Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma

Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma

Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma

NNA anyị nke eluigwe na-elekọta anyị ma na-achọ ka anyị na-enwe ihe ịga nke ọma dị nnọọ ka ndị nne na nna si elekọta ụmụ ha ma na-achọ ka ha na-enwe ihe ịga nke ọma. Iji gosi na ọ na-eche nnọọ banyere anyị, ọ gwara anyị ọtụtụ ihe ndị ga-eme ka anyị nwee ihe ịga nke ọma na ihe ndị ga-eme ka anyị ghara inwe ihe ịga nke ọma. N’ezie, mgbe Bible na-ekwu banyere onye na-aṅa ntị n’ihe Chineke na-ekwu, o kwuru ihe a na-emesi obi ike, sị: “Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.”—Abụ Ọma 1:3.

Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere ọtụtụ ndị adịghị enwe ihe ịga nke ọma, obi ụtọ, na afọ ojuju ná ndụ? Anyị ga-enweta azịza ya ma ọ bụrụ na anyị elerukwuo abụ ọma a anya, anyị ga-amatakwa otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma.

“Ndụmọdụ Ndị Na-emebi Iwu”

Ọbụ abụ ahụ dọrọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ dị n’ije ije “na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.” (Abụ Ọma 1:1) Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu bụ “ajọ onye ahụ” n’onwe ya. (Matiu 6:13) Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na ọ bụ ya “na-achị ụwa a” nakwa na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (Jọn 16:11; 1 Jọn 5:19) N’ihi ya, ọ gaghị eju anyị anya ịhụ na ọtụtụ ndụmọdụ ndị a na-enweta n’ụwa taa yiri nke ajọ onye ahụ.

Olee ụdị ndụmọdụ ndị na-emebi iwu na-enye? Ndị na-emebi iwu na-elelị Chineke. (Abụ Ọma 10:13) Ndụmọdụ ha, bụ́ nke na-eme ka a na-eleghara Chineke anya ma ọ bụ na-akparị ya, juru ebe nile. Taa, ụwa na-akwalite “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ.” (1 Jọn 2:16) Ihe a na-anụkarị n’usoro mgbasa ozi bụ ihe banyere otú mmadụ pụrụ isi “nweta ihe kasị mma ná ndụ” ma a bịa n’ihe banyere ihe onwunwe. Gburugburu ụwa, ụlọ ọrụ dị iche iche na-emefu ihe karịrị narị ijeri dọla ise n’afọ ọ bụla n’ịkpọsa ngwá ahịa ha iji mee ka ndị mmadụ zụọ ha—ma ngwá ahịa ndị ahụ hà dị ndị mmadụ mkpa ma ọ bụ na hà dịghị ha mkpa. Mkpọsa ndị a emeela ihe karịrị nanị ịgbanwe otú ndị mmadụ si azụ ihe. O meela ka ụwa na-enwe echiche hiere ụzọ banyere ihe bụ́ ihe ịga nke ọma.

N’ihi nke a, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị nweziri ihe ndị ha na-enwelighị ike inwe n’oge ndị gara aga, ihe onwunwe aka-ejubeghị ha afọ. Ọtụtụ na-eche na mmadụ agaghị enwe obi ụtọ ma ọ bụ ihe ịga nke ọma ọ gwụkwala ma o nwere ihe ndị a. Echiche a hiere ụzọ, ‘o siteghịkwa n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa.’—1 Jọn 2:16.

Onye kere anyị maara ihe ga-eme ka anyị nwee ihe ịga nke ọma n’ezie. Ndụmọdụ ya dị iche na “ndụmọdụ ajọ onye ahụ.” N’ihi ya, anyị ịchọ inweta ihu ọma Chineke, n’otu oge ahụkwa na-enwe ụdị echiche ụwa nwere banyere ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma, dị ka ịchọ ịga ije n’okporo ụzọ abụọ n’otu oge. Nke a apụghị ikwe omume. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji na-adọ aka ná ntị, sị: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a”!—Ndị Rom 12:2, Bible Nsọ nke Union Version.

