Ịnọgide Na-eguzosi Ike Mgbe Nwa Gị Nupụrụ Isi
Ịnọgide Na-eguzosi Ike Mgbe Nwa Gị Nupụrụ Isi
OTU nwanyị bụ́ Onye Kraịst anyị ga-akpọ Joy gbalịrị ịzụlite nwa ya ịhụ Jehova Chineke n’anya. Ma, mgbe nwa ahụ ruwere afọ iri abụọ, o nupụrụ isi ma hapụ ụlọ. Joy kwuru, sị: “Ọ bụ ihe kasị wute m ná ndụ m. Ọ dị m ka à gbara m mgba okpuru, obi gbawara m, ike ụwa agwụkwa m. Obi jọrọ m nnọọ njọ.”
Ikekwe, ị gbalịakwala ịzụlite ụmụ gị ịhụ Chineke n’anya na ife ya—ma otu n’ime ha ma ọ bụ karịa emesịa kwụsị ife ya. Olee otú ị ga-esi die ọnọdụ dị otú ahụ na-agbawa obi? Gịnị ga-enyere gị aka ịnọgidesi ike n’ofufe ị na-efe Jehova?
Mgbe Ụmụ Jehova Nupụrụ Isi
Ihe mbụ ọ dị mkpa ka i mee bụ ịghọta na Jehova maara nnọọ otú obi dị gị. Anyị na-agụ n’Aịsaịa 49:15, sị: “Nwanyị, ọ̀ ga-echezọ nwa ya na-aṅụ ara, wee ghara inwe obi ebere n’ahụ́ nwa afọ ya? ee, eleghị anya ndị a ga-echezọ, ma Mụ onwe m agaghị echezọ gị.” Ee, ihe na-emetụ Jehova n’obi otú o si emetụ ndị nne na nna. N’ihi ya, cheedị echiche ụdị obi ụtọ Jehova na-aghaghị inweworị mgbe ụmụ ya nile bụ́ ndị mmụọ ozi na-eto ma na-efe ya. Mgbe Jehova na-azaghachi nna ochie bụ́ Job ‘site n’oké ifufe,’ O chetara oge ya na ezinụlọ ya nke ndị mmụọ ozi nile dị n’otu ma na-enwe obi ụtọ, na-ekwu, sị: “Olee ebe ị nọ mgbe M tọrọ ntọala ụwa? . . . Mgbe kpakpando ụtụtụ na-etikọ mkpu ọṅụ, ụmụ Chineke nile wee tisie mkpu ọṅụ ike?”—Job 38:1, 4, 7.
Ka oge na-aga, ezi Chineke ahụ hụrụ ka otu mmụọ ozi zuru okè bụ́ nwa ya nupụụrụ ya isi ma ghọọ Setan, nke pụtara “Onye Nguzogide.” Jehova hụkwara ka mmadụ mbụ o kere eke, bụ́ Adam, na nwunye ya zuru okè, bụ́ Iv, sonyere ná nnupụisi ahụ. (Jenesis 3:1-6; Mkpughe 12:9) Ka e mesịrị, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ ‘gbahapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị’ ma nupụrụ Chineke isi.—Jud 6.
Akwụkwọ Nsọ agwaghị anyị otú obi dị Jehova mgbe ụfọdụ ụmụ ya ndị zuru okè nupụụrụ ya isi. Otú ọ dị, Bible kwuru hoo haa, sị: “Jehova wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ Jenesis 6:5, 6) Isi ndị Izrel, bụ́ ndị Jehova họọrọ, nupụụrụ ya ‘wutekwara ya’ ma ‘kpasuo ya iwe.’—Abụ Ọma 78:40, 41.
ogologo ụbọchị nile. Jehova wee chegharịa na O mere mmadụ n’ụwa, o wee wute Ya n’obi Ya.” (O doro anya na Jehova na-emetere ndị nne na nna àgwà ọjọọ ụmụ ha na-enupụ isi na-akpa na-ewute ma na-akpasu iwe ebere. N’Okwu ya, bụ́ Bible, o nyewo ndị nne na nna dị otú ahụ ezi ndụmọdụ na agbamume ga-enyere ha aka idi ọnọdụ ha. Chineke na-agba ha ume iweda onwe ha ala, ịtụkwasị ya nchegbu nile ha na iguzogide Setan bụ́ Ekwensu. Ka anyị hụ otú ịgbaso ndụmọdụ a nwere ike isi nyere gị aka ịnọgidesi ike mgbe nwa gị nupụrụ isi.
