụ́ onye England, bụ́ onye ọ kọwara dị ka ‘onye enyemaka Chineke zitere.’ Ha jiri ihe karịrị iri afọ atọ na ise jekọọ ozi ọnụ n’ozi Jehova.

N’oge Nwanna Sydlik nọ na Betel, o jere ozi ná ngalaba dị iche iche, bụ́ ndị gụnyere ebe a na-ebi akwụkwọ na Ngalaba Ide Ihe. Ọ rụkwara ọrụ n’ụlọ ọrụ redio WBBR dị na Betel ahụ. Na November 1974, a họpụtaziri ya iso n’Òtù Na-achị Isi, o mesịkwara rụọ ọrụ na Kọmitii Na-ahazi Ọrụ nakwa na Kọmitii Ihe Odide.

Ihe e ji mara ọrụ Nwanna Sydlik soro Ngalaba Na-ahazi Ọrụ rụkọọ ruo iri afọ atọ bụ otú o si hụ nnọọ ndị mmadụ n’anya. Ọ na-ejikarị olu ya na-ede ude agba ọtụtụ mmadụ ume, na-adọrọkarị uche ha gaa n’ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa anyị nwere ijere Jehova ozi. Ọ nọgidere na-emesi ya ike na ihe na-enye obi ụtọ abụghị ihe ndị gbara anyị gburugburu anya na-ahụ, kama ọ bụ mmekọrịta anyị na Jehova na otú anyị si ele ndụ anya.

Ọ bụ ezie na ọ na-ewute ezinụlọ Betel nke ukwuu na ha agakwaghị ahụ Nwanna Sydlik ọzọ, a ka ga-anọ na-echeta ihe nlereanya o setịpụrụ dị ka onye hụrụ ndụ n’anya n’ezie. Anyị nwere obi ike na-agụnyekọtara ya ná ndị ahụ e kwuru banyere ha n’akwụkwọ Mkpughe 14:13, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị na-anwụ n’ihe metụtara Onyenwe anyị site n’ugbu a gaa n’ihu. Ee, ka mmụọ ahụ na-ekwu, ka ha zuo ike ná ndọgbu n’ọrụ ha, n’ihi na ihe ndị ha mere na-eso ha kpọmkwem.”