Unu Ekwela Ka Ụwa Mee Ka Unu Yie Ya

Ụwa nke Setan na-achị na-eme ka à ga-asị na ọ chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya. Chetakwa na ọ bụ n’ihi ịchọ ọdịmma onwe ya nanị mere Setan ji duhie nwanyị mbụ bụ́ Iv ka o mee ihe na-amasị yanwa bụ́ Setan. O jiziri Iv nwata Adam ime mmehie. Taa, Setan na-esikwa n’aka ndị mmadụ agbasa echiche ọjọọ ya.

Dị ka ihe atụ, a chọrọ ka David, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu nke a ụzọ, na-arụ ọrụ mgbe ọrụ gbasachara nakwa ka ọ na-eme njem ugboro ugboro n’ihi ọrụ ya. David kwuru, sị: “Ana m apụ n’isi ụtụtụ Monday ma lọta n’uhuruchi Thursday.” Mgbe ezi ndị enyi David, ndị ezinụlọ ya na ndị ọrụ ibe ya, chọpụtara na oge ndị ahụ ọ na-etinyekwu n’ọrụ ga-eme ka ọ baa ọgaranya, ha gbara ya ume ka ọ nọgide na-arụ ọrụ ahụ n’ihi ezinụlọ ya. Ha gwara ya na nke a ga-ewe nanị afọ ole na ole ruo mgbe ọ ga-aghọ nnukwu mmadụ n’ụlọ ọrụ ahụ. David kwuru, sị: “Ha kwuru na nke a ga-abara ezinụlọ m uru n’ihi na m ga na-enwetakwu ego ma na-ezilatakwuru ndị ezinụlọ m ego. Ọ bụ ezie na ọ bụghị mụ na ezinụlọ m bi, ndị enyi m mere ka m kweta n’ezie na m na-enyekwu ezinụlọ m ihe dị ha mkpa.” Ọtụtụ ndị na-arụsi ọrụ ike dị ka David mere iji na-enye ezinụlọ ha ihe ọ bụla ha chere dị ha mkpa. Ma ịgbaso ụdị ndụmọdụ a ọ̀ na-eme ka mmadụ nwee ihe ịga nke ọma? Gịnị n’ezie dị ezinụlọ mkpa?

David chọpụtara ihe dị ezinụlọ ya mkpa mgbe o mere njem n’ihi ọrụ ya. O kwuru, sị: “Mụ na nwa m nwanyị bụ́ Angelica nọ na-akparịta ụka na telefon mgbe ọ jụrụ m, sị: ‘Papa, gịnị mere ị dịghị achọ ka anyị na gị na-anọ?’ David kwuru, sị: “Nke a wutere m nnọọ.” Ihe a nwa ya nwanyị kwuru mere ka o kpebisikwuo ike ịkwụsị ọrụ ahụ. David kpebiri inye ezinụlọ ya ihe dị ha mkpa n’ezie, ya bụ, iwepụta oge soro ezinụlọ ya na-anọ.

Itinye Ndụmọdụ Chineke n’Ọrụ Na-eme Ka Mmadụ Na-enwe Ihe Ịga nke Ọma

Olee otú ị pụrụ isi zere echiche na-ezighị ezi bụ́ nke jupụtara n’ụwa a? Ọbụ abụ ahụ gwara anyị na onye ihe na-agara nke ọma na onye obi ụtọ ka mmadụ ahụ bụ nke ọ bụ “n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.”—Abụ Ọma 1:2.

Mgbe Chineke họpụtara Jọshụa ka ọ bụrụ onye ndú mba Izrel, ọ gwara Jọshụa, sị: “Ị ga-atụgharị uche [n’Okwu Chineke] ehihie na abalị.” Ee, ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke dị oké mkpa, ma, Jọshụa kwesịkwara ‘ilezi anya ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya.’ N’ezie, nanị ịgụ Bible agaghị eme ka i nwee ihe ịga nke ọma n’ụzọ ọrụ ebube. Ị ga-etinyerịrị ihe ị na-agụ n’ọrụ. A gwara Jọshụa, sị: “Mgbe ahụ ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche.”—Joshua 1:8.