Tụkwasị Jehova Nchegbu Gị
Jehova maara na ọ na-enye nnọọ nne na nna nsogbu n’obi ịma na ụmụ ha nwere ike imerụ onwe ha ahụ́ ma ọ bụ ndị ọzọ emerụọ ha ahụ́. Pita onyeozi kwuru otu ụzọ a pụrụ isi die nchegbu a na ndị ọzọ. O dere, sị: “Na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe [Jehova] nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.” (1 Pita 5:7) Olee ihe mere agbamume na nkwa a ji dị ndị nne na nna nwa ha nupụrụ isi mkpa karịsịa?
Mgbe nwa gị ka bụ nwata, ị naghị ekwe ka aka kpa ya, ọ pụkwara nnọọ ịbụ na o rubere isi ná nduzi i ji ịhụnanya nye ya. Otú ọ dị, ka ọ na-etolite, ikike i nwere n’ebe ọ nọ nwere ike ibelatatụla, ma ọchịchọ i nwere ichebe ya pụọ ná nsogbu ebelataghị. Ma eleghịdị anya, i nwekwuola ọchịchọ ichebe ya.
N’ihi ya, mgbe nwa gị nupụrụ isi ma daba ná nsogbu ná mmekọrịta ya na Chineke, kpatara onwe ya nchegbu, ma ọ bụ mmerụ ahụ́, ị pụrụ iche na o si gị n’aka. Ọ bụ otú a ka Joy, bụ́ onye a kpọburu aha, chere. O kwuru, sị: “Kwa ụbọchị, anọ m na-eche banyere ihe ndị gara aga, n’ihi na echere m na ọ dị otú m si mejọọ ihe.” Ọ bụ n’oge dị otú ahụ karịsịa ka Jehova chọrọ ka ‘ị tụkwasị nchegbu nile gị n’ebe ọ nọ.’ Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-enyere gị aka. Ọbụ abụ kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Joy nwetara nkasi obi dị otú ahụ. Ọ kọwara, sị: “Agwara m Jehova ihe nile m na-eche banyere ihe nile na-emenụ. Agwara m ya nnọọ otú ọ dị m, nke ahụ bụkwa ihe kasị mee ka obi ruo m ala.”
Dị ka nne ma ọ bụ nna na-ezughị okè, a pụrụ inwe ebe ndị i mejọrọ ihe mgbe ị na-azụlite nwa gị. Ma, olee ihe mere ị ga-eji lekwasị anya n’ebe ndị i mejọrọ ihe? O doro anya na Jehova adịghị elekwasị anya na ha, n’ihi na ọbụ abụ e nyere ike mmụọ nsọ, bụrụ, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Ọ bụrụgodị na ị bụ nne ma ọ bụ nna zuru okè, nwa gị ka nwekwara ike inupụ isi. N’ihi ya, kọọrọ Jehova otú obi dị gị n’ekpere, ọ ga-enyekwara gị aka idi ya. Otú ọ dị, ị ghaghị imekwu ihe ma ọ bụrụ na gị onwe gị ga-anọgide na-eguzosi ike n’ife Jehova ma ghara ikwe ka Setan duhie gị.
Weda Onwe Gị Ala
Pita dere, sị: “Wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ya ruru.” (1 Pita 5:6) N’ihi gịnị ka ịdị umeala n’obi ji dị mkpa mgbe nwa gị nupụrụ isi? Ọ bụghị nanị na inwe nwa nupụrụ isi ga-ewute gị ma mee ka i nwee obi amamikpe, ọ ga-emechukwa gị ihu. I nwere ike ịdị na-eche na ihe ahụ nwa gị mere emebiela aha ọma nke ezinụlọ gị, karịsịa ma ọ bụrụ na a chụrụ ya n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ihere nwere ike ime ka ị ghara inwe mmasị ịbịa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst.
