Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Abụọ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Abụọ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Abụọ

AỊZAỊA ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ ya dị ka onye amụma. Amụma ndị o buru banyere alaeze ebo iri nke Izrel emezuolarị. Ugbu a o nwere amụma ọzọ ọ ga-ebu banyere ọdịnihu Jeruselem.

A ga-ebibi obodo Jeruselem ma dọrọ ndị bi na ya n’agha. Ma ọ gaghị atọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, a ga-eweghachi ezi ofufe. Nke a bụ isi ihe dị n’Aịsaịa 36:1-66:24. * Ịtụle ihe isiakwụkwọ ndị a na-ekwu ga-abara anyị uru n’ihi na ọtụtụ n’ime amụma ndị e buru na ha na-enwe mmezu ikpeazụ ha n’oge anyị ma ọ bụ ya abụrụ na ha ga-emezu n’ọdịnihu. Akụkụ akwụkwọ Aịsaịa a nwekwara amụma ndị magburu onwe ha e buru banyere Mezaịa.

“LEE, ỤBỌCHỊ NA-ABỊA”

(Aịsaịa 36:1–39:8)

N’afọ nke 14 nke ọchịchị Eze Hezekaịa (732 T.O.A.), ndị Asiria wakporo Juda. Jehova kwere nkwa na ya ga-echebe Jeruselem. Egwu ahụ ha na-eyi ịwakpo Jeruselem kwụsịrị mgbe nanị otu mmụọ ozi Jehova gburu ndị agha Asiria dị narị puku mmadụ na iri puku asatọ na ise.

Hezekaịa dara ọrịa. Jehova zara ekpere ya ma gwọọ ya, tụkwasị afọ 15 ná ndụ ya. Mgbe eze Babilọn zigara ndị ozi ka ha gaa kelee ya, Hezekaịa ji nzuzu gosi ha akụ̀ ya nile. Aịzaịa ziri Hezekaịa ozi Jehova ziri ya, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, na ihe nile dị n’ụlọ gị, na nke nna gị hà debeworo n’ụlọ akụ̀ ruo taa, a ga-eburu ha jee Babilọn.” (Aịsaịa 39:5, 6) E mezuru amụma ahụ mgbe ihe karịtụrụ otu narị afọ gasịrị.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

38:8—Gịnị bụ “ebe nrịgo” nke onyinyo si na ya laa azụ? Ebe ọ bụ na ndị Ijipt na ndị Babilọn ejiwela ihe ndị na-eji anwụ egosi oge eme ihe na narị afọ nke asatọ T.O.A., ebe nrịgo ndị a pụrụ ịbụ ebe dị iche iche a kanyere akara n’ihe na-eji anwụ egosi oge nke nna Hezekaịa, bụ́ Ehaz, zụrụ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e nwere steepụ dị n’ime obí eze ahụ. Ikekwe otu ogidi dị n’akụkụ ya, onyinyo nke ogidi ahụ a na-ahụ na steepụ ahụ enweekwa ike igosi ihe na-akụnụ.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

36:2, 3, 22. N’agbanyeghị na e wepụrụ Shebna n’ọkwá onye na-elekọta ụlọ, e kwere ka ọ nọgide na-ejere eze ozi dị ka odeakwụkwọ nke onye nọchiri ya. (Aịsaịa 22:15, 19) Ọ bụrụ na a napụrụ anyị ihe ùgwù ná nzukọ Jehova n’ihi ihe ụfọdụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịnọgide na-ejere Chineke ozi n’ọrụ ọ bụla o kwere ka anyị na-arụrụ ya?

37:1, 14, 15; 38:1, 2. N’oge ihe isi ike, ọ bụ ihe amamihe dị na ya anyị ikpegara Jehova ekpere ma tụkwasị ya obi anyị nile.

37:15-20; 38:2, 3. Mgbe ndị Asiria nọ na-eyi Jeruselem egwu, ihe kasị wute Hezekaịa bụ na ọdịda ya ga-ewetara aha Jehova nkọcha. Mgbe Hezekaịa nụrụ na ọrịa ya ga-egbu ya, ihe wutere ya abụghị nanị ọnwụ ya. Ihe ka nye ya nnọọ nsogbu n’obi bụ mmetụta ọnwụ ya n’amụtaghị nwa ga-anọchi ya ga-enwe n’usoro ndị eze sitere n’eriri eze Devid. Ihe ọzọ nọ na-enye ya nsogbu n’obi bụ onye ga-edu ndị Izrel gaa ịlụso ndị Asiria agha. Dị ka Hezekaịa, anyị kweere na ido aha Jehova nsọ na mmezu nke nzube ya dị mkpa karịa nzọpụta anyị.