Cheedị banyere nwatakịrị obi dị mma nke mama ya ku n’apata ụkwụ na-agụrụ ya akụkọ na-atọ ya ụtọ. Ugboro ole ọ bụla ọ sọkwarala ha gụọ akụkọ ahụ, oge ndị ahụ ha ji na-agụ ya dị nnọọ oké ọnụ ahịa n’anya ha. N’otu aka ahụ, onye hụrụ Chineke n’anya na-ewere ọgụgụ Bible dị ka ihe na-enye obi ụtọ—ọmarịcha oge ya na Nna ya nke eluigwe ji anọkọ. Ọ bụrụ na onye dị otú a agbasoo ndụmọdụ na nduzi Jehova, ọ na-adị “ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.”—Abụ Ọma 1:3.

Osisi ahụ ọbụ abụ ahụ kwuru banyere ya etoghị na mberede. Onye ọrụ ugbo jiri nlezianya kụọ ya n’akụkụ mmiri ma na-elekọta ya. N’otu aka ahụ, Nna anyị nke eluigwe na-eji ndụmọdụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ agbazi echiche anyị. Nke a na-eme ka anyị na-eme nke ọma ma na-akpa àgwà ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke.

Ma “ọ bụghị otú a ka ndị na-emebi iwu dị.” N’ezie, o nwere ike ịdị ka ndị na-emebi iwu hà na-enwe ihe ịga nke ọma ruo oge ụfọdụ, ma ọ ga-emecha rụpụtara ha ihe ọjọọ. Ha “agaghị eguzosi ike n’ikpe.” Kama iguzosi ike n’ikpe, “ụzọ ndị na-emebi iwu ga-ala n’iyi.”—Abụ Ọma 1:4-6.

Ya mere, ekwela ka ụwa na-ekpebiri gị ihe ga-abụ ihe mgbaru ọsọ gị ná ndụ nakwa otú ị ga-esi na-akpa àgwà. Ọ bụ ezie na i nwere ike inwe nkà bụ́ nke ị pụrụ iji nwee ihe ịga nke ọma n’ụwa a, kpachara anya otú i si e ji ya eme ihe ma ọ bụ otú i si ekwe ka ụwa jiri ya na-eme. Ịchụ ihe onwunwe n’ụzọ na-enweghị isi pụrụ ime ka mmadụ “kpọnwụọ.” Ma, iso Chineke na-enwe mmekọrịta dị mma na-eweta ihe ịga nke ọma na obi ụtọ.

Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma

Gịnị mere ihe ọ bụla mmadụ na-eme ga-eji gaa nke ọma ma ọ bụrụ na ọ gbasoo ndụmọdụ Chineke? Ọbụ abụ ahụ adịghị ekwu banyere inwe ihe ịga nke ọma dị ka ụwa si ele ya anya. E gosiri na onye na-atụ egwu Chineke ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na ya a na-eme uche Chineke—ee, ime uche Chineke na-emekarị ka mmadụ nwee ihe ịga nke ọma. Ngwa ka anyị hụ otú itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ pụrụ isi mee ka i nwee ihe ịga nke ọma.

N’ime Ezinụlọ: Akwụkwọ Nsọ gbara ndị di ume “ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha,” ọ gwakwara nwunye bụ́ Onye Kraịst ka ọ ‘na-enwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.’ (Ndị Efesọs 5:28, 33) A gbara ndị nne na nna ume iso ụmụ ha na-anọkọ, iso ha na-achịkọ ọchị, nakwa ka ha na-akụziri ha ihe ndị ka mkpa ná ndụ. (Deuterọnọmi 6:6, 7; Eklisiastis 3:4) Okwu Chineke dụkwara ndị nne na nna ọdụ, sị: “Unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe.” Ọ bụrụ na ndị nne na nna etinye ndụmọdụ a n’ọrụ, ọ ga-adịrị ụmụ mfe ịdị ‘na-erubere ndị mụrụ ha isi’ ma ‘na-asọpụrụ nna ha na nne ha.’ (Ndị Efesọs 6:1-4) Ịgbaso ndụmọdụ a Chineke nyere pụrụ ime ka e nwee ihe ịga nke ọma n’ezinụlọ.