Iji die ọnọdụ dị otú ahụ, ọ dị gị mkpa iji ezi amamihe mee ihe. Ilu 18:1 dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” Site n’ịgachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya, ị ga-enweta ntụziaka na agbamume dị gị mkpa. Joy kwetara, sị: “Na mbụ, achọghị m nnọọ ịhụ onye ọ bụla. Ma echetaara m onwe m mkpa ọ dị m ịnọgide n’ihe ndị m na-eme dị ka Onye Kraịst. E wezụga nke ahụ, a sị na m nọ n’ụlọ, m ga na-echegbu onwe m banyere nsogbu m. Ọmụmụ ihe nyeere m aka ilekwasị anya n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke. Obi dị m nnọọ ụtọ na ahapụghị m ọmụmụ ihe, bụ́ nke gaara ime ka enyemaka ndị ụmụnna m ji ịhụnanya nye m kwaa m.”—Ndị Hibru 10:24, 25.
Chetakwa na onye nke ọ bụla nọ n’ezinụlọ aghaghị ‘ibu ibu nke ya’ dị ka Onye Kraịst. (Ndị Galeshia 6:5) Jehova chọrọ ka ndị nne na nna na-ahụ ụmụ ha n’anya. Ọ chọkwara ka ụmụ na-ahụ ndị nne na nna ha n’anya ma na-asọpụrụ ha. Ọ bụrụ na nne na nna emee ike ha nile n’ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova,” nne na nna n’onwe ha ga-enwe aha ọma n’ebe Chineke nọ. (Ndị Efesọs 6:1-4) Ọ bụrụ na nwata enupụ isi na ndụmọdụ nne na nna ya ji ịhụnanya nye ya, ọ bụ aha nwa ahụ ga-emebi. Ilu 20:11 na-ekwu, sị: “Ọbụna nwata na-eme ka a mata ya site n’omume ya nile, ma ọrụ ya dị ọcha, ma o zikwara ezi.” N’ezie, isi Setan nupụụrụ Jehova emebighị aha Chineke n’ebe ndị maara banyere ihe ndị merenụ nọ.
Guzogide Ekwensu
Pita dọrọ aka ná ntị, sị: “Nọgidenụ na-enwe uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Dị ka ọdụm, Ekwensu na-elekwasịkarị ndị na-eto eto na-enweghị ahụmahụ anya. N’oge ochie, ọdụm na-akpagharị n’Izrel ma bụrụ ihe iyi egwu nye anụ ụlọ. Ọ bụrụ na nwa atụrụ esi n’ìgwè atụrụ kpafuo, ọ ga-aghọrọ ọdụm anụ oriri. Amamihe ebumpụta ụwa nke nne atụrụ nwere ike ịkpali ya itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ iji chebe nwa ya. Otú ọ dị, ọ dịtụghị ebe ike atụrụ tozuru etozu ruru ma e jiri ya tụnyere nke ọdụm. N’ihi ya, a chọrọ ndị ọzụzụ atụrụ obi siri ike iji chebe atụrụ.—1 Samuel 17:34, 35.
Iji chebe atụrụ ihe atụ ya n’aka “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” Jehova emeela ndokwa ka ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ na-elekọta atụrụ ya anya n’okpuru “onyeisi ọzụzụ atụrụ,” bụ́ Jizọs Kraịst. (1 Pita 5:4) Pita gbara ndị ikom dị otú ahụ a họpụtara ahọpụta ume, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama n’ọchịchọ obi; ọ bụghịkwa n’ihi ịhụnanya nke uru aghụghọ, kama n’ịnụ ọkụ n’obi.” (1 Pita 5:1, 2) Ọ bụrụ na unu bụ́ ndị nne na nna akwado ndị ọzụzụ atụrụ ndị a, ha nwere ike inyere onye na-eto eto aka ime ka ya na Chineke dịghachi ná mma.