38:9-20. Abụ a Hezekaịa bụrụ na-akụziri anyị na ọ dịghị ihe dị mkpa ná ndụ karịa mmadụ ito Jehova.

“A Ga-ewu Ya”

(Aịsaịa 40:1–59:21)

Ozugbo Aịzaịa buchara amụma banyere mbibi Jeruselem na ndọrọ a ga-adọrọ ndị Izrel n’agha gaa na Babilọn, o bukwara amụma banyere mwughachi ya na nlọghachi nke ndị ahụ n’obodo ha. (Aịsaịa 40:1, 2) Aịsaịa 44:28 kwuru, sị: “A ga-ewu [Jeruselem].” A ga-ebupụ ihe oyiyi nke chi dị iche iche nke Babilọn dị ka “ihe e boro ebo.” (Aịsaịa 46:1) A ga-ebibi Babilọn. E mezuru ihe a nile ka narị afọ abụọ gasịrị.

Jehova ga-enye ohu ya dị ka “ìhè nke mba nile.” (Aịsaịa 49:6) “Eluigwe” nke Babilọn, ma ọ bụ ndị ọchịchị ya, “ga-apụ n’anya dị ka anwụrụ ọkụ,” ndị bi na ya “ga-anwụkwa dị ka anwụnta”; ma ‘ada Zaịọn a dọtara n’agha ga-atọpụ onwe ya agbụ dị n’olu ya.’ (Aịsaịa 51:6; 52:2) Jehova gwara ndị bịakwutere ya ma ṅaa ya ntị, sị: “Mụ na unu ga-agbakwa ndụ, bụ́ ọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ́ ebere nile . . . nke e meere Devid.” (Aịsaịa 55:3) Ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke ga-eme ka ‘ihe Jehova na-atọ gị ụtọ.’ (Aịsaịa 58:14) N’aka nke ọzọ, ajọ omume nke ndị ahụ ‘na-akpa ókè n’etiti ha na Chineke ha.’—Aịsaịa 59:2.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

40:27, 28—N’ihi gịnị ka Izrel ji kwuo, sị: “Ụzọ m ezonahụworo Jehova, ọzọ, ikpe m esiwo n’ebe Chineke m nọ gabiga”? Ụfọdụ ndị Juu bi na Babilọn nwere ike icheworị na Jehova anaghị ahụ mmegbu a na-emegbu ha. E chetaara ha na Babilọn akaghị Onye kere ụwa ike, bụ́ onye ike na-adịghị agwụ.

43:18-21—N’ihi gịnị ka e ji gwa ndị ahụ si n’ala ọzọ na-alọghachi ka ha ‘ghara icheta ihe mbụ nile’? Nke a apụtaghị na ha kwesịrị ichefu nnapụta ndị Jehova napụtara ha n’oge ndị gara aga. Kama nke ahụ, Jehova chọrọ ka ha too ya n’ihi “ihe ọhụrụ” ha ga-ahụ, dị ka njem ha ga-eme gaa Jeruselem n’enweghị nsogbu, ikekwe site n’ụzọ ka nso si n’ọzara gafee. “Oké ìgwè mmadụ” si “n’oké mkpagbu ahụ” pụta ga-enwekwa ihe ọhụrụ onye nke ọ bụla n’ime ha ga-ahụ ga-eme ka ha too Jehova.—Mkpughe 7:9, 14.

49:6—Olee otú Mezaịa ahụ si bụrụ “ìhè nke mba nile,” n’agbanyeghị na ọ bụ nanị ụmụ Izrel ka o jeere ozi elu ala ya? Ihe mere a ga-eji kwuo otú ahụ bụ ihe mere mgbe Jizọs nwụchara. Bible kwuru na ihe dị n’Aịsaịa 49:6 metụtara ndị na-eso ụzọ ya. (Ọrụ 13:46, 47) Taa, Ndị Kraịst e tere mmanụ, na oké ìgwè mmadụ na-enyere ha aka, na-eje ozi dị ka “ìhè nke mba nile,” na-akụziri ndị mmadụ ihe “ruo nsọtụ ụwa.”—Matiu 24:14; 28:19, 20.

