Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú o si bụrụ na onye mkpọkọta ahụ chọtara nanị “otu mmadụ n’etiti [otu puku mmadụ]” ma ghara ịchọta “otu nwanyị n’ime ndị ahụ nile”?—Eklisiastis 7:28.

Iji ghọta okwu ndị ahụ e ji ike mmụọ nsọ kwuo n’ụzọ ziri ezi, anyị aghaghị ịghọta otú Chineke si ele ụmụ nwanyị anya. Bible kpọrọ nwunye nwa Naomi bụ́ Rut, onye bụ́ nwanyị di ya nwụrụ “nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma.” (Rut 3:11) Dị ka Ilu 31:10 si kwuo, ‘ọnụ ahịa ezigbo nwanyị karịrị ruby nke ukwuu.’ Oleezi ihe Eze Solomọn nke Izrel oge ochie bu n’obi mgbe o kwuru, sị: “Otu mmadụ n’etiti [otu puku mmadụ] ka m chọtaworo; ma ọ dịghị otu nwanyị n’ime ndị ahụ nile ka m chọtaworo”?

Ihe ndị ọzọ e kwuru n’ebe e kwuru okwu ahụ gosiri na ọ ghaghị ịbụ na ọtụtụ ụmụ nwanyị n’oge Solomọn na-akpa àgwà ọjọọ. (Eklisiastis 7:26) Nke a nwere nnọọ ike ịbụ n’ihi ihe ha mụtara n’aka ụmụ nwanyị ala ọzọ na-efe Bel, bụ́ ndị bi ebe ahụ. Ọbụna Eze Solomọn kwere ka ọtụtụ ụmụ nwanyị ala ọzọ ọ lụrụ nwata ya. Bible kwuru, sị: “O wee nwee [narị ndị inyom asaa], bụ́ ụmụ ndị isi, na [narị ndị iko atọ]: ndị inyom ya wee wezụga obi ya” ka o fee chi ọzọ. (1 Ndị Eze 11:1-4) Ndị nwoke na-akpakwa àgwà ọjọọ—ịhụ otu onye n’ime otu puku mmadụ gosiri na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọ dịghị nwoke omume ya dị mma. Solomọn kwubiri, sị: “Nanị nke a ka m chọtaworo, na Chineke mere mmadụ ka o zie ezie; ma ha onwe ha achọpụtawo ọtụtụ ihe e chepụtara.” (Eklisiastis 7:29) Ihe a e kwuru ebe a bụ maka mmadụ nile—ọ bụghị ihe na-egosi na ndị nwoke ka ndị nwanyị mma. N’ihi ya, e kwesịrị ile okwu ahụ dị na Eklisiastis 7:28 anya dị ka okwu Solomọn kwuru iji gosi otú àgwà ndị oge ya dị.

Ma, ọ dị ihe ọzọ amaokwu a nwere ike ịpụta. E nwere ike ịkọwa ya n’ụzọ amụma, n’ihi na ọ dịtụbeghị nwanyị rubeere Jehova isi n’ụzọ zuru okè. Ma, e nwewo nwoke mere otú ahụ—ya bụ Jizọs Kraịst.—Ndị Rom 5:15-17.

[Foto dị na peeji nke 31]

“Otu mmadụ n’etiti otu puku”