Mgbe ọ dị mkpa ka ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ Ndị Kraịst dụọ nwa gị na-enupụ isi ọdụ, i nwere ike ịchọ ịzọ ya. Otú ọ dị, ọ dị nnọọ njọ ime ihe dị otú ahụ. Pita kwuru, sị: “Guzogidenụ [Ekwensu]”—ọ bụghị ndị ọzụzụ atụrụ na-elekọta atụrụ Chineke.—1 Pita 5:9.
Mgbe E Nyere Ịdọ Aka ná Ntị Siri Ike
Ọ bụrụ na e meela nwa gị baptizim, ya abụrụkwa na o nweghị nchegharị, e nwere ike ịdọ ya aka ná ntị n’ụzọ kasị sie ike—ya bụ ịchụpụ ya n’ọgbakọ. Ókè gị na ya ga na-emekọru ihe dabeere n’afọ ndụ ya na ọnọdụ ndị ọzọ.
Ọ bụrụ na ọ ka bụ nwata ma biri n’ụlọ gị, ọ bụ ọrụ gị igbo mkpa anụ ahụ́ ya. Ọ dịkwa ya mkpa ka a zụọ ya ịkpa ezi àgwà nakwa ka a na-adọ ya aka ná ntị, ọ bụkwa ọrụ gị ime otú ahụ. (Ilu 1:8-18; 6:20-22; 29:17) O nwere ike ịdị mkpa ka i duziere ya ọmụmụ Bible, bụ́ nke ọ ga na-etinye ọnụ na ya. I nwere ike ịdọrọ uche ya gaa n’ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ dị iche iche “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” bipụtara. (Matiu 24:45) I nwekwara ike ịkpọrọ ya gaa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, gị na ya anọrọkwa. A pụrụ ime ihe nile a iji mee ka o tinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ.
Ị ga-eme ihe dị iche ma ọ bụrụ na nwa gị a chụrụ achụ abụkwaghị nwata ma biri iche. Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst nọ na Kọrint oge ochie ọdụ, sị: “Unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ, ọbụna unu na onye dị otú a erikọla ihe.” (1 Ndị Kọrint 5:11) Ọ bụ ezie na ihe ụfọdụ dị mkpa ka e mee n’ezinụlọ nwere ike ime ka gị na onye ahụ a chụrụ achụ mekọta ihe, nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịgbalịsi ike izere mkpakọrịta na-adịghị mkpa nke ya na onye ahụ.
Mgbe ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ Ndị Kraịst dọrọ nwa gị mere mmehie aka ná ntị, ọ gaghị ekwesị ekwesị ka ị gbaa ihe ahụ kwekọrọ na Bible ha mere ụkwụ ma ọ bụ leda ya anya. Ịdụnyere nwa gị nupụrụ isi úkwù agaghị echebe ya nnọọ pụọ n’aka Ekwensu. N’ezie, ị na-etinye mmekọrịta nke gị na Chineke n’ihe ize ndụ. N’aka nke ọzọ, site n’ịkwado ndokwa nke ndị ọzụzụ atụrụ ahụ mere, ị ‘ga-esi ike n’okwukwe’ ma nyere nwa gị ezigbo aka.—1 Pita 5:9.
Jehova Ga-akwagide Gị
Ọ bụrụ na nwa gị enupụ isi, cheta na ị bụghị onye mbụ. Nne na nna ndị ọzọ bụ́ Ndị Kraịst enwewo ahụmahụ yiri nke ahụ. N’agbanyeghị nsogbu ndị dakwasịrị anyị, Jehova pụrụ ịkwagide anyị.—Abụ Ọma 68:19.
Dabere na Jehova site n’ekpere. Na-eso ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpachi anya. Kwado ịdọ aka ná ntị ndị ọzụzụ atụrụ a họpụtara ahọpụta nyere. Site n’ime otú ahụ, ị ga-enwe ike ịnọgidesi ike. Ezi ihe nlereanya gị nwekwara ike inyere nwa gị aka ịza òkù Jehova ji ịhụnanya na-akpọ ya ịlaghachikwute ya.—Malakaị 3:6, 7.
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Nweta ike site n’ekpere na ọgbakọ Ndị Kraịst