Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Kere Nwoke na Nwanyị Maka Ibe Ha

E Kere Nwoke na Nwanyị Maka Ibe Ha

E Kere Nwoke na Nwanyị Maka Ibe Ha

KEMGBE ụwa, ọ na-agụ nwoke na nwanyị agụụ ịnọkọ ọnụ. Ọ bụ Chineke kenyere ụdị ọchịchọ a n’ime mmadụ. Jehova hụrụ na ọ dịghị mma ka mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam, nọrọ nanị ya. N’ihi ya, Chineke meere nwoke ahụ “onye inyeaka kwesịịrị ya.”

Jehova mere ka Adam hie oké ụra, ka ọ na-ehikwa ụra ahụ, ya ewere otu n’ime ọgịrịga ya “wuo ya dị ka ụlọ ka ọ ghọọ nwanyị, O wee mee ka ọ bịakwute mmadụ ahụ.” Obi tọrọ Adam ụtọ nke ukwuu mgbe ọ hụrụ nwanyị a mara mma Jehova kere nke na o kwuru, sị: “Ehee! nke a bụ nnọọ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m pụta, na anụ ahụ́ si n’anụ ahụ́ m pụta.” N’ihi àgwà ndị mere nwanyị ahụ zuru okè, bụ́ Iv, nwanyị, ọ dị nnọọ mfe ịhụ ya n’anya. Àgwà ndị Adam nwekwaranụ dị ka nwoke zuru okè mere ka o ruo eruo ka a kwanyere ya ùgwù. E kere ha maka ibe ha. Bible na-ekwu, sị: “N’ihi nke a ka nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ́ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ́.”—Jenesis 2:18-24.

Ma, taa, ọtụtụ ezinụlọ na-etisasị etisasị, ihe a na-ahụkarịzikwa ná mmekọrịta nke ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị bụ mmegbu na ịchọ ọdịmma onwe onye. Mmụọ nke ịsọ mpi nke na-adị n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị so na-akpata esemokwu na enweghị nkwekọrịta. Ihe ndị a nile megidere ihe Chineke zubere maka nwoke na nwanyị. E kere nwoke ka ọ rụọ ọrụ dị oké mkpa n’ụwa. E kekwara nwanyị ka ọ bụrụ ezigbo onye inyeaka nke nwoke. Ha kwesịrị ijikọta aka na-arụ ọrụ. Malite mgbe e kere mmadụ, ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke ejirila ikwesị ntụkwasị obi mee mgbalị ịrụ ọrụ Jehova zubere ka ha rụọ, nke a emewokwa ka ha nwekwuo obi ụtọ na afọ ojuju. Olee ọrụ ndị e zubere ka ha rụọ, oleekwa otú anyị pụrụ isi rụọ ha?

[Foto dị na peeji nke 3]

Chineke kere nwoke na nwanyị ịrụ ọrụ ndị ga-ewetara ha nkwanye ùgwù