Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Dị Ịrịba Ama A Rụzuru ná Mbipụta nke Bible Ndị E Dere n’Asụsụ Ndị Africa

Ihe Ndị Dị Ịrịba Ama A Rụzuru ná Mbipụta nke Bible Ndị E Dere n’Asụsụ Ndị Africa

Ihe Ndị Dị Ịrịba Ama A Rụzuru ná Mbipụta nke Bible Ndị E Dere n’Asụsụ Ndị Africa

Ọ DỊLA anya ndị nọ na Europe nakwa n’Ebe Ugwu America, bụ́ ndị ji ezi obi na-agụ Bible ghọtara mkpa ọ dị ndị Africa inwe ike ịgụ Okwu Chineke n’asụsụ ala nna ha. Iji mezuo ebumnobi a magburu onwe ya, ọtụtụ ndị gara Africa iji mụọ asụsụ dị iche iche a na-asụ na ya. Ụfọdụ chepụtara otú a ga-esi na-ede asụsụ ụfọdụ ede, ma dee akwụkwọ ọkọwa okwu n’asụsụ ndị ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha malitere ịsụgharị Bible n’ọtụtụ asụsụ a na-asụ n’Africa. Nke a abụghị obere ọrụ. Akwụkwọ bụ́ The Cambridge History of the Bible kwuru, sị: “Mmadụ nwere ike iji ọtụtụ afọ chọọ okwu kwesịrị ekwesị ọ ga-eji kọwaa ihe onye Bekee ọ bụla bụ́ Onye Kraịst maara.”

N’afọ 1857, ndị Tswana ghọrọ ndị mbụ nwere Bible zuru ezu n’otu n’ime asụsụ Africa ndị a na-adịbughị ede ede. * E biri ya ma dụkọta ya n’ùkwù n’ùkwù, ọ bụghị dị ka otu akwụkwọ. Ka oge na-aga, a sụgharịrị Bible n’asụsụ ndị ọzọ a na-asụ n’Africa. Ọtụtụ Bible ndị mbụ ahụ a sụgharịrị n’asụsụ ndị a na-asụ n’Africa bu aha Chineke, bụ́ Jehova, ma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma ọ bụ “Agba Ochie,” ma n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ.” Ma, ndị na-adịghị akwanyere aha nsọ nke Onye chepụtara Bible, bụ́ Jehova, ùgwù mesịrị degharịa Bible ndị ahụ ma sụgharịa ndị nke ọhụrụ. Kama ịkwanyere aha Chineke ùgwù, ha gbasoro omenala na nkwenkwe ụgha nke ndị Juu nke iji utu aha ndị dị ka Chineke ma ọ bụ Onyenwe Anyị dochie anya aha Chineke. N’ihi ya, a bịara nwee mkpa maka ndị Africa hụrụ Chineke n’anya inwe Bible nke weghachiri aha Chineke n’ebe ndị o kwesịrị ịdị.

Kemgbe afọ ndị 1980, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova emewo mgbalị dị ukwuu iji hụ na a sụgharịrị New World Translation of the Holy Scriptures n’ọtụtụ asụsụ ndị bụ́ isi a na-asụ n’Africa. N’ihi ya, taa, ọtụtụ narị puku ndị Africa ji Bible kpọrọ ihe na-agụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ala nna ha. Ka ọ dị ugbu a, e nweela Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, n’ozuzu ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ, n’asụsụ 17 nke ndị Africa.

Obi tọrọ ndị na-agụ Bible ndị ahụ a sụgharịrị n’asụsụ ndị a na-asụ n’Africa ụtọ inwe nsụgharị nke bú aha Chineke dị ebube, bụ́ Jehova. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs guzoro ọtọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret, ọ gwara ndị nọ ebe ahụ ihe mere o ji bịa site n’ịgụ otu akụkụ nke akwụkwọ mpịakọta nke Aịsaịa, bụ́ ebe aha Nna ya pụtara. (Aịsaịa 61:1, 2) Dị ka Oziọma Luk ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ si kwuo, Jizọs gụrụ, sị: “Mmụọ Jehova dịkwasịrị m, n’ihi na o tere m mmanụ ịkpọsara ndị ogbenye ozi ọma, o zigara m ikwusa ntọhapụ nye ndị a dọọrọ n’agha na ịmaliteghachi ịhụ ụzọ nye ndị ìsì, izilaga ndị e gwepịara egwepịa dị ka ndị a tọhapụrụ atọhapụ, ikwusa afọ Jehova na-anara mmadụ nke ọma.”—Luk 4:18, 19.

A rụzuru ihe ọzọ dị mkpa n’ibipụta Bible n’asụsụ ndị a na-asụ n’Africa n’August nke afọ 2005. N’ọnwa ahụ, e bipụtara ma dụkọta ihe karịrị iri puku Bible asaa na isii nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ndị a na-asụ n’Africa n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na South Africa. Iri puku Bible atọ dị n’asụsụ Shona so na ha. E wepụtara mbipụta a ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-erubere Chineke Isi” nke Ndịàmà Jehova, bụ́ nke e nwere na Zimbabwe.

N’ọnwa ahụ mere ihe akụkọ, obi tọrọ ndị njem bịara ileta alaka ụlọ ọrụ dị na South Africa ụtọ mgbe ha hụrụ Bible ndị e bipụtara n’asụsụ ndị ọzọ a na-asụ n’Africa. Nhlanhla, bụ́ onye na-arụ n’ebe a na-adụkọta akwụkwọ na Betel, kwuru, sị: “Obi tọrọ m nnọọ ụtọ inwe ihe ùgwù nke iso rụọ ọrụ n’iwepụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ Shona na n’asụsụ ndị ọzọ a na-asụ n’Africa.” N’ezie, ihe ahụ o kwuru bụ otú obi dị ndị nile nọ na Betel South Africa.

Ndị Africa ga na-enwetazi Bible ndị ọhụrụ ngwa ngwa ma ghara imefuru ha oké ego, karịa mgbe e biri ha n’ala Bekee ma bute ha n’Africa. Ihe ọzọ ka mkpa bụ na ndị Africa nwere ugbu a nsụgharị ziri ezi nke bú aha Onye ahụ chepụtara Bible, bụ́ Jehova Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ka ọ na-erule n’afọ 1835, a sụgharịwo Bible n’asụsụ Malagasy nke ndị Madagascar, sụgharịakwa ya n’asụsụ Amhar nke ndị Etiopia ka ọ na-erule n’afọ 1840. Ọ dịlarị anya a malitere ide asụsụ ndị ahụ ede tupu a sụgharịa Bible na ha.

[Foto dị na peeji nke 12]

Aha Chineke ná nsụgharị Bible Tswana, bụ́ nke e bipụtara n’afọ I840

[Ebe E Si Nweta Foto]

Harold Strange Library of African Studies

[Foto dị na peeji nke 13]

Ebe ndị njem si Swaziland na-ele Bible ndị ọhụrụ a na-ebipụta n’alaka ụlọ ọrụ South Africa