N’imeta Ezi Ndị Enyi: Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ chọrọ ndị enyi. E kenyere n’ime anyị ikike nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya na ịhụ ndị ọzọ n’anya. Jizọs gwara ụmụazụ ya na ha kwesịrị ‘ịhụrịta ibe ha n’anya.’ (Jọn 13:34, 35) N’etiti ụmụazụ Jizọs, anyị na-emeta ezi ndị enyi anyị pụrụ ịhụ n’anya ma na-atụkwasị obi—ọbụna ndị anyị pụrụ ịkọrọ otú ọ dị anyị n’obi. (Ilu 18:24) Karịsịa, ọ bụrụ na anyị etinye ụkpụrụ ndị dị na Bible n’ọrụ, anyị pụrụ ‘ịbịaru Chineke nso,’ ọbụna a pụkwara ịkpọ anyị “enyi Jehova” dị ka a kpọrọ Ebreham.—Jems 2:23; 4:8.

N’ime Ka Ndụ Anyị Nwee Nzube: Kama ịnọ na-ebi ndụ na-enweghị isi kwa ụbọchị, ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ezie na-ebi ndụ na-eju afọ nakwa nke nwere nzube. Ndụ ha adịghị ehiwe isi n’usoro ihe a na-agbanwe agbanwe. Ihe mgbaru ọsọ ndị ha na-esetịpụrụ onwe ha na-eme ka ha nwee afọ ojuju na-adịgide adịgide n’ihi na ihe mgbaru ọsọ ndị a hiwere isi ná nzube nke ndụ. Gịnị na-eme ka mmadụ nwee nzube ná ndụ? “Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.

N’ihe Banyere Inwe Olileanya: Anyị inwe Chineke dị ka Enyi anyị na-emekwa ka anyị nwee olileanya maka ọdịnihu. Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume “ka ha tụkwasịkwa olileanya ha, ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke.” Ha ga-esi otú a “na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:17-19) A ga-enwe ndụ a nke bụ ndụ n’ezie n’isi nso mgbe Alaeze eluigwe Chineke ga-eweghachi Paradaịs n’ụwa a.—Luk 23:43.

Itinye ụkpụrụ ndị dị na Bible n’ọrụ agaghị eme ka ị ghara inwe nsogbu, ma ọ ga-enyere gị aka izere ọtụtụ ihe ndị na-akpata obi mgbawa na iru uju ndị ndị ajọ mmadụ na-akpatara onwe ha. David, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na ọtụtụ nde ndị ọzọ dị ka ya, amụtala uru itinye ụkpụrụ ndị dị na Bible n’ọrụ ná ndụ ha na-aba. Mgbe David chọtasịrị ọrụ nyere ya ohere iso ezinụlọ ya na-anọkọ, o kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na mụ na nwunye m na ụmụ m na-emekọrịta nnọọ ihe nakwa na m nwere ihe ùgwù ijere Jehova Chineke ozi dị ka okenye ọgbakọ.” Ka a sịkwa ihe mere abụ ọma ji kwuo banyere onye na-aṅa ntị n’iwu Chineke, sị: “Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma”!

[Chaatị dị na peeji nke 6]

IHE ISE NA-EME KA E NWEE IHE ỊGA NKE ỌMA

1 Ekwela ka e mee ka i yie ajọ oge a.

Abụ Ọma 1:1; Ndị Rom 12:2

2 Na-agụ ma na-atụgharị uche n’Okwu Chineke kwa ụbọchị.

Abụ Ọma 1:2, 3

3 Tinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ ná ndụ gị.

Joshua 1:7-9

4 Bụrụ enyi Chineke.

Jems 2:23; 4:8

5 Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu.

Eklisiastis 12:13

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe ndị ị na-eme hà ga-eme ka i nwee ihe ịga nke ọma?