53:10—Olee otú o si bụrụ na ọ tọrọ Jehova ụtọ ịzọpịa Ọkpara ya? Ọ ghaghị iwuteworị Jehova, bụ́ Chineke nke nwere ọmịiko, ịhụ Ọkpara ya Ọ hụrụ n’anya ka ọ na-ata ahụhụ. N’agbanyeghị nke ahụ, nrubeisi Jizọs ji obi ya nile rube na ihe nile ọnwụ ya na ahụhụ ọ tara ga-arụzu, tọrọ Jehova ụtọ.—Ilu 27:11; Aịsaịa 63:9.

53:11—Olee ihe ọmụma nke Mezaịa ahụ ga-eji “mee ka ọha mmadụ ghọọ ndị ezi omume”? Ọ bụ ihe ọmụma Jizọs nwetara site n’ịbịa n’ụwa, ịghọ mmadụ, na ịta ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi ma nwụọ. (Ndị Hibru 4:15) O si otú ahụ chụọ àjà mgbapụta, bụ́ ihe a chọrọ iji nyere Ndị Kraịst e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ aka ịbụ ndị ezi omume n’anya Chineke.—Ndị Rom 5:19; Jems 2:23, 25.

56:6—Olee ndị bụ́ “ụmụ ala ọzọ,” oleekwa otú ha si ‘na-ejidesi ọgbụgba ndụ Jehova ike’? “Ụmụ ala ọzọ” ahụ bụ “atụrụ ọzọ” nke Jizọs. (Jọn 10:16) Ha na-ejidesi ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ike n’echiche bụ́ na ha na-erube isi n’iwu ndị metụtara ọgbụgba ndụ ahụ, na-akwado nnọọ ndokwa nile e si n’ọgbụgba ndụ ahụ mee, na-eso Ndị Kraịst e tere mmanụ eri otu nri ime mmụọ ahụ, ma na-akwado ndị e tere mmanụ n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

40:10-14, 26, 28. Jehova dị ike ma dị obiọma, o nwere ike ime ihe nile ma mara ihe nile, nghọta ya mikwara emi karịa otú anyị nwere ike ịghọta.

40:17, 23; 41:29; 44:9; 59:4. Njikọ ọchịchị na arụsị nile bụ “ihe efu.” Ọ baghị uru ịtụkwasị ha obi.

42:18, 19; 43:8. Anyị ileghara Okwu Chineke e dere ede anya na ịghara ige ntị ná ntụziaka ndị ọ na-enye anyị site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” bụ ịghọ ndị kpuru ìsì na ndị ntị chiri n’ụzọ ihe atụ.—Matiu 24:45.

43:25. Jehova na-ehichapụ mmehie anyị n’ihi aha ya. Ido aha Jehova nsọ dị mkpa karịa ya ịnapụta anyị n’agbụ nke mmehie na ọnwụ na inye anyị ndụ.

44:8. Jehova, bụ́ onye kwụsiri ike ma sie ike dị ka oké nkume, na-akwado anyị. Anyị ekwesịtụghị ịtụ egwu ịgba àmà banyere ịbụ Chineke ya!—2 Samuel 22:31, 32.

44:18-20. Ikpere arụsị bụ ihe na-egosi na obi mmadụ adịghị ọcha. Ọ dịghị ihe kwesịrị ịnọchi anya Jehova n’obi anyị.

46:10, 11. Jehova inwe ike ime ka ‘ndụmọdụ ya guzosie ike,’ nke bụ́ imezu ihe o zubere, bụ́ ihe na-egosi nnọọ na ọ bụ Chineke.

48:17, 18; 57:19-21. Ọ bụrụ na anyị elegara Jehova anya maka nzọpụta, bịaruo ya nso, ma rube isi n’iwu ya, udo anyị ga-ebu ibu ka osimiri na-asọ asọ, ezi omume anyị kwa adị ka mmali mmiri nke oké osimiri. Ndị na-adịghị aṅa Okwu Chineke ntị yiri “oké osimiri nke na-amagharị amagharị.” Ọ dịghị udo ha nwere.

52:5, 6. Ndị Babilọn kwubiri n’ụzọ na-ezighị ezi na ezi Chineke adịghị ike. Ha aghọtaghị na ihe mere ndị Izrel ji ghọọ ndị ohu bụ na Jehova na-eweso ha iwe. Mgbe ihe ọjọọ dakwasịrị ndị ọzọ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya anyị ịghara ikwubi ozugbo ihe kpatara ya.

52:7-9; 55:12, 13. Anyị nwere ọ dịkarịa ala ihe atọ mere anyị ga-eji jiri ọṅụ na-ekwusa Alaeze ahụ ma na-eme ndị na-eso ụzọ. Ụkwụ anyị na-ama mma n’anya ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị agụụ okwu Chineke na-agụ. Anyị na-ahụ Jehova “anya na anya,” nke pụtara na anyị na ya na-enwe mmekọrịta chiri anya. Anyị na-enwekwa ọganihu n’ofufe anyị na-efe ya.

52:11, 12. Iji ruo eruo ibu “ihe dị iche iche nke Jehova”—ihe ndị o nyere maka iji jeere ya ozi dị nsọ—anyị aghaghị ịdị ọcha n’ofufe na n’omume anyị.

58:1-14. Iji ihu abụọ na-eme ka anyị bụ́ ndị ezi omume na ndị na-atụ egwu Chineke abaghị uru. Ezi ndị na-efe Chineke kwesịrị iji obi ha nile na-atụ nnọọ egwu Chineke ma na-ahụ ụmụnna ha n’anya.—Jọn 13:35; 2 Pita 3:11.

59:15b-19. Jehova na-ahụ ihe ụmụ mmadụ na-eme, ọ na-emekwa ihe mgbe oge ya zuru.

Ọ “GA-AGHỌKWA OKPUEZE NKE ỊMA MMA”

(Aịsaịa 60:1–66:24)

Aịsaịa 60:1 na-ezo aka ná mweghachi e weghachiri ezi ofufe n’oge ochie nakwa n’oge anyị a, sị: “Bilie, nwuo; n’ihi na ìhè gị abịawo, ebube Jehova awawokwa n’ahụ́ gị dị ka anyanwụ.” Zaịọn “ga-aghọkwa okpueze nke ịma mma n’aka Jehova.”—Aịsaịa 62:3.

Aịzaịa kpegaara Jehova ekpere banyere ndị Izrel ga-enwe nchegharị n’oge a ga-adọrọ ha n’agha gaa Babilọn. (Aịsaịa 63:15–64:12) Mgbe Aịzaịa kwuchara ọdịiche dị n’etiti ezi ndị ohu Chineke na ndị na-abụghị ndị ohu ya, onye amụma ahụ kwuru otú Jehova ga-esi gọzie ndị na-efe Ya.—Aịsaịa 65:1-66:24.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

61:8, 9—Gịnị bụ “ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ,” oleekwa ndị bụ́ “mkpụrụ” ahụ? Nke a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke Jehova na Ndị Kraịst e tere mmanụ gbara. “Mkpụrụ” ahụ bụ “atụrụ ọzọ”—ya bụ ọtụtụ nde mmadụ ndị nabatara ozi ha.—Jọn 10:16.

63:5—Olee otú ọnụma Chineke si akwagide ya? Chineke na-achịkwa ọnụma ya achịkwa—ọ na-abụ iwe ezi omume. Ọnụma ya na-akwado ma na-akwali ya imezu ikpe ezi omume ya.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

64:6. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè agaghị azọpụtali onwe ha. A bịa n’ikpuchi mmehie anyị, ezi omume anyị dị nnọọ ka uwe e merụrụ emerụ.—Ndị Rom 3:23, 24.

65:13, 14. Jehova na-agọzi ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, na-enye ha okwu ya n’ụba.

66:3-5. Jehova kpọrọ omume ihu abụọ asị.

“Ka Obi Tọọ Unu Ụtọ”

Amụma ndị ahụ e buru maka mweghachi aghaghị ịkasiworị ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi a dọọrọ n’agha gaa Babilọn obi! Jehova kwuru, sị: “Ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke: n’ihi na, lee, M na-eke Jeruselem ịbụ ihe ntegharị egwú ọṅụ, ndị ya kwa, ịbụ ihe obi ụtọ.”—Aịsaịa 65:18.

Anyị onwe anyị bikwa n’oge ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa na n’oge oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa mba nile. (Aịsaịa 60:2) Anyị bi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) N’ihi ya, ozi nzọpụta nke Jehova, bụ́ nke dị n’akwụkwọ Aịsaịa, na-agba anyị ezigbo ume.—Ndị Hibru 4:12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Maka ịtule ihe dị n’Aịsaịa 1:1-35:10, lee “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ” n’Ụlọ Nche nke December 1, 2006.

[Foto dị na peeji nke 8]

Ị̀ maara ihe bụ́ isi mere Hezekaịa ji kpee ekpere ka Chineke napụta ya n’aka ndị Asiria?

[Foto dị na peeji nke 11]

“Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma!”